Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 25

ABỤ NKE 7 Jehova Bụ Ike Anyị

Na-echeta na Jehova Bụ “Chineke Dị Ndụ”

Na-echeta na Jehova Bụ “Chineke Dị Ndụ”

“Jehova dị ndụ.”​—ỌMA 18:46.

IHE A GA-AMỤ

Ọ bụrụ na anyị ana-echeta na Chineke anyị na-efe bụ “Chineke dị ndụ,” ọ na-abara anyị ezigbo uru.

1. Olee ihe na-enyere ndị Jehova aka ịna-efe ya n’agbanyeghị nsogbu ndị na-abịara ha?

 BAỊBỤL kwuru na oge a anyị bi na ya “ga-adị oké egwu, taakwa akpụ.” (2 Tim. 3:1) Anyị bụ́ ndị ohu Jehova na-enwe nsogbu ndị ọzọ nọ n’ụwa ọjọọ a na-enwe. Ma a na-emegide anyị, na-akpagbukwa anyị. Gịnị na-enyere anyị aka ịna-efe Jehova n’agbanyeghị nsogbu ndị a? Otu ezigbo ihe na-enyere anyị aka bụ na anyị amatala na Jehova bụ “Chineke dị ndụ.”​—Jere. 10:10; 2 Tim. 1:12.

2. Olee otú Jehova si bụrụ Chineke dị ndụ?

2 Jehova bụ Onye dị adị. Ọ na-ahụ nsogbu ọ bụla na-abịara anyị, na-achọkwa mgbe niile inyere anyị aka. (2 Ihe 16:9; Ọma 23:4) Icheta na ọ bụ Chineke dị ndụ ga-enyere anyị aka idi nsogbu ọ bụla bịaara anyị. Ka anyị chọpụta otú Eze Devid si mee ya.

3. Gịnị ka Devid bu n’obi mgbe ọ sịrị na “Jehova dị ndụ”?

3 Devid ma Jehova, tụkwasịkwa ya obi. Mgbe Eze Sọl na ndị iro ya ndị ọzọ nọ na-achụ ya, o kpere ekpere ka Jehova nyere ya aka. (Ọma 18:6) Mgbe Jehova zara ekpere Devid ma napụta ya, ọ sịrị: “Jehova dị ndụ.” (Ọma 18:46) Ihe Devid na-ekwu abụghị naanị na o kwetara na Chineke dị adị. Otu akwụkwọ e ji eme nchọnchọ kwuru na Devid ji ya na-egosi na obi siri ya ike na Jehova bụ Chineke dị ndụ, Onye na-enyere ndị ya aka mgbe niile. N’eziokwu, Devid si n’ihe ndị mere ya mata na Chineke ya dị ndụ. Ihe a mekwara ka o kpebisikwuo ike ịna-ejere ya ozi na ịna-eto ya.​—Ọma 18:28, 29, 49.

4. Olee uru ịmata na Jehova bụ Chineke dị ndụ ga-abara anyị?

4 Ọ bụrụ na obi esie anyị ike na Jehova bụ Chineke dị ndụ, ọ ga-enyere anyị aka iji ịnụ ọkụ n’obi na-ejere ya ozi. Ọ ga-eme ka anyị nwee ike idi ọnwụnwa ndị na-abịara anyị, meekwa ka ọ na-agụsi anyị agụụ ike ịna-arụsi ọrụ ike n’ozi Jehova. Ọ ga-emekwa ka anyị kpebisie ike ịnọ Jehova nso.

CHINEKE DỊ NDỤ GA-EME KA Ị DỊ IKE

5. Gịnị ga-eme ka obi sie anyị ike ma ọnwụnwa bịara anyị? (Ndị Filipaị 4:13)

5 Anyị ga-enwe ike idi ọnwụnwa ọ bụla, ma nke nta ma nke ukwu, ma ọ bụrụ na anyị echeta na Jehova dị ndụ nakwa na ọ nọ ya inyere anyị aka. A sị ka e kwuwe, e nweghị nsogbu ọ bụla ga-abịara anyị karịrị Chineke. Ọ bụ Onye Pụrụ Ime Ihe Niile. Ọ ga-enyelikwa anyị ike anyị ga-eji edi ọnwụnwa. (Gụọ Ndị Filipaị 4:13.) Ihe a na-eme ka obi sie anyị ike ma ọnwụnwa bịara anyị. Ọ bụrụ na anyị achọpụta na Jehova nyeere anyị aka mgbe ọnwụnwa ndị obere bịaara anyị, ọ ga-eme ka obi sie anyị ike na ọ ga-anọnyekwara anyị ma ndị nke buru ibu bịa.

