E Kwesịrị Ime Ndị Kraịst Baptizim
‘Ihe na-azọpụtakwa unu ugbu a bụ baptizim.’—1 PITA 3:21.
1, 2. (a) Olee otú obi na-adị ụfọdụ ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst ma nwa ha kwuo na ya chọrọ ime baptizim? (b) Gịnị mere e ji ajụ ndị chọrọ ime baptizim ma hà enyefeela Jehova onwe ha? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)
NDỊ mụrụ Maria nọ na-ele nwa ha nwaanyị a dị afọ itoolu ka ya na ndị ọzọ a na-aga ime baptizim guzo ọtọ. Onye na-ekwu okwu baptizim jụrụ ha ajụjụ abụọ. Maria ji olu dara ụda zaa ajụjụ ndị ahụ. N’oge na-adịghị anya, e mee ya baptizim.
2 Obi tọgburu ndị mụrụ ya atọgbu na nwa ha kpebiri inyefe Jehova onwe ya kpamkpam, e mee ya baptizim. Ma, tupu mgbe ahụ, e nwere ihe ndị na-echu mama ya ụra. Ọ jụrụ onwe ya, sị: ‘Maria, ò toruola ime baptizim? Ọ̀ ghọtara na ihe a ọ na-aga ime abụghị ihe e ji egwu egwu? Ọ̀ gaghị aka mma ka o chetụ?’ Ndị nne na nna hụrụ nwa ha n’anya na-ajụ onwe ha ajụjụ ndị a ma nwa ha kwuo na ọ chọrọ ime baptizim. (Ekli. 5:5) A sị ka e kwuwe, ihe kacha mkpa Onye Kraịst ga-ekpebi ime bụ inyefe Jehova onwe ya, e meekwa ya baptizim.—Gụọ igbe isiokwu ya bụ “ Ì Nyefeela Jehova Onwe Gị?”
3, 4. (a) Olee otú Pita onyeozi si gosi na baptizim dị mkpa? (b) Gịnị mere e nwere ike iji jiri baptizim tụnyere ụgbọ ahụ Noa wuru?
3 Pita onyeozi ji baptizim tụnyere ụgbọ Noa wuru. Ọ sịrị: “Ihe ya na ihe a yiri na-azọpụtakwa unu ugbu a, ya bụ, baptizim.” (Gụọ 1 Pita 3:20, 21.) Ụgbọ ahụ mere ka a mata na Noa ji obi ya niile chọọ ime ihe dị Chineke mma. O ji obi ya niile rụọ ọrụ Jehova nyere ya rụọ. Jehova zọpụtara Noa na ezinụlọ ya n’Iju Mmiri ahụ n’ihi okwukwe ya. Gịnị ka Pita ji ihe atụ ahụ na-akụziri anyị?
4 Otú ahụ ụgbọ ahụ Noa wuru gosiri na o nwere okwukwe, ka baptizim a na-eme ndị mmadụ n’ihu ọha nwekwara ihe ọ na-egosi. Gịnị ka ọ na-egosi? Ọ na-egosi na Onye Kraịst enyefeela Jehova onwe ya n’ihi okwukwe o nwere na Kraịst. Ndị e mere baptizim na-erubere Chineke isi ma na-arụ ọrụ o nyere ha, otú ahụ Noa mere. Mgbe Chineke ga-ebibi ụwa ọjọọ a, ọ ga-echebe ndị e mere baptizim na-efe ya, otú ahụ o chebere Noa n’Iju Mmiri ahụ. (Mak 13:10; Mkpu. 7:9, 10) Ọ bụ ihe a mere mmadụ inyefe Jehova onwe ya na ime baptizim ji dị ezigbo mkpa. Ọ bụrụ na mmadụ na-egbu oge ime baptizim n’ihi ihe na-enweghị isi, ndụ ebighị ebi nwere ike ịkwa ya.
5. Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu a?
5 Ebe ọ bụ na baptizim dị ezigbo mkpa, e nwere ajụjụ atọ anyị kwesịrị ịtụle. Gịnị ka Baịbụl kwuru gbasara baptizim? Gịnị ka mmadụ ga-eme tupu e mee ya baptizim? Gịnị mere Onye Kraịst na-amụrụ mmadụ ihe ga-eji buru mkpa ime baptizim dị n’obi mgbe ọ na-amụrụ nwa ya ma ọ bụ onye ọzọ ihe?
IHE BAỊBỤL KWURU GBASARA BAPTIZIM
6, 7. (a) Kọwaa ihe baptizim Jọn mere ndị mmadụ na-egosi. (b) Olee baptizim pụrụ iche Jọn mere mmadụ?
