ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | IHE ỌHỤỤ NDỊ E GOSIRI BANYERE ELUIGWE NA-AKỤZIRI ANYỊ
Ọhụụ Ndị Mere Ka A Mata Ndị Bí n’Eluigwe
Na Baịbụl, e nwere ọtụtụ ọhụụ ndị e gosiri ndị ohu Chineke. Ọhụụ ndị ahụ ga-enyere anyị aka ịmata ndị bi n’eluigwe. Ka anyị lebagodị ụfọdụ n’ime ha anya. Ọ bụ eziokwu na ihe ụfọdụ e gosiri n’ọhụụ ndị ahụ nwechara ihe ha pụtara, ha ga-eme ka ị mata ndị bi n’eluigwe, meekwa ka ị mata otú ha nwere ike isi nyere anyị aka.
JEHOVA BỤ ONYE KACHA ELU
“Otu ocheeze dị n’eluigwe, e nwekwara onye nọ ọdụ n’ocheeze ahụ. Onye ahụ nke nọ ọdụ na-egbuke dị ka nkume jaspa na nkume dị oké ọnụ ahịa nke na-acha ọbara ọbara, eke na egwurugwu nke na-egbuke dị ka emerad gbakwara ocheeze ahụ gburugburu.”—Mkpughe 4:2, 3.
“Ìhè na-enwukwa gburugburu ya. E nwere ihe yiri ụta nke na-apụta n’ígwé ojii n’ụbọchị mmiri na-ezo. Ọ bụ otú ahụ ka ìhè nke na-enwu gburugburu ya dị. O yiri ebube Jehova.”—Ezikiel 1:27, 28.
N’ọhụụ ndị a e gosiri Jọn onyeozi na Ezikiel onye amụma, e ji ihe ndị a na-ahụ anya kọwaa otú Jehova Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile, dịruru n’ebube ka anyị nwee ike ịghọta ha. Ihe ndị ahụ e ji kọwaa ya bụ nkume dị oké ọnụ ahịa, eke na egwurugwu, na ocheeze dị ebube. Ha na-eme ka anyị mata na ebe Jehova nọ mara mma, dị ebube, dịkwa jụụ.
Ihe ndị ahụ e kwuru gbasara Chineke dabara n’ihe otu onye so dee Abụ Ọma kwuru. Ọ sịrị: “N’ihi na Jehova dị ukwuu, kwesịkwa nnọọ ka e too ya. E kwesịrị ịtụ ya egwu karịa chi niile ọzọ. N’ihi na chi niile nke ndị dị iche iche bụ chi na-abaghị uru; ma, ọ bụ Jehova kere eluigwe. Ebube na ịma mma dị n’ihu ya; ike na ịma mma dị n’ebe nsọ ya.”—Abụ Ọma 96:4-6.
Ọ bụ eziokwu na Jehova bụ Onye Kacha Elu, ọ na-agwa anyị ka anyị na-ekpere ya ekpere. Ọ na-emekwa ka obi sie anyị ike na ya ga-aza anyị ekpere. (Abụ Ọma 65:2) Chineke hụrụ anyị n’anya nke ukwuu, ihe banyere anyị na-emetụkwa ya n’obi. Ọ bụ ya mere Jọn onyeozi ji kwuo, sị: “Chineke bụ ịhụnanya.”—1 Jọn 4:8.
JIZỌS GUZO N’AKA NRI CHINEKE
“Ebe o [ya bụ, Stivin onye na-eso ụzọ Jizọs] jupụtara na mmụọ nsọ, o legidere anya n’ime eluigwe ma hụ ebube Chineke, hụkwa Jizọs ka o guzo n’aka nri Chineke. O wee, sị: ‘Lee! Ana m ahụ eluigwe ka e meghere ya nakwa Nwa nke mmadụ ka o guzo n’aka nri Chineke.’”—Ọrụ Ndịozi 7:55, 56.
Obere oge tupu Stivin ahụ ọhụụ a, ndị ndú ndị Juu ọ nọ na-agwa okwu gburu Jizọs. Ọhụụ a gosiri na Jizọs dị ndụ, gosikwa na a kpọlitere ya n’ọnwụ gaa n’eluigwe, ya anọrọ n’aka nri Chineke. Ndị Efesọs 1:20, 21.
