Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 31

Ị̀ “Na-echere Obodo Ahụ nke Nwere Ezi Ntọala”?

Ị̀ “Na-echere Obodo Ahụ nke Nwere Ezi Ntọala”?

“Ọ nọ na-echere obodo ahụ nke nwere ezi ntọala, bụ́ obodo nke ọ bụ Chineke bụ onye wuru ma mee ya.”​—HIB. 11:10.

ABỤ NKE 22 Alaeze Chineke Na-achị​—Ya Bịawa

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Olee ihe ụfọdụ ụmụnna anyị hapụrụ, n’ihi gịnịkwa?

ỌTỤTỤ nde ụmụnna anyị n’oge a ahapụla ihe ụfọdụ iji nwee ike ife Jehova. Ọtụtụ ụmụnna kpebiri na ha agaghị alụ di ma ọ bụ nwunye. Ụfọdụ ndị lụrụ di ma ọ bụ nwunye kpebiri na ha ga-anọtụ n’amụghị ụmụ. Ụfọdụ ezinụlọ kpebikwara na ha agaghị na-ebi ndụ okomoko. Gịnị mere ha ji kpebie ime ihe ndị a? Ọ bụ n’ihi na ha chọrọ iji ike ha niile jeere Jehova ozi. Ihe ha nwere juru ha afọ, ha tụkwasịkwara Jehova obi na ọ ga na-egboro ha mkpa ha. Jehova ọ̀ ga-agharịpụ ha? Mba. Olee otú anyị si mara? Ọ bụ n’ihi na Jehova gọziri Ebreham, bụ́ “nna nke ndị niile nwere okwukwe.”​—Rom 4:11.

2. (a) Dị ka e kwuru ná Ndị Hibru 11:​8-10, 16, gịnị mere Ebreham ji jiri obi ya niile hapụ obodo Ọọ? (b) Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu a?

2 Ebreham ji obi ya niile hapụ ihe ọma niile dị n’obodo Ọọ. N’ihi gịnị? N’ihi na “ọ nọ na-echere obodo ahụ nke nwere ezi ntọala.” (Gụọ Ndị Hibru 11:​8-10, 16.) Gịnị bụ “obodo ahụ”? Olee nsogbu ndị bịaara Ebreham ka ọ nọ na-eche ka e wuo obodo ahụ? Olee otú anyị ga-esi mee ka Ebreham na ụmụnna anyị ndị na-eme ka ya n’oge anyị a?

GỊNỊ BỤ “OBODO AHỤ NKE NWERE EZI NTỌALA”?

3. Gịnị bụ obodo ahụ Ebreham nọ na-echere?

3 Obodo ahụ Ebreham nọ na-echere bụ Alaeze Chineke. Ndị ga-achị n’Alaeze ahụ bụ Jizọs na Ndị Kraịst e tere mmanụ dị otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ. Pọl kpọrọ Alaeze ahụ “obodo nke Chineke dị ndụ, bụ́ Jeruselem nke eluigwe.” (Hib. 12:22; Mkpu. 5:​8-10; 14:1) Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-ekpe ekpere ka Alaeze ahụ bịa, ka uche Chineke mee n’ụwa a otú ahụ ọ na-eme n’eluigwe.​—Mat. 6:10.

4. Dị ka e kwuru na Jenesis 17:​1, 2, 6, olee ihe ndị Ebreham ma gbasara obodo ahụ ma ọ bụ Alaeze Chineke kwere nkwa ya?

4 Ebreham ọ̀ ma ihe niile gbasara otú Alaeze Chineke ga-adị? Mba. Ruo ọtụtụ afọ, ihe ndị ahụ bụ “ihe nzuzo dị nsọ.” (Efe. 1:​8-10; Kọl. 1:​26, 27) Ma, Ebreham ma na ụfọdụ n’ime ụmụ ya ga-abụ ndị eze n’ihi na ọ bụ nkwa Jehova kwere ya. (Gụọ Jenesis 17:​1, 2, 6.) Otú Ebreham si nwee okwukwe ná nkwa ahụ Jehova kwere ya mere ka ọ dị ka ọ na-ahụ Onye E Tere Mmanụ ma ọ bụ Mesaya, onye ga-abụ Eze nke Alaeze Chineke. Ọ bụ ya mere Jizọs ji gwa ndị Juu, sị: “Ebreham nna unu ji ọṅụ dị ukwuu tụọ anya ịhụ ụbọchị m, ọ hụkwara ya wee ṅụrịa ọṅụ.” (Jọn 8:56) O doro anya na Ebreham ma na ụfọdụ n’ime ụmụ ya ga-eso chịa n’Alaeze Chineke. Ọ dịkwa njikere ichere Jehova ka o mezuo nkwa ahụ.

