Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 6

ABỤ NKE 18 Anyị Na-ekele Chineke Maka Ihe Mgbapụta

Ihe Mere Obi Ji Dị Anyị Ụtọ na Jehova Na-agbaghara Anyị

Ihe Mere Obi Ji Dị Anyị Ụtọ na Jehova Na-agbaghara Anyị

“Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya.”​—JỌN 3:16.

IHE A GA-AMỤ

Anyị ga-amụ ihe Jehova mere ka e nwee ike ịgbaghara anyị mmehie anyị. Ọ ga-eme ka obi na-atọkwu anyị ụtọ maka otú Jehova si agbaghara anyị.

1-2. Olee otú ụmụ mmadụ si dịrị ka nwa okorobịa ahụ e kwuru okwu ya na paragraf nke mbụ?

 WEREGODỊ ya na e nwere otu nwa okorobịa nne na nna ya bụ aka ji akụ̀. Otu ụbọchị, ha nwụrụ n’ihe mberede, obi agbawaa ya. Ma, ihe ọzọ na-agbawa obi mere ya. Ọ matara na ha mefusịrị ego ha nwere, jidekwa nnukwu ụgwọ. Kama iketa akụnụba n’aka nne na nna ya, ihe o ketaziri bụ ụgwọ buru ibu ha koteere ya nakwa ndị na-achụgharị ya ka ọ kwụọ ha ụgwọ ha ozugbo. O nweghị mgbe ọ ga-akwụchali ụgwọ ahụ.

2 E nwere otú anyị si yie nwa okorobịa ahụ. Nne na nna anyị mbụ bụ́ Adam na Iv zuru okè, birikwa na Paradaịs mara ezigbo mma. (Jen. 1:27; 2:7-9) Ha gakwaara ebi na ya na-enwe obi ụtọ ruo mgbe ebighị ebi. Ma, egwú dagharịrị. Ha mehiere, Jehova achụpụ ha n’ogige Iden. Ha enweghịzi ike ịdị ndụ ebighị ebi. Gịnịzi ka ụmụ ha ga-eketa n’aka ha? Baịbụl gwara anyị, sị: “Mmehie si n’aka otu mmadụ [ya bụ, Adam] bata n’ụwa, ọnwụ esikwa ná mmehie bata, ọnwụ wee gbasaa ruo mmadụ niile n’ihi na ha niile mehiere.” (Rom 5:12) Ihe anyị ketaziri n’aka Adam bụ mmehie, nke kpatara ọnwụ. Mmehie a anyị ketara n’aka ya dị ka nnukwu ụgwọ a na-enweghị onye n’ime anyị ga-akwụli ya.​—Ọma 49:8.

3. Gịnị mere e nwere ike iji jiri mmehie anyị tụnyere “ụgwọ” anyị ji?

3 Jizọs ji mmehie tụnyere ụgwọ anyị ji. (Mat. 6:12; Luk 11:4, na ihe e dere n’ala ala peeji ya.) Anyị mehie, ọ na-adị ka ànyị ji Jehova ụgwọ. Jehova nweziri ike ịsị ka anyị kwụọ ụgwọ mmehie ahụ. Ọ bụrụ na e nweghị otú e si kwụọ ya, ọ bụ naanị mgbe anyị nwụrụ ka anyị ga-akwụ ya. Anyị agaghịkwa enwe olileanya ịdị ndụ ọzọ.​—Rom 6:7, 23.

4. (a) Gịnị ga-eme ndị mmehie niile ma ọ bụrụ na e nyereghị ha aka? (Abụ Ọma 49:7-9) (b) Gịnị ka okwu bụ́ “mmehie” pụtara na Baịbụl? (Kwuokwa ihe dị n’igbe isiokwu ya bụ “ Mmehie.”)

4 Ànyị ga-enwetali ihe niile Adam na Iv tụfuru? A hapụ naanị anyị, ọ gaghị ekwe omume. (Gụọ Abụ Ọma 49:7-9.) Ọ bụrụ na e nyereghị anyị aka, anyị agaghị enwe olileanya ịdị ndụ n’ọdịnihu ma ọ bụ ịbụ ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ. Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị ga na-anwụ ka ụmụ anụmanụ n’enweghị olileanya mbilite n’ọnwụ.​—Ekli. 3:19; 2 Pita 2:12.