Pọl onyeozi kwuru banyere Jizọs, sị: “[Jehova] si ná ndị nwụrụ anwụ kpọlite [Jizọs] ma nye ya oche n’aka nri ya n’ebe ndị dị n’eluigwe, n’ebe dị elu karịa ọchịchị na ikike na ike na ịbụisi ọ bụla na aha ọ bụla a kpọrọ, ọ bụghị naanị n’ime usoro ihe a, kamakwa n’ime nke ahụ gaje ịbịa.”—Baịbụl kwuru na e buliri Jizọs elu, kwuokwa na ọ hụrụ ụmụ mmadụ n’anya ka Jehova. Mgbe Jizọs na-eje ozi ya n’ụwa, ọ gwọrọ ndị ọrịa, meghee anya ndị ìsì, mee ka ndị ngwọrọ gawa ije, kpọlitekwa ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. O ji ndụ ya chụọ àjà iji gbapụta ụmụ mmadụ, si otú ahụ gosi na ya hụrụ Chineke na ụmụ mmadụ n’anya. (Ndị Efesọs 2:4, 5) Jizọs nọ n’aka nri Chineke ugbu a. N’oge na-adịghị anya, ọ ga-eji ike Chineke nyere ya bibie ndị ajọ omume, ma gọzie ndị niile na-eme ihe Chineke na-achọ.
NDỊ MMỤỌ OZI NA-EJERE CHINEKE OZI
“Anọ m [ya bụ Daniel onye amụma] na-ele anya ruo mgbe e debegasịrị ocheeze, Onye Ochie ahụ [Jehova] wee nọdụ ọdụ. . . . E nwere puku kwuru puku ndị nọ na-ejere ya ozi, nakwa iri puku kwuru iri puku ndị guzo n’ihu ya.”—Daniel 7:9, 10.
N’ọhụụ a e gosiri Daniel banyere eluigwe, ọ bụghị naanị otu mmụọ ozi ka ọ hụru, kama ọ hụrụ ọtụtụ ndị mmụọ ozi. Ọhụụ a dị ebube. Ndị mmụọ ozi dịkwa ebube, mara ihe, ma sie ezigbo ike. N’ime ha, e nwere ndị seraf, nweekwa ndị cherọb. Baịbụl kwuru gbasara ndị mmụọ ozi ihe karịrị narị ugboro abụọ na iri ise.
Ndị mmụọ ozi abụghị ndị nwụrụ anwụ gara eluigwe. Chineke kere ha ọtụtụ afọ tupu ya ekee mmadụ. Ha nọ ya mgbe Chineke kere ụwa. Mgbe ha hụrụ ya, ha ṅụrịrị ọṅụ.—Job 38:4-7.
Otu n’ime ụzọ ndị mmụọ ozi si ejere Chineke ozi bụ na ha so na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke. Ozi ọma a bụ ọrụ kacha mkpa a na-arụ n’ụwa taa. (Matiu 24:14) Ọhụụ e gosiri Jọn onyeozi mere ka anyị mata na ha so na-ekwusa ozi ọma. Jọn kwuru, sị: “M wee hụ mmụọ ozi ọzọ ka ọ na-efegharị n’etiti eluigwe, o nwekwara ozi ọma ebighị ebi nke bụ́ ozi obi ụtọ ọ ga-ezisara ndị bi n’ụwa, mba niile na ebo niile na asụsụ niile na ndị niile.” (Mkpughe 14:6) Ọ bụ eziokwu na ndị mmụọ ozi anaghị agwa ndị mmadụ okwu n’oge anyị a, otú ahụ ha mere mgbe ụfọdụ n’oge ochie, ma ha na-eduru ndị na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke gaa na nke ndị ji obi ha dum chọọ ife Chineke.
SETAN NA-EDUHIE ỌTỤTỤ NDE MMADỤ
“Agha wee daa n’eluigwe: Maịkel [ya bụ, Jizọs Kraịst] na ndị mmụọ ozi ya busoro dragọn ahụ agha, dragọn ahụ na ndị mmụọ ozi ya bukwara agha ma dragọn ahụ emerighị, ohere adịghịrị ha ọzọ n’eluigwe. E wee chụda dragọn ukwu ahụ, bụ́ agwọ mbụ ahụ, onye a na-akpọ Ekwensu na Setan, onye na-eduhie elu ụwa dum mmadụ bi; a chụdara ya n’ụwa, a chụdara ya na ndị mmụọ ozi ya.”—Mkpughe 12:7-9.
E nwere mgbe udo na-adịchaghị n’eluigwe. Mgbe e kere mmadụ, otu mmụọ ozi chọwara ka e fewe ya kama ife Jehova. Ọ bụ ya mere o ji nupụrụ ya isi, ma ghọzie Setan. Setan pụtara “Onye mmegide.” Ụfọdụ ndị mmụọ ozi mechara soro ya nupụrụ Chineke isi ma ghọọ ndị mmụọ ọjọọ. Ha bụ ndị ọjọọ, ha na-agbakwa ihe Jehova kwuru ụkwụ. Ha na-emekwa ka ọtụtụ mmadụ na-enupụrụ Jehova isi, bụ́ onye hụrụ anyị n’anya ma na-agwa anyị ihe na-abara anyị uru.
