IHE I NWERE IKE ỊMỤ
Otú Ị Ga-esi Na-echeta Amaokwu Baịbụl
È nwetụla mgbe o siiri gị ike icheta amaokwu Baịbụl na-amasị gị? O nwere ike ịbụ amaokwu na-akasi gị obi, ma ọ bụ nke na-enyere gị aka ịkwụsị iche ihe na-adịghị mma, ma ọ bụkwanụ nke ị chọrọ ịgụrụ mmadụ. (Ọma 119:11, 111) Lee aro ụfọdụ nwere ike inyere gị aka ịna-echeta amaokwu Baịbụl.
-
Tinye tag n’amaokwu ahụ na JW Library®. Nwee tag ị kpọrọ “Amaokwu Baịbụl Ndị Dị M Mkpa.” E nwee amaokwu ọ bụla ị chọrọ ịna-echeta, tinye ya n’ebe ahụ.
-
Dee amaokwu ahụ ma dosa ya n’ebe ị ga na-ahụ ya. E nwee amaokwu ị chọrọ ịna-echeta, i nwere ike ide ya ná mpempe akwụkwọ ma dowe ya n’ebe ị ga na-ahụ ya. Ụfọdụ ndị na-amapawa ya n’akụkụ enyo ha. E nwekwara ndị na-amapawa ya na friji ha. Ụfọdụ na-eji ekwentị see amaokwu ahụ foto, jirizie ya mere foto na-adị n’ihu kọmputa ha, tablet ha ma ọ bụ ekwentị ha.
-
Dee ya n’obere kaadị. I nwere ike ide amaokwu ahụ n’elu obere kaadị, deekwa ihe ebe ahụ kwuru n’akụkụ ya nke ọzọ. I lee anya n’ebe ahụ i dere amaokwu ahụ, gị agbalịa icheta ihe o kwuru, ma ọ bụkwanụ i lee anya n’ebe i dere ihe o kwuru, gị agbalịzie icheta amaokwu kwuru ihe ahụ na Baịbụl.