Ihe Baịbụl Kwuru, Oge Ha Ọ̀ Gafeela?
WEREGODỊ YA na unu gara ilegharị anya n’ebe a na-akwakọba ihe mgbe ochie. N’ebe ahụ, e nwere ọtụtụ ihe a kpụrụ akpụ. Ọtụtụ n’ime ha enweela oghere, chagharịa ma mebie. Iberibe ụfọdụ n’ime ha adapụsịakwala. Ma, e nwere otu nke pụrụ iche. Ọ ka dị nnọọ otú ọ dị mgbe a kpụrụ ya. Mgbe i lechara ya, gị ajụọ onye na-edugharị unu, sị: “À kpụrụ nke a ọhụrụ?” Ya asị gị, “mba,” ma gwa gị na “ọ bụ ya kacha ọtụtụ n’ime ihe ndị ahụ ochie, nakwa na a kpụgharịbeghị ya kemgbe a kpụchara ya.” Gị ajụzie ya ma ‘è nwere ebe a dọwara ya mere na e nwebeghị ihe mere ya.’ Ya asị gị “mba,” ma gwa gị na “ọ bụ nke ahụ ka ajọ ifufe na nnukwu mmiri ozuzo nyerela nsogbu karịchaa, gwakwa gị na ọtụtụ ndị ọjọọ agbaala mbọ imebi ya.” Gị ajụzie onwe gị, sị: ‘Olee ụdị ihe e ji kpụọ ya?’
E nwere otú Baịbụl si yie ihe mgbe ochie ahụ pụrụ iche. Ọ bụ ya ka ọtụtụ akwụkwọ ndị e nwere taa ochie. Ọ bụ eziokwu na e nwere akwụkwọ ndị ọzọ merela ochie, ma ọtụtụ n’ime ha adịghịzi mma. Ha dị ka ihe ndị ọzọ ahụ a kpụrụ akpụ, n’ihi na o dịla anya e dere ha. Dị ka ihe atụ, e nweela ihe ọhụrụ ndị a chọpụtara gosiri na ihe ndị e dere n’akwụkwọ ndị ahụ abaghịzi uru. Ọtụtụ mgbe, ihe ndị e dere na ha banyere otú e si agwọ ọrịa nweziri ike ịkpatakwuru mmadụ nsogbu, kama inyere mmadụ aka. Ọtụtụ n’ime akwụkwọ ndị ahụ e dere n’oge ochie adịghịzi mma. E nweela ebe ndị furu efu ma ọ bụ dọkaa na ha.
Ma, Baịbụl dị iche. N’agbanyeghị na a malitere ide ya n’ihe karịrị puku afọ atọ na narị afọ ise gara aga, ọ ka dị nnọọ otú ọ dị mgbe e dere ya. Kemgbe ọtụtụ afọ, ndị mmadụ agbaala mbọ ka ha memilaa Baịbụl. Ha agbaala ya ọkụ, machie ya, katọọkwa ya. N’agbanyeghị ya, Baịbụl ka dịkwa nnọọ otú ọ dị. O nwetụdịghị otú ihe ọhụrụ ndị a chọpụtarala taa Oge Ya Ọ̀ Gafeela Ka Ò Kwuru Ihe Ndị Mmadụ Mechara Mata Na Ha Bụ Eziokwu?”
si gosi na ihe Baịbụl kwuru abaghịzi uru. Kama nke ahụ, ọtụtụ ihe Baịbụl kwuru gosiri na ọ ka na-aba uru taa, nakwa na ọ ga na-aba uru n’ọdịnihu. Gụọ igbe bụ́, “ÀGWÀ NDỊ GA-ABARA MMADỤ URU TAA
I nwere ike ịna-eche, sị, ‘Ihe Baịbụl kwuru ọ̀ ga-abara mmadụ uru taa n’eziokwu?’ Iji mata azịza ajụjụ a, jụọ onwe gị, sị: ‘Olee nsogbu ndị kacha echu ndị mmadụ ụra taa? Olee ndị nke kacha eyi egwu?’ I nwere ike ikwu na ọ bụ agha, imetọ ụwa, ime mpụ, ma ọ bụkwanụ nrụrụ aka. Ugbu a, ka anyị lebagodị anya n’ihe ụfọdụ Baịbụl kwuru. Ka a na-eleba ha anya, na-ajụ onwe gị, sị, ‘Ọ bụrụ na ndị mmadụ a na-eme ihe ndị a Baịbụl kwuru, ụwa ọ̀ gaghị adị mma obibi?’
