ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 32
ABỤ NKE 44 Ekpere Onye Ọ Na-enweghị Ka Ọ Hà Ya
Jehova Chọrọ Ka Mmadụ Niile Chegharịa
“O nweghị onye [Jehova] chọrọ ka e bibie, kama ọ chọrọ ka mmadụ niile chegharịa.”—2 PITA 3:9.
IHE A GA-AMỤ
Isiokwu a ga-enyere anyị aka ịghọta ihe nchegharị bụ, ihe mere o ji dị mkpa, nakwa otú Jehova si enyere ụdị mmadụ niile aka ichegharị.
1. Gịnị ka onye chegharịrị echegharị na-eme?
ANYỊ mee ihe ọjọọ, anyị kwesịrị ichegharị. Na Baịbụl, mmadụ chegharịa, ọ na-agbanwe echiche ya gbasara ihe ọjọọ ahụ o mere, kwụsị ime ya, kpebisiekwa ike na ọ gaghị eme ya ọzọ.—Gụọ Nkọwa Okwu Ndị Dị na Baịbụl, “Nchegharị.”
2. Olee ihe anyị niile kwesịrị ịmụta gbasara nchegharị? (Nehemaya 8:9-11)
2 Mmadụ ọ bụla dị ndụ kwesịrị ịmụ gbasara nchegharị. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na anyị niile na-emehie kwa ụbọchị. Ebe anyị bụ ụmụ Adam na Iv, onye ọ bụla n’ime anyị ketara mmehie na ọnwụ. (Rom 3:23; 5:12) E nweghị onye a gụpụrụ. Ụmụ nwoke ndị okwukwe ha siri ezigbo ike, dị ka Pọl onyeozi, gbasidịrị mbọ ike ka ha lụso mmehie ọgụ. (Rom 7:21-24) Ihe a ọ̀ pụtara na obi kwesịrị ịna-ajọ anyị njọ mgbe niile n’ihi mmehie anyị? Mba. Jehova dị obi ebere. Ọ chọkwara ka obi na-atọ anyị ụtọ. Ka anyị lee ihe mere ndị Juu n’oge Nehemaya. (Gụọ Nehemaya 8:9-11.) Jehova achọghị ka akọnuche ha na-apịa ha ụtarị maka mmehie ha mere n’oge gara aga. Kama, ọ chọrọ ka ha jiri obi ụtọ na-efe ya. Jehova ma na ọ bụrụ na mmadụ echegharịa, ọ na-eme ka onye ahụ nwee obi ụtọ. N’ihi ya, ọ na-akụziri anyị gbasara ya. Anyị chegharịa ná mmehie anyị, obi ga-esi anyị ike na Nna anyị nke eluigwe na-eme ebere ga-agbaghara anyị.
3. Gịnị ka anyị ga-amụ n’isiokwu a?
3 Ka anyị mụkwuo gbasara nchegharị. N’isiokwu a, anyị ga-atụle ihe atọ. Nke mbụ bụ ihe Jehova kụziiri ndị Izrel gbasara nchegharị. Nke abụọ bụ otú Jehova si enyere ndị mmehie aka ka ha chegharịa. Nke atọ abụrụ ihe Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya gbasara nchegharị.
IHE JEHOVA KỤZIIRI NDỊ IZREL GBASARA NCHEGHARỊ
4. Gịnị ka Jehova kụziiri ndị Izrel gbasara nchegharị?
4 Mgbe Jehova mere ka ndị Izrel ghọọ mba, ya na ha gbara ndụ. Ọ bụrụ na ha edebe iwu ya, ọ ga-echebe ha ma gọzie ha. Ọ gwara ha gbasara iwu ya, sị: “Iwu a m na-enye unu taa esighịrị unu oké ike, ọ dịghịkwa n’ebe aka unu na-agaghị eru.” (Diut. 30:11, 16) Ma, ọ bụrụ na ha enupụrụ ya isi, dị ka ihe atụ, ha fewe arụsị, ọ gaghịzi agọzi ha. Ha ga-atakwa ahụhụ. N’agbanyeghị ya, ha na Chineke nwere ike ịdịghachi ná mma. Ha nwere ike ‘ịlọghachikwute Jehova bụ́ Chineke ha ma gewe ntị n’olu ya.’ (Diut. 30:1-3, 17-20) Ọ pụtara na ha ga-echegharịli. Ọ bụrụ na ha echegharịa, Jehova ga-eme ka ha na ya dịrị ná mma ọzọ, gọziwekwa ha.
