ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 26
Otú Ịhụ Chineke n’Anya Si Eme Ka Anyị Kwụsị Ịtụ Ụjọ
“Jehova nọnyeere m. Agaghị m atụ egwu. Gịnị ka mmadụ ga-emeli m?”—ỌMA 118:6.
ABỤ NKE 105 “Chineke Bụ Ịhụnanya”
IHE ISIOKWU A NA-EKWU *
1. Olee ihe tụrụ ụfọdụ ụmụnna anyị ụjọ?
LEGODỊ ihe ndị a mere ụfọdụ ụmụnna anyị. Nwanna Nestor na nwunye ya María chọrọ ịga ebe a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma. * Ma, iji nwee ike ime ya, ha ga-amụta otú ha ga-esi selata aka n’otú ha si emefu ego. Ma, ụjọ nọ na-atụ ha ma hà ga-enwelikwa obi ụtọ ma ọ bụrụ na ha enweghịzi nnukwu ego. Mgbe otu nwanna aha ya bụ Biniam ghọrọ Onyeàmà Jehova n’obodo a na-emegide Ndịàmà Jehova, ọ ma na a ga-akpagbukwa yanwa. Ihe ahụ tụrụ ya ezigbo ụjọ. Ma, ihe kacha tụọ ya ụjọ bụ ihe ndị ezinụlọ ha ga-eme ma ha chọpụta na ọ gbanweela okpukpe ya. Dọkịta gwara otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Valérie na ọ na-arịa ọrịa kansa jọgburu onwe ya. O siiri ya ike ịchọta dọkịta ga-awa ya ahụ́ n’amịnyeghị ya ọbara. O doro anya na ụjọ nọ na-atụ ya na o nwere ike ịnwụ.
2. Gịnị mere anyị kwesịrị iji gbasie mbọ ike ka anyị kwụsị ịtụ ụjọ?
2 Ụdị ụjọ ahụ ọ̀ tụtụla gị? Ọ tụtụla ọtụtụ n’ime anyị. Ọ bụrụ na anyị akwụsịghị ịtụ ụjọ a, o nwere ike ime ka anyị mee ihe ndị nwere ike ime ka anyị na Jehova gharazie ịdị ná mma. Ọ bụ ihe Ekwensu chọrọ. Ọ na-agbalịkwa ka ụjọ mee ka anyị kwụsị irubere iwu Jehova isi, nke ikwusa ozi ọma so na ya. (Mkpu. 12:17) Obi kpọrọ Ekwensu nkụ. Ọ naghị eme ebere. O sikwara ezigbo ike. Ma, e nwere ihe anyị ga-emeli ka ọ ghara inweta anyị. Gịnị ka ọ bụ?
3. Gịnị ga-enyere anyị aka ịkwụsị ịtụ ụjọ?
3 Ọ bụrụ na obi esie anyị ike na Jehova hụrụ anyị n’anya nakwa na ọ nọnyeere anyị mgbe niile, Setan agaghị emeli ka ụjọ tụọ anyị. (Ọma 118:6) Dị ka ihe atụ, e nwere nsogbu ndị tara akpụ bịaara onye dere Abụ ọma nke 118. O nwere ọtụtụ ndị iro. Ụfọdụ n’ime ha bụdị ndị isi. (Amaokwu nke 9 na nke 10). O nwedịrị mgbe e nyere ya ezigbo nsogbu. (Amaokwu nke 13). E nwekwara mgbe Jehova dọsiri ya aka ná ntị ike. (Amaokwu nke 18). N’agbanyeghị ihe ndị a, ọbụ abụ ahụ sịrị: “Agaghị m atụ egwu.” Gịnị mere obi ji sie ya ike otú a? Ọ bụ maka na ọ ma na Nna ya nke eluigwe bụ́ Jehova hụrụ ya n’anya nke ukwuu n’agbanyeghị na ọ dọrọ ya aka ya ná ntị. Obi siri ya ike na n’agbanyeghị otú ihe si dịrị ya, Chineke ya hụrụ ya n’anya dị njikere mgbe niile inyere ya aka.—Ọma 118:29.