Olee otú Ebreham si gosi na o nwere okwukwe ná nkwa ndị Jehova kwere? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 5)

5. Olee otú anyị si mara na Ebreham nọ na-echere obodo ahụ Chineke wuru?

5 Olee otú Ebreham si gosi na ọ dị njikere ichere obodo ahụ ma ọ bụ Alaeze Chineke? Nke mbụ bụ na Ebreham abụghị nwa amaala obodo ọ bụla. Ọ nọ na-akwaga obodo dị iche iche. O nweghị ebe o ji mere obodo ya, e nweghịkwa onye ọchịchị ọ bụla ọ kwadoro. Ihe ọzọkwa bụ na Ebreham ehiweghị ọchịchị nke ya. Kama nke ahụ, ọ nọ na-erubere Jehova isi, na-echekwa ka o mezuo nkwa ya. Ihe a gosiri na Ebreham nwere okwukwe siri ike n’ebe Jehova nọ. Ka anyị leba anya n’ụfọdụ nsogbu ndị bịaara ya na ihe anyị nwere ike ịmụta n’aka ya.

OLEE NSOGBU NDỊ BỊAARA EBREHAM?

6. Olee ụdị obodo Ọọ bụ?

6 Ebreham hapụrụ obodo Ọọ, bụ́ obodo mara ezigbo mma obi na-eru mmadụ ala na ya. Ọtụtụ ndị bi na ya gụrụ akwụkwọ, jirikwa ego. A rụrụ nnukwu mgbidi na ọwa mmiri miri emi n’akụkụ atọ nke obodo ahụ. Ndị obodo Ọọ ma otú e si ede ihe na otú e si eme mgbakọ na mwepụ nke ọma. Ihe ndị e gwupụtara n’ala n’ebe obodo ahụ dịbu gosiri na a na-azụ ahịa nke ọma n’obodo ahụ. Ndị mmadụ na-eji brik rụọ ụlọ, teekwa ya ágbá na-acha ọcha. Ụfọdụ n’ime ụlọ ndị ahụ na-enwe ọnụ ụlọ iri na atọ ma ọ bụ iri na anọ gbara mbara èzí ha gburugburu.

7. Gịnị mere obi ji kwesị isi Ebreham ike na Jehova ga-echebe ya na ezinụlọ ya?

7 Obi kwesịrị isi Ebreham ike na Jehova ga-echebe ya na ezinụlọ ya. N’ihi gịnị? Cheta na Ebreham na Sera hapụrụ ụlọ ya ebe ahụ́ ruru ya ala n’obodo Ọọ gaa biri n’ụlọikwuu n’ọzara dị na Kenan. E nweghịzi nnukwu mgbidi na ọwa mmiri miri emi na-echebe ya na ezinụlọ ya. N’ihi ya, ndị iro nweziri ike ịbịa mekpaa ha ahụ́.

8. Olee nsogbu bịaara Ebreham n’otu oge?

8 Ebreham rubeere Chineke isi. Ma, e nwere mgbe nri kọrọ ya na ezinụlọ ya. Oké ụnwụ dara n’obodo ahụ Jehova gwara ya ka ọ gaa biri. Ụnwụ ahụ jọrọ ezigbo njọ nke na Ebreham kpebiri ka ya na ezinụlọ ya gaa biritụ n’Ijipt. Ma, mgbe ha nọ n’Ijipt, Fero, bụ́ eze na-achị Ijipt mgbe ahụ, kpọọrọ nwunye ya. Chegodị otú Ebreham si na-echegbu onwe ya ruo mgbe Jehova mere ka Fero kpọghachiri ya nwunye ya.​—Jen. 12:​10-19.

9. Olee nsogbu Ebreham nwere n’ezinụlọ ya?

9 Ebreham nwekwara nnukwu nsogbu n’ezinụlọ ya. Nwunye ya ọ hụrụ n’anya bụ́ Sera amụtaghị nwa. Ihe a wutere ha ruo ọtụtụ afọ. Sera mechara kpọnye ya ohu ya nwaanyị bụ́ Hega ka ha nwee ike isi n’aka ya mụta nwa. Ma mgbe Hega matara na ya dị ime, ọ malitere ileda Sera anya ruo nke na Sera chụpụrụ ya n’ụlọ.​—Jen. 16:​1-6.

