ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 23
Ị Nọghị Naanị Gị n’Ihi na Jehova Nọnyeere Gị Mgbe Niile
“Jehova nọ ndị niile na-akpọku ya nso.”—ỌMA 145:18.
ABỤ NKE 28 Ịbụ Enyi Jehova
IHE ISIOKWU A NA-EKWU *
1. Gịnị nwere ike ime ka owu na-ama ndị ohu Jehova mgbe ụfọdụ?
OWU na-ama ọtụtụ n’ime anyị mgbe ụfọdụ. E nwere ndị nke ha na-anaghị anọte aka, nweekwa ndị nke ha na-anọte aka. Owu nwekwara ike ịna-ama anyị mgbe anyị na ọtụtụ ndị nọ. Ọ na-esiri ụfọdụ ike imeta ndị enyi ma ha gafee n’ọgbakọ ọhụrụ. O nwere ndị si n’ezinụlọ na-emekọ ihe ọnụ, ma, owu na-ama ha ma ha gaa ebe tere aka n’ebe ndị ezinụlọ ha nọ. E nwekwara ndị ọzọ owu na-ama n’ihi na mmadụ nwụnahụrụ ha. Owu nwekwara ike ịna-ama ụfọdụ Ndị Kraịst, nke kacha nke ndị ka batara n’ọgbakọ ọhụrụ, ma ọ bụrụ na ndị enyi ha na ndị ezinụlọ ha na-abụghị Ndị Kraịst na-akpagbu ha.
2. Olee ajụjụ ndị anyị ga-aza?
2 Jehova ma ihe niile gbasara anyị, na-aghọtakwa ya. Ọ bụrụ na owu ana-ama anyị, ọ ma gbasara ya. Ọ chọkwara inyere anyị aka. Ma, olee otú o si enyere anyị aka? Gịnị ka anyị nwere ike ime iji nyere onwe anyị aka? Olee otú anyị nwere ike isi nyere ndị anyị na ha nọ n’ọgbakọ owu na-ama aka? Ka anyị zaa ajụjụ ndị a.
JEHOVA JI ANYỊ KPỌRỌ IHE
3. Olee otú Jehova si nyere Ịlaịja aka?
3 Jehova chọrọ ka ndị niile na-efe ya na-enwe obi ụtọ. Ọ nọ anyị nso, ọ na-amakwa ma anyị chegbuwe onwe anyị. (Ọma 145:18, 19) Chegodị otú Jehova si nyere Ịlaịja onye amụma aka. Ịlaịja onye amụma biri ndụ mgbe ihe siri ezigbo ike n’Izrel. A na-akpagbu ndị na-efe Jehova, chọọkwa igbu Ịlaịja. (1 Eze 19:1, 2) O nwekwara ike ịbụ na ihe kacha nyee Ịlaịja nsogbu bụ na o chere na ọ bụ naanị ya bụ onye amụma Jehova fọrọnụ. (1 Eze 19:10) Chineke mere ngwa ngwa nyere Ịlaịja aka. Jehova zitere mmụọ ozi ka ọ gbaa ya ume ma mee ka obi sie ya ike na a ka nwere ọtụtụ ndị na-atụ egwu Chineke n’Izrel.—1 Eze 19:5, 18.
4. Olee otú ihe e kwuru na Mak 10:29, 30 si gosi na Jehova na-eche banyere ndị ohu ya ndị ezinụlọ ha na ndị enyi ha gbahapụrụ?
4 Jehova ma na ọ bụrụ na anyị ekpebie ife ya, ọ ga-efu ụfọdụ n’ime anyị ọtụtụ ihe. Otu n’ime ha bụ na ndị ezinụlọ anyị na ndị enyi anyị nwere ike ịkwụsị inyere anyị aka. O nwere ike ịbụ na Pita nọ na-echegbu onwe ya gbasara ihe a. Ọ bụ ya mere o ji jụọ Jizọs, sị: “Anyị ahapụla ihe niile soro gị. Gịnịkwanụ ka anyị ga-enweta?” (Mat. 19:27) Jizọs mesiri ndị na-eso ụzọ ya obi ike na ndị ha na ha na-efekọ Chineke ga-abụ ndị ezinụlọ ha. (Gụọ Mak 10:29, 30.) Ihe ọzọ bụ na Jehova, Nna anyị nke eluigwe, kwere nkwa na ya ga-akwado onye ọ bụla chọrọ ife ya. (Ọma 9:10) Ka anyị leba anya n’ihe ụfọdụ anyị nwere ike ime ka Jehova nyere anyị aka ma owu mawa anyị.