6. Olee ihe ndị mere n’oge Devid na-eto eto mere ka ọ tụkwasịkwuo Jehova obi?

6 Ka anyị lee ihe abụọ mere ná ndụ Devid mere ka obi sikwuo ya ike na Jehova ga-enyere ya aka. Mgbe ọ na-azụ atụrụ n’oge ọ ka na-eto eto, otu anụ ọhịa bea na otu ọdụm bịara buru atụrụ nna ya. Ugboro abụọ ahụ, Devid ji obi ike chụrụ anụmanụ ndị ahụ gawa ma napụta atụrụ ndị ahụ ha buuru. Ma, Devid echeghị na ọ bụ ike ya ka o ji mee ya. Ọ ma na ọ bụ Jehova nyere ya ike ime ya. (1 Sam. 17:34-37) Devid echefughị ihe ndị ahụ merenụ. Ichebara ha echiche mere ka obi sikwuo ya ike na Chineke dị ndụ ga-enye ya ike n’ọdịnihu.

7. Gịnị ka Devid lekwasịrị anya? Oleekwa otú o si nyere ya aka ịlụso Golayat ọgụ?

7 Mgbe e mechara, n’oge Devid na-erubeghị afọ iri abụọ, ọ gara n’ebe ndị agha Izrel mara ụlọikwuu. Ọ chọpụtara na ụjọ nọ na-atụ ndị agha Izrel n’ihi na otu dike ndị Filistia aha ya bụ Golayat nọ “na-echere ndị agha Izrel aka mgba.” (1 Sam. 17:10, 11) Ihe mere ka ụjọ na-atụ ndị agha Izrel bụ na ha lekwasịrị anya n’otú dike ahụ si gbaa dimkpa, nakwa n’otú o si na-eyi ha egwu. (1 Sam. 17:24, 25) Ma otú Devid si lee ihe ahụ anya dị iche. O weere ya na dike ndị Filistia ahụ “na-echere ndị agha Chineke dị ndụ aka mgba,” ọ bụghị ndị agha Izrel. (1 Sam. 17:26) Devid nọ na-eche banyere Jehova. Obi siri ya ike na Chineke ahụ nyeere ya aka mgbe ọ na-azụ atụrụ ga-enyekwara ya aka ugbu a. Ebe ọ bụ na obi siri ya ike na Jehova nọnyeere ya, ọ gara lụso Golayat ọgụ ma merie ya.​—1 Sam. 17:45-51.

8. Gịnị ga-eme ka obi sie anyị ike na Jehova ga-enyere anyị aka ma ọnwụnwa bịara anyị? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

8 Anyịnwa ga-emerili ọnwụnwa ma ọ bụrụ na anyị echeta na Chineke dị ndụ dị njikere inyere anyị aka. (Ọma 118:6) Ihe ga-eme ka obi sikwuo anyị ike na Jehova ga-enyere anyị aka bụ icheta ihe ndị o mere n’oge gara aga. Gụọ akụkọ Baịbụl ndị ga-echetara gị otú Jehova si napụta ndị na-efe ya. (Aịza. 37:17, 33-37) Gụọkwa akụkọ ma ọ bụ lee vidio ndị dị na jw.org ndị gosiri otú Jehova si nyere ụmụnna anyị aka n’oge a. Chetakwa oge ndị Jehova nyeere gịnwa aka. Echegbula onwe gị ma ọ bụrụ na i nweghị ike icheta ihe pụrụ iche Jehova meere gị, dị ka inyere gị aka ịlụso anụ ọhịa bea ma ọ bụ ọdụm ọgụ. Maka gịnị? Nke bụ́ eziokwu bụ na Jehova emeerela gị ọtụtụ ihe. Ọ dọtara gị ka gị na ya dịrị ná mma. (Jọn 6:44) Ugbu a kwa, ọ bụ enyemaka ya mere ị ka ji nọrọ n’ọgbakọ ya. Ọ ga-adị mma ka ị rịọ ya ka o nyere gị aka icheta oge ndị ọ zara ekpere gị, kwado gị n’oge dabara adaba, ma ọ bụ nyere gị aka mgbe ihe siiri gị ezigbo ike. Icheta ụdị ihe ndị a ga-eme ka obi sikwuo gị ike na Jehova agaghị akwụsị inyere gị aka.

