ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ 43
Na-efe Naanị Jehova
“Jehova bụ Chineke nke chọrọ ofufe a na-ekewaghị ekewa.”—NEHỌ. 1:2.
ABỤ NKE 51 Anyị Nyefere Chineke Onwe Anyị
IHE ISIOKWU A NA-EKWU *
1. Olee ihe mere anyị ji kwesị ịna-efe naanị Jehova?
ANYỊ kwesịrị ịna-efe naanị Jehova n’ihi na ọ bụ ya kere anyị, meekwa ka anyị dịrị ndụ. (Mkpu. 4:11) Ma, e nwere ihe na-eme ka o siere anyị ike. Ọ bụrụgodị na anyị hụrụ Jehova n’anya ma na-asọpụrụ ya, ihe ndị ọzọ nwere ike ime ka anyị ghara ịhụ ya n’anya otú o kwesịrị, gharakwa ịna-efe naanị ya. Anyị kwesịrị ịmata otú ụdị ihe ahụ nwere ike isi mee anyị. Ma, ka anyị burugodị ụzọ leba anya n’ihe ife naanị Jehova pụtara.
2. Dị ka e kwuru n’Ọpụpụ 34:14, gịnị ka anyị ga-eme ma ọ bụrụ na anyị na-efe naanị Jehova?
2 Ihe Baịbụl kwuru gosiri na ọ bụ iji obi anyị niile hụ Jehova n’anya ga-eme ka anyị na-efe naanị ya. Anyị agaghị ahụ onye ọ bụla ma ọ bụ ihe ọ bụla n’anya karịa ya.—Gụọ Ọpụpụ 34:14.
3. Olee ezigbo ihe mere anyị ji hụ Jehova n’anya?
3 E nwere ezigbo ihe mere anyị ji hụ Jehova n’anya. Gịnị ka ọ bụ? Ọ bụ ihe ndị anyị mụtarala gbasara ya. Àgwà ọma ndị o nwere na-amasị anyị. Anyị ma ihe na-adị ya mma na ihe na-anaghị adị ya mma. Ihe na-adị ya mma na-adịkwa anyị mma. Ihe na-anaghị adị ya mma anaghịkwa adị anyị mma. Anyị ghọtara ihe o bu n’obi kee ụmụ mmadụ, anyị na-emekwa ya. Obi dị anyị ụtọ na o kwere ka anyị na ya bụrụ enyi. (Ọma 25:14) Ihe niile anyị mụtara gbasara Onye kere anyị na-eme ka anyị na-abịa ya nso.—Jems 4:8.
4. (a) Olee ihe Ekwensu na-eji eme ka anyị ghara ịhụ naanị Jehova n’anya? (b) Gịnị ka anyị ga-eleba anya na ya n’isiokwu a?
4 Ọ bụ Ekwensu na-achị ụwa a. Ọ na-ejikwa ya eme ka ihe na-agụ ụmụ mmadụ agụụ bụrụ ihe kacha anyị mkpa ná ndụ, na-emekwa ka o siere anyị ike ịgbara ọchịchọ ọjọọ ọsọ. (Efe. 2:1-3; 1 Jọn 5:19) Mkpa ya bụ ka e nwee ihe ndị ọzọ anyị ga-ahụ n’anya ka anyị ghara ịhụ naanị Jehova n’anya. Ka anyị leba anya n’ụzọ abụọ o nwere ike isi mee ya. Nke mbụ bụ na ọ na-agbalị ime ka anyị chụwa akụnụba ọnwụ ọnwụ. Nke abụọ abụrụ na ọ na-agbalị ime ka anyị na-eji ihe na-adịghị mma na-atụrụ ndụ.