6 Onye mbụ anyị gụrụ na Baịbụl mere ndị ọzọ baptizim bụ Jọn Onye Na-eme Baptizim. (Mat. 3:1-6) Ihe mere ndị mmadụ ji bịakwute Jọn ka o mee ha baptizim bụ iji gosi na ha echegharịala n’Iwu Mozis ha dara. Ma, o doro anya na baptizim kacha mkpa Jọn mere mmadụ enweghị ihe gbasara ya na nchegharị. Jọn nwere ihe ùgwù pụrụ iche ime Jizọs, bụ́ Ọkpara Chineke zuru okè, baptizim. (Mat. 3:13-17) Jizọs enweghị mmehie ọ bụla, n’ihi ya, nchegharị adịghị ya mkpa. (1 Pita 2:22) Baptizim o mere na-egosi na o wepụtala onwe ya ime uche Chineke.—Hib. 10:7.
7 N’oge Jizọs na-eje ozi ya n’ụwa, ndị na-eso ụzọ ya mekwara ndị mmadụ baptizim. (Jọn 3:22; 4:1, 2) Ihe mere ndị ahụ ha mere baptizim ji mee baptizim bụ iji gosi na ha echegharịala n’Iwu Mozis ha dara, otú ahụ ndị ahụ Jọn mere baptizim mere. Ma, mgbe Jizọs nwụchara, akpọlitekwa ya n’ọnwụ, a ga-enwe ihe dị iche mere a ga-eji mee ndị chọrọ ịghọ ndị na-eso ụzọ ya baptizim.
8. (a) Mgbe a kpọlitechara Jizọs n’ọnwụ, olee ihe ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya? (b) Kọwaa ihe mere Ndị Kraịst ji eme baptizim.
8 N’afọ 33, obere oge a kpọlitechara Jizọs n’ọnwụ, ọ pụtara n’ihu ihe karịrị narị mmadụ ise, ma ndị nwoke, ma ndị nwaanyị, ụmụaka nwekwara ike iso na ha. O nwere ike ịbụ mgbe ahụ ka Jizọs kwuru, sị: “Ya mere, gaanụ mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m. Na-eme ha baptizim n’aha nke Nna na nke Ọkpara na nke mmụọ nsọ. Na-ezi ha ka ha debe ihe niile m nyere unu n’iwu.” (Mat. 28:19, 20; 1 Kọr. 15:6) O nwere ike ịbụ na ọtụtụ narị ndị na-eso ụzọ ya nọ mgbe ọ gwara ha ihe a. Jizọs mere ka o doo anya na onye ọ bụla chọrọ ịghọ onye na-eso ụzọ ya ga-emerịrị baptizim. (Mat. 11:29, 30) Onye ọ bụla chọrọ ife Chineke otú ọ chọrọ ga-ekweta na Jehova ji Jizọs na-emezu nzube ya. O kweta ihe a, e nwere ike ime ya baptizim. Ọ bụ naanị ụdị baptizim a ka Chineke kwadoro. Baịbụl kwuru ọtụtụ ihe na-egosi na n’oge ndịozi Jizọs, ndị ghọrọ ndị na-eso ụzọ Kraịst ọhụrụ ghọtara na ime baptizim dị mkpa. Ha egbughị oge ime baptizim.—Ọrụ 2:41; 9:18; 16:14, 15, 32, 33.
EGBULA OGE
9, 10. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta gbasara baptizim n’aka nwoke Itiopia, nakwa Pọl onyeozi?
9 Gụọ Ọrụ Ndịozi 8:35, 36. Otu nwoke Itiopia, bụ́ onye na-ekpe okpukpe ndị Juu, si Jeruselem na-ala obodo ya mgbe o fechara Chineke n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem. Mmụọ ozi gwara Filip ka ọ gakwuru ya ma “zisaara ya ozi ọma banyere Jizọs.” Olee ihe nwoke a mere? Ihe o mere mere ka o doo anya na obi dị ya ezigbo ụtọ maka eziokwu ọ mụtara. Ọ chọsiri ike ime ihe Jehova kwuru, n’ihi ya, e mere ya baptizim n’egbughị oge.