5. Olee otú Jehova si gosi na ọ hapụghị ndị ya? (2 Ndị Eze 17:13, 14)
5 Ndị Izrel nupụụrụ Jehova isi ọtụtụ ugboro. Ha kpeere arụsị, meekwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ jọgburu onwe ha. Ihe a mere ka ha taa ahụhụ. Mana, Jehova ahapụghị ndị ya na-akpa àgwà ọjọọ. O zigaara ha ndị amụma ya ugboro ugboro ka ọ gbaa ha ume ka ha chegharịa ma lọghachikwute ya.—Gụọ 2 Ndị Eze 17:13, 14.
6. Olee otú Jehova si jiri ndị amụma ya kụziere ndị ya ihe mere o ji dị mkpa ka ha chegharịa? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)
6 Ọtụtụ mgbe, Jehova na-eji ndị amụma ya adọ ndị ya aka ná ntị ma na-agbazi ha. Dị ka ihe atụ, Chineke si n’aka Jeremaya gwa ndị ya, sị: “Izrel, onye na-enupụrụ m isi, lọghachi . . . Agaghị m ewesa gị iwe, n’ihi na ana m akwụsi ike n’ihe m kwuru. Agaghị m ebu iwe n’obi ruo mgbe ebighị ebi. Ma kweta na i mehiere, n’ihi na i nupụrụla Jehova bụ́ Chineke gị isi.” (Jere. 3:12, 13) Jehova sikwa n’ọnụ onye amụma bụ́ Joel gwa ndị ya, sị: “Jirinụ obi unu niile lọghachikwute m.” (Joel 2:12, 13) O mere ka Aịzaya kwuo, sị: “Dowenụ onwe unu ọcha. Kwụsịnụ omume ọjọọ unu nọ n’ihu m eme. Kwụsịnụ ime ihe ọjọọ.” (Aịza. 1:16-19) O sikwa n’ọnụ Ezikiel jụọ ha, sị: “Ọ̀ na-atọ m ụtọ ka onye ajọ omume nwụọ? Ihe na-atọ m ụtọ ọ́ bụghị ka ọ hapụ ihe ọjọọ ọ na-eme wee dịrị ndụ na-aga? . . . Ọ naghị atọ m ụtọ ka onye ọ bụla nwụọ. N’ihi ya, chegharịanụ ka unu wee dịrị ndụ na-aga.” (Ezik. 18:23, 32) Obi na-atọgbu Jehova atọgbu ma ọ hụ ka ndị mmadụ chegharịrị n’ihi na ọ chọrọ ka ha dịrị ndụ ebighị ebi. N’ihi ya, ihe Jehova na-eme abụghị ịnọ na-eche ka ndị mere mmehie chegharịa tupu ya enyewere ha aka. Ka anyị hụ ihe atụ ndị ọzọ gosiri ya.
7. Olee ihe Jehova ji akụkọ Hosia onye amụma na nwunye ya kụziere ndị ya?
7 Ka anyị lee ihe Jehova ji otu ihe mere eme kụziere ndị ya, ya bụ, ihe Goma nwunye Hosia onye amụma mere. Mgbe Goma kwachara iko, ọ hapụrụ Hosia sowe ụmụ nwoke ndị ọzọ. Ihe a ò gosiri na ọ gaghị echegharịli? Jehova bụ́ onye na-enyocha obi gwara Hosia, sị: “Gaghachi hụ nwunye gị n’anya, onye nwoke ọzọ hụrụ n’anya na onye na-akwa iko. Hụ ya n’anya otú Jehova si hụ ndị Izrel n’anya mgbe ha na-agakwuru chi ọzọ dị iche iche.” (Hos. 3:1; Ilu 16:2) Chetakwa na nwunye Hosia ka nọ na-eme mmehie dị oké njọ. N’agbanyeghị ya, Jehova gwara Hosia ka ọ gakwuru ya, gbaghara ya ma gwa ya ka ya na ya kpezie ka ọ bụrụkwa nwunye ya. a Jehova ji ihe atụ a na-akụziri ndị ya otú obi dị ya gbasara ha. Ọ bụ eziokwu na ha ka na-eme ihe ọjọọ, ọ hụrụ ha n’anya ma na-eziga ndị amụma ya ka o nyere ha aka ka ha chegharịa ma gbanwee ụzọ ha. Ihe a ọ̀ pụtara na Jehova bụ́ onye “na-enyocha obi” ga-enyere onye ka na-eme mmehie dị oké njọ aka ka o chegharịa? (Ilu 17:3) Ka anyị chọpụta.