4. Olee ihe ndị anyị ga-akwụsị ịtụ ụjọ ha ma obi sie anyị ike na Jehova hụrụ anyị n’anya?
4 Obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova hụrụ anyịnwa n’anya. Ọ bụrụ na obi esie anyị ike, ọ ga-enyere anyị aka ka anyị ghara ịtụ ụjọ ihe atọ ndị a: (1) ụjọ na anyị agaghị egboliri ezinụlọ anyị mkpa ha; (2) ụjọ mmadụ, nakwa (3) ụjọ ọnwụ. Ụmụnna ndị ahụ anyị kwuru okwu ha na paragraf nke mbụ kwụsịrị ịtụ ụjọ ha nọ na-atụ n’ihi na obi siri ha ike na Chineke hụrụ ha n’anya.
ỤJỌ NA Ị GAGHỊ EGBOLIRI NDỊ EZINỤLỌ GỊ MKPA HA
5. Olee ihe ndị nwere ike ịna-echegbu onyeisi ezinụlọ? (Kọwaa ihe e sere n’ihu Ụlọ Nche a.)
5 Onyeisi ezinụlọ bụ́ Onye Kraịst ji ọrụ ya bụ́ ịna-egboro ezinụlọ ya mkpa ha kpọrọ ihe. (1 Tim. 5:8) Ọ bụrụ na ị bụ onyeisi ezinụlọ, o nwere ike ịbụ na ị na-echegbu onwe gị n’oge a e nwere ọrịa koronavaịrọs na e nwere ike ị gaghịzi enwe ọrụ. I nwere ike ịna-echegbu onwe gị na o nwere ike isiri gị ike ịkpa afọ ezinụlọ gị na ịkwụ ụgwọ ụlọ. Ụjọ nwekwara ike ịna-atụ gị na ọ bụrụ na i nweghịzi ọrụ, ị gaghị enwetali ọrụ ọzọ. O nwekwara ike ịdị gị otú ọ dị Nwanna Nestor na nwunye ya anyị kwuburu okwu ha. I nwere ike iche na ihe ga-esiri gị ike ma ọ bụrụ na ị naghịzi enweta nnukwu ego. Ekwensu ejirila ụdị ụjọ a mee ka ọtụtụ ndị kwụsị ijere Jehova ozi.
6. Gịnị ka Ekwensu na-agbalị ime ka anyị kweta?
6 Ekwensu na-agbalị ime ka anyị kweta na ihe banyere onye nke ọ bụla n’ime anyị anaghị emetụ Jehova n’obi nakwa na ọ gaghị enyere anyị aka igboro ezinụlọ anyị mkpa ha. Ihe a nwere ike ime ka anyị kpebie ime ihe ọ bụla a chọrọ ka anyị mee ka a ghara ịchụ anyị n’ọrụ, ọ bụrụgodị na ọ bụ imebi iwu Chineke.
7. Gịnị ka Jizọs gwara anyị?
7 Jizọs ma Nna ya karịa onye ọ bụla. Ọ gwara anyị na Chineke ‘ma ihe na-akpa anyị tupu anyị arịọ ya.’ (Mat. 6:8) Jizọs makwa na Jehova dị njikere igboro anyị mkpa anyị. Ebe anyị bụ Ndị Kraịst, anyị bụ ndị ezinụlọ Chineke. Obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova, bụ́ Onyeisi ezinụlọ anyị, ga-eme ihe ọ gwara ndị isi ezinụlọ niile ka ha na-eme na 1 Timoti 5:8.
8. (a) Gịnị ga-enyere anyị aka ịkwụsị ịtụ ụjọ na anyị agaghị enwe ike igboro ndị ezinụlọ anyị mkpa ha? (Matiu 6:31-33) (b) Dị ka anyị hụrụ na foto e ji kọwaa paragraf a, olee otú anyị nwere ike isi na-eme ka di na nwunye ahụ gara ibunye otu nwanna nwaanyị nri?