IME UDO
“Obi ụtọ na-adịrị ndị na-eme udo, n’ihi na a ga-akpọ ha ‘ụmụ Chineke.’” (Matiu 5:9) “Ọ bụrụ na o kwere omume, ọ bụrụhaala na ọ dị unu n’aka, unu na mmadụ niile dịrị n’udo.”—Ndị Rom 12:18.
IME EBERE NA ỊGBAGHARA MMEHIE
“Obi ụtọ na-adịrị ndị na-eme ebere, n’ihi na a ga-emere ha ebere.” (Matiu 5:7) “Na-ediri ibe unu ihe ma na-agbaghara ibe unu kpamkpam ma ọ bụrụ na onye ọ bụla nwere ihe mere ọ ga-eji mee mkpesa megide ibe ya. Ọbụna dị ka Jehova * gbaghaara unu kpamkpam, na-emekwanụ otú ahụ.”—Ndị Kọlọsi 3:13.
NDỊ SI NÁ MBA DỊ ICHE ICHE IBI N’UDO
Chineke “sitekwara n’otu mmadụ mee mba ọ bụla nke ụmụ mmadụ, ka ha biri n’elu ala dum.” (Ọrụ Ndịozi 17:26) “Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu, kama ná mba ọ bụla, onye na-atụ egwu ya ma na-eme ezi omume bụ onye ọ na-anabata nke ọma.”—Ọrụ Ndịozi 10:34, 35.
ILEKỌTA ỤWA
“Jehova bụ́ Chineke wee kpọrọ mmadụ ahụ mee ka o biri n’ogige Iden ka ọ na-akọ ihe na ya ma na-elekọta ya.” (Jenesis 2:15) Chineke ‘ga-ebibi ndị na-ebibi ụwa.’—Mkpughe 11:18.
ỊKPỌ ANYAUKWU NA ỊKWA IKO ASỊ
“Lezienụ anya ka unu ghara inwe ụdị anyaukwu ọ bụla, n’ihi na ọbụna mgbe mmadụ nwere ọtụtụ ihe, ihe o nwere adịghị eme ka ọ dị ndụ.” (Luk 12:15) “Ka a ghara ịkpọtụdị ịkwa iko na ụdị adịghị ọcha ọ bụla ma ọ bụ anyaukwu aha n’etiti unu, dị nnọọ ka o kwesịrị ndị nsọ.”—Ndị Efesọs 5:3.
ỊKWỤWA AKA ỌTỌ NA ỊRỤSI ỌRỤ IKE
“Anyị na-achọ ka anyị na-eme ihe n’eziokwu n’ihe niile.” (Ndị Hibru 13:18) “Ka onye na-ezu ohi kwụsị izu ohi, kama ka ọ rụsie ọrụ ike.”—Ndị Efesọs 4:28.
ỊNA-ENYERE NDỊ NỌ NÁ MKPA AKA
“Na-agụgụnụ mkpụrụ obi dara mbà, na-akwadonụ ndị na-adịghị ike, na-enwenụ ogologo ntachi obi n’ebe mmadụ niile nọ.” (1 Ndị Tesalonaịka 5:14) ‘Na-elekọta ụmụ mgbei na ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ ná mkpagbu ha.’—Jems 1:27.