OTÚ JEHOVA SI ENYERE NDỊ MMEHIE AKA KA HA CHEGHARỊA
8. Olee otú Jehova si gbalịa inyere Ken aka ka o chegharịa? (Jenesis 4:3-7) (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)
8 Ken bụ nwa mbụ Adam na Iv mụrụ. O ketakwara mmehie n’aka nne na nna ya. Ma, Ken alụsoghị mmehie ahụ o ketara ọgụ. Baịbụl kwuru gbasara ya, sị: “Ọrụ ya jọrọ njọ.” (1 Jọn 3:12) Ọ ga-abụ na ihe a kọwara ihe mere na Jehova ‘eleghị Ken na onyinye ya anya ọma’ mgbe ọ chụụrụ ya àjà. Kama Ken ịgbanwe ụzọ ya, ‘o were ezigbo iwe ma gbarụọ ihu.’ Olee ihe ọzọ Jehova mere? Ọ gwara Ken okwu. (Gụọ Jenesis 4:3-7.) Ị̀ chọpụtara na Jehova medara obi gwa Ken na ọ ga-agọzi ya ma o mewe ihe ọma, gwakwa ya nsogbu iwe iwe nwere ike ịkpatara ya? Ọ dị mwute na Ken egeghị Jehova ntị. O kweghị ka Jehova nyere ya aka ichegharị. Mgbe Ken mechara ihe a, Jehova ọ̀ kwụsịrị inyere ndị mmehie ndị ọzọ aka ka ha chegharịa? Mba.
9. Olee otú Jehova si nyere Devid aka ichegharị?
9 Jehova hụrụ Eze Devid n’anya nke ukwuu. Ọ kpọdịrị ya “nwoke obi m nabatara.” (Ọrụ 13:22) Ma Devid mere mmehie dị oké njọ, dị ka ịkwa iko na igbu mmadụ. Iwu Mosis gosiri na e kwesịrị igbu Devid maka ihe ahụ o mere. (Lev. 20:10; Ọnụ Ọgụ. 35:31) N’agbanyeghị ya, Jehova chọrọ inyere Devid aka ka o chegharịa. b O zigara onye amụma ya bụ́ Netan ka ọ gakwuru eze, ọ bụ eziokwu na e nwebeghị ihe ọ bụla Devid mere gosiri na o chegharịala. Netan ji ihe atụ nyere Devid aka ịghọta na o meela mmehie dị ezigbo njọ. Ihe a mere ka Devid chegharịa. (2 Sam. 12:1-14) O dere abụ ọma na-emetụ n’obi iji gosi na ya echegharịala. (Okwu mmeghe Abụ Ọma 51) Abụ ọma a akasiela ọtụtụ ndị mere mmehie obi, nyekwara ha aka ichegharị. Ọ̀ bụ na obi adịghị anyị ụtọ na Jehova weturu obi nyere ohu ya ọ hụrụ n’anya bụ́ Devid aka ichegharị?
10. Olee otú obi dị gị gbasara otú Jehova si enwe ndidi ma na-agbaghara ndị mmehie?
10 Jehova kpọrọ mmehie asị, ọ naghịkwa akwado ụdị ya ọ bụla. (Ọma 5:4, 5) Ma, ọ ma na anyị niile bụ ndị mmehie. Ebe ọ bụ na ọ hụrụ anyị n’anya, ọ chọrọ inyere anyị aka ịlụso mmehie ọgụ. Ọ na-agbalịdị mgbe niile ịna-enyere onye kacha mee mmehie aka ichegharị ka ya na ya dịrịkwa ná mma. Ihe a na-akasi anyị obi. Ka anyị na-eche banyere otú Jehova si enwere ndị mmadụ ndidi nakwa otú o si agbaghara mmehie, anyị na-ekpebisi ike iji obi anyị niile na-efe ya ma chegharịa ozugbo anyị mehiere. Ka anyị lee otú e si kụziere ọgbakọ Ndị Kraịst gbasara nchegharị.