8 Ọ bụrụ na obi esie anyị ike na Jehova hụrụ anyị n’anya nakwa na ọ hụrụ ndị ezinụlọ anyị n’anya, ọ gaghị esiri anyị ike ikweta na anyị ga-enweta ihe ndị dị anyị mkpa. (Gụọ Matiu 6:31-33.) Jehova chọrọ ịna-egboro anyị mkpa anyị. Ọ hụrụ anyị n’anya, na-emesapụkwa aka. Mgbe o kere ụwa, ihe o mere abụghị naanị inye anyị ihe ndị ga-eme ka anyị dịrị ndụ. O mekwara ka ihe ndị ga-eme ka anyị na-enwe obi ụtọ n’ụwa ju eju bara abara. (Jen. 2:9) Ọ bụrụgodị na e nwee mgbe anyị nwere naanị ihe ndị dị anyị mkpa, ka anyị cheta na ọ bụ ya nyere anyị ndị nke anyị nwere enwe. (Mat. 6:11) Anyị kwesịrị ịna-echeta na ihe ọ bụla anyị hapụrụ maka ozi Jehova enweghị ihe ọ bụ ma e jiri ya tụnyere ihe ndị Jehova na-enye anyị ugbu a, na ndị ọ ga-enye anyị n’ọdịnihu. Ọ bụkwa ihe a ka Nwanna Nestor na nwunye ya María chọpụtara.—Aịza. 65:21, 22.
9. Gịnị ka ị mụtara n’akụkọ Nwanna Nestor na María nwunye ya?
9 Nwanna Nestor na nwunye ya bi n’ezigbo ụlọ, nweekwa ọrụ dị mma na Kolombia. Ha sịrị: “Anyị chere echiche gbasara ire ụfọdụ ihe ndị anyị nwere ma jekwuoro Jehova ozi. Ma, ụjọ nọ na-atụ anyị na anyị agaghị na-enwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na anyị anaghịzi enweta nnukwu ego.” Gịnị nyeere ha aka ịkwụsị ụjọ a? Ha chere gbasara ọtụtụ ụzọ Jehova sirila gosi na ọ hụrụ ha n’anya. Ha kwụsịrị ọrụ a na-akwụ ha ezigbo ụgwọ ha na-arụ n’ihi na obi siri ha ike na Jehova agaghị akwụsị ịna-elekọta ha. Ha rere ụlọ ha, kwaga n’ebe a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma n’obodo ha bi. Olee otú obi dị ha gbasara ihe a ha mere? Nwanna Nestor sịrị: “Anyị ahụla na ihe e kwuru na Matiu 6:33 bụ eziokwu. O nweghị ihe ọ bụla dị anyị mkpa kọrọ anyị. Anyị na-enwekwu obi ụtọ ugbu a.”
EGWU MMADỤ
10. Gịnị mere ndị mmadụ ji atụ ụjọ mmadụ ibe ha?
10 Kemgbe Adam na Iv nupụụrụ Jehova isi, ụmụ mmadụ na-emegbu mmadụ ibe ha. (Ekli. 8:9) Dị ka ihe atụ, ndị mmadụ na-eji ikike ha nwere emegbu ndị ọzọ. Ndị omekome na-eme tigbuo zọgbuo. Ụmụ akwụkwọ dị arụrụala na-akparị ibe ha, na-eyikwa ha egwu. Ụfọdụ ndị na-emekpọ ndị ezinụlọ ha ọnụ. Ka a sịkwa ihe mere ndị mmadụ ji atụ ụjọ mmadụ ibe ha. Olee otú Ekwensu si agbalị iji ụjọ mmadụ eme ka anyị kwụsị ife Chineke?
11-12. Olee otú Ekwensu si eji egwu mmadụ agbalị ka anyị kwụsị ife Jehova?
11 Setan na-eji egwu mmadụ agbalị ime ka anyị kwụsị ikwusa ozi ọma ma ọ bụ ime ihe ndị ọzọ Jehova gwara anyị mee. Ọ na-emekwa ka ndị ọchịchị machie ozi ọma anyị ma na-akpagbu anyị. (Luk 21:12; ) N’ụwa Setan a, ọtụtụ ndị na-agbasa akụkọ ụgha gbasara Ndịàmà Jehova. Ndị kwetara ụgha ndị a nwere ike ịna-akwa anyị emo ma ọ bụdị kụọ anyị ihe. ( Mkpu. 2:10Mat. 10:36) Ihe a Setan na-eme ọ̀ na-eju anyị anya? Mba. Ọ na-eme ya kemgbe oge ndịozi Jizọs.—Ọrụ 5:27, 28, 40.
