Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Eziokwu Banyere Chineke na Kraịst

Eziokwu Banyere Chineke na Kraịst

Ọ bụ eziokwu na ndị mmadụ na-efe ọtụtụ chi, ma e nwere naanị otu ezi Chineke. (Jọn 17:3) Ọ bụ “Onye Kacha Elu,” Onye kere ihe niile, nakwa Onye nyere anyị ndụ. Ọ bụ naanị ya ka anyị kwesịrị ife.—Daniel 7:18; Mkpughe 4:11.

Ònye Bụ Chineke?

Aha Chineke gbara na Baịbụl mbụ e nwere IHE DỊ KA UGBORO PUKU ASAA

JEHOVA Bụ aha Chineke

ONYENWE ANYỊ, CHINEKE NA NNA Bụ ụfọdụ utu aha Jehova nwere

Gịnị Bụ Aha Chineke? Chineke n’onwe ya kwuru, sị: “Abụ m Jehova. Ọ bụ ya bụ aha m.” (Aịzaya 42:8) Aha Chineke gbara ihe ruru ugboro puku asaa na Baịbụl. Ma, ọtụtụ ndị sụgharịrị Baịbụl ji utu aha dị ka “Onyenwe anyị” dochie ya. Chineke chọrọ ka ị bụrụ enyi ya, chọọkwa ka ị ‘na-akpọku aha ya.’—Abụ Ọma 105:1.

Utu Aha Ndị Jehova Nwere. Na Baịbụl, a kpọrọ Jehova utu aha ndị dị ka “Chineke,” “Onye Pụrụ Ime Ihe Niile,” ‘Onye kere anyị,’ “Nna,” “Onyenwe anyị,” na “Ọkaakaa.” N’ọtụtụ ekpere ndị e dere na Baịbụl, a kpọrọ Chineke aha ya bụ́ Jehova, kpọọkwa ya utu aha ndị e ji kwanyere ya ùgwù.—Daniel 9:4.

Otú Chineke Dị. Chineke bụ mmụọ. (Jọn 4:24) Baịbụl kwukwara na “o nweghị mmadụ hụtụrụla Chineke.” (Jọn 1:18) Baịbụl gosiri otú obi na-adị Chineke. Ndị mmadụ nwere ike ime ka o nwee mwute, ma ọ bụkwanụ mee ya “obi ụtọ.”—Ilu 11:20; Abụ Ọma 78:40, 41.

Àgwà Chineke Ndị Magburu Onwe Ya. Chineke anaghị ele mmadụ anya n’ihu n’agbanyeghị mba mmadụ si na ọnọdụ onye ahụ. (Ọrụ Ndịozi 10:34, 35) Ọ bụkwa onye “nwere ọmịiko ma na-eme ebere, onye na-anaghị ewe iwe ọsọ ọsọ, onye ịhụnanya ya na eziokwu ya dị ukwuu.” (Ọpụpụ 34:6, 7) Ma, o nwere àgwà anọ Chineke nwere ndị kacha amasị anyị.

Ike. Chineke nwere ike na-enweghị atụ ọ ga-eji emezu ihe ọ bụla o kwere ná nkwa n’ihi na ọ bụ “Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.”—Jenesis 17:1.

Amamihe. Chineke ma ihe karịa onye ọ bụla. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji kwuo na ọ bụ onye “naanị ya ma ihe.”—Ndị Rom 16:27.

Ikpe Ziri Ezi. Chineke na-eme ihe ziri ezi mgbe niile. Ihe niile ọ na-eme “zuru okè,” ọ bụkwa “onye na-anaghị ekpe ikpe na-ezighị ezi.”—Diuterọnọmi 32:4.