5. Olee otú Nna anyị hụrụ anyị n’anya si nyere anyị aka kwụọrọ anyị ụgwọ mmehie anyị? (Kọwaa foto.)

5 Chegodị banyere nwa okorobịa ahụ anyị kwuru okwu ya ná mmalite isiokwu a. Olee otú obi ga-adị ya ma ọ bụrụ na otu nwoke ji ego ekwe nkwa ịkwụrụ ya ụgwọ ahụ? O doro anya na obi ga-adị ya ezigbo ụtọ, ya anabatakwa onyinye ahụ nwoke ahụ chọrọ inye ya. Otú ahụ ka ọ dịkwa anyị. Nna anyị hụrụ anyị n’anya, bụ́ Jehova, nyere anyị onyinye ga-akwụ ụgwọ mmehie ahụ anyị ketara n’aka Adam. Jizọs sịrị: “Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka a ghara ibibi onye ọ bụla nwere okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16) Ihe ọzọ bụ na onyinye ahụ ga-eme ka anyị na Jehova nwee ike ịdị ná mma.

Jizọs kwusaara ndị mmadụ ozi ọma gbasara otú Jehova ga-esi agbaghara ha n’ihi ihe mgbapụta ahụ. (Jọn 3:16) O jikwa obi ya kweta ịnwụ iji nye ihe mgbapụta ahụ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 5)


6. Gịnị ka anyị ga-amụ n’isiokwu a? Maka gịnị?

6 Olee ihe anyị ga-eme ka onyinye ahụ magburu onwe ya baara anyị uru, meekwa ka a gbaghara anyị mmehie anyị ma ọ bụ kwụọ ụgwọ ahụ anyị ji? Azịza ya dị n’ihe ụfọdụ Baịbụl kwuru, ihe ndị dị ka ime ka anyị na Chineke dị ná mma, ikpuchi mmehie, àjà ga-eme ka anyị na Chineke dịrị n’udo, ihe mgbapụta, ịgbapụta anyị, na ịkpọ anyị ndị ezi omume. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe ihe nke ọ bụla n’ihe ndị a pụtara. Ka anyị na-atụgharị uche n’ihe ha pụtara, obi ga na-adịkwu anyị ụtọ maka ihe Jehova mere ka e nwee ike ịgbaghara anyị.

JEHOVA CHỌRỌ KA ANYỊ NA YA DỊ NÁ MMA

7. (a) Olee ihe ọzọ Adam na Iv tụfuru? (b) Ebe anyị bụ ụmụ Adam na Iv, olee ihe dị anyị ezigbo mkpa? (Ndị Rom 5:10, 11)

7 Mgbe Adam na Iv mehiere, ọ bụghị naanị na ha enweghịzi ike ịdị ndụ ebighị ebi, kama ha na Nna ha bụ́ Jehova kwụsịrị ịdị ná mma. Adam na Iv sobu n’ezinụlọ Chineke. (Luk 3:38) Ma, mgbe ha nupụụrụ Jehova isi, ọ chụpụrụ ha n’ezinụlọ ya tupu ha ebido ịmụ ụmụ. (Jen. 3:23, 24; 4:1) N’ihi ya, ebe anyị bụ ụmụ ha, e kwesịrị ime ka anyị na Jehova dịrị ná mma. (Gụọ Ndị Rom 5:10, 11.) Ihe ọ pụtara bụ na anyị kwesịrị ịgba mbọ ka anyị na ya bụrụ enyi. Otu akwụkwọ na-akọwa okwu kwuru na okwu Grik a sụgharịrị ‘ime ka a dị ná mma’ ebe a nwere ike ịpụta “mmadụ ime ka ya na onye iro ya bụrụ enyi.” Ọ dị ịtụnanya na ọ bụ Jehova bu ụzọ mee ka anyị na ya nwee ike ịdị ná mma. Olee otú o si mee ya?

NHAZI CHINEKE MERE MAKA IKPUCHI MMEHIE

8. Gịnị bụ (a) ikpuchi mmehie? (b) àjà ga-eme ka a dịrị n’udo?

8 Ikpuchi mmehie bụ nhazi Chineke mere ka ya na ụmụ mmadụ na-ezughị okè nwee ike ịdị ná mma. Ihe a na-eme na ya bụ iji otu ihe gbanwere ihe ọzọ ya na ya hà. Ọ na-eme ka e nwetaghachi ihe furu efu ma ọ bụ ihe e mebiri emebi. Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst ji okwu ya na ya yiri kọwaa ya, ya bụ, àjà ga-eme ka a dịrị n’udo. (Rom 3:25) Ọ bụ ihe ga-eme ka mmadụ na Chineke dịrị ná mma ma ọ bụ dịrị n’udo.

