ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 27
ABỤ NKE 73 Mee Ka Anyị Ghara Ịtụ Egwu
Na-akata Obi Ka Zedọk
‘E nwere nwa okorobịa bụ́ dike obi kara, aha ya bụ Zedọk.’—1 IHE 12:28.
IHE A GA-AMỤ
Otú akụkọ Zedọk ga-esi nyere anyị aka ịna-akata obi.
1-2. Ònye bụ Zedọk? (1 Ihe E Mere 12:22, 26-28)
WEREGODỊ ya na ị na-ahụ ìgwè mmadụ karịrị narị puku mmadụ atọ na iri puku anọ (340,000) ndị gbakọtara ka ha chie Devid eze Izrel niile. Kemgbe abalị atọ, ha niile nọ n’ugwu bụ́ okwute okwute dị nso na Hebrọn. Ọnụ bụ ha ọchị ọchị, ha ana-ekwurịta okwu, jirikwa obi ụtọ na-abụ abụ na-eto Jehova. (1 Ihe 12:39) E nwere otu nwa okorobịa aha ya bụ Zedọk so n’ìgwè mmadụ ahụ. Ọ ga-abụ na ọtụtụ ndị amaghịdị na ọ nọ ebe ahụ. Ma, Jehova ma. Ọ chọkwara ka anyịnwa mara. (Gụọ 1 Ihe E Mere 12:22, 26-28.) Ònye bụ Zedọk?
2 Zedọk bụ onye nchụàjà. Ya na Abayata bụ́ nnukwu onye nchụàjà rụkọrọ ọrụ. Zedọk bụkwa onye ọhụ ụzọ, onye na-amata ihe bụ́ uche Chineke. Chineke mekwara ka o nwee nghọta pụrụ iche. (2 Sam. 15:27) Ndị mmadụ na-agakwuru Zedọk mgbe ọ bụla ha chọrọ ndụmọdụ ga-abara ha uru. Ọ bụ nwoke nwere ezigbo obi ike. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’otú Zedọk si kata obi.
3. (a) Gịnị mere ndị na-efe Jehova ji kwesị inwe obi ike? (b) Gịnị ka anyị ga-amụ n’isiokwu a?
3 N’oge ikpeazụ a, Setan na-agbasikwu mbọ ike ịlụso ndị Chineke ọgụ. (1 Pita 5:8) Anyị kwesịrị inwe obi ike ka anyị na-eche ka Jehova bibie Setan na ụwa ọjọọ ya. (Ọma 31:24) Ka anyị leba anya n’ụzọ atọ anyị nwere ike isi na-akata obi ka Zedọk.
NA-AKWADO ALAEZE CHINEKE
4. Gịnị mere ndị Jehova ji kwesị ịkata obi ka ha kwado Alaeze Chineke? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)
4 Ebe anyị bụ ndị Jehova, anyị ji obi anyị niile na-akwado Alaeze Chineke. Ma, ọtụtụ mgbe, anyị kwesịrị ịkata obi iji mee ya. (Mat. 6:33) Dị ka ihe atụ, n’ụwa ọjọọ a, anyị kwesịrị ịkata obi ka anyị nwee ike ịna-edebe iwu Jehova, na-ekwusakwa ozi ọma Alaeze Chineke. (1 Tesa. 2:2) Anyị kwesịkwara inwe obi ike ka anyị ghara itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị n’ụwa a ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-emekwu ka ndị mmadụ ghara ịdị n’otu. (Jọn 18:36) E nwere ọtụtụ ndị Jehova ihe na-esiri ike, ndị a kụrụ ihe, ma ọ bụkwanụ tụọ mkpọrọ n’ihi na ha ekweghị aga agha ma ọ bụ etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị.
5. Gịnị mere Zedọk ji kwesị inwe obi ike iji kwado Devid?
5 Ihe mere Zedọk ji gaa Hebrọn abụghị naanị ka ọ hụ ka a na-echi Devid eze. O ji ngwá agha ya, jikere ejikere maka agha. (1 Ihe 12:38) Ọ dị njikere iso Devid lụọ agha ma chebe ndị Izrel ma ndị iro ha bịa ịlụso ha ọgụ. O nwere ike ịbụ na Zedọk amachaghị otú e si alụ agha. Ma, o nwere ezigbo obi ike.