10. Olee ihe ndị gbasara Ishmel na Aịzik gaara eme ka o siere Ebreham ike ịtụkwasị Jehova obi?

10 Sera mechara dịrị ime ma mụtara Ebreham nwa nwoke. Ebreham gụrụ ya Aịzik. Ebreham hụrụ ụmụ ya abụọ bụ́ Ishmel na Aịzik n’anya. Ma n’ihi otú na-adịghị mma Ishmel si na-emeso Aịzik, Jehova gwara Ebreham ka ọ chụpụ ya na nne ya bụ́ Hega. (Jen. 21:​9-14) Mgbe ọtụtụ afọ gachara, Jehova gwara Ebreham ka o jiri Aịzik chụọrọ ya àjà. (Jen. 22:​1, 2; Hib. 11:​17-19) N’oge ndị a, obi kwesịrị isi Ebreham ike na Jehova ga-emezu nkwa o kwere gbasara ụmụ ya ndị ahụ.

11. Gịnị mere Ebreham ga-eji jiri ndidi chere Jehova?

11 N’oge ndị a niile, Ebreham ga-amụta iji ndidi chere Jehova. O nwere ike ịbụ na ọ karịala afọ iri asaa ya na ezinụlọ ya hapụrụ Ọọ. (Jen. 11:31–12:4) Ruokwa ihe dị ka otu narị afọ, o biri n’ụlọikwuu, na-akwaga ọtụtụ ebe na Kenan. Ebreham nwụrụ mgbe ọ dị otu narị afọ na iri asaa na ise. (Jen. 25:7) Ma, ọ hụghị mgbe Jehova nyere ụmụ ya ala ahụ o kwere ha ná nkwa. Ọ hụghịkwa mgbe e wuru obodo ahụ, ya bụ, Alaeze Chineke. N’agbanyeghị ya, Baịbụl kwuru na Ebreham nwụrụ mgbe “ọ kara nká ma nwee afọ ojuju.” (Jen. 25:8) N’agbanyeghị nsogbu niile bịaara Ebreham, okwukwe ya siri ike, obi adịkwa ya ụtọ ichere Jehova. Gịnị mere o ji nwee ike ịtachi obi? Ọ bụ n’ihi na Jehova chebere ya ná ndụ ya niile, mesokwa ya ka enyi ya.​—Jen. 15:1; Aịza. 41:8; Jems 2:​22, 23.

Olee otú ndị ohu Chineke si egosi na ha nwere okwukwe na ndidi otú ahụ Ebreham na Sera mere? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 12) *

12. Gịnị ka anyị na-echere, oleekwa ihe anyị ga-eleba anya na ya?

12 Dị ka Ebreham, anyịnwa na-echere obodo ahụ nke nwere ezi ntọala. Ma, anyị anaghị echere ka e wuo ya. E hiwere Alaeze Chineke n’afọ 1914, ya ana-achịkwa n’eluigwe kemgbe ahụ. (Mkpu. 12:7-10) Ma, anyị na-eche ka ọ chịwa ụwa a. Ka anyị na-echere ka o mee, e nwere ọtụtụ nsogbu yiri nke Ebreham na Sera anyị na ha na-alụ. È nwere ụfọdụ ndị ohu Jehova mere ka Ebreham n’oge anyị a? Akụkọ ndụ ndị gbara n’Ụlọ Nche gosiri na e nwere ọtụtụ ụmụnna anyị taa nwere ụdị okwukwe na ndidi ahụ Ebreham na Sera nwere. Ka anyị tụlee naanị ole na ole n’ime ha, matakwa ihe anyị ga-amụta n’aka ha.

