Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị Ga-adịli Ndụ Ebighị Ebi n’Ụwa

Ị Ga-adịli Ndụ Ebighị Ebi n’Ụwa

OLILEANYA MARA EZIGBO MMA. Onye kere anyị kwere nkwa inye anyị ndụ ebighị ebi n’ụwa ebe a. Mana, ọ na-esiri ọtụtụ ndị ike ikweta ihe a. Ha na-ekwu na ‘onye ọ bụla ga-anwụ anwụ, nakwa na e kere mmadụ, ọ́ dịtụ ndụ, ya anwụọ.’ Ndị ọzọ kwetara na mmadụ ga-adịli ndụ ebighị ebi, mana na ọ bụghị n’ụwa a. Ha sịrị na mmadụ ga-adị ndụ ebighị ebi naanị ma ọ nwụọ gaa eluigwe. Gịnị ka gịnwa chere?

Tupu gị azaa ajụjụ a, legodị ihe Baịbụl zara n’ajụjụ atọ ndị a: Gịnị ka otú e si kee mmadụ na-egosi gbasara afọ ole Chineke chọrọ ka ọ dịruo ndụ? Gịnị ka Chineke bu n’obi kee ụwa na mmadụ? Olee otú ọnwụ si bata n’ụwa?

OTÚ E SI KEE MMADỤ

Ụmụ mmadụ pụrụ nnọọ iche n’ihe niile Chineke kere n’ụwa. Olee otú ha si pụọ iche? Baịbụl gosiri na ọ bụ naanị mmadụ ka e kere “n’onyinyo” Chineke, nakwa ‘n’oyiyi’ ya. (Jenesis 1:26, 27) Gịnị ka nke a pụtara? Ọ pụtara na e kere ụmụ mmadụ, ha enwee àgwà ndị Chineke nwere. Àgwà ndị dị ka ịhụnanya na ikpe ziri ezi.

Ihe ọzọ bụ na e kere ụmụ mmadụ, ha enwee ikike iche echiche na ịma ihe ọma na ihe ọjọọ. Ha na-achọkwa ịmata Chineke, nakwa ka ha na ya dị ná mma. Ọ bụ ya mere obi ji adị anyị ụtọ ma anyị hụ ihe ndị Chineke kere na otú ha si maa mma. Ọ bụkwa ya mere egwú, abụ, na ihe e sere ese ji eme anyị obi ụtọ. Nke ka nke bụ na ọ bụ naanị ụmụ mmadụ nwere ike ife Chineke. Ihe ndị a niile mere ka ụmụ mmadụ dị ezigbo iche n’ihe ndị ọzọ niile e kere eke dị ndụ n’ụwa.

Chegodị ihe a: Chineke ọ̀ ga-eke ụmụ mmadụ n’ụzọ pụrụ iche otú a, keekwa ha otú ha ga-enwe ike ịna-emekwu nke ọma ma ọ bụrụ na ọ chọrọ ka ha dị ndụ naanị afọ ole na ole n’ụwa? Nke bụ́ eziokwu bụ na ihe mere Chineke ji kee ụmụ mmadụ otú a bụ ka ha biri n’ụwa ma na-enwe obi ụtọ ruo mgbe ebighị ebi.

IHE CHINEKE BU N’OBI KEE ỤWA NA ỤMỤ MMADỤ

Ụfọdụ na-ekwu na e nweghị mgbe Chineke kere mmadụ ka ọ dịrị ndụ ebighị ebi n’ụwa. Ha na-ekwu na ihe mere e ji kee ụwa bụ ka a nọrọ na ya nwalee ndị mmadụ iji mata onye ruru eru ịga eluigwe ka ya na Chineke biri ruo ebighị ebi. Ma, ọ bụrụ na ihe a ha na-ekwu bụ eziokwu, ihe ọ pụtara ọ́ bụghị na ọ bụ Chineke na-akpata ihe ọjọọ niile juru n’ụwa? Ma, ọ bụghị otú a ka Chineke dị. Baịbụl kwuru gbasara Chineke, sị: “N’ihi na ụzọ ya niile bụ ikpe ziri ezi. Chineke nke kwesịrị ntụkwasị obi, onye ikpe na-ezighị ezi na-adịghị n’ebe ọ nọ; Onye ezi omume na onye ziri ezi ka ọ bụ.”—Diuterọnọmi 32:4.

Baịbụl mere ka ihe Chineke bu n’obi kee ụwa doo anya. Ọ sịrị: “Eluigwe bụ eluigwe Jehova, ma ụwa ka o nyere ụmụ mmadụ.” (Abụ Ọma 115:16) N’eziokwu, Chineke kere ụwa a mara mma ka ụmụ mmadụ biri na ya ruo mgbe ebighị ebi. O kere ihe niile ga-eme ka anyị nwee obi ụtọ ma dị ndụ ebighị ebi na ya.—Jenesis 2:8, 9.