IHE I NWERE IKE IME MA OWU NA-AMA GỊ
5. Olee uru iche gbasara otú Jehova si enyere gị aka ga-abara gị?
5 Na-eche gbasara otú Jehova si enyere gị aka. (Ọma 55:22) Ọ ga-enyere gị aka ịmata na ọ bụghị naanị gị nọ. Otu nwanna nwaanyị na-alụbeghị di aha ya bụ Carol, * onye ndị ezinụlọ ya na-abụghị Ndịàmà Jehova, kwuru, sị: “Icheta otú Jehova si nyere m aka mgbe ọnwụnwa bịara m na ịtụgharị uche na ya emeela ka m mata na ọ bụghị naanị m nọ. O meekwala ka obi sie m ike na Jehova ga-anọgide na-anọnyere m n’ọdịnihu.”
6. Olee otú 1 Pita 5:9, 10 ga-esi nyere ndị owu na-ama aka?
6 Chee gbasara otú Jehova si nyere ndị ohu ya ndị ọzọ owu na-ama aka. (Gụọ 1 Pita 5:9, 10.) E nwere otu nwanna aha ya bụ Hiroshi. Ọ bụ naanị ya bụ Onyeàmà Jehova n’ezinụlọ ha. Ọ sịrị: “Ọ dị mfe ịchọpụta na n’ọgbakọ, onye ọ bụla nwere nsogbu nke ya. Ịmata na onye ọ bụla na-eme ike ya niile iji fee Jehova ga-eme ka obi sie onye naanị ya bụ Onyeàmà Jehova n’ezinụlọ ha ike na ọ nọghị naanị ya.”
7. Olee otú ekpere si enyere gị aka?
7 Na-ekpe ekpere, na-agụ Baịbụl, na-agakwa ọmụmụ ihe. Na-agwa Jehova ihe dị gị n’obi. (1 Pita 5:7) Mgbe otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Massiel ghọrọ Onyeàmà Jehova, owu bidoro ịma ya n’ihi na ndị ezinụlọ ya abụghị Ndịàmà Jehova. Ọ sịrị: “Ihe kacha nyere m aka bụ ịna-akọrọ Jehova otú ọ dị m n’obi. M na-ekpekwa ekpere ọtụtụ ugboro n’ụbọchị ọ bụla na-agwa ya ihe dị m n’obi.”
8. Olee otú ịgụ Baịbụl na ịtụgharị uche na ya si enyere anyị aka?
8 Na-agụ Akwụkwọ Nsọ mgbe niile, na-atụgharị uche n’ihe dị iche iche ị gụtara na ya gosiri na Jehova hụrụ gị n’anya. Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Bianca onye ndị ezinụlọ ya gwara okwu ọjọọ mgbe ọ chọrọ ịghọ Onyeàmà Jehova kwuru, sị: “Ịgụ akụkọ ndị a kọrọ na Baịbụl na ịtụgharị uche na ha nakwa n’akụkọ ndụ ụmụnna anyị a kpagburu otú e si na-akpagbu m nyeere m aka.” Ụfọdụ ụmụnna na-ebute amaokwu Baịbụl ụfọdụ ndị ga-akasi ha obi n’isi, dị ka Abụ Ọma 27:10 na Aịzaya 41:10. Ndị ọzọ achọpụtala na igere Baịbụl na akwụkwọ anyị ndị a na-egere egere mgbe ha na-akwadebe ọmụmụ ihe enyerela ha aka ka owu ghara ịna-amacha ha.
