Ihe Chineke Ga-emere Ndị Na-enyere Ndị Nọ ná Mkpa Aka
Ọtụtụ ndị n’ụwa a chọsiri nri na ebe obibi ike. E nwekwara ndị nke e kwesịrị ime ka ha nwee olileanya na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu. Olee otú mbọ anyị na-agba iji nyere ndị dị otú ahụ aka ga-esi eme ka ihe anyị dị Chineke mma, ya agọziekwa anyị?
IHE AKWỤKWỌ NSỌ KWURU
“Onye na-emere onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya amara na-agbazinye Jehova ihe, Ọ ga-akwụkwa onye ahụ ụgwọ ihe o mere.”—ILU 19:17.
IHE INYERE MMADỤ AKA PỤTARA
Jizọs mere ihe atụ gbasara otu nwoke ndị ohi kụrụ ezigbo ihe ma hapụ ya chee na ọ nwụọla. (Luk 10:29-37) Otu nwoke si obodo ọzọ hụrụ nwoke a e merụrụ ahụ́, ya akwụsị ma nyere ya aka. O nyeere nwoke a aka n’agbanyeghị na ọ bụ onye obodo ọzọ.
Nwoke obiọma ahụ, kechiri ọnyá ya, nyekwa ihe ndị a ga-eji na-elekọta ya. Ihe ọzọ o mere bụ na ọ kasiri ya obi ma mee ka o nweta onwe ya.
Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’ihe atụ ahụ Jizọs mere? Jizọs ji ihe atụ ahụ na-akụziri anyị na anyị kwesịrị ime ihe ọ bụla anyị nwere ike ime iji nyere ndị nọ ná mkpa aka. (Ilu 14:31) Akwụkwọ Nsọ kwuru na n’oge na-adịghị anya, Chineke ga-eme ka ahụhụ ndị mmadụ na-ata kwụsị, meekwa ka ndị mmadụ gharazie ịda ogbenye. Ma, anyị nwere ike ịna-eche otú Chineke ga-esi mee ya na mgbe ọ ga-eme ya. Isiokwu na-esonụ ga-atụle ihe ọma ndị Onye kere gị ga-emere gị n’ọdịnihụ.