IHE NDỊ NA-ESO ỤZỌ JIZỌS MỤTARA GBASARA NCHEGHARỊ
11-12. Gịnị ka Jizọs kụziiri ndị mmadụ gbasara otú Nna ya si agbaghara mmehie? (Kọwaa foto.)
11 Oge ruru ka a mata onye bụ́ Mezaya. Dị ka e kwuru n’isiokwu bu nke a ụzọ, Jehova ji ma Jọn Onye Na-eme Baptizim ma Jizọs Kraịst kụziere ndị mmadụ na nchegharị dị ezigbo mkpa.—Mat. 3:1, 2; 4:17.
12 N’oge niile Jizọs jere ozi ya n’ụwa, ọ kụziiri ndị mmadụ gbasara otú Nna ya si agbaghara mmehie. Jizọs mere ka o doo ezigbo anya mgbe ọ kọrọ akụkọ nwa mmefu. Nwa okorobịa ahụ kpebiri ịpụ n’ụlọ ha, gaa mewe ihe ndị dị ezigbo njọ. Ma “mgbe anya doro ya,” ọ lọtara. Gịnị ka nna ya mere? Jizọs kwuru na mgbe nwa ahụ “ka nọ ebe dị anya, nna ya hụrụ ya ma metere ya ebere. O wee gbara ọsọ gaa makụọ ya ma jiri nwayọọ susuo ya ọnụ.” Nwa ya nwoke ahụ bu n’obi na ọ ga-agwa nna ya ka o were ya ka ohu na-arụrụ ya ọrụ n’ụlọ. Mana nna ya kpọrọ ya “nwa m nwoke a” ma mee ka ọ bụrụkwa onye ezinụlọ ya. Nna ya sịrị: ‘O furu efu, ma a hụla ya.’ (Luk 15:11-32) Mgbe Jizọs bi n’eluigwe tupu ya abịa n’ụwa, ọ hụrụ otú Nna ya si metere ọtụtụ ndị mmehie a na-agaghị agụtali ọnụ chegharịrị ụdị ebere ahụ. Akụkọ a Jizọs kọrọ na-akasi anyị obi ma na-egosi na Nna anyị bụ́ Jehova na-eme ebere.
13-14. Olee ihe Pita si n’ihe mere ya mụta gbasara nchegharị? Gịnịkwa ka ọ kụziiri ndị ọzọ gbasara ya? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)
13 Pita onyeozi mụtara ọtụtụ ihe n’aka Jizọs gbasara nchegharị na ịgbaghara mmehie. E nwere ọtụtụ ugboro Pita mejọrọ ihe. Jizọs gbaghakwaara ya. Dị ka ihe atụ, mgbe Pita gọnahụrụ Onyenwe ya ugboro atọ, obi gbawara ya. (Mat. 26:34, 35, 69-75) Ma, mgbe a kpọlitechara Jizọs n’ọnwụ, ọ pụtara n’ihu Pita. Ọ ga-abụ n’ebe ndị ọzọ na-anọghị. (Luk 24:33, 34; 1 Kọr. 15:3-5) O doro anya na n’oge ahụ, Jizọs medara obi mee ka obi sie onye na-eso ụzọ ya a chegharịrị echegharị ike na ọ gbagharala ya.
