Tụkwasị Kraịst Bụ́ Onye Ndú Anyị Na-arụsi Ọrụ Ike Obi
“Onye Ndú unu bụ otu onye, ya bụ, Kraịst.”—MAT. 23:10.
1, 2. Olee nnukwu ọrụ Jọshụa ga-arụ mgbe Mozis nwụrụ?
JEHOVA gwara Jọshụa, sị: “Ohu m Mozis anwụọla; bilie, gafee Jọdan a, gị na ndị a niile, banye n’ala ahụ m na-enye ha.” (Jọsh. 1:1, 2) Ị̀ hụlanụ otú ihe si gbanwee ná ndụ Jọshụa na mberede, bụ́ onye nọ na-ejere Mozis ozi kemgbe ihe fọrọ obere ka o ruo iri afọ anọ?
2 Ebe ọ bụ na Mozis eduola ụmụ Izrel ruo ọtụtụ afọ, Jọshụa nwere ike na-eche ma ndị Izrel hà ga-anabatakwa ya ka onye ndú ha. (Diut. 34:8, 10-12) Otu akwụkwọ e ji eme nchọnchọ kwuru gbasara Jọshụa 1:1, 2, sị: “Oge na-akacha ata akpụ ma dị njọ ná mba ọ bụla, ma n’oge anyị a ma n’oge gara aga, bụ mgbe onye ọchịchị ọhụrụ nọchiri onye nke na-achị achị.”
3, 4. Olee otú anyị si mara na obi Jọshụa tụkwasịrị Jehova efughị ọhịa? Olee ajụjụ anyị nwere ike ịjụ onwe anyị?
3 E nwere ezigbo ihe mere Jọshụa ji na-echegbu onwe ya. Ma ọ tụkwasịrị Jehova obi, meekwa ihe ọ gwara ya ozugbo. (Jọsh. 1:9-11) Obi a ọ tụkwasịrị Jehova efughị ọhịa. Ihe Baịbụl kwuru gosiri na Jehova ji mmụọ ozi ya duzie ya na ndị Izrel. Ọ ga-abụ na mmụọ ozi ahụ bụ Okwu ahụ, ya bụ, Ọkpara Chineke.—Ọpụ. 23:20-23; Jọn 1:1.
4 Jehova nyeere ndị Izrel aka ịnabata mgbanwe ndị e nwere mgbe Jọshụa ghọrọ onye ndú ha. Anyịnwa nọkwa n’oge a na-eme mgbanwe si n’oge ruo n’oge. Anyị nwere ike ịna-eche sị, ‘Ka nzukọ Jehova si na-aga n’ihu n’ike n’ike, è nwere ezigbo ihe mere anyị ji kwesị ịtụkwasị Jizọs obi, ebe ọ bụ Onye Ndú Jehova họpụtara? (Gụọ Matiu 23:10.) Ka anyị tụlee otú Jehova si duo ndị ya mgbe e nwere mgbanwe n’oge gara aga.
IDURU NDỊ CHINEKE BAA N’ALA KENAN
5. Olee ihe Jọshụa na-atụghị anya ya merenụ mgbe ọ fọrọ obere ka o ruo Jeriko? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)
5 Obere oge ụmụ Izrel gafechara Jọdan, Jọshụa hụrụ ihe ọ na-atụghị anya ya. Mgbe ọ fọrọ obere ka o ruo Jeriko, ọ hụrụ otu nwoke mịpụtara mma agha ya. Ebe ọ bụ na ọ maghị onye ọ bụ, ọ jụrụ nwoke ahụ, sị: “Ị̀ dịnyeere anyị ka ị dịnyeere ndị na-emegide anyị?” O juru Jọshụa anya na ọchịagha a gwara ya onye ọ bụ. O nweghị onye ọzọ ọ bụ ma ọ̀ bụghị “ọchịagha nke ụsụụ ndị agha Jehova,” onye bịara ịnapụta ndị ohu Chineke. (Gụọ Jọshụa 5:13-15.) Ọ bụ eziokwu na amaokwu ndị ọzọ kwuru na ọ bụ Jehova gwara Jọshụa okwu, ma o doro anya na ọ bụ mmụọ ozi ka o ji gwa Jọshụa okwu otú o mere n’oge ndị gara aga.—Ọpụ. 3:2-4; Jọsh. 4:1, 15; 5:2, 9; Ọrụ 7:38; Gal. 3:19.