9. Olee otú ịga ọmụmụ ihe si abara gị uru?
9 Gbalịa na-agachi ọmụmụ ihe anya, ọ ga-abara gị ezigbo uru. Ị ga-esikwa otú ahụ matakwuo ụmụnna gị. (Hib. 10:24, 25) Nwanna Nwaanyị Massiel anyị kwuburu okwu ya sịrị: “N’agbanyeghị na m bụ onye ihere, m kpebiri na m ga na-aga ọmụmụ ihe ọ bụla, na-azakwa ajụjụ. Ihe a mere ka mụ na ụmụnna nọ n’ọgbakọ anyị dịrịkwuo ná mma.”
10. Gịnị mere imeta ụmụnna anyị enyi ji dị mkpa?
10 Na-emeta ụmụnna enyi. Meta ụmụnna ndị i nwere ike ịmụta ihe n’aka ha enyi, ma ndị gị na ha na-abụghị ọgbọ ma ọ bụ ndị gị na ha na-esighị otu ebe. Baịbụl gwara anyị na ndị agadi nwere amamihe. (Job 12:12) Ndị agadi nwekwara ọtụtụ ihe ha nwere ike ịmụta n’aka ndị na-eto eto. Devid bụ obere nwa n’ebe Jọnatan nọ. Ma nke ahụ emeghị ka ha ghara ịbụ ezigbo enyi. (1 Sam. 18:1) Devid na Jọnatan nyeere ibe ha aka ife Jehova n’agbanyeghị nsogbu ndị siri ike bịaara ha. (1 Sam. 23:16-18) Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Irina onye ọ bụ naanị ya bụ Onyeàmà Jehova n’ezinụlọ ha kwuru, sị: “Ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwaanyị nwere ike ịghọrọ anyị ndị nne na nna na ụmụnne. Jehova nwere ike iji ha nyere anyị aka.”
11. Gịnị ka anyị kwesịrị ime iji meta ezigbo ndị enyi?
11 Imeta ndị enyi ọhụrụ nwere ike isiri anyị ike, karịchaa, ma ọ bụrụ na anyị bụ ndị ihere. E nwere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Ratna. Ọ bụ onye ihere. Ọ batara n’ọgbakọ n’agbanyeghị mkpagbu a na-akpagbu ya. Ọ sịrị: “Ekwetara m na enyemaka ndị ọgbakọ anyị dị m mkpa.” O nwere ike ịna-esiri anyị ike ịgwa ndị ọzọ ihe dị anyị n’obi. Ma, ọ bụrụ na anyị agbalịa na-agwa ha ihe dị anyị n’obi, ọ ga-eme ka anyị na ha bụrụ ezigbo enyi. Ndị enyi gị chọrọ inyere gị aka, chọọkwa ịgba gị ume. Ma, ọ bụ gị ga-eme ka ha mata otú ha ga-esi eme ya.
12. Olee otú ịga ozi ọma si enyere anyị aka imeta ezigbo ndị enyi?
12 Otu ụzọ kacha mma isi meta ụmụnna anyị enyi bụ anyị na ha ịrụ n’ozi ọma. Carol anyị kwuru okwu ya sịrị: “Iso ụmụnna na-aga ozi ọma na ịna-eme ihe ndị ọzọ a na-eme n’ọgbakọ emeela ka m meta ọtụtụ n’ime ha enyi. Jehova ejirila ha nyere m aka kemgbe ọtụtụ afọ.” Imeta ụmụnna anyị enyi na-aba ezigbo uru. Jehova na-eji ndị enyi anyị ndị a na-enyere anyị aka mgbe obi na-adịghị anyị mma, dị ka mgbe owu na-ama anyị.—Ilu 17:17.
NYERE NDỊ ỌZỌ AKA KA HA MARA NA ANYỊ NA HA BỤ OTU EZINỤLỌ
13. Olee ọrụ onye ọ bụla n’ime anyị nwere n’ọgbakọ?
13 Ọ bụ ọrụ onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ ime ka udo na-adị n’ọgbakọ na ịna-ahụ ndị ọzọ n’anya ka owu ghara ịna-ama ha. (Jọn 13:35) Ihe anyị na-eme na ihe anyị na-ekwu nwere ike ịgba ndị ọzọ ume. Otu nwanna nwaanyị sịrị: “Mgbe m mụtara eziokwu dị na Baịbụl, mụ na ndị ọgbakọ anyị bịara bụrụ otu ezinụlọ. Ọ garaghị adịrị m mfe ịbụ Onyeàmà Jehova ma a sị na ha enyereghị m aka.” Gịnị ka i nwere ike ime iji nyere ndị ndị ezinụlọ ha na-anọghị n’ọgbakọ aka ka ha mara na ụmụnna hụrụ ha n’anya?
