Udo, Olee Otú Ị Ga-esi Enweta Ya?
EBE anyị bi n’ụwa nsogbu juru na ya, anyị ga-agba ezigbo mbọ ka anyị nwee ike inweta udo. Ọ bụ eziokwu na mgbe ụfọdụ, anyị nwere ike inwetụ udo, ọ na-esiri anyị ike ịnọgide na-enwe ya. Olee ihe Okwu Chineke kwuru nke ga-enyere anyị aka ịna-enwe udo? Oleekwa otú anyị ga-esi enyere ndị ọzọ aka inwe ya?
OLEE IHE ANYỊ GA-EME KA ANYỊ NWETA EZIGBO UDO?
Anyị ga-enwe ezigbo udo ma obi na-eru anyị ala, nakwa ma anyị na ndị ọzọ na-adị n’ezigbo mma. Ihe kachanụ nke ga-eme ka anyị na-enwe udo bụ ma anyị na Chineke dịrị n’ezigbo mma. Olee otú anyị ga-esi eme ya?
Anyị rube isi n’iwu Jehova nyere anyị, anyị na-egosi ya na anyị tụkwasịrị ya obi, nakwa na anyị chọrọ ka anyị na ya dịrị n’ezigbo mma. (Jere. 17:7, 8; Jems 2:22, 23) Anyị mee otú ahụ, ọ ga-abịaru anyị nso ma mee ka obi ruo anyị ala. Aịzaya 32:17 kwuru, sị: “Ihe ezi omume ahụ ga-arụpụta bụ udo; ihe ga-esikwa n’ezi omume ahụ pụta bụ ịnọ jụụ na ịnọ n’obi iru ala ruo mgbe ebighị ebi.” Obi ga-eru anyị ala ma anyị si n’ala ala obi anyị na-erubere Jehova isi.—Aịza. 48:18, 19.
Ihe ọzọ ga-eme ka anyị nwee udo bụ mmụọ nsọ, nke bụ́ onyinye pụrụ iche Nna anyị nke eluigwe na-enye anyị.—Ọrụ 9:31.
MMỤỌ NSỌ NA-ENYERE ANYỊ AKA INWETA UDO
Udo bụ ihe nke atọ Pọl kwuru okwu ya so ná “mkpụrụ nke mmụọ nsọ.” (Gal. 5:22, 23) Ebe ọ bụ mmụọ nsọ na-eme ka anyị nweta ezigbo udo, anyị ga-ekwe ka mmụọ nsọ na-edu anyị ka anyị nwee ike inweta ezigbo udo. Ka anyị leba anya n’ụzọ abụọ mmụọ nsọ nwere ike isi nyere anyị aka inweta udo.
Ọma 1:2, 3) Ọ bụrụ na anyị na-echebara ihe ndị anyị gụrụ echiche, mmụọ nsọ ga-enyere anyị aka ịghọta otú Jehova si ele ihe ụfọdụ anya. Dị ka ihe atụ, anyị na-ahụ otú o si na-eme udo, nakwa ihe mere udo ji dị ya ezigbo mkpa. Anyị mee ihe ndị ahụ anyị mụtara n’Okwu Chineke, anyị ga na-enwekwu udo.—Ilu 3:1, 2.
Nke mbụ, ịgụ Okwu Chineke mgbe niile ga-eme ka anyị nweta udo. (Nke abụọ, anyị ga-arịọ Chineke ka o nye anyị mmụọ nsọ ya. (Luk 11:13) Jehova na-ekwe anyị nkwa na anyị rịọ ya ka o nyere anyị aka, ọ ga-eme ka ‘udo nke Chineke nke karịrị echiche niile na-eche obi anyị na ike iche echiche anyị nche site n’aka Kraịst Jizọs.’ (Fil. 4:6, 7) Ọ bụrụ na anyị arịọ Jehova ka o nye anyị mmụọ nsọ ya, Chineke anyị ga-eme ka obi ruo anyị ala, bụ́ ihe ọ na-emere naanị ndị ya na ha dị n’ezigbo mma.—Rom 15:13.
