ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 16
ABỤ NKE 87 Bịa Ka A Gbaa Gị Ume
Anyị na Ụmụnna Anyị Ịbụ Ezigbo Enyi Na-abara Anyị Uru
“Ọ bụ ihe dị mma, bụrụkwa ihe na-eme obi ụtọ ma ụmụnne bikọta ọnụ ma dịrị n’otu.”—ỌMA 133:1.
IHE A GA-AMỤ
Ihe ndị ga-enyere anyị aka ka anyị na ụmụnna anyị na-adị ná mma nakwa ọtụtụ ngọzi anyị ga-enweta ma anyị na ụmụnna anyị dịrị n’ezigbo mma.
1-2. Olee otu ihe dị Jehova ezigbo mkpa? Gịnị ka ọ chọrọ ka anyị mee?
OTÚ anyị si emeso ndị ọzọ dị Jehova ezigbo mkpa. Jizọs kụziri na anyị kwesịrị ịhụ ndị agbata obi anyị n’anya otú anyị hụrụ onwe anyị. (Mat. 22:37-39) Ihe ọ pụtara bụ na anyị kwesịkwara ịna-emere ndị na-anaghị efe Jehova ihe ọma. Ọ bụrụ na anyị na-eme otú ahụ, anyị na-eme ka Jehova Chineke, bụ́ onye “na-eme ka anyanwụ ya waara ndị ọjọọ na ndị ọma. Ọ na-emekwa ka mmiri zooro ndị ezi omume na ndị ajọ omume.”—Mat. 5:45.
2 Ọ bụ eziokwu na Jehova hụrụ mmadụ niile n’anya, ndị ihe ha kacha amasị ya bụ ndị na-erubere ya isi. (Jọn 14:21) Ọ chọrọ ka anyị na-eme ka ya. Ọ gwara anyị ka anyị ‘jiri obi anyị niile’ hụ ụmụnna anyị n’anya, ‘na-enwekwara ha ọmịiko.’ (1 Pita 4:8; Rom 12:10) Ụdị ịhụnanya na ọmịiko a yiri ụdị nke anyị na-egosi onye ezinụlọ anyị anyị hụrụ n’anya ma ọ bụkwanụ enyi anyị anyị na ya dị n’ezigbo mma.
3. Gịnị ka anyị kwesịrị icheta gbasara ịhụnanya?
3 E nwere ike iji ịhụnanya tụnyere ihe a kụrụ akụ. E kwesịrị ịna-elekọta ihe a kụrụ akụ nke ọma ka o nwee ike ito. Otú ahụ ka anyị kwesịkwara ịna-agbasi mbọ ike ka anyị na-ahụkwu ndị ọzọ n’anya. Pọl onyeozi gwara Ndị Kraịst, sị: “Nọgidenụ na-ahụ ibe unu n’anya ka ụmụnne.” (Hib. 13:1) Jehova chọrọ ka anyị na-ahụkwu ndị ọzọ n’anya. Isiokwu a ga-enyere anyị aka ịmata ihe mere anyị na ụmụnna anyị kwesịrị iji na-abụkwu enyi nakwa otú anyị ga-esi na-eme ya.
IHE MERE ANYỊ NA ỤMỤNNA ANYỊ KWESỊRỊ IJI NA-ADỊKWU NÁ MMA
4. Dị ka e kwuru n’Abụ Ọma 133:1, olee otú anyị ga-esi gosi na obi dị anyị ụtọ na anyị na ụmụnna anyị dị n’otu? (Kọwaakwa foto.)