6. Olee otú obi ike Devid nwere si mee ka Zedọk mụta inwe obi ike? (Abụ Ọma 138:3)
6 Olee ebe Zedọk bụ́ onye nchụàjà si mụta ịkata ezigbo obi? Ndị gbara ya gburugburu bụ ụmụ nwoke ndị siri ike ma nwee obi ike. O doro anya na ọ mụtara ihe n’aka ha. Dị ka ihe atụ, otú Devid si kata obi “na-edu ndị Izrel aga agha” mere ka ndị Izrel niile jiri obi ha niile na-akwado ya. (1 Ihe 11:1, 2) Devid tụkwasịkwara Jehova obi mgbe niile ka o nyere ya aka merie ndị iro ya. (Ọma 28:7; gụọ Abụ Ọma 138:3.) Zedọk mụtakwara ihe n’aka ụmụ nwoke nwere obi ike, dị ka Jehoyada na Benaya nwa ya bụ́ dike nakwa ndị isi iri abụọ na abụọ ndị ọzọ ndị si n’ebo dị iche iche, ndị kwadoro Devid. (1 Ihe 11:22-25; 12:26-28) Ụmụ nwoke ndị a niile kpebisiri ike ịkwado ọchịchị Devid.
7. (a) Olee ndị nwere obi ike n’oge a anyị nwere ike ịmụta ihe n’aka ha? (b) Gịnị ka ị mụtara n’akụkọ Nwanna Nsilu e gosiri na vidio?
7 Anyị na-enweta ike, na-amụtakwa ịkata obi ma anyị na-eleba anya n’akụkọ banyere ndị katara obi kwado ọchịchị Jehova. Eze anyị bụ́ Jizọs Kraịst katara obi jụ itinye aka n’ọchịchị ụwa Ekwensu. (Mat. 4:8-11; Jọn 6:14, 15) Ọ tụkwasịrị Jehova obi mgbe niile ka o nye ya ike. E nwekwara imirikitiimi ụmụ okorobịa n’oge a ndị ji obi ike jụ itinye aka n’agha ma ọ bụ na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ọ ga-adị mma ka ị gụọ banyere ụfọdụ n’ime ha na jw.org. a
NA-ENYERE ỤMỤNNA GỊ AKA
8. Olee mgbe o nwere ike ịdị mkpa ka ndị okenye kata obi nyere ụmụnna ha aka?
8 Ọ na-atọ ndị Jehova ụtọ inyere ibe ha aka. (2 Kọr. 8:4) Ma, mgbe ụfọdụ, anyị kwesịrị ịkata obi iji mee ya. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na agha adaa, ndị okenye ọgbakọ na-achọpụta na e kwesịrị ịna-agba ụmụnna ha ume, na-enyere ha aka, mee ka ha na-enweta Baịbụl na akwụkwọ ndị e ji amụ ihe ma ọ bụ ihe ndị dị ka nri, uwe, na ebe ha ga-ebi. Ebe ọ bụ na ndị okenye hụrụ atụrụ Jehova n’anya, ha na-eme ihe niile ha ga-emeli iji nye ụmụnna ha ihe na-akpa ha ọ bụrụgodị na ime otú ahụ nwere ike ime ka ha baa ná nsogbu. (Jọn 15:12, 13) Ha mee otú a, ha na-eme ka Zedọk bụ́ onye na-akata obi.