Ihe anyị na-eme mgbe ọnwụnwa bịaara anyị gbasara Jehova (A ga-akọwa ya na paragraf nke 8 na nke 9)


9. Gịnị ka anyị kwesịrị icheta ma ọnwụnwa bịara anyị? (Ilu 27:11)

9 Ịghọta na Jehova bụ Chineke dị ndụ ga-eme ka anyị na-ele ọnwụnwa anya otú kwesịrị ekwesị. Olee otú ọ bụ? Anyị ga-ewere ọnwụnwa ndị na-abịara anyị ka ihe so n’ihe dị ezigbo mkpa na-esere Setan na Jehova. Ekwensu na-ekwu na ọ bụrụ na nsogbu abịara anyị, na anyị ga-ahapụ Jehova. (Job 1:10, 11; gụọ Ilu 27:11.) Ma, ọ bụrụ na anyị ana-erubere Jehova isi n’agbanyeghị ọnwụnwa, anyị na-egosi na anyị hụrụ Jehova n’anya, gosikwa na Setan bụ onye ụgha. Ndị ọchịchị hà na-emegide gị? Ihe ọ̀ na-esiri gị ike? Ndị mmadụ há anaghị ege gị ntị n’ozi ọma, ka è nwere nsogbu ọzọ gị na ya na-alụ? Ọ bụrụ otú ahụ, na-echeta na ọnwụnwa ndị na-abịara gị na-eme ka i nwee ohere ị ga-eji eme ka obi Jehova ṅụrịa. Chetakwa na Jehova agaghị ekwe ka ọnwụnwa ị na-agaghị edili bịara gị. (1 Kọr. 10:13) Ọ ga-enye gị ike ị ga-eji edi ya.

CHINEKE DỊ NDỤ GA-AKWỤ GỊ ỤGWỌ

10. Gịnị ka Chineke dị ndụ ga-emere ndị na-efe ya?

10 Jehova na-akwụ ndị na-efe ya ụgwọ. (Hib. 11:6) Ọ na-eme ka obi ruo anyị ala, na-emekwa ka ihe anyị nwere ugbu a ju anyị afọ. Ọ ga-enyekwa anyị ndụ ebighị ebi n’ọdịnihu. Anyị kwesịrị inwe olileanya n’ebe Jehova nọ, obi esie anyị ike na ọ chọrọ ịkwụ anyị ụgwọ, nweekwa ikike ọ ga-eji eme ya. Obi sie anyị ike otú a, ọ ga-eme ka anyị jiri ofufe Jehova kpọrọ ihe otú ahụ ndị ji obi ha niile fee ya n’oge gara aga mere. Ọ bụkwa ihe Timoti mere n’oge ndịozi.​—Hib. 6:10-12.

11. Gịnị mere ka Timoti rụsie ọrụ ike n’ọgbakọ? (1 Timoti 4:10)

11 Gụọ 1 Timoti 4:10. Timoti nwere okwukwe na Chineke dị ndụ ga-akwụ ya ụgwọ. N’ihi ya, ọ gbasiri mbọ ike n’ozi Jehova, nyekwara ndị ọzọ aka. Olee otú o si mee ya? Pọl onyeozi gbara ya ume ka ọ na-akụzikwu ihe nke ọma n’ozi ọma nakwa n’ọgbakọ. Ọ gwakwara ya ka ọ na-akpa àgwà ụmụnna ya ga-eji na-ama atụ, ma nwata ma okenye. E nyekwara ya ụfọdụ ọrụ siri ike ọ ga-arụ, ma iji obiọma nye ndụmọdụ n’ezoghị ọnụ mgbe o kwesịrị. (1 Tim. 4:11-16; 2 Tim. 4:1-5) Obi sikwara Timoti ike na ọ bụ eziokwu na mgbe ụfọdụ, ndị mmadụ agaghị ahụ ọrụ ọ rụrụ ma ọ bụ jaa ya mma maka ya, na Jehova ga-akwụ ya ụgwọ.​—Rom 2:6, 7.