Obi fere Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya azụ. Ha ahụghị anyị n’anya. Ọ bụkwa ha na-akpata ọtụtụ ahụhụ anyị na-ata n’ụwa taa. Dị ka ihe atụ, ọ bụ Setan gburu anụ ụlọ niile Job nwere, gbuokwa ụfọdụ ndị na-ejere ya ozi. O gbukwara ụmụ iri Job nwere mgbe o mere ka “oké ifufe” fetuo ụlọ ha nọ na ya ma gbuo ha niile. Mgbe Setan gbuchara ha, o mere “ka etuto ọjọọ too Job, malite n’ọbụ ụkwụ ya ruo n’opu isi ya.”—Job 1:7-19; 2:7.
Ma, a ga-ebibi Setan n’oge na-adịghị anya. Kemgbe a chụdara ya n’ụwa, ọ ma na “o nwere oge dị mkpirikpi.” (Mkpughe 12:12) Ọ pụtara na n’oge na-adịghị anya, Setan agaghị adịkwa. Ihe a bụ ozi ọma.
NDỊ E SI N’ỤWA KPỌLITE N’ỌNWỤ GAA ELUIGWE
‘Ị [ya bụ Jizọs] zụtaara Chineke ndị mmadụ si n’ebo niile na asụsụ niile na ndị niile na mba niile, i mekwara ka ha bụụrụ Chineke anyị otu alaeze na ndị nchụàjà, ha ga-achịkwa ụwa dị ka ndị eze.’—Mkpughe 5:9, 10.
E nwere ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ gaa n’eluigwe, otú ahụ e mere Jizọs. Jizọs gwara ndịozi ya kwesịrị ntụkwasị obi, sị: “M na-aga ịkwadebere unu ebe. Ọ bụrụkwa na mụ agaa . . . M ga-abịa ọzọ, mụ onwe m ga-anabatakwa unu n’ebe obibi m, ka unu wee nọrọkwa n’ebe m nọ.”—Jọn 14:2, 3.
Ndị ahụ ga-aga eluigwe nwere ihe mere ha ji aga. Ha na Jizọs ga-eso chịa n’Alaeze Chineke. Ha ga-achị ndị bi n’ụwa, ma gọzie ha. Ọ bụ Alaeze a ka Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-ekpe ekpere maka ya n’ekpere ahụ ọ kụziiri ha. Ọ gwara ha na-ekpe ekpere, sị: “Nna anyị nke bi n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ. Ka alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.”—IHE NDỊ NỌ N’ELUIGWE GA-EMERE NDỊ BÍ N’ỤWA
“M [ya bụ Jọn onyeozi] wee nụ ka otu oké olu si n’ocheeze ahụ na-asị: ‘Lee! Ụlọikwuu nke Chineke dịnyeere mmadụ, . . . Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri niile n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ niile agabigawo.’”—Mkpughe 21:3, 4.
Ọhụụ a e gosiri Jọn na-ekwu gbasara mgbe Alaeze Chineke ga-ebibi ọchịchị Setan, ma mee ka ụwa ghọọ paradaịs. Ọ bụ Jizọs na ndị ahụ e si n’ọnwụ kpọlite gaa eluigwe ga-achị n’Alaeze ahụ. Ihe niile merela ka ụmụ mmadụ hụsie anya n’ụwa a agaghị adịkwa. Ọnwụ agaghịzi adị.
Gịnịkwanụ banyere ọtụtụ ijeri mmadụ ndị nwụrụla anwụ a na-agaghị akpọlite n’ọnwụ gaa eluigwe? A ga-akpọlite ha n’ọnwụ ibi n’ụwa. Ha ga-enwe olileanya ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi mgbe ụwa ga-aghọ Paradaịs.—Luk 23:43.
Ọhụụ ndị ahụ anyị lebarala anya n’isiokwu a na-eme ka obi sie anyị ike na Jehova Chineke na Ọkpara ya Jizọs Kraịst, ndị mmụọ ozi na ndị ahụ e si n’ụwa zụta, hụrụ anyị n’anya nke ukwuu, ha chọkwara ka ihe dịrị anyị ná mma. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu ihe ha ga-emere ndị bí n’ụwa, gwa Ndịàmà Jehova nọ gị nso, ma ọ bụkwanụ gị agaa n’ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet bụ́, www.jw.org/ig, danloduo akwụkwọ bụ́ Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?