4 Gụọ Abụ Ọma 133:1. Anyị kwetara ihe ọbụ abụ a kwuru, na anyị na ụmụnna anyị ịbụ ezigbo enyi “dị mma, bụrụkwa ihe na-eme obi ụtọ.” Ma, o nwere ike o nweghịzi ihe anyị ga-eji otú anyị na ụmụnna anyị si dịrị n’otu kpọrọ otú ahụ mmadụ nwere ike ịhụkata okooko osisi mara mma, o nweghịzi ihe ọ ga-eji ya kpọrọ. Anyị na-ahụkarị ụmụnna anyị, ikekwe, ọtụtụ ugboro n’izu. Olee otú anyị ga-esi gbalịsie ike jiri ha kpọrọ ihe? Anyị ga na-ahụkwu ụmụnna anyị n’anya ma ọ bụrụ na anyị ewepụta oge na-eche gbasara uru onye nke ọ bụla n’ime ha baara ma ọgbakọ ma anyịnwa.
5. Olee otú obi na-adị ndị mmadụ ma ha hụ otú anyị si hụ ibe anyị n’anya?
5 Ụfọdụ ndị bịara ọmụmụ ihe anyị na nke mbụ ya na-enwe ezigbo obi ụtọ maka otú anyị si hụ ụmụnna anyị n’anya. Naanị ya nwere ike ime ka ha mata na ha achọtala eziokwu. Jizọs sịrị: “Ọ bụrụ na unu hụrụ ibe unu n’anya, mmadụ niile ga-eji ya mata na unu bụ ndị na-eso ụzọ m.” (Jọn 13:35) Legodị akụkọ otu nwaanyị aha ya bụ Chaithra. Ọ na-aga mahadum mgbe ya na Ndịàmà Jehova na-amụ ihe. O kwetara ịga mgbakọ ukwu a kpọrọ ya. Mgbe ọ gachara n’ụbọchị nke mbụ, ọ gwara onye na-amụrụ ya Baịbụl, sị: “Nne na nna m amakụtụbeghị m. Mana ná mgbakọ unu, mmadụ iri ise na abụọ makụrụ m naanị n’otu ụbọchị. O mere ka m mata na Jehova ji ndị ya na-egosi m na ọ hụrụ m n’anya. Achọrọ m iso n’ezinụlọ a.” Chaithra nọ na-amụ ihe, na-emekwa mgbanwe ndị o kwesịrị ime. O mere baptizim n’afọ 2024. N’eziokwu, ndị ọhụrụ hụ ọrụ ọma ndị anyị na-arụ, nke ịhụ ibe anyị n’anya so na ya, ọ na-emekarị ka ha chọọ ife Jehova.—Mat. 5:16.
6. Olee otú anyị na ụmụnna anyị ịdị n’ezigbo mma si echebe anyị?
6 Anyị na ibe anyị ịdị n’ezigbo mma nwere ike ichebe anyị. Pọl gwara Ndị Kraịst ibe ya, sị: “Na-agbanụ ibe unu ume kwa ụbọchị . . . ka onye ọ bụla n’ime unu wee ghara ikwe ka ike dị aghụghọ nke mmehie mee ka obi ya kpọchie.” (Hib. 3:13) Ọ bụrụ na obi adaa anyị mbà nke na ọ na-esiziri anyị ike ime ihe dị mma, Jehova nwere ike ime ka nwanna chọpụtara ya nyere anyị aka. (Ọma 73:2, 17, 23) Ụdị enyemaka a na-abara anyị ezigbo uru.
7. Gịnị jikọrọ ịhụnanya na ịdị n’otu? (Ndị Kọlọsi 3:13, 14)
7 Anyị bụ́ ndị Jehova na-agbasi mbọ ike ịhụ ibe anyị n’anya. N’ihi ya, Jehova si n’ọtụtụ ụzọ na-agọzi anyị. (1 Jọn 4:11) Dị ka ihe atụ, ịhụnanya na-eme ka anyị ‘na-ediri ibe anyị ihe.’ Ọ na-emekwa ka anyị na ụmụnna anyị dịrị n’otu. (Gụọ Ndị Kọlọsi 3:13, 14; Efe. 4:2-6) N’ihi ya, e nweghị ndị ọzọ nọ n’ụwa na-enwe ụdị obi ụtọ anyị na-enwe ma anyị zukọọ ife Jehova.
