Onye Pụrụ Ime Ihe Niile nke Na-echebara Ndị Ọzọ Echiche
“[Jehova] maara nnọọ otú e si kpụọ anyị, ọ na-echeta na anyị bụ ájá.”—ỌMA 103:14.
1, 2. (a) Olee ihe dị iche n’otú Jehova si emeso ndị mmadụ ihe nakwa n’otú ndị ọnụ na-eru n’okwu si emeso ndị mmadụ ihe? (b) Olee ihe anyị ga-atụle n’isiokwu a?
NDỊ UKWU na ndị ọnụ na-eru n’okwu na-emekarị ndị ọzọ ka “ọ̀ bụ ha nwe” ha. Ha na-emegbudị ha. (Mat. 20:25; Ekli. 8:9) Jehova anaghị eme otú ahụ. N’agbanyeghị na ọ bụ Onye Pụrụ Ime Ihe Niile, ọ na-echebara ụmụ mmadụ na-ezughị okè echiche. Ọ dị obiọma, na-echebara otú obi dị anyị echiche, na-egbokwara anyị mkpa anyị. Ọ naghị agwa anyị mee ihe anyị na-agaghị emeli n’ihi na “ọ na-echeta na anyị bụ ájá.”—Ọma 103:13, 14.
2 Baịbụl gwara anyị otú Jehova si echebara ndị ya echiche. Ka anyị tụlee ihe atụ atọ. Nke mbụ bụ otú Jehova si nyere Samuel aka ịgwa Ilaị, bụ́ Nnukwu Onye Nchụàjà, ihe Jehova gwara ya na ọ ga-eme ya na ndị ezinụlọ ya. Nke abụọ bụ otú Jehova si nweere Mozis ndidi mgbe o chere na ọ gaghị enweli ike idupụta ndị Izrel n’Ijipt. Nke atọ abụrụ otú Jehova si chebara ndị Izrel echiche ka ha hapụrụ Ijipt. Mgbe anyị na-echebara ihe atụ ndị a echiche, ka anyị chọpụta ihe
anyị ga-amụta banyere Jehova, nakwa otú anyị ga-esi eme ihe ndị anyị mụtara.NNA NKE NA-ECHEBARA NWA YA ECHICHE
3. Olee ihe na-anaghị emekarị nke mere Samuel n’otu abalị? Olee ajụjụ anyị nwere ike ịjụ maka ya? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)
3 Samuel malitere ‘ijere Jehova ozi’ n’ụlọikwuu mgbe ọ bụ nwata. (1 Sam. 3:1) N’otu abalị Samuel nọ na-ehi ụra, ihe na-anaghị emekarị mere. * (Gụọ 1 Samuel 3:2-10.) Ọ nụrụ ka otu olu kpọrọ aha ya. O chere na ọ bụ Ilaị, bụ́ Nnukwu Onye Nchụàjà merela agadi na-akpọ ya. Ọ gbakwuuru ya, sị ya: “Lee m, n’ihi na ị kpọrọ m.” Ilaị gwara ya na ọ bụghị ya kpọrọ ya. Mgbe olu ahụ kpọrọ ya ugboro abụọ ọzọ, Ilaị ghọtara na ọ bụ Chineke na-akpọ Samuel. N’ihi ya, ọ gwara Samuel otú ọ ga-esi aza, ya emeekwa otú ahụ. Gịnị mere Jehova agwaghị Samuel ná mmalite na ọ bụ ya na-akpọ ya? Baịbụl agwaghị anyị. Ma, ọ ga-abụ na ihe mere Jehova agwaghị ya bụ n’ihi na o chebaara otú obi dị Samuel echiche. Olee otú o si mee ya?
4, 5. (a) Gịnị ka Samuel mere mgbe Jehova gwara ya ka ọ gaa zie Ilaị ozi? Olee ihe mere n’ụtụtụ echi ya? (b) Olee ihe akụkọ a na-akụziri anyị banyere Jehova?