9. Dị ka e kwuru na 2 Samuel 15:27-29, gịnị ka Devid gwara Zedọk ka o mee? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)
9 Devid nọ ná nsogbu. Nwa ya bụ́ Absalọm chọrọ igbu ya ka o nwee ike ịbụ eze. (2 Sam. 15:12, 13) Devid kwesịrị ịgbapụ na Jeruselem ozugbo. Ọ gwara ndị na-ejere ya ozi, sị: “Bịanụ ka anyị gbapụ, n’ihi na anyị agaghị agbanahụli Absalọm ma ọ bịakwute anyị.” (2 Sam. 15:14) Ka ndị na-ejere Devid ozi na-apụ, Devid chọpụtara na e kwesịrị inwe onye ga-anọ na Jeruselem na-akọrọ ya nkata Absalọm na-akpa. N’ihi ya, ọ gwara Zedọk na ndị nchụàjà ndị ọzọ ka ha laghachi n’obodo ahụ, na-achọpụtara ya otú ihe si aga. (Gụọ 2 Samuel 15:27-29.) Ha kwesịrị ịkpachara ezigbo anya. Ihe Devid gwara ha mee nwere ike ịkpatara ha nsogbu. O nwedịrị ike ịta isi ha. Absalọm bụ onye onwe ya na-ebu isi, onye ụfụ obi, na onye aghụghọ. Chegodị ihe o nwere ike ime Zedọk na ndị nchụàjà ndị ọzọ ma ọ chọpụta na ha bịara inyopụta ihe ọ na-eme ka ha nwee ike ichebe Devid.
10. Olee otú Zedọk na ndị so ya si chebe Devid?
10 Devid gwara Zedọk na enyi ya ọzọ ọ tụkwasịrị obi bụ́ Hushaị ka ha nyere ya aka n’atụmatụ ya. (2 Sam. 15:32-37) Ihe so n’atụmatụ ahụ bụ na Hushaị ga-eme ka Absalọm tụkwasị ya obi, gwazie ya otú ha ga-esi aga agha, nke ga-enye Devid ohere ijikere ejikere maka ịlụ agha. Mgbe Absalọm kwetara ime ihe Hushaị tụụrụ ya aro ka o mee, Hushaị gwara Zedọk na Abayata ihe merenụ. (2 Sam. 17:8-16) Ha abụọ gwaziri Devid nkata Absalọm na-akpa. (2 Sam. 17:17) Jehova nyeere Zedọk na ndị nchụàjà ndị ọzọ aka, ha emee ihe chebere Devid.—2 Sam. 17:21, 22.
11. Olee otú anyị nwere ike isi na-akata obi ka Zedọk mgbe anyị na-enyere ụmụnna anyị aka?
11 Ọ bụrụ na a gwa anyị ka anyị nyere ụmụnna anyị aka n’oge nsogbu, olee otú anyị ga-esi kata obi ka Zedọk? (1) Soro ntụziaka e nyere. N’ụdị oge ahụ, ọ dị ezigbo mkpa ka anyị dịrị n’otu. Anyị kwesịrị ịna-erube isi ná ntụziaka alaka ụlọ ọrụ nyere anyị. (Hib. 13:17) Ndị okenye kwesịrị ịna-eleba anya mgbe niile n’ihe ndị e kwuru gbasara otú a ga-esi na-akwadebe maka ọdachi nakwa ihe a ga-eme ma e nwee ọdachi. (1 Kọr. 14:33, 40) (2) Nwee obi ike ma na-akpachapụ anya. (Ilu 22:3) Na-akpa àgwà ka onye ma ihe. Kpachara anya ka ị ghara ịba ná nsogbu. (3) Tụkwasị Jehova obi. Cheta na Jehova chọrọ ka ọkọ ghara ịkọ gị na ụmụnna gị. O nwere ike ime ka i nyere ụmụnna gị aka n’enweghị ihe ga-eme gị.