9. Olee ndokwa Jehova mere n’oge ụmụ Izrel ka e nwee ike ịgbaghara ha mmehie ha?

9 Jehova haziri ka e nwee otú ọ ga-esi na-agbaghara mmehie ụmụ Izrel nakwa ka ha na ya dịrị ná mma. N’Izrel, a na-enwe Ụbọchị Ikpuchi Mmehie kwa afọ. N’ụbọchị ahụ, nnukwu onye nchụàjà na-eji anụmanụ achụ àjà iji kpuchie mmehie ụmụ Izrel. N’eziokwu, naanị àjà ụmụ anụmanụ agaghị ewepụli mmehie ụmụ Izrel kpamkpam n’ihi na mmadụ ka ụmụ anụmanụ. Ma, ọ bụrụhaala na ụmụ Izrel echegharịa, jiri anụmanụ Jehova kwuru ka e jiri chụọrọ ya àjà chụọ àjà, ọ dị njikere ịgbaghara ha mmehie ha. (Hib. 10:1-4) Ihe ọzọ bụ na nhazi Jehova mere nakwa àjà ahụ ndị Izrel na-achụ ma n’Ụbọchị Ikpuchi Mmehie ma n’ụbọchị ndị ọzọ na-enyere ha aka ịchọpụta na ha bụ ndị mmehie. Ọ na-emekwa ka ha mata na e nwere ihe ọzọ dị mkpa ga-ekpuchi mmehie ha kpamkpam.

10. Gịnị ka Jehova mere ka e nwee ike ịgbaghara anyị mmehie anyị kpamkpam?

10 Gịnị ka Jehova mere ka e nwee ike ịgbaghara ụmụ mmadụ mmehie ha kpamkpam? Ọ haziri ka a chụọ Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya “n’àjà naanị otu ugboro ka o buru mmehie ọtụtụ ndị.” (Hib. 9:28) Jizọs ‘nyere ndụ ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta maka ọtụtụ mmadụ.’ (Mat. 20:28) Gịnị bụ ihe mgbapụta?

ÀJÀ JIZỌS CHỤRỤ KWỤRỤ ỤGWỌ AHỤ

11. (a) Dị ka e kwuru na Baịbụl, gịnị bụ ihe mgbapụta? (b) Olee onye ọ bụ naanị ya ga-akwụli ihe mgbapụta ahụ?

11 Baịbụl kwuru na ihe mgbapụta bụ ụgwọ a kwụrụ iji kpuchie mmehie nakwa iji mee ka anyị na Jehova dịrị ná mma. a N’anya Jehova, ọ bụ ya ga-eme ka e nweta ihe ahụ furu efu. Olee otú ọ ga-esi eme ya? Cheta na Adam na Iv tụfuru ndụ ha zuru okè, ya na olileanya ha nwere ịdị ndụ ebighị ebi. N’ihi ya, e kwesịrị inwe ihe mgbapụta ya na ihe ahụ furu efu hà. (1 Tim. 2:6) Naanị onye ga-akwụli ya bụ nwoke tozuru etozu (1) onye zuru okè, (2) onye nwere ikike ịdịrị ndụ n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi, na (3) onye dị njikere iji ndụ ahụ ọ gaara adị chụọ àjà ka anyịnwa nwee ike ịdị ndụ. Ọ bụ ndụ onye ahụ ga-akwụli ụgwọ ihe ahụ a tụfuru.