14 Pita si n’ihe mere ya ghọta ihe nchegharị na mgbaghara pụtara. N’ihi ya, ọ kụziiri ndị ọzọ ihe ọ mụtara. Mgbe e mechara ememme Pentikọst, oge ụfọdụ agaa, Pita gwara ìgwè mmadụ bụ́ ndị Juu na-abụghị Ndị Kraịst okwu. Ọ kọwaara ha na ha gburu Mezaya. N’agbanyeghị ya, ọ gbara ha ume, sị: “N’ihi ya, chegharịanụ, lọghachikwutekwanụ Jehova ka o wee hichapụ mmehie unu, meekwa ka obi ruo unu ala.” (Ọrụ 3:14, 15, 17, 19) Pita si otú ahụ gosi na onye mmehie chegharịa, ọ na-agbanwe echiche ọjọọ ya na omume ọjọọ ya, biwezie ndụ ọhụrụ nke na-amasị Chineke. Pita gosikwara na Jehova ga-ehichapụ mmehie ha, mee ka a ghara ịhụkwa ya. Mgbe ọtụtụ afọ gachara, Pita mere ka obi sie Ndị Kraịst ike. Ọ sịrị ha: “Jehova . . . na-enwere unu ndidi n’ihi na o nweghị onye ọ chọrọ ka e bibie, kama ọ chọrọ ka mmadụ niile chegharịa.” (2 Pita 3:9) Ihe a na-eme ka Ndị Kraịst nwee olileanya ma ha mee mmehie, ọ bụrụgodị mmehie dị oké njọ.
15-16. (a) Olee otú Pọl onyeozi si mụta gbasara mgbaghara? (1 Timoti 1:12-15) (b) Gịnị ka anyị ga-ekwu gbasara ya n’isiokwu na-eso nke a?
15 Pọl onye Tasọs mere ọtụtụ ihe ọjọọ. O chiri Ndị Kraịst ọnụ n’ala. Ọ ga-abụ na ọtụtụ Ndị Kraịst chere na o nweghị ike ichegharị. N’agbanyeghị ya, Jizọs ma na Sọl nwere ike ịgbanwe ma chegharịa. Ya na Nna ya hụrụ ihe dị mma n’ime Sọl. Jizọs sịrị: “Ahọrọla m nwoke a.” (Ọrụ 9:15) Jizọs rụdịrị ọrụ ebube iji nyere Sọl aka ichegharị. (Ọrụ 7:58–8:3; 9:1-9, 17-20) Sọl mechara zawa Pọl. Mgbe ọ ghọrọ Onye Kraịst, o kwuru ọtụtụ ugboro otú obi si atọ ya ụtọ maka na e gosiri ya obiọma ma meere ya ebere. (Gụọ 1 Timoti 1:12-15.) Pọl gwara ụmụnna ya na Chineke ‘na-achọ inyere ha aka ka ha chegharịa maka na ọ dị obiọma.’—Rom 2:4.
16 E nwere mgbe Pọl nụrụ na ọgbakọ dị na Kọrịnt hapụrụ otu nwoke na-akwa iko ka ọ ka nọrọ n’ọgbakọ. Gịnị ka Pọl gwara ha ka ha mee? Anyị si n’ihe ọ gwara ha mụta na Jehova na-adọ ndị na-efe ya aka ná ntị otú gosiri na ọ hụrụ ha n’anya ma na-emere ha ebere ma ha chegharịa. Anyị ga-amụtakwa otú anyị ga-esi na-eme ebere ka ya. N’isiokwu na-eso nke a, anyị ga-ekwu gbasara ihe mere n’ọgbakọ ahụ dị na Kọrịnt.
ABỤ NKE 33 Tụkwasị Jehova Ibu Gị
a Ihe mere n’akụkọ a pụrụ iche. Taa, Jehova enyeghị iwu na ọ bụrụ na di ma ọ bụ nwunye mmadụ akwaa iko, onye nke ahụ aka ya dị ọcha ka ga na-alụ ya. Jehova sidị n’aka Ọkpara ya bụ́ Jizọs Kraịst kwuo na ọ bụrụ na onye nke ahụ aka ya dị ọcha chọrọ, o nwere ike ịgba di ya ma ọ bụ nwunye ya ahụ kwara iko alụkwaghịm.—Mat. 5:32; 19:9.
b Gụọ isiokwu bụ́ “Olee Otú Ị Ga-esi Rite Uru n’Otú Jehova Si Agbaghara Mmehie?” n’Ụlọ Nche Nọvemba 15, 2012, peeji nke 21 ruo na nke 23, paragraf nke 3 ruo na nke 10.