12-13. Gịnị ka ị mụtara n’akụkọ Nwanna Viktor na Nwanna Vitalii? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)
12 Ka anyị kwuo banyere ụmụnna abụọ aha ha bụ Viktor na Vitalii. Ha abụọ rụkọrọ ọrụ bugara ụmụnna anyị nri na mmiri na Yukren. Nwanna Viktor sịrị: “Anyị chọrọ nri ebe niile. A na-agbakwa égbè gburugburu anyị ọtụtụ mgbe. Otu nwanna bunyere anyị nri o chekwara. Onyinye a nwanna ahụ nyere anyị mere ka anyị nye ọtụtụ ndị nkwusa nri zuuru ha ruo oge ụfọdụ. Ka anyị nọ na-akwanye ngwongwo na gwongworo ga-ebu ha, a tụrụ bọmbụ n’ebe na-adịghị anya n’ebe anyị nọ. N’ụbọchị ahụ niile, m rịọrọ Jehova ka o nye m obi ike ka m nwee ike ịkata obi na-enyere ụmụnna anyị aka.”
13 Nwanna Vitalii sịrị: “Anyị kwesịrị inwe ezigbo obi ike iji rụọ ọrụ a. Njem mbụ m gara bugara ụmụnna anyị nri were awa iri na abụọ. E nweghị mgbe m kwụsịrị ikpe ekpere na njem ahụ niile.” Nwanna Vitalii nwere obi ike. Ma, ọ na-akpachapụkwa anya. Ọ sịrị: “M nọ na-arịọ Jehova ka o nye m amamihe nakwa ka m mara ebe ike m ruru. Ebe m gbara bụ naanị n’ụzọ ndị ọchịchị kwuru ka a na-agba. Okwukwe m sikwuru ike mgbe m ji anya m hụ otú ụmụnna anyị si rụkọọ ọrụ ọnụ. Ha bupụrụ ihe ndị dachiri ụzọ, kwakọta ihe ndị e ji agbatara ụmụnna anyị ọsọ enyemaka, tinye ha n’ihe ndị ga-ebu ha. Ha nyekwara anyị nri na ebe anyị hiri ụra mgbe anyị nọ n’ụzọ.”
NA-AKWADOSI JEHOVA IKE
14. Ọ bụrụ na onye anyị hụrụ n’anya akwụsị ife Jehova, olee otú o nwere ike ịdị anyị?
14 Otu n’ime ihe kacha esi ike bụ mgbe onye ezinụlọ anyị ma ọ bụ ezigbo enyi anyị hapụrụ Jehova. (Ọma 78:40; Ilu 24:10) Ọ bụrụ na anyị na onye ahụ dị n’ezigbo mma, o nwere ike isiri anyị ike idi ya. Ọ bụrụ na ụdị ihe a emeela gị, otú Zedọk si kwadosie Jehova ike ga-agba gị ume.
15. Gịnị mere Zedọk ji kwesị inwe obi ike ka o nwee ike ịna-akwadosi Jehova ike? (1 Ndị Eze 1:5-8)
15 Zedọk kwadosiri Jehova ike ma mgbe ezigbo enyi ya bụ́ Abayata kpebiri inupụrụ eze isi. Ihe a mere ná ngwụcha ọchịchị Eze Devid. Mgbe ọ fọrọ obere ka Devid nwụọ, nwa ya bụ́ Adọnaịja gbalịrị ime onwe ya eze n’agbanyeghị na Jehova ekwuola na ọ bụ Solomọn ga-abụ eze. (1 Ihe 22:9, 10) Abayata kpebiri ịkwado Adọnaịja. (Gụọ 1 Ndị Eze 1:5-8.) Ihe a Abayata mere gosiri na ọ gbara Devid na Jehova mgba okpuru. Chegodị otú ihe ahụ si wuteruo Zedọk n’ọkpụkpụ. Ya na Abayata arụkọọla ọrụ nchụàjà ọnụ ruo ihe karịrị afọ iri anọ. (2 Sam. 8:17) Ha abụọ so lekọta “Igbe ezi Chineke.” (2 Sam. 15:29) Ná mmalite, ha abụọ kwadoro ọchịchị Devid, meekwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ n’ozi Jehova.—2 Sam. 19:11-14.