6-8. (a) Olee ihe mere ụfọdụ ntụziaka Jehova nyere ụmụ Izrel nwere ike iji yie ihe na-abaghị uru n’anya mmadụ? (b) Olee ihe mere ntụziaka ndị ahụ ji baa uru ma bịa n’oge kwesịrị ekwesị? (Gụọkwa ihe e dere n’ala ala peeji.)
6 Mmụọ ozi ahụ gwara Jọshụa kpọmkwem ihe ọ ga-eme ka o nwee ike imeri obodo Jeriko. Ná mmalite, ihe ahụ mmụọ ozi ahụ kwuru nwere ike iyi ihe na-agaghị aba uru. Di ka ihe atụ, Jehova kwuru ka e bie ụmụ nwoke niile úgwù. Ọ pụtara na ha agaghị enwe ike ịlụ agha ruo oge ụfọdụ. Oge a ọ̀ bụ oge dị mma ibi ụmụ nwoke ndị a ga-alụ agha úgwù?—Jen. 34:24, 25; Jọsh. 5:2, 8.
7 O nwekwara ike ịbụ na ndị agha Izrel nọ na-eche otú ha ga-esi chebe ndị ezinụlọ ha ma ndị agha bịa ilụso ha agha n’ụlọikwuu ha. Ma na mberede, ha nụrụ na “e mechisiri ọnụ ụzọ ámá Jeriko ike n’ihi ụmụ Izrel.” (Jọsh. 6:1) Ọ̀ bụ na ihe a merenụ agaghị eme ka ha tụkwasịkwuo Chineke obi?
8 Ihe ọzọ a gwakwara ụmụ Izrel bụ ka ha ghara ilụso Jeriko agha, kama ka ha jiri ụkwụ gbaa obodo ahụ gburugburu otu ugboro n’ụbọchị ruo ụbọchị isii, ma n’ụbọchị nke asaa, ha ga-agba ya gburugburu ugboro asaa. Ụfọdụ ndị agha ahụ nwere ike ịna-eche, sị: ‘Ihe a bụ igbu oge na iji ike anyị na-eme ihe na-abaghị uru.’ Ma Jehova, bụ́ Onye Ndú ụmụ Izrel, ma ihe ọ na-eme. Ihe a ọ gwara ha mee mere ka okwukwe ha sie ezigbo ike, meekwa ka ha na ndị Jeriko bụ́ aka ochie n’ịlụ agha ghara ịlụ agha.—Jọsh. 6:2-5; Hib. 11:30. *
9. Olee ihe mere anyị ji kwesị ime ihe nzukọ Jehova gwara anyị mee? Nye ihe atụ.
9 Gịnị ka anyị na-amụta n’akụkọ a? Ọ bụghị mgbe niile ka anyị nwere ike ịghọtacha ihe mere nzukọ Jehova ji gwa anyị ihe ọhụrụ anyị ga-eme. Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike ịna-eche ihe mere e ji
gwa anyị ka anyị jiri ihe ndị dị ka ekwe-ntị ma ọ bụ kọmpụta na-amụ ihe n’onwe anyị, na-aga ozi ọma nakwa ọmụmụ ihe. Ma ugbu a, o nwere ike ịbụ na anyị amatala uru ihe ndị ahụ bara. Mgbe ọ bụla anyị hụrụ otú ihe ọhụrụ ndị a gwara anyị mee si abara anyị uru, ọ na-eme ka okwukwe anyị sikwuo ike, meekwa ka anyị na ụmụnna anyị dịrị n’otu.OTÚ KRAỊST SI DUO ỌGBAKỌ NDỊ KRAỊST N’OGE NDỊOZI
10. Ònye ka nzukọ ahụ dị mkpa òtù na-achị isi nwere na Jeruselem si n’aka?