NA-ASỌPỤRỤNỤ IBE UNU
8. Olee otú Jehova si enyere anyị aka ka anyị na ụmụnna anyị na-adị n’otu?
8 Otú anyị na ụmụnna anyị si dịrị n’otu n’ụwa niile bụ ọrụ ebube. Jehova mere ka o nwee isi n’agbanyeghị ezughị okè anyị. (1 Kọr. 12:25) Baịbụl kwuru na ‘Chineke na-akụziri anyị ka anyị na-ahụ ibe anyị n’anya.’ (1 Tesa. 4:9) Ihe ọ pụtara bụ na Jehova ji Baịbụl na-agwa anyị ihe anyị kwesịrị ime ka anyị na ụmụnna anyị dịrịkwuo ná mma. “Chineke na-akụziri” anyị ihe ma anyị na-amụ Baịbụl nke ọma ma na-eme ihe anyị na-amụta. (Hib. 4:12; Jems 1:25) Ọ bụkwa ihe Ndịàmà Jehova na-agbalị ime.
9. Gịnị ka anyị mụtara ná Ndị Rom 12:9-13 gbasara ịna-asọpụrụ ibe anyị?
9 Olee otú Okwu Chineke si akụziri anyị ka anyị na ibe anyị na-adịkwu ná mma? Legodị ihe Pọl kwuru gbasara okwu a ná Ndị Rom 12:9-13. (Gụọ ya.) Ị̀ hụrụ na ọ sịrị: “Na-ebunụ ụzọ asọpụrụ ndị ọzọ”? Gịnị ka ọ pụtara? Anyị kwesịrị ibu ụzọ na-enwere ndị ọzọ ọmịiko. Ụzọ ụfọdụ anyị ga-esi eme ya bụ ịna-agbaghara ha, ịna-ele ha ọbịa, nakwa ịna-emesapụrụ ha aka. (Efe. 4:32) Anyị ekwesịghị ịnọ na-eche ka nwanna anyị gbawa mbọ ka anyị na ya dịkwuo ná mma. Anyị nwere ike ‘ibu ụzọ’ mee ya. Anyị mee otú ahụ, anyị ga-ahụ na ihe Jizọs kwuru bụ eziokwu. Ọ sịrị: “A na-aka enwe obi ụtọ n’inye ihe karịa ka a na-enwe n’ịnara ihe.”—Ọrụ 20:35.
10. Olee otú anyị ga-esi na-agbasi mbọ ike ‘ịna-asọpụrụ ibe anyị’? (Kọwaakwa foto.)
10 Ọ dị mma na ozugbo Pọl gwachara anyị ka anyị buru ụzọ na-asọpụrụ ibe anyị, ọ gwara anyị ka anyị ‘na-arụsi ọrụ ike, gharakwa ịdị umengwụ.’ Onye na-arụsi ọrụ ike na-anụ ọkụ n’obi, ọ naghịkwa adị umengwụ. E nye ya ọrụ, ọ na-eji obi ya niile arụ ya. Ilu 3:27, 28 gwara anyị, sị: “Ajụla imere ndị i kwesịrị imere ihe ọma ihe ọma ma ọ bụrụ na i nwere ike inyere ha aka.” N’ihi ya, anyị hụ onye anyị kwesịrị inyere aka, ka anyị nyere ya aka ozugbo. Anyị anaghị egbu oge ma ọ bụ chewe na onye ọzọ ga-enyere ya aka.—1 Jọn 3:17, 18.
