Olee Ihe Ndị Alaeze Chineke Ga-eme?
Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-ekpe ekpere ka Alaeze Chineke bịa. Ọ ma na ọtụtụ ihe ọjọọ na-eme n’ụwa taa abụghị uche Chineke, nakwa na ọ bụ naanị Alaeze Chineke bụ ọchịchị ga-ewepụli ihe ọjọọ ndị ahụ. Olee ihe ndị Alaeze Chineke ga-eme?
IHE ALAEZE CHINEKE MERELA
N’isiokwu bu nke a ụzọ, anyị kwuru banyere ihe ndị Jizọs kwuru a ga-eji amata na Alaeze Chineke adịla nso. Ha bụ ihe ndị a na-ahụ anya na-egosi na Alaeze Chineke, nke Jizọs Kraịst bụ Eze ya, amalitela ịchị n’eluigwe.
Baịbụl kwuru na Jizọs malite ịchị n’eluigwe, ọ ga-achụpụ Ekwensu na ndị mmụọ ọjọọ ya. Ugbu a, ọ bụzi n’ụwa ka ha nọ, o sokwa n’ihe mere nsogbu ji jupụta n’ụwa kemgbe afọ 1914.—Mkpughe 12:7, 9.
N’agbanyeghị na ihe na-aka njọ n’ụwa kwa ụbọchị, Jizọs, bụ́ Eze nke Alaeze Chineke, na-eme ọtụtụ ihe iji nyere ndị mmadụ aka n’ụwa niile. Ọrụ ịkụzi Baịbụl a na-arụ n’ụwa niile, nke Jizọs kwuru na a ga-arụ, emeela ka ọtụtụ ndị mụta ihe Baịbụl kwuru ma na-eme ya. (Aịzaya 2:2-4) Ọtụtụ nde mmadụ anaghịzi ekwe ka akụnụba, ego na ọrụ ha ji akpa afọ ha bụrụ ihe kacha ha mkpa ná ndụ. Ha amụtala ihe ga-enyere ha aka ịna-enwe obi ụtọ n’ezinụlọ ha, mụtakwa otú ha ga-esi baara onwe ha uru. Ha aghọọla ụdị ndị Chineke chọrọ ka ha biri n’Alaeze ya.
OLEE IHE ALAEZE CHINEKE GA-EME?
N’agbanyeghị na Jizọs amalitela ịchị n’eluigwe, ọ ka bụ ụmụ mmadụ na-achị ụwa. Ma, Chineke agwala Jizọs, sị: “Gaa meriwe n’etiti ndị iro gị.” (Abụ Ọma 110:2) N’oge na-adịghị anya, Jizọs ga-ebibi ndị iro ya niile ma mee ka ndị na-efe Chineke kuru ume ndụ.
N’oge ahụ, Alaeze Chineke
-
Ga-ebibi okpukpe ụgha. A ga-ebibi okpukpe niile na-akụziri ndị mmadụ ihe ndị na-abụghị eziokwu banyere Chineke ma na-eme ka ihe na-esiri ndị mmadụ ike. Baịbụl kpọrọ okpukpe ụgha ndị a nwaanyị akwụna. Mbibi ya ga-atụ ọtụtụ ndị n’anya.—Mkpughe 17:15, 16.
-
Ga-ebibi ọchịchị ụmụ mmadụ. Alaeze Chineke ga-ewepụ ọchịchị ụmụ mmadụ.—Mkpughe 19:15, 17, 18.
-
Ga-ebibi ndị ọjọọ. Olee maka ndị kpọrọ ekwe nkụ na-eme ihe ọjọọ ma jụ irubere Chineke isi? “A ga-ekpochapụ ndị ajọ omume n’ụwa.”—Ilu 2:22.
-
Ga-ebibi Setan na ndị mmụọ ọjọọ. Alaeze Chineke ga-eme ka Setan na ndị mmụọ ọjọọ “ghara iduhie mba niile ọzọ.”—Mkpughe 20:3, 10.
Olee uru ihe a niile ga-abara ndị nabatara Alaeze Chineke?
IHE ALAEZE CHINEKE GA-EMERE ỤMỤ MMADỤ
Ihe Jizọs ga-emere ụmụ mmadụ ga-akarị ihe ọ bụla onye ọchịchị bụ́ mmadụ nwere ike ime. Otu narị puku mmadụ na iri puku anọ na puku anọ (144,000) ndị si n’ụwa gaa eluigwe ga-eso ya chịa. (Mkpughe 5:9, 10; 14:1, 3) Jizọs ga-eme ka uche Chineke mezuo n’ụwa. Gịnị ka Alaeze Chineke ga-emere ndị bi n’ụwa?
-
Ọ ga-ewepụ ọnwụ na ọrịa. “O nweghị onye bi n’ala a ga-asị: ‘Ahụ́ adịghị m.’” “Ọnwụ agaghịzi adị.”—Aịzaya 33:24; Mkpughe 21:4.
-
Ọ ga-eme ka e nwee ezigbo udo na obi iru ala. “Ụmụ gị ga-anọkwa nnọọ n’udo.” “Onye ọ bụla n’ime ha ga-anọdụ ala n’okpuru osisi vaịn ya nakwa n’okpuru osisi fig ya. E nweghịkwa onye ga-emenye ha ụjọ.”—Aịzaya 54:13; Maịka 4:4.
-
Ọ ga-eme ka e nwee ezigbo ọrụ. “Ndị m họọrọ ga-eji ihe aka ha rụpụtara mee ihe n’uju. Ha agaghị arụsi ọrụ ike na nkịtị.”—Aịzaya 65:22, 23.
-
Ọ ga-eme ka ụwa maa mma. “Ala ịkpa na ala kpọrọ nkụ ga-enwe aṅụrị. Ọzara ga-aṅụrịkwa ọṅụ, okooko osisi ga-ejukwa eju na ya.”—Aịzaya 35:1.
-
Ọ ga-akụziri ndị mmadụ ihe ha ga na-eme iji dịrị ndụ ebighị ebi. “Iji nweta ndụ ebighị ebi, ha ga-amata gị, onye naanị ya bụ ezi Chineke, matakwa onye i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.”—Jọn 17:3.
Chineke chọrọ ka ngọzi ndị a niile bụrụ nke anyị. (Aịzaya 48:18) Isiokwu na-eso nke a ga-agwa gị ihe ị ga-eme ugbu a ka i nwee ike iketa Alaeze Chineke.