12 Ọ bụghị naanị mmegide si n’aka ndị ọchịchị ka Ekwensu ji kwara ngwá ọrụ. Ụfọdụ ndị na-atụ ụjọ ihe ndị ezinụlọ ha ga-eche ma ha ghọọ Ndịàmà Jehova karịa otú ha si atụ ụjọ ịkụ ha ihe. Ha hụrụ ndị ezinụlọ ha n’anya nke ukwuu, chọọkwa ka ha mata Jehova ma hụ ya n’anya. Ọ na-ewute ha ma ọ bụrụ na ndị ezinụlọ ha ana-akparị Chineke na ndị na-efe ya. Ma, mgbe ụfọdụ, ndị ezinụlọ ha ndị ahụ na-emegidebu ha na-emecha bata n’ọgbakọ. Ma, ọ bụrụkwanụ na ndị ezinụlọ anyị agbahapụ anyị ma sị na e nweghịzi ihe jikọrọ anyị na ha n’ihi na anyị bụzi Ndịàmà Jehova? Olee ihe anyị ga-eme?
13. Olee otú obi isi anyị ike na Jehova hụrụ anyị n’anya nwere ike isi nyere anyị aka ma ndị ezinụlọ anyị jụ anyị? (Abụ Ọma 27:10)
13 Ọmarịcha ihe e dere n’Abụ Ọma 27:10 nwere ike inyere anyị aka. (Gụọ ya.) Ọ bụrụ na anyị echeta otú Jehova si hụ anyị n’anya, obi ga-eru anyị ala ma a kpagbuwe anyị. Obi ga-esikwa anyị ike na ọ ga-agọzi anyị n’ihi na anyị na-atachi obi. Jehova ga-enyere anyị aka karịa onye ọ bụla ọzọ. Ọ ga-enye anyị ihe niile ga-eme ka anyị na-adị ndụ, mee ka obi ruo anyị ala, anyị ana-enwe obi ụtọ, anyị na ya ana-adịkwa ná mma. Ọ bụ ihe Nwanna Biniam anyị kwuburu okwu ya chọpụtara.
14. Gịnị ka ị mụtara n’akụkọ Nwanna Biniam?
14 Biniam ghọrọ Onyeàmà Jehova n’agbanyeghị na ọ ma na e nwere ike ịkpagbu ya. Ka anyị hụ otú ịmata na Jehova hụrụ ya n’anya si nyere ya aka imeri egwu mmadụ. Nwanna Biniam sịrị: “A kpagburu m karịa otú m tụrụ anya ya. Ma, ihe tụrụ m ụjọ karịa mkpagbu ndị ọchịchị bụ na ndị ezinụlọ m ga-emegide m. Ụjọ bịara tụwa m na otú a m kpebiri ịbụ Onyeàmà Jehova ga-ewute papa m na-abụghị Onyeàmà Jehova nakwa na ndị ezinụlọ m ga-eche na emechuola m ha ihu.” Ma, obi siri Biniam ike na Jehova anaghị akwụsị ilekọta onye ọ bụla ọ hụrụ n’anya. Biniam sịrị: “M chetara otú Jehova si nyere ndị ọzọ aka idi ihe isi ike, asị a kpọrọ ha, na ihe ndị mmadụ kụrụ ha. Ama m na ọ bụrụ na mụ ana-erubere Jehova isi, ọ ga-agọzi m. Mgbe a nwụchiri m ọtụtụ ugboro ma taa m ezigbo ahụhụ, m hụrụ otú Jehova si enyere anyị aka mgbe ọ dị anyị mkpa ma ọ bụrụ na anyị akwụsịghị irubere ya isi.” Jehova ghọọrọ Biniam ezigbo Nna, ndị ya aghọọkwara ya ezigbo ndị ezinụlọ.