Olee otú ụfọdụ sirila mee ihe a Baịbụl kwuru ma gbanwee ndụ ha nke mere ka ha na-enwe udo, ha na Chineke na ndị mmadụ ana-adị n’udo?
OTÚ ỤFỌDỤ NDỊ SI NWETA EZIGBO UDO
Ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ taa bụbu ndị “na-ewekarị oké iwe,” ma ugbu a, ha na-echebakwuru ndị mmadụ echiche, na-enwekwuru ha ndidi na obiọma, ma na-eme ka ha na ha dịrị n’udo, mgbe ha na ha na-emekọ ihe. * (Ilu 29:22) Ka anyị chọpụta otú ihe a si bụrụ eziokwu n’akụkọ gbasara ndị nkwusa abụọ e nyeere aka ha akwụsị ịna-ewe oké iwe, meekwa ka ha na ndị ọzọ na-adị n’udo.
Àgwà ọjọọ David na-akpa mere ka ọ na-ekwu okwu ọjọọ. Tupu ya enyefee Chineke ndụ ya, ọ na-akatọkarị ndị ọzọ, na-eji okwu ọjọọ asa ndị ezinụlọ ya ahụ́. Mgbe oge na aga, ọ chọpụtara na ya kwesịrị ịgbanwe ndụ ya ma na-eme udo. Gịnị nyeere ya aka ịna-eme udo? O kwuru, sị: “M malitere ime ihe Baịbụl kwuru ná ndụ m, ya emee ka mụ na ndị ezinụlọ m na-akwanyere ibe anyị ùgwù.”
Otú e si zụọ Rachel kpara àgwà ya aka ọjọọ. O kwuru, sị: “Mụ na iwe ọkụ ka na-alụ
n’ihi na m toro n’ezinụlọ ebe onye ọ bụla na-ewekarị iwe.” Gịnị nyeere ya aka ịna-emekwu udo? O kwuru, sị: “M na-ekpe ekpere mgbe niile ma na-arịọ Jehova ka o nyere m aka.”Akụkọ gbasara David na Rachel bụ naanị ihe atụ abụọ na-egosi na anyị ga-enwe udo ma anyị na-eme ihe Baịbụl kwuru ma na-arịọ Chineke ka o jiri mmụọ nsọ ya nyere anyị aka. O doro anya na n’agbanyeghị àgwà ọjọọ juru n’ụwa a, anyị nwere ike inweta udo nke ga-eme ka anyị na ndị ezinụlọ anyị na ụmụnna anyị na-adị n’udo. Ma, Jehova na-agwa anyị ka anyị “na mmadụ niile dịrị n’udo.” (Rom 12:18) Ihe a ọ̀ ga-ekwe omume? Oleekwa uru anyị ga-erite ma anyị gbaa mbọ mee ka anyị na ndị ọzọ na-adị n’udo?
GỊ NA NDỊ ỌZỌ NA-ADỊ N’UDO
Mgbe anyị na-ekwusa ozi ọma, anyị na-agwa ndị mmadụ ka ha bịa rite uru n’udo Alaeze Chineke ga-eme ka anyị nwee. (Aịza. 9:6, 7; Mat. 24:14) Obi dị anyị ụtọ na ọtụtụ ndị emeela ihe a anyị na-agwa ha. Ha abụghịzi ndị ike ụwa na-agwụ ma ọ bụ ndị na-ewe oké iwe n’ihi otú ihe si kwụrụ n’ebe ha bi. Kama nke ahụ, ha nwere olileanya na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu. Ha ‘na-achọ udo, na-achụsokwa ya.’—Ọma 34:14.