11. Gịnị nwere ike inyere anyị aka ka anyị na ibe anyị na-adịkwu ná mma?
11 Otú ọzọ anyị nwere ike isi na-asọpụrụ ndị ọzọ bụ ịna-agbaghara ha ngwa ngwa ma ha mejọọ anyị. Ndị Efesọs 4:26 sịrị: “Unu anọkwala na-ewe iwe ruo mgbe anyanwụ dara.” N’ihi gịnị? Amaokwu nke 27 kwuru na ime otú ahụ ‘ga-enye Ekwensu ohere.’ Jehova si n’Okwu ya gwa anyị ugboro ugboro ka anyị na-agbaghara ibe anyị. Ndị Kọlọsi 3:13 gwara anyị ka anyị ‘na-agbaghara ibe anyị kpamkpam.’ Ịgbaghara ndị ọzọ ma ha mejọọ anyị bụ otu n’ime ụzọ ndị kacha mma anyị na ha si adịkwu ná mma. Anyị mee otú ahụ, anyị ‘na-eme ka anyị na-adị n’otu otú mmụọ nsọ mere ka anyị dịrị.’ (Efe. 4:3) O doro anya na ịgbaghara ndị ọzọ nwere ike ime ka ọgbakọ dịkwuo n’otu, udo adịkwa.
12. Olee otú Jehova si enyere anyị aka ịna-agbaghara ndị ọzọ?
12 Nke bụ́ eziokwu bụ na o nwere ike isiri anyị ike ịgbaghara ndị mejọrọ anyị. Ma, mmụọ nsọ Chineke ga-enyere anyị aka ịgbaghara ha. Mgbe Baịbụl gwara anyị ka anyị ‘na-enwere ibe anyị ọmịiko,’ nakwa ka anyị ‘na-arụsi ọrụ ike,’ ọ gwakwara anyị ‘ka mmụọ Chineke mee ka anyị na-anụ ọkụ n’obi.’ Ọ pụtara na mmụọ nsọ Chineke nwere ike ime ka anyị na-anụ ọkụ n’obi, jirikwa obi anyị niile na-ejere Chineke ozi. (Rom 12:11) N’ihi ya, mmụọ nsọ Chineke nwere ike inyere anyị aka ịna-enwere ibe anyị ọmịiko ma na-agbaghara ha kpamkpam. Ọ bụ ya mere anyị kwesịrị iji si n’obi anyị niile na-arịọ Jehova ka o nyere anyị aka.—Luk 11:13.
“KA UNU GHARAKWA ỊNA-AKPA ICHE ICHE”
13. Gịnị nwere ike ịkpata nkewa n’ọgbakọ?
13 N’ọgbakọ, e nwere “ụdị mmadụ niile” si n’ebe dị iche iche. (1 Tim. 2:3, 4) N’ihi ya, ihe na-amasị anyị nwere ike ịdị iche iche, dị ka ụdị uwe anyị ga-eyi na otú anyị chọrọ ịna-adị, okwu gbasara ahụ́ ike ma ọ bụ ihe ndị anyị ji eme onwe anyị obi ụtọ. Ma anyị akpacharaghị anya, ihe ndị a nwere ike ịkpata nkewa. (Rom 14:4; 1 Kọr. 1:10) Ebe ọ bụ na Chineke akụzierela anyị ka anyị na-ahụ ibe anyị n’anya, anyị kwesịrị ịkpachara anya ka anyị ghara ịna-esi ọnwụ na ihe anyị họọrọ ime banyere ihe mmadụ kwesịrị ikpebiri onwe ya ka nke ndị ọzọ họọrọ mma.—Fil. 2:3.
14. Gịnị ka anyị kwesịrị ịna-agba mbọ na-eme? Maka gịnị?
14 Anyị nwekwara ike ime ka nkewa ghara ịdị n’ọgbakọ ma ọ bụrụ na anyị ejisie ike na-agwa ndị ọzọ okwu ọma mgbe niile. (1 Tesa. 5:11) Na nso nso a, ọtụtụ ndị kwụsịrịla ịga ọmụmụ ihe na ozi ọma ma ọ bụkwanụ ndị e kewapụrụ n’ọgbakọ alọghachila. Anyị ji obi anyị niile na-anabata ha. (2 Kọr. 2:8) Legodị otú e si meso otu nwanna nwaanyị mgbe ọ bịara n’Ụlọ Nzukọ Alaeze mgbe ọ kwụsịrịla ịga ozi ọma na ọmụmụ ihe ruo afọ iri. Ọ sịrị: “Onye ọ bụla mụmụụrụ m ọnụ ọchị ma kwe m n’aka.” (Ọrụ 3:19) Gịnị ka ihe a yiri obere ihe mere ka o mee? Ọ sịrị: “O mere ka ọ dị m ka Jehova ọ̀ na-enyere m aka inwewekwa obi ụtọ.” Ọ bụrụ na anyị ana-agwa mmadụ niile okwu ọma, Jizọs nwere ike iji anyị mee ka ‘ndị na-arụgbu onwe ha n’ọrụ, ndị e bokwara ibu dị arọ,’ nweta ume.—Mat. 11:28, 29.