10 Onye ọzọ bụ otu nwoke onye Juu, bụ́ onye na-emesi Ndị Kraịst ike. A mụrụ ya n’obodo ndị bi na ya nyefere Chineke onwe ha. Ma, Jehova jụrụ ndị Juu n’ihi na ha erubereghị ya isi. Nwoke ahụ bu omenala okpukpe ndị Juu n’isi, ma mechaa mụta ihe ka mma. Jizọs si n’eluigwe gwa ya okwu. Gịnị ka nwoke a mere? O ji obi ụtọ nabata aka onye na-eso ụzọ Jizọs aha ya bụ Ananayas nyeere ya. Baịbụl kwuru banyere nwoke a, sị: “O bilikwara, e wee mee ya baptizim.” (Ọrụ 9:17, 18; Gal. 1:14) O doro anya na ị matala na nwoke onye Juu ahụ bụ onye e mechara kpọwa Pọl onyeozi. Ma, cheta na ozugbo ọ ghọtara na Chineke ji Jizọs na-emezu nzube ya, e mere ya baptizim n’egbughị oge.—Gụọ Ọrụ Ndịozi 22:12-16.
11. (a) Olee ihe na-eme ka ndị a na-amụrụ Baịbụl taa kpebie ka e mee ha baptizim? (b) Olee otú obi na-adị anyị ma anyị hụ ndị ọhụrụ nyefere Jehova onwe ha, e meekwa ha baptizim?
11 Otú ahụ ka ọ dịkwa ndị a na-amụrụ Baịbụl taa, ma hà bụ ndị na-eto eto ma hà bụ ndị torola eto. Ndị nwere okwukwe, obi ana-atọkwa ha ụtọ maka eziokwu Baịbụl ha mụtara, na-achọ inyefe Jehova onwe ha, e meekwa ha baptizim. Okwu baptizim a na-ekwu maka ha bụ okwu pụrụ iche a na-ekwu ná mgbakọ ọ bụla. Obi na-atọ Ndịàmà Jehova ụtọ mgbe ha hụrụ ka onye a na-amụrụ Baịbụl nabatara eziokwu ma kpebie ka e mee ya baptizim. Obi ọ̀ naghị atọ ndị nne na nna ụtọ mgbe ha hụrụ na ụmụ ha so ná ndị ọhụrụ a chọrọ ime baptizim? N’afọ ije ozi 2017, ihe karịrị narị puku abụọ na iri puku asatọ na anọ, bụ́ ndị “nwere ezi obi,” nyefere Jehova onwe ha, e meekwa ha baptizim. (Ọrụ 13:48) O doro anya na ndị ọhụrụ a e mere baptizim ghọtara na e kwesịrị ime Ndị Kraịst baptizim. Ma, gịnị ka ha mere tupu e mee ha baptizim?
12. Olee ihe onye a na-amụrụ Baịbụl ga-eme tupu e mee ya baptizim?
12 Tupu e mee onye a na-amụrụ Baịbụl baptizim, ọ ga-amụta eziokwu banyere Chineke, nzube ya, nakwa ihe o mere a ga-eji azọpụta ụmụ mmadụ. (1 Tim. 2:3-6) Ha kwesịrị inwe okwukwe nke ga-enyere ha aka irubere Chineke isi ma kwụsị ịkpa àgwà ndị na-adịghị ya mma. (Ọrụ 3:19) O doro anya na mmadụ agaghị enyefeli Chineke onwe ya ma ọ bụrụ na ọ na-akpa àgwà ndị ga-eme ka Alaeze Chineke kwaa ya. (1 Kọr. 6:9, 10) Ma, ịkpa àgwà ndị na-amasị Chineke abụghị naanị ebe okwu biri. Onye chọrọ inyefe Jehova onwe ya kwesịrị ịna-agachi ọmụmụ ihe na ozi ọma anya. Jizọs sịrị na ezigbo ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị ịna-ezi ozi ọma. (Ọrụ 1:8) Onye a na-amụrụ ihe ga-ebu ụzọ mee ihe ndị a. O mechazie ha, ya enyefee Jehova onwe ya n’ekpere, e meekwa ya baptizim n’ihu ọha.
MEE KA ONYE Ị NA-AMỤRỤ BAỊBỤL BURU IME BAPTIZIM N’OBI
13. Mgbe anyị na-amụrụ ndị ọzọ ihe, gịnị mere na anyị ekwesịghị ichefu na e kwesịrị ime ha baptizim ka ha nwee ike ịbụ ezigbo Ndị Kraịst?
13 Mgbe anyị na-enyere ụmụ anyị na ndị ọzọ aka ka ha na-eme ihe ndị ahụ dị mkpa, anyị kwesịrị iburu n’obi na ndị chọrọ ịbụ ezigbo ndị na-eso ụzọ Jizọs kwesịrị ime baptizim. Ọ bụrụ na anyị e buru ihe ndị a n’obi, ụjọ agaghị na-atụ anyị ịgwa ha na mmadụ inyefe Jehova onwe ya, e meekwa ya baptizim dị ezigbo mkpa. N’eziokwu, anyị chọrọ ka ụmụ anyị na ndị anyị na-amụrụ ihe mee baptizim.