Ọ bụghị mmadụ niile na-ege anyị ntị mgbe mbụ anyị chọrọ izi ha ozi ọma. (Jọn 3:19) N’agbanyeghị nke ahụ, mmụọ Chineke na-enyere anyị aka imeda obi na ịkwanyere ha ùgwù mgbe anyị na-ezi ha ozi ọma. Anyị si otú ahụ na-eme ihe Jizọs kwuru na Matiu 10:11-13 banyere ihe anyị ga-eme ma anyị chọọ izi mmadụ ozi ọma. Ebe ahụ sịrị: “Mgbe unu na-abanye n’ụlọ, keleenụ ndị ezinụlọ ahụ; ọ bụrụkwa na ụlọ ahụ kwesịrị ekwesị, ka udo unu na-asị ka o nwee dịkwasị ya; ma ọ bụrụ na o kwesịghị ekwesị, ka udo nke si n’ebe unu nọ lọghachiri unu.” Anyị mee ihe Jizọs kwuru, anyị ga-enwe udo mgbe anyị na-apụ, burukwa n’obi na onye ahụ ga-emecha gee anyị ntị.
Anyị na-emekwa ka e nwekwuo udo ma anyị na-akwanyere ndị ọrụ gọọmenti ùgwù, ma ndị nke na-emegide anyị. Dị ka ihe atụ, otu gọọmenti dị n’otu mba Afrịka achọghị inye anyị ikike iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze n’ihi na ha kpọrọ anyị asị. Mgbe a chọrọ idozi okwu ahụ n’udo, a họpụtara otu nwanna jerela ozi ala ọzọ n’obodo ahụ ka ọ gaa hụ onye na-anọchite anya obodo ahụ na Lọndọn dị n’Ịngland. Ọ gara ka ọ gwa ya gbasara ọrụ Ndịàmà Jehova na-arụ n’obodo ahụ n’enyeghị onye ọ bụla nsogbu. Olee ihe mechara mee?
Nwanna ahụ kwuru, sị: “Mgbe m ruru n’ebe a na-anabata ndị ọbịa n’ụlọ ọrụ ya hụ onye na-anabata ndị ọbịa, m kwuru n’obi m na o si n’agbụrụ m ma asụsụ ha. N’ihi ya, m kelere ya n’asụsụ obodo ya, ya eju ya anya, ya ajụọ m, sị, ‘Olee ihe butere gị ebe a?’ M medara obi gwa ya na m chọrọ ịhụ onyeisi ha. Ọ kpọziri onyeisi ahụ na telefon, ya abịa hụ m ma kelee m n’asụsụ obodo ha. Mgbe anyị kelechara, o medara obi gee m ntị mgbe m na-akọwara ya ozi ọma Ndịàmà Jehova na-ezi n’obodo ha n’enweghị onye ha na-enye nsogbu.”
Otú nwanna ahụ si kwanyere onyeisi ahụ ùgwù mgbe ọ na-akọwara ya gbasara Ndịàmà Jehova mere ka ọ ghọtakwuo ọrụ anyị ma gbanwee otú o sibu ele ya anya. Mgbe obere oge gachara, ndị ọchịchị wepụrụ iwu ha machiri anyị ịrụ Ụlọ Nzukọ Alaeze n’obodo ahụ. Obi tọrọ ụmụnna ezigbo ụtọ n’ihi ihe a merenụ. N’eziokwu, ịkwanyere ndị ọzọ ùgwù mgbe gị na ha na-emekọ ihe na-aba ezigbo uru, na-emekwa ka gị na ha na-adị n’udo.
NA-ENWE UDO RUO MGBE EBIGHỊ EBI
Taa, Ndịàmà Jehova na ibe ha dị n’udo. Ị ga-eso mee ka a na-enwekwu udo ma ọ bụrụ na i nwee udo, bụ́ àgwà so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ. Nke kacha mkpa bụ na ihe gị ga na-amasị Jehova, ọ ga-emekwa ka i nweta udo nke ga-adịru mgbe ebighị ebi n’ụwa ọhụrụ ya.—2 Pita 3:13, 14.
^ para. 13 Anyị ga-atụle àgwà a bụ́ obiọma n’isiokwu ndị anyị ga-atụle n’ọdịnihu e ji na-akọwa àgwà ndị so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ.