Mgbe Ịkpọasị Ga-akwụsị Kpamkpam
Ọ bụrụgodị na anyị ewepụ ịkpọasị n’obi anyị, anyị agaghị emeli ka ndị nọ anyị gburugburu kwụsị ịkpọ ndị ọzọ asị. Ndị aka ha dị ọcha ka na-ata ahụhụ n’ihi na a kpọrọ ha asị. Oleezi ihe ga-eme ka ndị mmadụ kwụsị ịkpọ ibe ha asị kpamkpam?
Ọ bụ naanị Jehova Chineke nwere ike ime ka ịkpọasị kwụsị kpamkpam. Ọ bụkwa ihe o kwere anyị nkwa na Baịbụl na ọ ga-eme.—Ilu 20:22.
CHINEKE GA-EWEPỤ IHE NDỊ BỤ́ ISI MERE NDỊ MMADỤ JI AKPỌ IBE HA ASỊ
-
1. SETAN BỤ́ EKWENSU. Setan, bụ́ mmụọ ozi ahụ nupụụrụ Chineke isi, bụ isi sekpụ ntị na-eme ka ndị mmadụ na-akpọ ibe ha asị taa. Chineke ga-ebibi Setan na ndị niile na-akpọ ndị ọzọ asị ka ya.—Abụ Ọma 37:38; Ndị Rom 16:20.
-
2. ỤWA EKWENSU ỊKPỌASỊ JURU. Chineke ga-ebibi ndị niile na-akpata ịkpọasị n’ụwa a, ma ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-arụrụ aka ma ndị isi okpukpe na-eme ka ndị mmadụ na-akpọ ibe ha asị. Chineke ga-ebibikwa ndị ahịa dị anyaukwu, n’ihi na ha na-arụrụ aka, na-aghọgbukwa ndị mmadụ.—2 Pita 3:13.
-
3. EZUGHỊ OKÈ. Baịbụl kwuru na mmadụ niile ezughị okè. Ezughị okè na-eme ka ndị mmadụ na-echekarị ihe ọjọọ, na-emekwa ya eme. (Ndị Rom 5:12) Dị ka ihe atụ, ọ na-eme ka ndị mmadụ na-akpọ ndị ọzọ asị n’obi ha ma na-eme ihe ndị gosiri na ha kpọrọ ndị ọzọ asị. Chineke ga-enyere ndị mmadụ aka ịkwụsị àgwà ọjọọ ndị a ezughị okè mere ka ha na-akpa. Mgbe ahụ, ịkpọasị ga-ala ka naị.—Aịzaya 54:13.
BAỊBỤL KWERE ANYỊ NKWA NA E NWERE MGBE ỊKPỌASI NA-AGAGHỊZI ADỊ N’ỤWA
-
1. E NWEGHỊ ONYE A GA-EMEGBU. Ọ bụ Alaeze Chineke ga na-achị ụwa n’oge ahụ. Ọ ga-esi n’eluigwe na-achị, meekwa ka mmegbu kwụsị kpamkpam. (Daniel 2:44) E nweghịzi onye ga-akpọ ibe ya asị. Chineke ga-edozi nsogbu niile ịkpọasị kpataara ndị mmadụ taa.—Luk 18:7.
-
2. MMADỤ NIILE GA-ADỊ N’UDO. O nweghị onye ga na-ata ahụhụ n’ihi agha ma ọ bụ tigbuo zọgbuo. (Abụ Ọma 46:9) Obi ga-eru ndị niile bi n’ụwa ala n’ihi na onye ọ bụla na ibe ya ga-adị n’udo.—Abụ Ọma 72:7.
-
3. MMADỤ NIILE GA-ADỊ NDỤ EBIGHỊ EBI N’ỤWA NSOGBU NA-ADỊGHỊ NA YA. Mmadụ niile bi n’ụwa ga-eji obi ha hụ ibe ha n’anya. (Matiu 22:39) E nweghị onye ga-enwe nsogbu ọ bụla. E nweghịkwa onye ga na-echeta ihe ndị ga-eme ka obi na-ajọ ya njọ. (Aịzaya 65:17) N’oge ahụ, mmadụ niile nọ n’ụwa agaghịzi na-akpọ ibe ha asị. “Obi ga-adịkwa ha ezigbo ụtọ maka na ha ga-anọ nnọọ n’udo.”—Abụ Ọma 37:11.
Ị̀ ga-achọ ibi n’ụdị ụwa a? Ọtụtụ ndị n’ụwa ugbu a na-esi na Baịbụl amụta ihe ndị na-enyere ha aka ịkwụsị ịkpọ ndị ọzọ asị. (Abụ Ọma 37:8) Ọ bụ ihe a ka ọtụtụ nde Ndịàmà Jehova nọ n’ụwa niile na-eme. Ha niile hụrụ ibe ha n’anya, dịrịkwa n’udo n’agbanyeghị na ha si n’ebe dị iche iche, omenala ha adịkwa iche iche.—Aịzaya 2:2-4.
Ndịàmà Jehova ga-achọ ịkụziri gị ihe ha mụtara na-enyere ha aka ma a na-emegbu ha ma ọ bụkwanụ kpọọ ha asị. Ihe ndị ha ga-akụziri gị ga-enyere gị aka ka i jiri nwayọọ nwayọọ kwụsịchaa ịkpọ ndị ọzọ asị ma na-ahụ ha n’anya. Ị ga-amụta otú ị ga-esi jiri obiọma na-emeso ndị ọzọ, ma ndị na-anaghị eji ihe i meere ha kpọrọ ihe ma ndị kpọrọ gị asị. I mee ihe ndị a, obi ga na-adịkwu gị ụtọ, gị na ndị ọzọ ga na-adịkwukwa ná mma. Nke kachanụ bụ na ị ga-amụta ihe ị ga-eme ka i nwee ike ibi n’Alaeze Chineke, bụ́ ebe ịkpọasị ọ bụla na-agaghị adị.—Abụ Ọma 37:29.