4 Gụọ 1 Samuel 3:11-18. Iwu Jehova kwuru ka ụmụaka na-erubere ndị agadi isi, nke ka nke, onyeisi. (Ọpụ. 22:28; Lev. 19:32) N’ihi ya, o siri ike iche n’echiche na Samuel ga-agakwuru Ilaị n’ụtụtụ, kata obi gwa ya ihe Chineke kwuru na ọ ga-eme ya na ndị ezinụlọ ya. Baịbụl gwara anyị na “ụjọ na-atụkwa Samuel ịkọrọ Ilaị banyere ọhụụ ahụ.” Ma, Chineke mere ka o doo Ilaị anya na ọ bụ Samuel ka ọ na-akpọ. Ọ bụ ya mere Ilaị ji gwa Samuel ka ọ gwa ya ihe Chineke gwara ya. Ọ gwara Samuel, sị: ‘Ezochirila m ihe ọ bụla n’ime ihe niile ọ gwara gị.’ Samuel rubeere ya isi ma “gwa ya okwu ahụ niile.”
5 Ozi a Samuel ziri Ilaị ejuchaghị ya anya n’ihi na ọ bụkwa ihe “otu onye nke Chineke” a na-akpọghị aha ya bu ụzọ gwa Ilaị. (1 Sam. 2:27-36) Akụkọ a na-akụziri anyị otú Jehova si echebara anyị echiche nakwa otú o si mara ihe.
6. Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’otú Chineke si nyere Samuel aka mgbe ọ bụ nwata?
6 Ị̀ bụ onye na-eto eto? Ọ bụrụ otú ahụ, akụkọ Samuel mgbe ọ bụ nwata, na-egosi na Jehova na-aghọta ihe gị na ya na-alụ, nakwa otú obi dị gị. O nwere ike ịbụ na ihere na-eme gị, ya ana-esiri gị ike izi ndị tọrọ gị ozi ọma ma ọ bụ ịjụ ime ihe ndị ọgbọ gị na-eme. Ka obi sie gị ike na Jehova chọrọ inyere gị aka. N’ihi ya, gwa ya otú obi dị gị n’ekpere. (Ọma 62:8) Na-eche banyere akụkọ ndị na-eto eto a kọrọ na Baịbụl dị ka Samuel. Gị na ụmụnna ndị ọzọ ma ndị agadi ma ndị na-eto eto kwurịta ya, bụ́ ndị meririla ụdị nsogbu gị na ya na-alụ. Ha nwere ike ịgwa gị oge ụfọdụ Jehova gbataara ha ọsọ enyemaka, o nwere ike ịbụ n’ụzọ ha na-atụghị anya ya.
OTÚ JEHOVA SI CHEBARA MOZIS ECHICHE
7, 8. Olee otú Jehova si gosi na o chebaara otú obi dị Mozis echiche?
7 Mgbe Mozis dị afọ iri asatọ, Jehova nyere ya ọrụ tara ezigbo akpụ. Ọrụ ahụ bụ ịnapụta ndị Izrel n’ohu ha na-agba n’Ijipt. (Ọpụ. 3:10) Ọ ga-abụ na ọrụ a juru Mozis anya n’ihi na ọ zụọla atụrụ afọ iri anọ na Midian. O kwuru, sị: “Ònye ka m bụ nke na m ga-agakwuru Fero, nke na m ga-akpọpụtakwa ụmụ Izrel n’Ijipt?” Chineke mesiri ya obi ike, sị: “M ga-anọnyere gị.” (Ọpụ. 3:11, 12) Ọ gwakwara ya na ndị okenye Izrel ‘ga-ege ntị n’olu ya.’ N’agbanyeghị ihe ndị a Jehova gwara Mozis, ọ gwara Jehova, sị: “Ọ bụrụkwanụ na ha . . . ghara ige ntị n’olu m?” (Ọpụ. 3:18; 4:1) Ọ ga-abụ na ihe Mozis na-ekwu bụ na ya ekwetaghị na ihe Jehova kwuru ga-eme. Ma, Jehova nọgidere na-enwere ya ndidi. Nke bụ́ eziokwu bụ na Jehova mekwuru ihe. O nyere ya ikike ịrụ ọrụ ebube, nke mere ka ọ bụrụ onye mbụ Baịbụl kwuru na Jehova nyere ikike ịrụ ọrụ ebube.—Ọpụ. 4:2-9, 21.