12. Olee ihe nwere ike ime ka ndị okenye na-arụsi ọrụ ike n’ọgbakọ? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

12 Taa, obi kwesịkwara isi ndị okenye ike na Jehova na-ahụ ọrụ ọma ndị ha na-arụ, jirikwa ha kpọrọ ihe. Ndị okenye na-azụ atụrụ Chineke, na-akụzi ihe, na-ekwusakwa ozi ọma. Ma, e nwekwara ọtụtụ ndị okenye na-eso arụ ụlọ ndị nzukọ Jehova na-arụ, na-agbatakwara ndị ọdachi dakwasịrị ọsọ enyemaka. E nwekwara ndị nke so ná Ndị Na-aga Eleta Ndị Ọrịa ma ọ bụ na Kọmitii Ndị Na-ahụ Maka Mmekọrịta Anyị na Ndị Ụlọ Ọgwụ. Ndị okenye, ndị na-ewepụta onwe ha arụ ụdị ọrụ a, ghọtara na ọ bụ Jehova nwe ọgbakọ, ọ bụghị mmadụ. Ihe a na-eme ka ha jiri obi ha niile na-arụ ya, obi esiekwa ha ike na Jehova ga-akwụ ha ụgwọ maka ihe ndị ha na-eme.​—Kọl. 3:23, 24.

Chineke dị ndụ ga-akwụ gị ụgwọ maka ọrụ ị na-arụsi ike n’ọgbakọ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 12 na nke 13)


13. Olee otú obi na-adị Jehova ná mbọ anyị na-agba n’ozi ya?

13 Ọ bụghị mmadụ niile ga-abụli okenye. Ma, e nwere ihe anyị niile ga-enyeli Jehova. Obi na-atọ Jehova ụtọ ma anyị na-eme ike anyị niile ife ya. Ọ na-ahụ onyinye anyị na-enye iji kwado ọrụ zuru ụwa ọnụ, ọ bụrụgodị na ihe anyị na-enye ebughị ibu. Obi na-atọ ya ụtọ ma anyị gbaa mbọ welie aka ka anyị zaa ajụjụ n’ọmụmụ ihe n’agbanyeghị na anyị bụ ndị ihere. Obi na-atọkwa ya ụtọ ma anyị leghara mmejọ anya ma gbaghara ndị mejọrọ anyị. Ọ bụrụgodị na i chee na ị gaghị emeliri Jehova ihe niile ị ga-achọ imere ya, ka obi sie gị ike na o ji ihe ị na-emere ya kpọrọ ihe. Ọ hụrụ gị n’anya maka ya. Ọ ga-akwụkwa gị ụgwọ.​—Luk 21:1-4.

NỌRỌ CHINEKE DỊ NDỤ NSO

14. Olee otú anyị na Jehova ịdị n’ezigbo mma si enyere anyị aka ịna-erubere ya isi? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

14 Ọ bụrụ na anyị na Jehova adịrị n’ezigbo mma, ọ ga-adịrị anyị mfe ịna-erubere ya isi. Ọ bụ ihe Josef mere. Ọ jụwapụrụ isi ime omume rụrụ arụ. Ọ ma na ihe ọ bụla o kpebiri ime gbasara Jehova. Ọ chọghịkwanụ ime ihe ga-ewute ya. (Jen. 39:9) Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka anyị na Jehova dịrị n’ezigbo mma, anyị kwesịrị iwepụta oge na-ekpe ekpere ma na-amụ Okwu ya. Anyị na ya ga-esi otú ahụ na-adịkwu ná mma. Ọ bụrụ na anyị na Jehova abụrụ ezigbo enyi otú ahụ ya na Josef bụ, anyị agaghị achọ ime ihe ọ bụla ga-akpasu ya iwe.​—Jems 4:8.