10 Mgbe ihe dị ka afọ iri na atọ Kọnịliọs ghọchara Onye Kraịst gara, ụfọdụ ndị Juu bụ́ Ndị Kraịst nọkwa na-ekwu na e kwesịrị ibi Ndị Kraịst úgwù. (Ọrụ 15:1, 2) Mgbe ụmụnna nọ n’Antiọk nwere nghọtahie banyere ya, ha dunyere Pọl ka ọ gaa kọọrọ ya òtù na-achị isi nọ na Jeruselem. Ma ònye ka ntụziaka a si n’aka? Pọl kwuru, sị: “Agara m n’ihi ihe e kpugheere m.” O doro anya na ọ bụ Kraịst nyere ntụziaka a ka òtù na-achị isi dozie ya.—Gal. 2:1-3.
11. (a) Olee ihe ụfọdụ ndị Juu ghọrọ Ndị Kraịst ka kweere gbasara ibi úgwù? (b) Olee otú Pọl si gosi na ya na-akwado ndị okenye nọ na Jeruselem? (Lee ihe e dere n’ala ala peeji.)
11 Kraịst si n’aka òtù na-achị isi mee ka o doo anya na ọ dịghị mkpa ka e bie ndị na-abụghị ndị Juu ghọrọ Ndị Kraịst úgwù. (Ọrụ 15:19, 20) Ma, mgbe ọtụtụ afọ gachara òtù na-achị isi mere mkpebi a, ọtụtụ ndị Juu bụ́ Ndị Kraịst ka nọ na-ebi ụmụ ha úgwù. Mgbe ndị okenye nọ na Jeruselem nụrụ sịm sịm sịm ndị mmadụ na-akọ gbasara Pọl, na ọ naghị edebe Iwu Mozis, ha gwara ya mee ihe ọ na-atụghị anya ya. * (Ọrụ 21:20-26) Ha sị ya kpọrọ ụmụ nwoke anọ gaa n’ụlọ nsọ ma mee ka ha dịrị ọcha otú iwu Mozis kwuru ka ndị mmadụ nwee ike ịmata na ọ “na-edebe Iwu ahụ.” Pọl nwere ike ichewe ihe mere ha ji gwa ya mee ụdị ihe a. O nwere ike ịgwa ha na ọ bụ ndị Juu ndị ahụ ghọrọ Ndị Kraịst nwere nsogbu n’ihi na ha aghọtaghị ihe e kwuru gbasara ibi úgwù. Pọl mere ihe ha gwara ya, si otú ahụ gosi na ya na-akwado ndị okenye ahụ n’ihi na ha chọrọ ka Ndị Kraịst dịrị n’otu. Ma, anyị nwere ike ịna-eche ihe mere Kraịst ji gbachi nkịtị n’okwu gbasara ibi úgwù ruo ogologo oge ebe ọ bụkwanụ na ọnwụ ya akagbuola Iwu Mozis.—Kọl. 2:13, 14.
12. Olee ihe o nwere ike ịbụ ya mere Kraịst ji kwe ka ogologo oge gaa tupu ya edozie okwu gbasara ibi úgwù?
12 Ọ na-esiri ụfọdụ ike ịnabata mgbanwe ndị e mere n’otú anyị si ghọta ihe ụfọdụ. E kwesịrị inyetụ ndị Juu bụ́ Ndị Kraịst oge ka ha nwee ike ịgbanwe echiche ha. (Jọn 16:12) O siiri ụfọdụ n’ime ha ike ikweta na ibi mmadụ úgwù abụghịzi ihe ga-eme ka mmadụ na Chineke dịrị n’ezigbo mma. (Jen. 17:9-12) E nwekwara ndị nke na-atụ ụjọ na ndị Juu bụ́ ndị obodo ha ga-akpagbu ha ma ha kwuo na e kwesịghị ibi mmadụ úgwù. (Gal. 6:12) Ma ka oge na-aga, Kraịst si n’akwụkwọ ozi ndị Pọl dere nyekwuo ntụziaka.—Rom 2:28, 29; Gal. 3:23-25.