Ọ bụghị naanị na Baịbụl kwuru ihe ndị a dị mkpa ka mmadụ na-eme, kama ọ gwakwara anyị otú anyị ga-esi na-eme ha eme ná ndụ anyị kwa ụbọchị. Ọ bụrụ na ọtụtụ ndị a na-eme ihe ndị a Baịbụl kwuru, ụwa ọ̀ gaghị adị mma karịa otú ọ dị ugbu a? N’eziokwu, ihe Baịbụl kwuru bara uru ugbu a karịa
mgbe ọ bụla ọzọ. Olee uru ihe Baịbụl kwuru nwere ike ịbara gị ugbu a?OTÚ IHE BAỊBỤL KWURU NWERE IKE ISI BARA GỊ URU UGBU A
Nwoke kacha mara ihe nke bitụrụla n’ụwa, kwuru, sị: “A na-egosi na amamihe ziri ezi site n’ọrụ ya.” (Matiu 11:19) Ihe a o kwuru bụ eziokwu. Ọ bụrụ na mmadụ achọọ ịmata ma ihe ọ̀ ga-abara ya uru, ọ́ gaghị ebu ụzọ nwalee ihe ahụ? N’ihi ya, i nwere ike ịjụ onwe gị, sị: ‘Ọ bụrụ na ime ihe Baịbụl kwuru na-aba uru n’eziokwu, ọ̀ bụ na o kwesịghị inyere m aka ná ndụ? Olee otú ọ ga-esi nyere m aka ná nsogbu ndị m nwere ugbu a?’ Legodị otú o si nyere otu nwaanyị aha ya bụ Delphine aka.
Ihe niile nọbu na-agara Delphine * siriri werere, ndụ ana-atọkwa ya ụtọ. Ma, n’otu ntabi anya, nsogbu bidoro zowere ya ka mmiri. Nwa ya nwaanyị na-erubeghị afọ iri abụọ nwụrụ. Ya na di ya gbasakwara. Ihe bidokwara siwere ya ike. Delphine kwuru, sị: “O nweghịzi ihe m ji n’aka. Enweghịzi m nwa, enweghịzi m di, enweghịzi m ụlọ. Ọ bịaziri dị m ka ndụ m enweghịzi isi.”
Ọ bụ mgbe ahụ ka Delphine ghọtara otu ihe Baịbụl kwuru nke ọma. Baịbụl sịrị: “Afọ ndụ anyị na-adị afọ iri asaa; ọ bụrụkwa na anyị enwee ike pụrụ iche, ha na-adị afọ iri asatọ, ma ha jupụtara ná Abụ Ọma 90:10.
nsogbu na ihe ọjọọ; n’ihi na ha ga-agafe ngwa ngwa, anyị ewee ghara ịnọkwa.”—Baịbụl nyeere Delphine aka n’ụzọ na-enweghị atụ n’oge ahụ ihe siiri ya ike. Dị ka anyị ga-ahụ n’isiokwu atọ ndị na-esonụ, e nwekwara ndị ọzọ ime ihe Baịbụl kwuru nyeerela ezigbo aka ná nsogbu ha. Ha abịala chọpụta na Baịbụl dị ka ihe ndị mgbe ochie ahụ pụrụ iche e kwuru gbasara ya ná mmalite isiokwu a. Ọ dịtụdịghị ka ọtụtụ akwụkwọ ndị ọzọ merela ochie, na-abaghịzi uru. Ọ̀ bụ maka na ihe e ji mee Baịbụl dị iche? Ka ọ̀ nwere ike ịbụ na ihe e dere na ya bụ okwu Chineke n’eziokwu?—1 Ndị Tesalonaịka 2:13.
O nwere ike ịbụ na gịnwa achọpụtakwala na mmadụ anaghị adịte ndụ aka, nakwa na ndụ jupụtara ná nsogbu. Ọ bụrụ na nsogbu ezuo gị ahụ́, olee ebe ị na-aga ka i nweta nkasi obi, enyemaka, ma ọ bụkwanụ mata ihe i nwere ike ime?
Ka anyị lebagodị anya n’ụzọ atọ dị ezigbo mkpa Baịbụl nwere ike inyere gị aka ná ndụ. Baịbụl ga-enyeliri gị aka
-
izere nsogbu ụfọdụ.
-
ịma otú ị ga-esi kwụsị nsogbu ụfọdụ i nwere.
-
idi nsogbu ọ bụla ị na-agaghị akwụsịli.
Isiokwu ndị na-esonụ ga-eleba anya n’ihe atọ ndị a.
^ para. 10 Baịbụl kwuru na aha Chineke bụ Jehova.—Abụ Ọma 83:18.
^ para. 24 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a na n’isiokwu atọ na-esonụ abụghị ezigbo aha ha.