14. Gịnị mere na anyị ekwesịghị ịmanye mmadụ ka e mee ya baptizim?
14 O doro anya na nne ma ọ bụ nna, onye na-amụrụ mmadụ ihe ma ọ bụ onye ọ bụla ọzọ n’ọgbakọ ekwesịghị ịmanye mmadụ ka o mee baptizim. Jehova anaghị eme otú ahụ. (1 Jọn 4:8) Kama, mgbe anyị na-akụziri ha ihe, anyị kwesịrị ịgwasi ha okwu ike ka ha gbalịa ka ha na Chineke dịrị n’ezigbo mma. Ihe ga-eme ka onye ahụ chọọ ka e mee ya baptizim bụ eziokwu ọ mụtara na otú o si agụsi ya agụụ ike ịghọ onye na-eso ụzọ Jizọs.—2 Kọr. 5:14, 15.
15, 16. (a) È nwere afọ ole mmadụ ga-anọ tupu a sị na o ruola ime baptizim? Kọwaa. (b) Olee ihe mere onye a na-amụrụ Baịbụl kwesịrị iji mee baptizim ka ọ bụrụ Onyeàmà Jehova, a sịgodị na e meela ya baptizim n’okpukpe mbụ ya?
15 E nweghị afọ ole mmadụ ga-anọ tupu a sị na o ruola ime baptizim. Mmadụ niile abụghị otu, ụfọdụ ndị a na-amụrụ Baịbụl na-eme nke ọma ngwa ngwa karịa ibe ha. E mere ọtụtụ ndị baptizim mgbe ha dị obere, ha akwụsịbeghịkwa ịna-efe Jehova. Ụfọdụ mụtara eziokwu mgbe ha katarala ahụ́, e meekwa ha baptizim. Ụfọdụ n’ime ha karịdịrị otu narị afọ.
16 Otu nwaanyị katarala ahụ́ jụrụ onye na-amụrụ ya Baịbụl ma ọ̀ dị mkpa ka o mee baptizim ọzọ. E meela ya baptizim kemgbe ọtụtụ afọ na chọọchị ndị ọ gaburula. Onye na-amụrụ ya Baịbụl gosiri ya ọtụtụ ebe na Baịbụl zara ajụjụ ya. Nwaanyị ahụ ghọtara ihe Baịbụl kwuru banyere baptizim, ya emee baptizim n’egbughị oge. N’agbanyeghị na ọ fọrọ obere ka o ruo iri afọ asatọ, o cheghị na baptizim adịghị ya mkpa. Naanị ihe ga-eme ka Jehova nabata baptizim anyị bụ ma anyị mụta nke bụ́ eziokwu banyere uche ya. N’ihi ya, e kwesịrị ime ndị ọhụrụ batara n’ọgbakọ baptizim, ọ bụrụgodị na e meela ha baptizim n’okpukpe mbụ ha.—Gụọ Ọrụ Ndịozi 19:3-5.
17. Gịnị ka mmadụ kwesịrị ichebara echiche n’ụbọchị a ga-eme ya baptizim?
17 Mmadụ na-enwe ezigbo obi ụtọ n’ụbọchị a na-eme ya baptizim. Ụbọchị ahụ bụkwa ụbọchị onye ahụ na-eji eche banyere ihe mmadụ inyefe Jehova onwe ya, e meekwa ya baptizim, pụtara. Mmadụ ime ihe niile o kwesịrị ime ka ezigbo Onye Kraịst abụghị obere ọrụ. Ọ bụ ya mere Jizọs ji jiri mmadụ ịbụ onye na-eso ụzọ ya tụnyere ịnyara yok. Ndị na-eso ụzọ Jizọs agaghị adịrị ‘onwe ha ndụ ọzọ, kama ha ga-adịrị onye ahụ ndụ, bụ́ onye nwụrụ n’ihi ha, e wee kpọlite ya.’—2 Kọr. 5:15; Mat. 16:24.
18. Olee ajụjụ ndị anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?
18 Mama Maria na-eche ụdị ihe a mgbe ọ jụrụ ajụjụ ndị ahụ dị ná mmalite isiokwu a. Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, o nwere ike ịbụ na ị jụọla onwe gị ajụjụ ndị a: ‘Nwa m ò jikerela ime baptizim? Ọ̀ ma nke a na-akọ gbasara Jehova nke ga-eme ka o nyefee ya onwe ya? Ò kwesịrị ịgụ ezigbo akwụkwọ, nweta ezigbo ọrụ tupu e mee ya baptizim? Ò meekwanụ mmehie dị oké njọ ma o mechaa baptizim?’ N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-atụle ajụjụ ndị a, tụleekwa otú ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst kwesịrị isi ele baptizim anya.