KPACHARA ANYA KA Ị GHARA ỊHỤ EGO N’ANYA
5. Gịnị mere anyị kwesịrị iji kpachara anya ka anyị ghara ịhụ ego n’anya?
5 Anyị niile chọrọ inwe ihe oriri ga-ezuru anyị, uwe dị mma, na ebe obibi dị mma. Ma, anyị ekwesịghị ịhụ ego n’anya. Ọtụtụ ndị taa “hụrụ ego n’anya,” hụkwa ihe e ji ya azụta n’anya. (2 Tim. 3:2) Jizọs maara na e nwere ike ịnwa ndị na-eso ụzọ ya ka ha hụ ego n’anya. Ọ gwara ha, sị: “Ọ dịghị onye pụrụ ịbụ ohu nke nna ukwu abụọ; n’ihi na, ma ọ́ bụghị na ọ ga-akpọ otu asị ma hụ onye nke ọzọ n’anya, ya abụrụ na ọ ga-arapara n’otu ma leda onye nke ọzọ anya. Unu apụghị ịbụ ndị ohu Chineke na nke Akụnụba.” (Mat. 6:24) Ọ bụrụ na onye na-efe Jehova ejiri oge karịrị akarị na-agbalị ịchụta akụnụba nke ụwa a, e nwere ike ikwu na onye ahụ chọrọ ịbụ ohu nna ukwu abụọ. Ọ pụtara na ọ naghị efe naanị Jehova.
6. Gịnị ka anyị mụtara n’ihe Jizọs gwara ọgbakọ dị na Leodisia?
6 Tupu afọ 100, ndị nọ n’ọgbakọ dị na Leodisia kwuru, sị: “Abara m ọgaranya, enwetawokwa m akụnụba, ọ dịghịkwa ihe na-akpa m ma ọlị.” Ma, Jehova na Jizọs hụrụ na ha nọ ‘ná nhụsianya, bụrụkwa ndị e kwesịrị imere ebere nakwa ndị dara ogbenye na ndị kpuru ìsì na ndị gba ọtọ.’ Ihe mere Jizọs ji baara ha mba abụghị na ha bara ọgaranya, kama ọ bụ maka na ịhụ akụnụba n’anya emeela ka ha na Jehova ghara Mkpu. 3:14-17) Anyị chọpụta na ọ gụwala anyị agụụ ibido chụwa akụnụba ọnwụ ọnwụ, anyị kwesịrị ime ngwa ngwa wepụ ya n’obi anyị. (1 Tim. 6:7, 8) Ma ọ́ bụghị ya, anyị agaghịzi eji obi anyị niile hụ Jehova n’anya, nke ga-eme ka Jehova jụ ofufe anyị. Jehova “chọrọ ofufe a na-ekewaghị ekewa.” (Diut. 4:24) Olee otú ego nwere ike isi ghọọ ihe kacha anyị mkpa ná ndụ?
ịdị ná mma. (7-9. Gịnị ka ị mụtara n’ihe otu okenye aha ya bụ David mere?
7 Chegodị gbasara otu okenye na-arụsi ọrụ ike bi n’Amerịka aha ya bụ David. O kwuru na ya ejighị ọrụ ya egwu egwu. Ụlọ ọrụ ọ na-arụrụ ọrụ buliri ya n’ọkwá, tinyekwuoro ya ego n’ụgwọ ọnwa ya, ya esorokwa ná ndị a kacha akwanyere ùgwù n’ụdị ọrụ ahụ n’obodo ha. David kwuru, sị: “Mgbe ahụ, m chere na ihe ọma ndị a pụtara na Jehova agọziela m.” Ma, hà bụ ngọzi Jehova n’eziokwu?
8 David bidoro ịhụ ihe na-egosi na ọrụ ahụ akpawala adịm ná mma ya na Jehova aka ọjọọ. Ọ sịrị: “M nọrọ n’ọmụmụ ihe ma ọ bụ n’ozi ọma, uche m na-adị ná nsogbu m nwere n’ụlọ ọrụ. Ọ bụ eziokwu na m na-arụta ego buru ibu, obi anaghị ezu m ike. Mụ na nwunye m bidokwara ise okwu.”
9 David ghọtara na ya kwesịrị ikpebi ihe kacha ya mkpa. Ọ sịrị: “M kpebisiri ike na m ga-agbanwe.” David chọrọ ịhazigharị oge o ji arụ ọrụ. N’ihi ya, ọ gwara onye were ya n’ọrụ ihe ọ chọrọ ime. Gịnịzi mere? A chụrụ ya n’ọrụ. Gịnịzi ka o mere? David sịrị: “Echi ya, m dejupụtara akwụkwọ na m chọrọ ịbụ ọsụ ụzọ inyeaka n’akwụsịghị akwụsị.” Mat. 6:31-33.
David na nwunye ya bidoro ihichara ndị mmadụ ụlọ ka ha nwee ike ịna-akpata ihe ha ga-eri. Mgbe obere oge gara, o bidoro ịsụ ụzọ oge niile, nwunye ya emechaakwa soro ya bụrụ ọsụ ụzọ oge niile. Nwanna a na nwunye ya kpebiri ịna-arụ ụdị ọrụ ndị mmadụ na-eleda anya. Ma ihe kacha ha mkpa abụghị ụdị ọrụ ha na-arụ. E kee ego ha na-akpatabu ụzọ iri, ihe ha na-enwetazi ugbu a bụ naanị otu ụzọ. Ma n’ọnwa ọ bụla, ha na-enweta ihe na-ezuru ha. Ha chọrọ ka ofufe Jehova bụrụ ihe kacha ha mkpa. Ha jikwa anya ha hụ otú o si elekọta ndị bu ụzọ na-achọ Alaeze ya.—10. Olee otú anyị nwere ike isi chebe obi anyị?
10 Ma ànyị nwere ego ma ànyị enweghị, anyị kwesịrị ichebe obi anyị. Olee otú ị ga-esi eme ya? Ekwela ka ị hụwa akụnụba n’anya. Ekwela ka ọrụ gị dị gị mkpa karịa ozi ị na-ejere Jehova. Olee otú ị ga-esi mata ma ụdị ihe ahụ ò mewela gị? Ụfọdụ ajụjụ i nwere ike ịjụ onwe gị bụ: ‘M̀ na-echekarị gbasara ọrụ m ma m nọrọ n’ọmụmụ ihe ma ọ bụ n’ozi ọma? M̀ na-echegbukarị onwe m gbasara otú m ga-esi bụrụ aka ji akụ̀? Ego na ihe onwunwe ọ̀ na-eme ka mụ na nwunye m na-etinye ụkwụ n’otu traụza? M̀ ga-adị njikere ịrụ ọrụ ndị mmadụ na-eleda anya iji nwee ohere jekwuoro Jehova ozi?’ (1 Tim. 6:9-12) Mgbe anyị na-eche gbasara ajụjụ ndị a, ka anyị cheta na Jehova hụrụ anyị n’anya, kwekwa ndị ji obi ha niile na-efe ya nkwa, sị: “M gaghị ahapụ gị ma ọlị, m gaghịkwa agbahapụ gị ma ọlị.” Ọ bụ ya mere Pọl onyeozi ji dee, sị: “Ka ụzọ ndụ unu bụrụ nke ịhụnanya ego na-adịghị na ya.”—Hib. 13:5, 6.
LEZIE ANYA MGBE Ị NA-AHỌRỌ IHE Ị GA-EJI NA-ATỤRỤ NDỤ
11. Olee ihe ntụrụndụ nwere ike ime mmadụ?
11 Jehova chọrọ ka anyị na-enwe obi ụtọ. Ntụrụndụ nwekwara ike inyere anyị aka ịna-enwe obi ụtọ. Nke bụ́ eziokwu bụ na Baịbụl kwuru na “ọ dịghị ihe dịịrị mmadụ mma karịa iri ihe na ịṅụ ihe ọṅụṅụ, meekwa ka mkpụrụ obi ya hụ ihe ọma n’ihi ịrụsi ọrụ ike ya.” (Ekli. 2:24) Ma, ọtụtụ ihe e ji atụrụ ndụ n’ụwa nwere ike ịkpatara anyị nsogbu. Ọ na-eme ka ndị mmadụ na-amụta àgwà ọjọọ, meekwa ka ha na-anabata ihe Baịbụl kwuru na ọ dịghị mma, ma ọ bụdị na-aṅụ ihe ọjọọ ka mmiri.
12. Dị ka e kwuru ná 1 Ndị Kọrịnt 10:21, 22, gịnị mere anyị ji kwesị ịkpachara anya mgbe anyị na-ahọrọ ihe anyị ji atụrụ ndụ?
1 Ndị Kọrịnt 10:21, 22.) Mmadụ na mmadụ irikọ nri na-egosi na ha abụọ dị ná mma. Ọ bụrụ na ihe anyị ji atụrụ ndụ bụ ihe na-akwado tigbuo zọgbuo, mgbaasị, omume rụrụ arụ, ma ọ bụ ihe ọjọọ ndị ọzọ na-agụ anụ ahụ́ anyị, ọ pụtara na anyị na ndị iro Chineke na-erikọ nri ha siri. N’ihi ya, anyị na-akpatara onwe anyị nsogbu, na-emekwa ka anyị na Jehova ghara ịdị ná mma.
12 Anyị chọrọ ịna-efe naanị Jehova. N’ihi ya, o nweghị otú anyị ga-esi na-eri na “tebụl Jehova, na-erikwa na tebụl ndị mmụọ ọjọọ.” (Gụọ13-14. N’ihi ihe e kwuru na Jems 1:14, 15, gịnị mere anyị ji kwesị ịkpachara anya n’ihe anyị ji atụrụ ndụ? Nye ihe atụ.
13 Chegodị otú ntụrụndụ si yie nri a na-eri eri. Anyị riwe nri, anyị nwere ike ịhọrọ ihe anyị ga-etinye n’ọnụ anyị. Ma ozugbo anyị lobara ya n’afọ, ọ bụghịzi anyị ga-ekwu ihe nri ahụ ga-enye anyị. Anyị rie ezigbo nri, ọ ga-eme ka ahụ́ na-adị anyị mma. Ma, nke na-adịghị mma ga-akpatara anyị ọrịa. Ihe anyị riri nwere ike ọ gaghị apụta anyị n’ahụ́ ozugbo. Ma, ọ ga-emecha pụta anyị n’ahụ́.
14 Otú ahụ ka ntụrụndụ dị. Anyị chọwa ịtụrụ ndụ, anyị nwere ike ịhọrọ ihe anyị ga-etinye n’obi anyị. Ozugbo ọ bara anyị n’obi, ọ bụghịzi anyị ga-ekwu ihe ọ ga-eme obi anyị ma ọ bụ mee ka anyị chewe. Ezigbo ntụrụndụ nwere ike ime ka anyị nweta onwe anyị. Ma, nke na-adịghị mma ga-akpatara anyị nsogbu. (Gụọ Jems 1:14, 15.) O nwere ike anyị agaghị ahụ nsogbu ntụrụndụ na-adịghị mma na-akpatara anyị ozugbo. Ma, anyị ga-emecha hụ ya. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji dọọ anyị aka ná ntị, sị: “Unu ekwela ka e duhie unu: Chineke abụghị onye a ga-akwa emo. N’ihi na mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha, ọ bụ ya ka ọ ga-aghọrọkwa; n’ihi na onye na-agha mkpụrụ maka anụ ahụ́ ya ga-aghọrọ ire ure site n’anụ ahụ́ ya.” (Gal. 6:7, 8) Ọ dị ezigbo mkpa ka anyị jụ ntụrụndụ ọ bụla nwere ike ime ka ihe Jehova kpọrọ asị gụwa anyị agụụ.—Ọma 97:10.
15. Olee ọmarịcha onyinye Jehova nyere anyị?
15 Ile ọmarịcha Ihe Omume Tiivi Ndịàmà Jehova dị n’Ịntanet na-atọgbu ọtụtụ ndị Jehova atọgbu. Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Marilyn kwuru, sị: “Ihe Omume Tiivi anyị enyerela m aka ịna-enwe obi ụtọ. M nwere ike ile ihe niile a na-egosi na ya n’ihi na ha niile dị mma. Mgbe ọ bụla owu mawara m ma ọ bụ na obi jọwara m njọ, m na-achọta okwu na-agba ume ma ọ bụ Ihe Mmụta Dịịrị Ụbọchị ga-eme ka obi dị m mma. Ọ na-eme ka mụ na Jehova na nzukọ ya dịkwuo ná mma. Ihe Omume Tiivi a Jehova nyere anyị emeela ka ndụ m gbanwee.” Ihe Jehova nyere anyị ọ̀ na-abara gị uru? E wepụ ihe omume a na-eme kwa ọnwa, e nwere ọtụtụ ihe a na-egere egere, vidio nakwa abụ na egwú mmadụ nwere ike ịhọrọ mgbe ọ bụla ọ chọrọ.
16-17. Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-ejide onwe anyị ka ntụrụndụ ghara irikpọ oge anyị? Oleekwa otú anyị nwere ike isi eme ya?