14. Olee ihe i nwere ike ime ka gị na ndị ọhụrụ bụrụ enyi?
14 Na-emeta ndị ọhụrụ enyi. Otu ụzọ anyị nwere ike isi mee ya bụ ịnabata ndị ọhụrụ n’ọgbakọ anyị. (Rom 15:7) Ma, ọ bụghị naanị ekele ka anyị ga na-ekele ha. Anyị chọrọ ka anyị na ha dịrị n’ezigbo mma. N’ihi ya, gosi ha na ihe gbasara ha na-emetụ gị n’obi. Gbalịa ka ị ghọta ihe ndị ha na ha na-alụ. Ma, ajụkwala ha ajụjụ ndị ga-emenye ha ihere. O nwere ike isiri ụfọdụ n’ime ha ike ikwu ihe dị ha n’obi. N’ihi ya, kpachara anya ka ị ghara ịmanye ha ikwu okwu. Kama, jiri akọ na-ajụ ha ajụjụ ma na-ege ha ntị ma ha zawa ya. Dị ka ihe atụ, i nwere ike ịjụ onye ahụ otú o si bata n’ọgbakọ.
15. Olee otú ndị ma nke a na-akọ n’ọgbakọ nwere ike isi nyere ndị ọzọ aka?
15 Ndị niile nọ n’ọgbakọ ga na-eme nke ọma ma ọ bụrụ na Ndị Kraịst ma nke a na-akọ, karịchaa ndị okenye, ana-egosi ha na ha hụrụ ha n’anya. Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Melissa onye nne ya zụrụ n’ọgbakọ sịrị: “Obi dị m
ezigbo ụtọ maka ụmụnna ndị ghọọrọ m nne na nna kemgbe m batara n’ọgbakọ. Mgbe ọ bụla m chọrọ ikwu otú ọ dị m n’obi, m na-agakwuru ụmụnna ndị a.” E nwere otu nwanna nwoke na-eto eto aha ya bụ Mauricio. Mgbe onye na-amụrụ ya Baịbụl dapụrụ n’ọgbakọ, owu mara ya. Ọ sịrị: “Otú ndị okenye si gosi na ha hụrụ m n’anya nyeere m ezigbo aka. Ha na-agwa m okwu mgbe niile. Mụ na ha na-arụ n’ozi ọma, ha ana-akọkwara m ihe ndị ha mụtara n’ọmụmụ Baịbụl ha. Mụ na ha na-esokwa egwu egwuregwu.” Melissa na Mauricio mechara banye ozi oge niile.16-17. Olee ụzọ dị iche iche anyị nwere ike isi nyere ụmụnna anyị aka?
16 Si n’ụzọ dị iche iche na-enyere ha aka. (Gal. 6:10) Otu nwanna na-eje ozi ala ọzọ n’ebe dị ezigbo anya n’ebe ezinụlọ ya nọ aha ya bụ Leo sịrị: “Ọtụtụ mgbe, obere ihe e meere gị n’oge ọ dị gị mkpa na-aba uru. Echetara m otu ụbọchị ụgbọala m kpọkara. Mgbe m mechara ruo ụlọ, ike gwụchara m. Ma otu di na nwunye kpọrọ m ka m bịa n’ụlọ ha rie nri. Echetaghị m ihe anyị riri n’ụbọchị ahụ, ma echetara m otú ha si meda obi gee m ntị. O mere ka obi ruo m ala.”