KRAỊST KA NA-EDU ỌGBAKỌ YA
13. Olee ihe ga-enyere anyị aka ịkwado otú Kraịst si edu ndú taa?
13 Ọ bụrụ na anyị aghọtachaghị ihe mere e ji mee mgbanwe ụfọdụ ná nzukọ Jehova, ọ dị mma ka anyị cheta otú Kraịst si duo ndú n’oge gara aga. Ma n’oge Jọshụa ma n’oge ndịozi, Kraịst nyere ha ntụziaka kwesịrị ekwesị iji chebe ndị Chineke, mee ka okwukwe ha sikwuo ike, meekwa ka ha dịrị n’otu.—Hib. 13:8.
14-16. Olee otú ntụziaka “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” na-enye anyị si egosi na Kraịst chọrọ inyere anyị aka mee ka okwukwe anyị sie?
14 Kraịst na-esi n’aka “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” enye anyị ntụziaka n’oge kwesịrị ekwesị. (Mat. 24:45) Otu nwanna nwere ụmụ anọ aha ya bụ Marc kwuru, sị: “Satan na-etisa ezinụlọ dị iche iche, si otú ahụ na-eme ka ọgbakọ ghara isi ike. Ugbu a a na-agba anyị ume ka anyị na-enwe ofufe ezinụlọ kwa izu, ihe a na-agwa ndị isi ezinụlọ hoo haa bụ ka ha chebe ezinụlọ ha.”
15 Mgbe anyị hụrụ otú Kraịst si edu anyị, anyị na-aghọta na ọ chọrọ inyere anyị aka ka okwukwe anyị na-esi ike. Otu okenye aha ya bụ Patrick kwuru, sị: “Ná mmalite, o siiri ụfọdụ ike izukọta n’obere ìgwè gaa ozi ọma ná ngwụcha izu. Ma, anyị si ná ndokwa a na-aghọta na Kraịst nwere mmasị n’onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ. Ụmụnna ndị na-eme ihere na ndị na-anaghị ejechi ozi anya amatala na ha dị mkpa n’ọgbakọ, baakwa uru. O meekwala ka ha na-ejechi ozi anya ugbu a.”
16 Ihe ọzọ Kraịst na-eme bụ inyere anyị aka iji ozi ọma kpọrọ ihe, n’ihi na ọ bụ ọrụ kacha mkpa a na-arụ n’ụwa ugbu a. (Gụọ Mak 13:10.) Otu okenye a họpụtara ọhụrụ aha ya bụ André na-eme ihe ọhụrụ ọ bụla nzukọ Jehova kwuru ka e mee. O kwuru, sị: “Otú e si belata ọnụ ọgụgụ ndị na-eje ozi na Betel na-echetara anyị na oge na-akụ kwarapụ kwarapụ, nakwa na anyị kwesịrị itinyekwu ike anyị n’ozi ọma.”
OTÚ ANYỊ GA-ESI EGOSI NA ANYỊ NA-ANABATA NTỤZIAKA KRAỊST NA-ENYE ANYỊ
17, 18. Olee ihe mere o ji dị mma ka anyị na-eche gbasara uru ndị anyị na-erite ná mgbanwe ndị e mere n’oge ndị na-adịbeghị anya?
17 Ntụziaka Jizọs Kraịst, bụ́ Eze na-achị achị ugbu a, na-enye anyị ga-abara anyị uru ma ugbu a ma n’ọdịnihu. N’ihi ya, ka obi na-atọ anyị ụtọ n’ihi uru ndị anyị riterela ná mgbanwe ndị e mere ná nzukọ Jehova n’oge na-adịbeghị anya. Mgbe unu na-enwe ofufe ezinụlọ, unu nwere ike ikwurịta uru ndị unu riterela ná mgbanwe ndị e mere n’ọmụmụ ihe anyị na-enwe kwa izu ma ọ bụkwanụ n’ozi ọma.