15. Olee otú ọzọ anyị nwere ike isi mee ka ọgbakọ dị n’otu? (Kọwaakwa foto.)
15 Ụzọ ọzọ anyị nwere ike isi na-eme ka udo dị n’ọgbakọ bụ n’ihe ndị anyị na-ekwu. Job 12:11 sịrị: “Ọ̀ bụ na ntị anaghị atụle okwu otú ire si amata otú nri na-atọ?” Onye na-esi nri na-abụ o sitụ, ya edetụ ya ọnụ ka o jide n’aka na ọ na-atọ ụtọ tupu ya enye ya ndị ọzọ. Anyị kwesịkwara ịna-eche ihe anyị chọrọ ikwu eche tupu anyị ekwuo ya. (Ọma 141:3) Ihe kwesịrị ịbụ mkpa anyị mgbe niile bụ ijide n’aka na ihe anyị chọrọ ikwu ga-agba ụmụnna ume, mee ka ha nweta ume, ‘baakwara ndị nụrụ ya uru.’—Efe. 4:29.
16. Ole ndị karịchaa kwesịrị ịna-ekwu okwu na-agba ume?
16 Ndị di na ndị nne na nna kwesịrị ịkacha kpachara anya ka ha na-ekwu ihe ndị na-agba ume. (Kọl. 3:19, 21; Taị. 2:4) Ndị okenye kwesịkwara ịna-eme ka atụrụ Jehova nweta ume, na-akasikwa ha obi. (Aịza. 32:1, 2; Gal. 6:1) Otu ilu dị na Baịbụl gwara anyị, sị: “Okwu e kwuru mgbe kwesịrị ekwesị na-adịkwa ezigbo mma.”—Ilu 15:23.
NA-AHỤ ỤMỤNNA GỊ N’ANYA “N’OMUME NAKWA N’EZIOKWU”
17. Olee otú anyị ga-esi jide n’aka na anyị si n’obi anyị hụ ụmụnna anyị n’anya?
17 Jọn onyeozi gwara anyị na “anyị kwesịrị ịhụ ụmụnna anyị n’anya, ọ bụghị n’okwu ọnụ ma ọ bụ n’ire, kama n’omume nakwa n’eziokwu.” (1 Jọn 3:18) Anyị chọrọ isi n’obi anyị na-ahụ ụmụnna anyị n’anya. Olee otú anyị nwere ike isi eme ya? Ọ bụrụ na anyị ana-ewepụtakwu oge ka anyị na ụmụnna anyị na-anọrị, anyị na ha ga na-adịkwu ná mma, anyị ana-ahụkwu ha n’anya. N’ihi ya, gbalịa wepụta oge ka gị na ụmụnna gị na-anọ ma n’ọmụmụ ihe ma n’ozi ọma. Wepụta oge na-aga eleta ha. Anyị mee otú ahụ, anyị na-egosi na ‘Chineke na-akụziri anyị ka anyị na-ahụ ibe anyị n’anya.’ (1 Tesa. 4:9) Anyị ga-esikwa otú ahụ chọpụta na “ọ bụ ihe dị mma, bụrụkwa ihe na-eme obi ụtọ ma ụmụnne bikọta ọnụ ma dịrị n’otu.”—Ọma 133:1.
ABỤ NKE 90 Ka Anyị Na-agbarịta Ibe Anyị Ume