NDỊ MERE KA EBREHAM

Bill Walden hapụrụ ọtụtụ ihe iji nwee ike ife Jehova. Jehova gọzikwara ya

13. Gịnị ka ị mụtara n’akụkọ Nwanna Walden?

13 Dị njikere ịhapụ ihe ụfọdụ iji fee Chineke. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Alaeze Chineke bụrụ ihe kacha mkpa ná ndụ anyị, anyị kwesịrị ịna-eme ka Ebreham, bụ́ onye hapụrụ ihe ụfọdụ iji mee Chineke obi ụtọ. (Mat. 6:33; Mak 10:​28-30) Legodị ihe mere otu nwanna aha ya bụ Bill Walden. * Ya na Ndịàmà Jehova malitere ịmụ Baịbụl mgbe ọ fọrọ obere ka o nweta akara ugo mmụta na mahadum dị n’Amerịka n’afọ 1942. Otu n’ime ndị nkụzi Bill haziri ka o nweta ọrụ ozugbo ọ gụchara akwụkwọ. Ma, Bill jụrụ ajụ. Ọ kọwaara onye nkụzi ahụ na ya ekpebiela iji oge ya niile fee Chineke kama ịrụwa ọrụ a ga na-akwụ ya nnukwu ụgwọ. Ọ dịghị anya, gọọmentị nyere Bill iwu ka ọ banye amị. O weturu obi kọwaara ha na ya agaghị aga. N’ihi ya, ha riri ya nhá puku dọla iri, tụọkwa ya mkpọrọ afọ ise. Ma, a tọhapụrụ ya mgbe afọ atọ gachara. Mgbe e mechara, a kpọrọ ya ka ọ gaa Ụlọ Akwụkwọ Gilied. O mechakwara ghọọ onye ozi ala ọzọ n’Afrịka. Bill mechara lụọ nwanna nwaanyị aha ya bụ Eva, ha abụọ ejeekwa ozi n’Afrịka. Nke ahụ pụtara na ha ga-ahapụkwa ọtụtụ ihe iji jee ozi ahụ. Mgbe afọ ole na ole gachara, ha laghachiri Amerịka ịga lekọtawa mama Bill. Bill kwuru otú obi dị ya n’ihe niile merenụ ná ndụ ya. Ọ sịrị: “Obi na-adị m ezigbo ụtọ ma m cheta ihe ọma Jehova meere m kwe ka m jeere ya ozi ihe karịrị afọ iri asaa. M na-ekele ya mgbe ọ bụla n’ihi na o nyeere m aka iji ndụ m niile jeere ya ozi.” Ì nwere ike iwepụta onwe gị jee ozi oge niile?

Jehova nyeere Eleni na Aristotelis Apostolidis aka inwe okwukwe

14-15. Olee ihe ị mụtara n’akụkọ Nwanna Apostolidis na nwunye ya?

14 Echela na ị gaghị enwe nsogbu ná ndụ gị. Ihe mere Ebreham kụziiri anyị na nsogbu na-abịara ma ndị ji ndụ ha niile na-ejere Jehova ozi. (Jems 1:2; 1 Pita 5:9) Ọ bụ ihe mere otu nwanna aha ya bụ Aristotelis Apostolidis. * O mere baptizim na Gris n’afọ 1946. N’afọ 1952, ya na otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Eleni, bụ́ onye chọkwara iji ndụ ya niile jeere Jehova ozi, kwere onwe ha nkwa ọlụlụ. Ma, Eleni malitere ịrịa ọrịa. E mechara chọpụta na o nwere akpụ n’ụbụrụ. A wara ya ahụ́ ma wepụ akpụ ahụ, ha alụọkwa. Ma ka afọ ole na ole gachara, akpụ ahụ lọghachiri. Ndị dọkịta wara ya ahụ́ ọzọ, nke mere ka akụkụ ahụ́ ya ụfọdụ kpọnwụọ, ọ naghịkwa ekwuzi okwu nke ọma. Ọ kwụsịghị ịnụ ọkụ n’obi n’ozi ọma n’agbanyeghị ọrịa ya na mkpagbu ndị ọchịchị na-akpagbu ha n’oge ahụ.

15 Nwanna Apostolidis lekọtara nwunye ya ruo afọ iri atọ. N’oge ndị ahụ niile, ọ bụ okenye ọgbakọ, soro na kọmitii na-ahụ maka mgbakọ dị iche iche, nyekwa aka rụọ otu Ụlọ Mgbakọ. N’afọ 1987, Eleni merụrụ ahụ́ mgbe ọ nọ n’ozi ọma. Ọ tụbọrọ ruo afọ atọ, mechaakwa nwụọ. Ná ngwụcha akụkọ ndụ Nwanna Apostolidis, o kwuru, sị: “Kemgbe ọtụtụ afọ, ọtụtụ nsogbu abịarala m. Ụfọdụ n’ime ha bịara na mberede. N’ihi ya, m kwesịrị ikpebisi ike ịtachi obi, gharakwa ikwe ka ihe ọ bụla mee ka m daa mbà. Ma, Jehova akwụsịghị inye m ike m ji die nsogbu ndị ahụ niile.” (Ọma 94:​18, 19) Jehova ejighị ndị ohu ya na-eme ike ha niile n’ofufe ya n’agbanyeghị nsogbu ndị ha na-enwe egwu egwu.