8 N’agbanyeghị ihe niile a, Mozis kụgidekwara ihe ọzọ aka. O kwuru na ya amaghị okwu ekwu. Chineke gwara ya, sị: “M ga-anọnyere ọnụ gị, m ga-akụziri gị ihe ị ga-ekwu.” Mozis ò mechara kweta ije ozi ahụ? Ọ ga-abụ na o kwetaghị n’ihi na o medara obi gwa Chineke ka o ziga onye ọzọ. N’ihi ya, Jehova were iwe. Ma, ọ kwụsịghị ichebara otú obi dị Mozis echiche. Ọ bụ ya mere o ji ziga Erọn ka ọ bụrụ ọnụ na-ekwuchitere Mozis.—Ọpụ. 4:10-16.
9. Olee otú ndidi Jehova nweere Mozis na otú o si chebara ya echiche si nyere ya aka n’ọrụ ya?
9 Gịnị ka akụkọ a na-akụziri anyị banyere Jehova? Ebe ọ bụ na Jehova bụ Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile, ọ gaara eyi Mozis egwu ka o mee ihe ọ gwara ya ozugbo. Kama, Jehova nweere Mozis ndidi ma gosi ya obiọma. O mekwara ka obi sie ohu ya a dị umeala n’obi ike na ọ ga-anọnyere ya. Ihe Jehova mere ọ̀ baara Mozis uru? À na-ajụkwa ajụ? Mozis ghọrọ ezigbo onye ndú. Ọ gbalịrị iji nwayọọ na-emeso ndị ọzọ ihe ma na-echebara ha echiche otú ahụ Jehova si meso ya ihe.—Ọnụ Ọgụ. 12:3.
10. Olee uru anyị na-erite ma anyị na-eṅomi otú Jehova si echebara ndị ọzọ echiche?
10 Olee ihe ndị anyị na-amụta n’akụkọ a? Ọ bụrụ na ị bụ di, nne, nna, ma ọ bụ okenye ọgbakọ, e nwere ndị Jehova nyere gị ikike ịna-elekọta. N’ihi ya, ọ dị mkpa ka ị na-eṅomi Jehova. Otú ị ga-esi eme ya bụ ịna-echebara ndị ị na-elekọta echiche, ịna-egosi ha obiọma, Kọl. 3:19-21; 1 Pita 5:1-3) Ọ bụrụ na ị gbalịa na-eṅomi Jehova na Jizọs Kraịst, bụ́ Mozis nke Ka Ukwuu, ọ ga-adịrị ndị ọzọ mfe ịna-abịakwute gị, gị ana-agbakwa ha ume. (Mat. 11:28, 29) Ha ga na-emekwa ka gị.—Hib. 13:7.
ma na-enwere ha ndidi mgbe ị na-emeso ha ihe. (ONYE NZỌPỤTA DỊ IKE MANA-ECHEBARA NDỊ ỌZỌ ECHICHE
11, 12. Mgbe Jehova kpọpụtara ndị Izrel n’Ijipt, olee otú o si mesie ha obi ike ma mee ka ahụ́ ruo ha ala?