ỤJỌ ỌNWỤ
15. Gịnị mere na ịtụ ụjọ ọnwụ adịghị njọ mgbe ụfọdụ?
15 Baịbụl kwuru na ọnwụ bụ onye iro. (1 Kọr. 15:25, 26) Ụjọ ọnwụ nwere ike ịtụ anyị, karịchaa ma ọ bụrụ na anyịnwa ma ọ bụ onye anyị na-arịa ezigbo ọrịa. Gịnị mere anyị ji atụ ụjọ ọnwụ? Ọ bụ n’ihi na Jehova kere anyị ka anyị chọọ ịdị ndụ ebighị ebi. (Ekli. 3:11) Ma, ụjọ ọnwụ nwere ike ichebe anyị. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ime ka anyị na-eri nri dị mma ma na-emega ahụ́, gaa hụ dọkịta ma ṅụọ ọgwụ mgbe ahụ́ na-adịghị anyị, gharakwa ime ihe ọ bụla nwere ike ịta isi anyị.
16. Olee otú Setan si agbalị iji ụjọ ọnwụ eme ka anyị kwụsị ife Chineke?
16 Setan ma na ndụ anyị dị anyị ezigbo mkpa. Ma, o kwuru na anyị nwere ike ịhapụ ihe ọ bụla, ma adịm ná mma anyị na Jehova, iji mee ka anyị dịrị ndụ n’ụwa ochie a. (Job 2:4, 5) Ihe a Ekwensu kwuru bụ okpookpo ụgha. Ma, ebe o “nwere ikike ịkpata ọnwu,” ọ na-agbalị iji ụjọ ọnwụ a anyị na-atụ eme ka anyị kwụsị ife Jehova. (Hib. 2:14, 15) Mgbe ụfọdụ, ndị Ekwensu ji arụ ọrụ na-eyi ndị Jehova egwu na ha ga-egbu ha ma ọ bụrụ na ha akwụsịghị ife Chineke. Mgbe ụfọdụkwa, Ekwensu nwere ike iji ọrịa na-arịasi anyị ike gbalịa ime ka anyị nupụrụ Chineke isi. Ndị dọkịta ma ọ bụ ndị ezinụlọ anyị na-abụghị Ndịàmà Jehova nwere ike ịna-enye anyị nsogbu ka anyị kweta ka a mịnye anyị ọbara, bụ́kwanụ ihe Jehova sịrị anyị emela. Mmadụ nwekwara ike ịgbalịwa ka anyị kweta ka e si n’ụzọ Baịbụl na-akwadoghị gwọọ anyị ọrịa.
17. Dị ka e kwuru ná Ndị Rom 8:37-39, gịnị mere na anyị ekwesịghị ịtụ ọnwụ ụjọ?
17 Ọ bụ eziokwu na anyị achọghị ịnwụ, ma, anyị ma na Jehova agaghị akwụsị ịhụ anyị n’anya ọ bụrụgodị na anyị anwụọ. (Gụọ Ndị Rom 8:37-39.) Ọ bụrụ na enyi Jehova anwụọ, ọ ka na-echeta ya. N’anya ya, onye ahụ ka dị ndụ. (Luk 20:37, 38) Ọ na-agụsi ya agụụ ike ịkpọlite onye ahụ n’ọnwụ. (Job 14:15) Jehova kwụrụ nnukwu ụgwọ ka anyị “nwee ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16) Anyị ma na Jehova hụrụ anyị n’anya nke ukwuu, na-elekọtakwa anyị. N’ihi ya, kama ịhapụ Jehova ma ọrịa bịa anyị ma ọ bụkwanụ ma e yie anyị egwu ọnwụ, anyị ga-atụkwasị ya obi na ọ ga-akasi anyị obi, nyekwa anyị amamihe na ike anyị ga-eji die ya. Ọ bụ ihe a ka Nwanna Nwaanyị Valérie na di ya mere.—Ọma 41:3.