Audrey Hyde lekwasịrị anya n’ọdịnihu

16. Olee ezigbo ndụmọdụ Nwanna Knorr nyere nwunye ya?

16 Lekwasị anya n’ọdịnihu. Ebreham lekwasịrị anya n’ụgwọ ọrụ Jehova ga-enye ya. Ọ bụ ya nyeere ya aka idi nsogbu ndị bịaara ya. Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Audrey Hyde lekwasịrị anya n’ọdịnihu n’agbanyeghị na ọrịa kansa gburu di ya mbụ bụ́ Nathan H. Knorr. Di ya nke abụọ aha ya bụ Glenn Hyde mechakwara rịawa ọrịa na-eme ka ụbụrụ ghara ịkpakọ mmadụ ọnụ. * O kwuru na ihe nyeere ya aka bụ ihe Nwanna Knorr gwara ya izu ole na ole tupu ya anwụọ. Ọ sịrị: “Nwanna Knorr chetaara m, sị: ‘Ọ bụrụ na anyị anwụọ, olileanya anyị doro anya, anyị agaghịkwa na-ata ahụhụ ọzọ.’ Ọ gwaziri m, sị: ‘Lekwasị anya n’ọdịnihu, n’ihi na ọ bụ ebe ahụ ka ụgwọ ọrụ gị dị.’ . . . Ọ sịkwara m: ‘Wepụta onwe gị na-enyere ndị ọzọ aka. Ọ ga-enyere gị aka ịna-enwe obi ụtọ.’” Ndụmọdụ ahụ na-abakwara anyị uru taa, ya bụ, ịna-enyere ndị ọzọ aka na ‘ịna-aṅụrị ọṅụ n’olileanya ahụ.’​—Rom 12:12.

17. (a) Gịnị mere anyị ji kwesị ilekwasị anya n’ọdịnihu? (b) Olee otú ime ihe e kwuru na Maịka 7:7 ga-esi nyere anyị aka inweta ihe ọma n’ọdịnihu?

17 E nwere ọtụtụ ihe mere anyị ji kwesị ilekwasị anya n’ọdịnihu n’oge anyị a karịa mgbe ọ bụla ọzọ. Ihe ndị na-eme n’ụwa gosiri na anyị bi n’oge ikpeazụ nke ụwa ọjọọ a. N’oge na-adịghị anya, anyị agaghịzi na-ele anya ka Alaeze Chineke bịa chịwa ụwa niile. Otu n’ime ihe ọma ndị ọ ga-emere anyị bụ ime ka ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ si n’ọnwụ bilie. N’oge ahụ, Jehova ga-akwụ Ebreham ụgwọ ọrụ maka okwukwe ya na ndidi ya. Otú ọ ga-esi eme ya bụ ịkpọlite ya na ezinụlọ ya n’ọnwụ n’ụwa a. Ị̀ ga-anọ soro nabata ha mgbe ahụ? I nwere ike ịnọ ya ma ọ bụrụ na i mee ka Ebreham, hapụ ihe ụfọdụ maka Alaeze Chineke, na-enwe okwukwe n’agbanyeghị nsogbu, nakwa ma ị mụta iji ndidi na-echere Jehova.​—Gụọ Maịka 7:7.

ABỤ NKE 74 Soro Bụọ Abụ Alaeze

^ par. 5 Ike nwere ike ịgwụ anyị ma ọ bụdị okwukwe anyị anyụọ ka ọkụ mgbe anyị na-eche ka Chineke mezuo nkwa ya. Olee ihe ndị anyị nwere ike ịmụta n’aka Ebreham ga-enyere anyị aka iji ndidi na-echere ka Jehova mezuo nkwa ya? Oleekwa ihe anyị ga-amụta n’aka ndị ohu Jehova n’oge anyị a?

^ par. 56 NKỌWA FOTO: Ebe di na nwunye katarala ahụ́ ji obi ha niile na-efe Jehova n’agbanyeghị nsogbu. Otú ha si eme ka okwukwe ha na-esi ike bụ ilekwasị anya ná nkwa ndị Jehova kwere maka ọdịnihu.