“Eluigwe bụ eluigwe Jehova, ma ụwa ka o nyere ụmụ mmadụ.”—Abụ Ọma 115:16

Baịbụl mekwara ka ihe Chineke bu n’obi kee ụmụ mmadụ doo anya. Ọ gwara di na nwunye mbụ, sị: ‘Jupụtanụ ụwa, meekwanụ ka ọ dịrị n’okpuru unu, ka . . . ihe ọ bụla e kere eke dị ndụ nke na-agagharị n’elu ala nọrọkwa n’okpuru unu.’ (Jenesis 1:28) Ọ bụ ezigbo ihe ọma ka e meere ha nye ha ọrụ ilekọta ụwa na ime ka ụwa niile ghọọ Paradaịs. N’eziokwu, ihe Chineke bu n’obi kee Adam na Iv bụ ka ha na ụmụ ha ga-amụta dịrị ndụ ebighị ebi n’ụwa, ọ bụghị n’eluigwe.

GỊNỊ MERE ANYỊ JI ANWỤ ANWỤ?

Gịnịzi mere anyị ji anwụ anwụ? Baịbụl gosiri na otu mmụọ ozi, e mechara kpọwa Setan, gbara mbọ imebi ihe Chineke haziri n’ogige Iden. Olee otú o si mee ya?

Setan mere ka nne na nna anyị mbụ bụ́ Adam na Iv soro ya nupụrụ Chineke isi. Ọ gwara ha na e nwere ihe ọma Chineke na-achọghị ka ha nweta, ya bụ, iji aka ha na-ekpebiri onwe ha ihe ọma na ihe ọjọọ. Ha kwetara ihe o kwuru ma soro ya nupụrụ Chineke isi. Gịnị ka ihe a ha mere kpataara ha? Ka oge na-aga, ha nwụrụ, otú ahụ Chineke gwara ha. Ha enweghịzi olileanya ịdị ndụ ebighị ebi na Paradaịs.—Jenesis 2:17; 3:1-6; 5:5.

Nnupụ isi Adam na Iv kpataara mmadụ niile nsogbu ha nọ na ya ruo taa. Baịbụl kwuru, sị: “Mmehie si n’aka otu mmadụ [ya bụ, Adam] bata n’ụwa, ọnwụ esikwa ná mmehie bata, ọnwụ wee si otú ahụ gbasaa ruo mmadụ niile.” (Ndị Rom 5:12) Ihe mere anyị ji anwụ anwụ bụ na anyị ketara mmehie n’aka nne na nna anyị mbụ, ọ bụghị n’ihi na ọ bụ nzube Chineke, nke ụfọdụ ndị na-ekwu na ọ bụ ihe omimi.

Ị GA-ADỊLI NDỤ EBIGHỊ EBI N’ỤWA

Isi ahụ e nupụụrụ Chineke n’Iden emeghị ka ihe o bu n’obi kee ụwa na ụmụ mmadụ gbanwee. Chineke nyere anyị ihe ga-eme ka anyị nwere onwe anyị n’aka mmehie na ọnwụ n’ihi na ọ hụrụ anyị n’anya, na-ekpekwa ikpe ziri ezi. Pọl onyeozi kwuru, sị: “Ụgwọ ọrụ nke mmehie na-akwụ bụ ọnwụ, ma onyinye nke Chineke na-enye bụ ndụ ebighị ebi site n’aka Kraịst Jizọs Onyenwe anyị.” (Ndị Rom 6:23) N’ihi na Chineke hụrụ anyị n’anya, “o nyere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya [ya bụ, Jizọs Kraịst], ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke nwere okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16) Jizọs ji obi ya niile chụọ ndụ ya n’àjà iji gbapụta ụmụ mmadụ, si otú a weghachi ihe niile Adam tụfuru. a

N’oge na-adịghị anya, ụwa ga-aghọ paradaịs otú Chineke kwere ná nkwa. Ị ga-eso na ndị ga-ebi na paradaịs ma ọ bụrụ na i mee ihe Jizọs kwuru. Ọ sịrị: “Sinụ n’ọnụ ụzọ ámá dị warara banye; n’ihi na okporo ụzọ nke na-eduba ná mbibi sara mbara ma dị obosara, ndị na-esikwa na ya abanye dị ọtụtụ; ma ọnụ ụzọ ámá nke na-eduba ná ndụ dị warara, okporo ụzọ ya dịkwa mkpagide, ndị na-achọta ya dịkwa ole na ole.” (Matiu 7:13, 14) N’eziokwu, ihe ị họọrọ ime ugbu a ga-ekpebi ma ị̀ ga-adị ndụ n’ọdịnihu. Olee ihe ị ga-eme?

a Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere uru àjà mgbapụta ahụ ga-abara gị, gụọ isi nke 27 n’akwụkwọ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi. Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya. Ọ dịkwa na www.jw.org/ig.