18 Ọ bụrụ na anyị aghọta ihe mere nzukọ Jehova ji enye anyị ntụziaka na uru ndị ha na-abara anyị, anyị nwere ike jiri ọṅụ na-eme ihe ndị ahụ. Dị ka ihe atụ, obi na-atọ anyị ụtọ ugbu a na anyị na-ebelata otú anyị si ebi akwụkwọ, ya emee ka anyị belata ego ndị a na-emefu. Ihe ọgbara ọhụrụ na-enyekwara anyị aka ịgbasa ozi ọma Alaeze n’ebe niile n’ụwa. Ọ bụrụ na anyị a na-echeta ihe a, o nwere ike ime ka anyị na-eji vidio na akwụkwọ anyị ndị dị n’ekwentị, tablet ma ọ bụ ngwá elektrọniks ndị ọzọ na-eme ihe. Anyị mee otú ahụ, ọ ga-egosi na anyị na-akwado Kraịst, bụ́ onye chọrọ ka anyị jiri ego ndị a na-enweta ná nzukọ Jehova na-eme ihe bara uru.
19. Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-eme ihe Kraịst na-agwa anyị?
19 Ọ bụrụ na anyị ejiri obi anyị na-eme ihe Kraịst gwara anyị, anyị na-eme ka okwukwe ụmụnna anyị na-esikwu ike, na-emekwa ka anyị dịrị n’otu. Nwanna André kwuru gbasara otú ahụ e si belata ọnụ ọgụgụ ndị na-eje ozi na Betel, sị: “Otú ụmụnna ndị ahụ jeburu ozi na Betel si nabata mgbanwe ahụ e mere mere ka m tụkwasị otú Kraịst si edu ndú obi, meekwa ka m na-akwanyere ụmụnna ndị ahụ ùgwù. Ha na-enwe ọṅụ n’ozi ha na-ejere Jehova, si otú ahụ soro ụgbọ ịnyịnya Jehova na-aga ụkwụ na ụkwụ.”
TỤKWASỊ ONYE NDÚ ANYỊ OBI, NWEEKWA OKWUKWE NA YA
20, 21. (a) Olee ihe mere anyị ji kwesị ịtụkwasị Onye Ndú anyị bụ́ Kraịst obi? (b) Olee ajụjụ anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?
20 N’oge na-adịghị anya, Onye Ndú anyị bụ́ Jizọs Kraịst, ‘ga-enwezu mmeri ya,’ meekwa “ihe dị iche iche dị egwu.” (Mkpu. 6:2; Ọma 45:4) Ka ọ dịgodị, ọ na-akwadebe anyị maka ụwa ọhụrụ nakwa ọrụ anyị ga-arụ mgbe ahụ. N’oge ahụ, anyị ga-akụziri ndị a kpọlitere n’ọnwụ ihe, nyekwa aka mee ka ụwa ghọọ paradaịs.
21 Eze anyị e tere mmanụ ga-eduru anyị baa n’ụwa ọhụrụ, ọ bụrụhaala na anyị atụkwasị ya obi n’agbanyeghị ihe ndị nwere ike ịgbanwe. (Gụọ Abụ Ọma 46:1-3.) Mgbe ụfọdụ, o nwere ike isiri anyị ike ịnabata mgbanwe ndị e nwere, nke ka nke, ma ha kpaa anyị aka otú anyị na-atụghị anya ya. Ọ bụrụ na ụdị ihe a emee, olee otú anyị nwere ike isi nọgide na-enwe obi iru ala ma tụkwasị Jehova obi anyị niile? Anyị ga-atụle ajụjụ a n’isiokwu na-eso nke a.
^ para. 8 Ndị na-amụ banyere ihe ndị mgbe ochie chọpụtara ọtụtụ ọka n’ụlọ ndị dakasịrị adakasị na Jeriko oge ochie. Nke a gosiri na ụmụ Izrel anọchibidoghị obodo ahụ ruo ogologo oge, gosikwa na nri ndị Jeriko nwere agwụghị ruo mgbe e bibiri ha. Ebe ọ bụ na Jehova ekweghị ka ụmụ Izrel kwakọrọ ihe ndị Jeriko, mgbe ahụ bụ oge kwesịrị ekwesị ibibi obodo ahụ n’ihi na ọ bụ oge ndị Jeriko ji ewe ihe ubi, ha nwekwara nnukwu ọka n’ubi ha.—Jọsh. 5:10-12.
^ para. 11 Gụọ igbe isiokwu ya bụ “Pọl Ejiri Obi Umeala Merie Ule.” Ọ gbara n’Ụlọ Nche nke Mach 15, 2003, peeji nke 24.