11 Mgbe ndị Izrel hapụrụ Ijipt n’afọ 1513 Tupu Oge Ndị Kraịst, ọ ga-abụ na ha karịrị nde atọ. E nwere ụmụaka nakwa ndị agadi n’ime ha. Ọ ga-abụkwa na ụfọdụ n’ime ha bụ ndị ọrịa ma ọ bụ ndị nwere nkwarụ. Ụdị ìgwè mmadụ a kwesịrị inwe Onye Ndú ga na-aghọta ha ma na-echebara ha echiche. Jehova si n’aka Mozis gosi na ya bụ ụdị onye ahụ. Nke a mere ka obi sie ndị Izrel ike mgbe ha na-ahapụ Ijipt ha bi kemgbe a mụrụ ha.—Ọma 78:52, 53.
12 Olee otú Jehova si mee ka obi sie ndị ya ike, ahụ́ eruokwa ha ala? Otú o si mee ya bụ na ọ haziri ha n’usoro “dị ka ndị agha” mgbe o si n’Ijipt kpọpụta ha. (Ọpụ. 13:18) Otú a Jehova si hazie ndị Izrel mere ka obi sie ha ike na Chineke ha kwụ ha n’azụ. Jehova nyekwara ha “ígwé ojii na-edu ha n’ehihie,” nakwa “ìhè ọkụ” nke na-edu ha n’abalị iji mee ka ha mata na ọ nọnyeere ha, na-edu ha ma na-echebe ha. (Ọma 78:14) N’eziokwu, obi a Jehova mesiri ndị Izrel ike kwesịrị ekwesị n’ihi ihe ọzọ na-aga ime.
13, 14. (a) Olee ihe Jehova meere ndị Izrel n’Oké Osimiri Uhie iji gosi na ọ na-echebara ha echiche? (b) Olee otú Jehova si gosi na ya ka ndị Ijipt ike?
13 Gụọ Ọpụpụ 14:19-22. Were ya na gị na ndị Izrel so. Oké Osimiri Uhie nọ unu n’ihu, ndị agha Fero anọrọ unu n’azụ. Unu tọrọ atọ. Ka unu nọ ebe ahụ, Chineke emee ihe. O mere ka ogidi ígwé ojii ahụ si n’ihu unu pụọ guzoro n’azụ unu, ya emee ka ọchịchịrị gbaa n’ebe ndị Ijipt nọ. Ma, Chineke nyere gị na ìgwè mmadụ gị na ha so ìhè. Mgbe ahụ, gị ahụ Mozis ka o setipụrụ aka ya n’elu oké osimiri ahụ, oké ifufe siri ike nke si n’ebe ọwụwa anyanwụ emee ka oké osimiri ahụ kewaa ụzọ abụọ, nke mere ka e nwee ụzọ sara mbara ruo n’akụkụ nke ọzọ. N’ihi ya, gị na ndị ezinụlọ gị, anụ ụlọ gị, nakwa ndị ọzọ akwụrụ n’ahịrị ma si n’ala oké osimiri ahụ mmiri na-adịghịzi gafere. O juru gị anya na ala oké osimiri ahụ abụghị apịtị apịtị, ọ naghịkwa achị achị. Ọ dị kọrọ kọrọ, siekwa ike, n’ihi ya, ọ dị mfe ịga ije na ya. Nke a mere ka ndị na-anaghị agasi ije ike nwee ike rute n’akụkụ nke ọzọ n’enweghị ihe mere ha.
14 Gụọ Ọpụpụ 14:23, 26-30. Ka ihe a nọ na-eme, Fero, bụ́ onye mpako na onye iberiibe chụụrụ gị na ndị Izrel ibe gị na-abịa. Mozis esetipụ aka ya ọzọ n’elu osimiri ahụ. Na nke ugbu a, mmiri ahụ nke bụụrụ unu mgbidi n’akụkụ abụọ dara. Mmiri ahụ erikpuo Fero na ndị agha ya. Ha niile nwụrụ pịị.—Ọpụ. 15:8-10.