16. Gịnị ka ọ ga-abụ ya nyeere Zedọk aka ịkwadosi Jehova ike?
16 Zedọk ji obi ya niile kwado Jehova n’agbanyeghị ihe Abayata kpebiri ime. O nweghị mgbe ọ bụla Devid nyoro Zedọk enyo. Mgbe nkata ahụ Adọnaịja nọ na-akpa gbara n’anwụ, Devid tụkwasịrị Zedọk, Netan, na Benaya obi, gwa ha ka ha tee Solomọn mmanụ ka ọ bụrụ eze. (1 Eze 1:32-34) Ọ ga-abụ na ihe gbara Zedọk ume ma mee ka ọ dị ike bụ na ya na ndị ji obi ha niile na-efe Jehova na-anọ, ndị dị ka Netan nakwa ndị ọzọ na-akwado Eze Devid. (1 Eze 1:38, 39) Mgbe Solomọn ghọrọ eze, ‘o mere Zedọk onye nchụàjà, ya anọchie Abayata.’—1 Eze 2:35.
17. Olee otú i nwere ike isi eme ka Zedọk ma onye gị na ya dị n’ezigbo mma kwụsị ife Jehova?
17 Olee otú i nwere ike isi mee ka Zedọk? Ọ bụrụ na onye gị na ya dị ná mma ekpebie ịhapụ Jehova, mee ka o doo anya na ị na-akwado Jehova. (Josh. 24:15) Jehova ga-eme ka ị dị ike, meekwa ka ị kata obi. Na-ekpe ekpere ma na-akwadosi ndị gị na ha so na-efe ya ike. Ọ bụrụ na i jiri obi gị niile na-akwado Jehova, ọ ga-eji gị kpọrọ ihe, kwụọkwa gị ụgwọ maka ya.—2 Sam. 22:26.
18. Gịnị ka ị mụtara n’aka Nwanna Marco na Sidse nwunye ya?
18 Ka anyị kwuo banyere Nwanna Marco na nwunye ya Sidse. Ụmụ nwaanyị abụọ ha mụtara toro ma kpebie ịkwụsị ife Jehova. Nwanna Marco sịrị: “Malite n’ụbọchị ị mụrụ ụmụ gị, ị na-eji obi gị niile ahụ ha n’anya. Ị ga-emekwa ihe ọ bụla ị ga-emeli iji na-echebe ha ka ihe ghara ime ha. N’ihi ya, ha kpebie ịhapụ Jehova, ọ na-agbawa obi.” Ọ sịkwara: “Ma, Jehova ahapụbeghị anyị. Mgbe ọ bụla ike gwụrụ m, ọ na-eme ka nwunye m sie ike. Mgbe ọ bụla ike gwụrụ nwunye m, mụnwa na-esi ike.” Nwunye ya Sidse sịrị: “Anyị agaraghị edili ihe a ma a sị na Jehova enyeghị anyị ike. M nọ na-eche na ihe ụmụ m mere si m n’aka. N’ihi ya, m gwara Jehova otú ọ dị m n’obi. Obere oge, otu nwanna nwaanyị m na-ahụbeghị kemgbe ọtụtụ afọ bịakwutere m, konye m aka n’olu, lee m anya n’anya, sị m, ‘Sidse, cheta na o sighị gị n’aka.’ Jehova enyerela m aka mụ ana-enwe obi ụtọ n’ofufe m na-efe ya.”
19. Gịnị ka i kpebisiri ike ime?
19 Jehova chọrọ ka ndị niile na-efe ya nwee obi ike ka Zedọk. (2 Tim. 1:7) Ma, ọ chọghị ka anyị tụkwasị onwe anyị obi. Ọ chọrọ ka anyị tụkwasị ya obi. N’ihi ya, e nwee ihe mere ka ọ dị mkpa na ị ga-enwe obi ike, rịọ Jehova ka o nyere gị aka. Obi sie gị ike na ọ ga-eme ka ị kata obi ka Zedọk.—1 Pita 5:10.
ABỤ NKE 126 Mụrụ Anya, Ka Okwukwe Gị Sie Ike, Dị Ike
a Lee vidio dị na jw.org isiokwu ya bụ Ihe Mere Ezigbo Ndị Kraịst Ji Kwesị Inwe Obi Ike—Ịdị Iche n’Ụwa.