16 Anyị kwesịrị ịkpachara anya n’ụdị ihe anyị ji atụrụ ndụ nakwa n’awa ole anyị na-eji atụrụ ndụ. Ma anyị emeghị otú ahụ, oge anyị ji atụrụ ndụ nwere ike ịkarị nke anyị ji ejere Jehova ozi. Ọ na-esiri ọtụtụ ndị ike ijide onwe ha ka ntụrụndụ ghara irikpọ oge ha. Otu nwanna nwaanyị dị afọ iri na asatọ aha ya bụ
Abigail kwuru, sị: “Ile tiivi na-eme ka isi jụọ m oyi ma m rụchaa ọrụ n’ụbọchị. Ma, ọ bụrụ na mụ akpacharaghị anya, m nwere ike ịnọ na-ele tiivi ọtụtụ awa agaa.” Otu nwanna nwoke bụ́ nwa okorobịa aha ya bụ Samuel sịrị: “M na-anọ n’Ịntanet na-ele ọtụtụ obere vidio. M na-amalite lewe naanị otu. Tupu mụ amata ihe na-eme, awa atọ ma ọ bụ anọ agaala.”17 Olee otú i nwere ike isi na-ejide onwe gị ka ntụrụndụ ghara irikpọ oge gị? Ihe mbụ ị ga-eme bụ ịmata awa ole ị na-eji atụrụ ndụ. Ọ ga-adị mma ka i dekọọ awa ole i ji tụrụ ndụ n’otu izu. Gaa na kalenda dee awa ole i ji lee tiivi, nọọ n’Ịntanet, gwuokwa egwuregwu ndị dị n’ekwentị gị. Ị chọpụta na oge i ji atụrụ ndụ karịrị akarị, gbalịa depụta ihe ndị ị ga na-eme. Buru ụzọ wepụta oge ị ga-eji na-eme ihe ndị ka mkpa, gị ewepụtazie oge ị ga-eji na-atụrụ ndụ. Ihe ọzọ ị ga-eme bụ ịrịọ Jehova ka o nyere gị aka ime ihe ahụ i dere. I mee otú ahụ, ị ga-enwe oge na ume ị ga-eji na-amụ ihe nke onwe gị, na-enwe ofufe ezinụlọ, na-aga ọmụmụ ihe, na-ekwusa ozi ọma ma na-amụrụ ndị mmadụ Baịbụl, bụ́ ozi anyị na-ejere Jehova. O nwekwara ike ime ka obi ghara ịna-ama gị ikpe gbasara oge i ji atụrụ ndụ.
NA-EFE NAANỊ JEHOVA
18-19. Olee otú anyị nwere ike isi gosi na anyị na-efe naanị Jehova?
18 Mgbe Pita onyeozi dechara gbasara ọgwụgwụ ụwa Ekwensu a na ụwa ọhụrụ anyị na-atụ anya ya, o dere, sị: “Ndị m hụrụ n’anya, ebe unu na-echere ihe ndị a, gbalịsienụ ike ka o wee hụ unu n’ikpeazụ dị ka ndị na-enweghị ntụpọ na ndị na-enweghị mmerụ na ndị nọ n’udo.” (2 Pita 3:14) Ọ bụrụ na anyị ana-eme ihe a Pita kwuru, gbalịakwa na-ebi ndụ otú Jehova chọrọ ma na-efe ya otú ọ chọrọ, anyị na-egosi na anyị na-efe naanị Jehova.
19 Setan na ụwa ya agaghị akwụsị ịgbalị ime ka ihe ndị ọzọ dị anyị mkpa karịa ofufe Jehova. (Luk 4:13) Ma, n’agbanyeghị nsogbu ọ bụla bịaara anyị, anyị agaghị ahụ onye ọ bụla ma ọ bụ ihe ọ bụla n’anya karịa Jehova. Anyị kpebisiri ike ịna-efe naanị Jehova n’ihi na ọ bụ naanị ya ka anyị kwesịrị ife.
ABỤ NKE 30 Nna M, Chineke M na Enyi M
^ par. 5 Ife Jehova na-atọ anyị ụtọ. Ma, ọ̀ bụ naanị ya ka anyị na-efe? Ọ bụ ihe ndị anyị na-ekpebi ime ga-egosi ma ànyị na-efe naanị ya. Ka anyị leba anya n’ihe abụọ anyị na-eme ná ndụ ga-enyere anyị aka ịmata ma ọ̀ bụ naanị Jehova ka anyị na-efe.
^ par. 53 NKỌWA FOTO: Anyị agaghị achọ iri nri e siri n’ebe na-adịghị ọcha, nke nwere ike ịkpatara mmadụ ọrịa. Oleezi ihe mere anyị ga-eji chọwa ile fim ndị a na-eme tigbuo zọgbuo, omume rụrụ arụ ma ọ bụ mgbaasị?