Ịbịaru Chineke dị ndụ nso ga-enyere gị aka ịna-erubere ya isi (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14 na nke 15)


15. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe mere ụmụ Izrel mgbe ha nọ n’ala ịkpa? (Ndị Hibru 3:12)

15 Ọ na-adịrị ndị na-echefu na Jehova bụ Chineke dị ndụ mfe inupụrụ ya isi. Legodị ihe mere ndị Izrel mgbe ha nọ n’ala ịkpa. Ha ma na Jehova dị, ma ha malitere inwe obi abụọ ma ọ̀ ga-egboro ha mkpa ha. E nwedịrị mgbe ha jụrụ, sị: “Jehova ọ̀ nọnyeere anyị, ka ọ̀ bụ na ọ nọnyereghị anyị?” (Ọpụ. 17:2, 7) Ihe a mere ka ha nupụrụ Jehova isi. O doro anya na anyị achọghị ime ka ha. Ihe ha mere bụkwa ihe e ji adọ anyị aka ná ntị.​—Gụọ Ndị Hibru 3:12.

16. Olee ihe nwere ike ime ka okwukwe anyị nyụwa ka ọkụ?

16 Ụwa Ekwensu a na-eme ka o siere anyị ike ịnọrọ Jehova nso. Ọtụtụ ndị ekwetaghị na Chineke dị. Ọtụtụ mgbe, ọ na-eyi ka ihe ọ̀ na-agaziri ndị na-anaghị erubere Jehova isi. Anyị hụ ụdị ihe ahụ, o nwere ike ime ka okwukwe anyị nyụwa ka ọkụ. Ọ bụ eziokwu na anyị agaghị ekweta na Chineke adịghị, ma anyị nwere ike ịmalite ịna-eche ma Jehova ọ̀ ga-enyekwara anyị aka. E nwere mgbe onye dere Abụ Ọma nke 73 chere ụdị ihe a. Ọ hụrụ ka ndị nọ ya gburugburu na-emebi iwu Chineke, ihe ana-agaziri ha. Ihe a mere ka ọ na-eche ma ife Chineke ọ̀ bara uru.​—Ọma 73:11-13.

17. Gịnị ga-enyere anyị aka ịnọ Jehova nso?

17 Gịnị mechara nyere ọbụ abụ ahụ aka ịgbanwe otú o si eche echiche? O chere echiche ihe ga-eme ndị kwụsịrị ịtụkwasị Jehova obi. (Ọma 73:18, 19, 27) O chebakwaara uru ife Chineke na-aba echiche. (Ọma 73:24) Anyịnwa nwekwara ike ịtụgharị uche n’otú Jehova sirila gọzie anyị. Anyị nwekwara ike iche otú ndụ anyị gaara adị ma ọ bụrụ na anyị anaghị efe Jehova. Ime otú a ga-enyere anyị aka ikpebisi ike ife Jehova. Dịkwa ka ọbụ abụ ahụ, anyị ga-asị: “Ịbịa Chineke nso dị m mma.”​—Ọma 73:28.

18. Gịnị mere na ụjọ ekwesịghị ịtụwa anyị maka ihe ga-eme n’ọdịnihu?

18 Anyị ga-edili nsogbu ọ bụla nwere ike ịbịara anyị n’oge ikpeazụ a n’ihi na anyị bụ “ndị ohu ezi Chineke dị ndụ.” (1 Tesa. 1:9) Chineke anyị bụ Onye dị adị. Ọ na-enyere ndị na-efe ya aka. Ọ nọnyeere ndị fere ya n’oge gara aga. Ọ nọnyekwaara anyị taa. N’oge na-adịghị anya, a ga-enwe oké mkpagbu kachanụ n’ụwa a. Ma, Jehova ga-enyere anyị aka. (Aịza. 41:10) Ka anyị niile “nwee obi ike ma sị: ‘Jehova bụ onye na-enyere m aka. Agaghị m atụ egwu.’”​—Hib. 13:5, 6.

ABỤ NKE 3 Ị Bụ Ike Anyị, Olileanya Anyị, na Obi Ike Anyị