IHE Ị GA-EME KA Ị KWỤSỊ ỊKPỌ NDỊ ỌZỌ ASỊ
2 | Emegwarala Ihe E Mere Gị
Ihe Baịbụl Kwuru:
“Unu ejila ihe ọjọọ akwụ onye ọ bụla ụgwọ ihe ọjọọ. . . . Ọ bụrụ na o kwere omume, ọ bụrụkwa unu ka ọ dị n’aka, unu na mmadụ niile dịrị n’udo. . . . Unu abọrọla onwe unu ọbọ, . . . n’ihi na e dere, sị: ‘“Ọ bụ m ga-abọ ọbọ. M ga-akwụ ụgwọ.” Ọ bụ ihe Jehova kwuru.’”—NDỊ ROM 12:17-19.
Ihe Ọ Pụtara:
Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ na-ewute anyị ma mmadụ mejọọ anyị. Ma, Chineke achọghị ka anyị na-emegwara ndị ọzọ ihe ha mere anyị. Kama, ọ chọrọ ka anyị nwee ndidi n’ihi na o kwere anyị nkwa na ọ ga-eme ka ihe niile dị mma n’oge na-adịghị anya.—Abụ Ọma 37:7, 10.
Ihe I Nwere Ike Ime:
Ọ bụrụ na ndị mmadụ emegwara ihe ọjọọ e mere ha, ọ na-eme ka ha kpọkwuo ibe ha asị. N’ihi ya, mmadụ mee gị ihe ọjọọ ma ọ bụ kpasuo gị iwe, emegwarala ya. Gbalịa jide onwe gị ma jiri nwayọọ meso ya. Mgbe ụfọdụ, ihe nwere ike ịkacha mma ime bụ ichefu ihe ahụ merenụ. (Ilu 19:11) Ma, o nwere ike ịka mma mgbe ụfọdụ ka i wega okwu ahụ n’aka ndị ga-elebara ya anya. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na e mere gị ihe ọjọọ ndị uwe ojii ma ọ bụkwanụ ndị ọzọ na-ahụ maka iwu nwere ike ilebara anya, i nwere ike ikpebi ịkọrọ ha ya.
Ihe na-aka njọ ma mmadụ megwara ihe e mere ya
Gịnị ka i kwesịrị ime ma ọ bụrụ na o yie ka o nweghị otú a ga-esi edozi nsogbu ahụ n’udo, ma ọ bụkwanụ na i meela ihe niile i nwere ike ime ka e dozie okwu ahụ n’udo? Emegwarala. Ọ bụrụ na i megwara, o nwere ike ime ka ihe ka njọ. Ma, ọ bụrụ na i megwaraghị, o nwere ike ime ka unu ghara ịkpọ ibe unu asị. Gbalịa ka ị tụkwasị Jehova obi na ihe o kwuru gbasara otú e si edozi esemokwu kacha mma. Baịbụl sịrị: “Tụkwasị ya obi. Ọ ga-enyere gị aka.”—Abụ Ọma 37:3-5.