17 Ịga mgbakọ sekit na mgbakọ ukwu na-atọ anyị ezigbo ụtọ n’ihi na ọ na-eme ka anyị na ụmụnna anyị nọkọọ na-ekwurịta ihe ndị anyị mụtara. Carol anyị kwuru okwu ya ná mmalite sịrị: “Owu na-akacha ama m ma m gaa mgbakọ ukwu na mgbakọ sekit. Ihe kpatara ya bụ na n’agbanyeghị na ọtụtụ puku ụmụnna gbara m gburugburu, ọ na-abụkarị onye nke ọ bụla na ndị ezinụlọ ya nọ. Ma, ebe ọ bụ naanị m na-anọ, owu na-ama m.” O nwere ndị ọzọ ọ na-esiri ike ịga mgbakọ mbụ ha ga-aga ma di ha ma ọ bụ nwunye ha nwụọ. Ò nwere onye ị maara ọ dị otú ahụ? I nwere ike ịkpọ ya ka ọ bịa soro ezinụlọ unu ná mgbakọ ọzọ unu ga-enwe.
18. Olee otú anyị nwere ike isi mee ihe e kwuru ná 2 Ndị Kọrịnt 6:11-13 mgbe anyị na-akpọ ụmụnna anyị ka ha bịa n’ụlọ anyị?
18 Gị na ha na-anọrị. Gbalịa ka gị na ụmụnna dị iche iche na-emekọ ihe ọnụ, 2 Ndị Kọrịnt 6:11-13.) Melissa anyị kwuburu okwu ya sịrị: “Obi na-adị anyị ezigbo ụtọ ma ụmụnna anyị kpọọ anyị ka anyị bịa n’ụlọ ha ka anyị na ha nọrịa ma ọ bụ soro ha mee njem.” Ò nwere onye nọ n’ọgbakọ unu ị ga-achọ ịkpọ ka ọ bịa n’ụlọ gị?
nke kacha nke, ndị owu na-ama. Anyị kwesịrị iji obi anyị niile hụ ụmụnna anyị n’anya, karịchaa ụdị ndị ahụ. (Gụọ19. Olee mgbe anyị na Ndị Kraịst ibe anyị ịnọ nwere ike ịkacha baara ha uru?
19 E nwere oge ndị ọ ga-atọgbu ụmụnna anyị atọgbu ka anyị na ha nọrịa. O nwere ike isiri ụfọdụ n’ime ha ike ha na ndị ezinụlọ ha na-abụghị Ndịàmà Jehova ịnọ n’oge ha na-eme ememme okpukpe. Obi na-ajọ ụfọdụ ndị ezigbo njọ n’ụbọchị ụfọdụ, dị ka n’ụbọchị dabara n’ụbọchị onye ha nwụrụ. Ọ bụrụ na anyị ewepụta oge ka anyị na ha nọrịa, anyị na-egosi na anyị ji ‘obi anyị niile’ hụ ha n’anya.—Fil. 2:20.
20. Olee otú ihe Jizọs kwuru na Matiu 12:48-50 ga-esi nyere anyị aka mgbe owu na-ama anyị?
20 E nwere ọtụtụ ihe nwere ike ime ka owu na-ama Onye Kraịst mgbe ụfọdụ. Ma, ka anyị ghara ichefu na Jehova ma otú ihe niile si dịrị anyị. Ọ na-esi n’aka ụmụnna anyị egboro anyị mkpa anyị. (Gụọ Matiu 12:48-50.) Anyị na-egosi na obi dị anyị ụtọ n’ihe ndị Jehova meere anyị ma ọ bụrụ na anyị ana-akwado ụmụnna anyị. N’agbanyeghị otú ihe si dịrị anyị, anyị ma na anyị anọghị naanị anyị n’ihi na Jehova nọnyeere anyị mgbe niile.
ABỤ NKE 46 Anyị Na-ekele Gị, Jehova
^ par. 5 Ò nwere mgbe owu na-ama gị? Ya bụrụ otú ahụ, obi sie gị ike na Jehova maara ihe ndị gị na ha na-alụ nakwa na ọ dị njikere inyere gị aka. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe ndị nwere ike inyere anyị aka ma owu mawa anyị. Anyị ga-amụtakwa ihe anyị ga-eme iji nyere ụmụnna anyị ndị owu na-ama aka.
^ par. 5 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.