18. Gịnị ka ị mụtara n’ihe Nwanna Nwaaanyị Valérie mere?
18 Mgbe Nwanna Nwaanyị Valérie dị afọ iri atọ na ise, dọkịta gwara ya na ọ na-arịa ọrịa kansa jọgburu onwe ya. Ka anyị hụ otú o si merie ụjọ ọnwụ maka na ọ hụrụ Jehova n’anya. Ọ sịrị: “Ihe ahụ dọkịta kwuru riri mụ na di m ọnụ. E kwesịrị ịwa m ahụ́ ka m nwee ike ịdị ndụ. M gakwuuru ọtụtụ ndị dọkịta na-awa ahụ́. Ma ha niile ekweghị na ha ga-awa m ahụ́ n’amịnyeghị m ọbara. Ezigbo ụjọ tụrụ m. Ma, e nweghị otú m ga-esi kwere ka a mịnye m ọbara ebe ọ bụ na iwu Chineke sịrị ka anyị ghara ime otú ahụ. Ná ndụ m niile, Jehova egosila m na ọ hụrụ m n’anya. Ugbu a, ọ bụzi m ga-egosi Jehova na m hụrụ ya n’anya. Mgbe ọ bụla dọkịta gwara m ihe na-adịghị mma gbasara ọrịa m ahụ, m na-ekpebisikwu ike ime Jehova obi ụtọ ma mee Ekwensu onye ụgha. E mechara waa m ahụ́ n’amịnyeghị m ọbara. Ọ bụ eziokwu na ọrịa m ahụ alabeghị, ma Jehova nyere m ihe niile dị m mkpa. Dị ka ihe atụ, n’ọmụmụ ihe anyị gara tupu dọkịta agwa m na m na-arịa ọrịa kansa, isiokwu Ụlọ Nche anyị mụrụ bụ ‘Iji Obi Ike Na-edi Nsogbu Ndị E Nwere Taa.’ * Isiokwu ahụ kasiri anyị ezigbo obi. Anyị gụrụ ya ọtụtụ ugboro. Ụdị isiokwu ahụ na ịna-eme ihe ndị gbasara ofufe Jehova emeela ka obi ruo mụ na di m ala, meekwa ka anyị na-ekpebi ihe ndị dị mma.”
ỊKWỤSỊ ỊTỤ ỤJỌ
19. Gịnị ga-eme n’oge na-adịghị anya?
19 Jehova enyerela ụmụnna ndị nọ n’ụwa niile aka imeri nsogbu ndị bịaara ha nakwa ịlụso Ekwensu ọgụ. (1 Pita 5:8, 9) Gịnwa ga-emelikwa ya. N’oge na-adịghị anya, Jehova ga-agwa Jizọs na ndị ya na ha ga-eso chịa ka ha “bibie ọrụ Ekwensu.” (1 Jọn 3:8) Ha bibichaa ya, ndị na-efe Chineke n’ụwa a ‘agaghị atụ egwu ihe ọ bụla, ụjọ agaghịkwa atụ ha.’ (Aịza. 54:14; Maị. 4:4) Ma, tupu mgbe ahụ, anyị kwesịrị ịgbalịsi ike kwụsị ịtụ ụjọ.
20. Gịnị ga-enyere anyị aka ịkwụsị ịtụ ụjọ?
20 Anyị kwesịrị ịna-eme ka obi sie anyị ike na Jehova hụrụ anyị n’anya nakwa na ọ na-echebe ndị ya. Ihe ga-enyere anyị aka ime ya bụ iche gbasara otú Jehova si chebe ndị ohu ya n’oge gara aga na ịna-ekwu gbasara ya. Anyị kwesịkwara ịna-echeta otú o si nyere anyịnwa aka ná nsogbu ndị bịaara anyị. Anyị ga-akwụsịli ịtụ ụjọ ma Jehova nyere anyị aka.—Ọma 34:4.
ABỤ NKE 129 Anyị Ga Na-atachi Obi
^ Mgbe ụfọdụ, ịtụ ụjọ abụghị ihe ọjọọ n’ihi na o nwere ike ime ka mmadụ ghara ịba ná nsogbu. Ma, mgbe ụfọdụ, ịtụ ụjọ adịghị mma. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na Ekwensu na-agbalị ime ka anyị jiri ụjọ mee ihe anyị na-ekwesịghị ime. O doro anya na anyị kwesịrị ịgbasi mbọ ike ka anyị ghara ịna-atụ ụdị ụjọ a. Gịnị ga-enyere anyị aka? N’isiokwu a, anyị ga-ahụ na ọ bụrụ na obi esie anyị ike na Jehova nọnyeere anyị nakwa na ọ hụrụ anyị n’anya, anyị ga-akwụsị ịtụ ụjọ ọ bụla.
^ Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.