Ịhụnanya. Baịbụl kwuru na “Chineke bụ ịhụnanya.” (1 Jọn 4:8) Ọ bụghị naanị na Chineke na-egosi na ọ hụrụ anyị n’anya, kama, ọ bụ ịhụnanya n’onwe ya. Ọ bụ ịhụnanya na-enweghị atụ Chineke nwere na-akpali ya ime ihe niile ọ na-eme, ọ na-abakwara anyị uru n’ọtụtụ ụzọ.

Otú Chineke na Ụmụ Mmadụ Nwere Ike Isi Bụrụ Enyi. Chineke bụ Nna anyị nke eluigwe hụrụ anyị n’anya. (Matiu 6:9) Ọ bụrụ na anyị enwee okwukwe na ya, anyị na ya ga-abụ enyi. (Abụ Ọma 25:14) Chineke na-agwadị gị ka ị bịaruo ya nso n’ekpere nakwa ka ị ‘na-akọrọ ya ihe niile na-echegbu gị, n’ihi na ihe banyere gị na-emetụ ya n’obi.’—1 Pita 5:7; Jems 4:8.

Olee Ihe Dị Iche na Chineke na Kraịst?

Jizọs Abụghị Chineke. Jizọs pụrụ iche. Ọ bụ naanị ya ka Chineke ji aka ya kee. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji akpọ ya Ọkpara Chineke. (Jọn 20:31) Mgbe Jehova kechara Jizọs, o ji ọkpara ya a bụ́ “ọkà n’ọrụ” kee ihe niile na onye ọ bụla ọzọ.—Ilu 8:30, 31; Ndị Kọlọsi 1:15, 16.

O nweghị mgbe Jizọs kwuru na ya bụ Chineke. Kama, o kwuru, sị: “Abụ m onye nnọchiteanya [Chineke]. O bụ ya zitere m.” (Jọn 7:29) Mgbe Jizọs na-agwa otu n’ime ndị na-eso ụzọ ya okwu, ọ kpọrọ Jehova “Nna m na Nna unu,” nakwa “Chineke m na Chineke unu.” (Jọn 20:17) Mgbe Jizọs nwụrụ, Jehova kpọlitere ya n’ọnwụ gaa n’eluigwe, mee ka ọ nọrọ n’aka nri ya ma nye ya ikike dị ukwuu.—Matiu 28:18; Ọrụ Ndịozi 2:32, 33.

Jizọs Kraịst Nwere Ike Inyere Gị Aka Ịbịaru Chineke Nso

Jizọs bịara n’ụwa ka ọ kụziere anyị banyere Nna ya. Jehova kwuru gbasara Jizọs, sị: “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya. Geenụ ya ntị.” (Mak 9:7) Jizọs ma Chineke karịa onye ọ bụla ọzọ. Ọ sịrị: “O nweghịkwa onye ma Nna m ma e wezụga m na onye ọ bụla m chọrọ ịkụziri gbasara ya.”—Luk 10:22.

Jizọs ṅomiri Chineke nke ọma. Jizọs ṅomiri Nna ya nke ọma nke na o kwuru, sị: “Onye ọ bụla hụrụ m ahụla Nna m.” (Jọn 14:9) Jizọs gosiri na ọ hụrụ ụmụ mmadụ n’anya ka Nna ya, ma n’okwu ọnụ ma n’omume ya. Nke a dọtara ndị mmadụ n’ebe Chineke nọ. O kwuru, sị: “Ọ bụ m bụ ụzọ na eziokwu na ndụ. E nweghị onye na-abịakwute Nna m ma ọ bụrụ na o sighị na m.” (Jọn 14:6) O kwukwara, sị: “Ndị na-efe Nna m otú ọ chọrọ ga-efe ya n’ime mmụọ na n’eziokwu, n’ihi na n’eziokwu, Nna m na-achọ ụdị ndị ahụ ka ha fee ya ofufe.” (Jọn 4:23) Chegodị ihe ọ dị ka ya na Jehova na-achọ ndị dị ka gị chọrọ ịmụta eziokwu gbasara ya.