15. Gịnị ka akụkọ a na-akụziri gị banyere Jehova?
15 Akụkọ a emeela ka anyị mata na Jehova bụ Chineke nke na-ahazi ihe ahazi. Àgwà a o nwere na-eme ka ahụ́ ruo anyị ala. (1 Kọr. 14:33) Jehova gosikwara na ya bụ onye ọzụzụ atụrụ hụrụ ndị ya n’anya ma na-egboro ha mkpa ha. Ọ na-echebe ha n’aka ndị iro ha. Nke a na-eme ka obi sie anyị ezigbo ike n’ihi na ọ fọrọ obere ka Jehova bibie ụwa Setan a.—Ilu 1:33.
16. Olee uru ọ ga-abara anyị ma anyị na-atụle otú Jehova si zọpụta ndị Izrel?
16 Taa, Jehova ka na-elekọta ndị ya. Mkpu. 7:9, 10) N’ihi ya, ma hà bụ nwata ma hà bụ agadi, ma ahụ́ ọ̀ gbasiri ha ike ma hà nwere nkwarụ, ụjọ agaghị atụ ndị ohu Chineke n’oge oké mkpagbu. * Nke bụ́ eziokwu bụ na ha ga-emedị ihe dị iche. Ha ga-echeta ihe a Jizọs kwuru. Ọ sịrị: “Guzonụ kwem ma welie isi unu elu, n’ihi na nnapụta unu na-eru nso.” (Luk 21:28) Obi ga na-esi ha ike na Jehova ga-echebe ha ma mgbe Gọg, bụ́ ọtụtụ mba ndị gbakọrọ aka ọnụ ma dịrị ike karịa Fero, ga-alụso ha ọgụ. (Ezik. 38:2, 14-16) Gịnị mere obi ga-eji na-esi ndị ohu Chineke ike? Ha ma na Jehova anaghị agbanwe agbanwe. Ọ ga-egosikwa na ya bụ Onye Nzọpụta nke hụrụ ndị ya n’anya ma na-echebe ha.—Aịza. 26:3, 20.
Ọ na-enyere ha aka ka ya na ha nọgide na-adị ná mma, na-echebekwa ha n’aka ndị iro ha. Ọ ga na-eme ya ruo oké mkpagbu a ga-enwe n’oge na-adịghị anya. (17. (a) Olee uru ọ ga-abara anyị ma anyị na-atụle akụkọ Baịbụl ndị na-egosi otú Jehova si lekọta ndị ya? (b) Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?
17 N’isiokwu a, anyị ahụla ihe atụ ụfọdụ ndị gosiri otú Jehova si chebara ndị ya echiche, dịrị obiọma mgbe ọ na-elekọta ndị ya, na-eduzi ha ma na-echebe ha. Mgbe ị na-atụgharị uche n’akụkọ ndị a, gbalịa ka ị mụta ihe ọhụrụ gbasara Jehova. Otú ị ga-esi eme ya bụ ịchọpụta ihe ụfọdụ o nwere ike ịbụ na ị chọpụtabeghị. Ka ị na-amụtakwu banyere àgwà ọma Jehova nwere, ị ga na-ahụkwu ya n’anya, okwukwe gị ana-esikwu ike. N’isiokwu na-eso nke a, anyị ga-atụle otú anyị nwere ike isi na-eṅomi Jehova n’ichebara ndị ọzọ echiche. Anyị ga-elekwasị anya n’ezinụlọ, n’ọgbakọ, nakwa n’ozi ọma.
^ para. 3 Otu onye Juu na-akọ akụkọ ihe mere eme aha ya bụ Josifọs kwuru na Samuel dị afọ iri na abụọ mgbe ahụ.
^ para. 16 Ọ dịghị njọ iche na ndị nwere nkwarụ tupu Amagedọn ga-ebu ya gafee Amagedọn. Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ọ gwọrọ ndị nwere “ụdị nsogbu ahụ́ ike ọ bụla.” O ji ya gosi anyị ihe ọ ga-emere ndị gafere Amagedọn, ọ bụghị ndị e si n’ọnwụ kpọlite. (Mat. 9:35) O doro anya na ndị e si n’ọnwụ kpọlite ga-enwe ezigbo ahụ́ ike.