12. Gịnị mere Jizọs ji nwee ike ịkwụ ihe mgbapụta ahụ?

12 Legodị ihe atọ mere Jizọs ji nwee ike ịkwụ ihe mgbapụta ahụ. (1) O zuru okè, ya bụ, “o meghị mmehie ọ bụla.” (1 Pita 2:22) (2) N’ihi ya, o nwere ikike ịdị ndụ n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi. (3) Ọ dị njikere ịnwụ, jiri ndụ ahụ ọ gaara adị chụọ àjà maka anyị. (Hib. 10:9, 10) Jizọs zuru okè ka nwoke mbụ ahụ bụ́ Adam tupu ya emehie. (1 Kọr. 15:45) N’ihi ya, Jizọs ji ọnwụ ya kpuchie mmehie Adam, ya bụ, o ji ya dochie ihe Adam tụfuru. (Rom 5:19) Jizọs si otú ahụ bụrụ “Adam ikpeazụ.” Ọ dịghịzi mkpa ka onye ọzọ zuru okè bịa kwụọ ụgwọ ihe Adam tụfuru. Jizọs nwụrụ “naanị otu ugboro.”​—Hib. 7:27; 10:12.

13. Gịnị dị iche n’ikpuchi mmehie na ihe mgbapụta?

13 Gịnịzi dị iche n’ikpuchi mmehie na ihe mgbapụta? Ikpuchi mmehie bụ ihe Chineke na-eji eme ka ya na ụmụ mmadụ dịrị ná mma. Ihe mgbapụta ahụ bụ ụgwọ a kwụrụ iji kpuchie mmehie ụmụ mmadụ na-ezughị okè. Ọ bụ ọbara ahụ Jizọs ji chụọ àjà maka anyị bụ ụgwọ ahụ a kwụrụ.​—Efe. 1:7; Hib. 9:14.

JEHOVA GBAPỤTARA ANYỊ N’AKA MMEHIE NA ỌNWỤ MA KPỌỌ ANYỊ NDỊ EZI OMUME

14. Olee ihe anyị ga-atụle ugbu a? Maka gịnị?

14 Olee uru otú ahụ Jehova si kpuchie mmehie anyị na-abara anyị? Baịbụl ji ọtụtụ ihe kọwaa uru ọ na-abara anyị. Ọ bụ eziokwu na ihe okwu ndị ahụ pụtara nwere ike iyi ibe ha, ma nke ọ bụla n’ime ha na-ekwu otu ihe gbasara otú ikpuchi mmehie ahụ si mepee ụzọ ka Jehova nwee ike ịgbaghara anyị mmehie anyị. Ka anyị na-akọwa okwu ndị ahụ, anyị ga-achọpụta otú ha si gbasa anyị.

15-16. (a) Baịbụl sị na a gbapụtara anyị, gịnị ka ọ pụtara? (b) Olee uru ọ na-abara anyị?

15 Baịbụl kwuru na a gbapụtara anyị ma ọ bụ mee ka anyị nwere onwe anyị n’ihi na a kwụọla ihe mgbapụta ahụ. Pita onyeozi sịrị: “Unu ma na ọ bụghị ihe ndị nwere ike imebi emebi, dị ka ọlaọcha ma ọ bụ ọlaedo, ka e ji napụta unu [ma ọ bụ “gbapụta unu”], unu akwụsị ibi ndụ na-enweghị isi na ọdụ nna nna unu hà kụziiri unu. Kama ihe e ji napụta unu bụ ọbara Kraịst, nke pụrụ iche, nke dị ka nke nwa atụrụ a na-emerụghị emerụ, nke na-enweghịkwa ntụpọ.”​—1 Pita 1:18, 19, na ihe e dere n’ala ala peeji ya.

16 N’ihi àjà ahụ Jizọs chụrụ, anyị ga-enwere onwe anyị n’aka mmehie na ọnwụ nke na-akpatara anyị ịta ahụhụ. (Rom 5:21) Obi dị anyị ezigbo ụtọ na Jehova na Jizọs gbapụtara anyị n’ihi ọbara Jizọs bara ezigbo uru e ji chụọ àjà maka anyị.​—1 Kọr. 15:22.

17-18. (a) Gịnị ka ịkpọ anyị ndị ezi omume pụtara? (b) Olee uru ọ na-abara anyị?

17 Ịkpọ anyị ndị ezi omume pụtara na Jehova akagbuola mmehie anyị ma ọ bụ were ya na anyị emeghịzi mmehie. Ọ bụ eziokwu na Jehova mere ihe a, ma ọ ka bụkwa onye na-ekpe ikpe ziri ezi. Ọ kpọghị anyị ndị ezi omume n’ihi na anyị metara ihe a ga-eji kpọọ anyị ndị ezi omume. Mmehie anaghịkwanụ amasị ya. Ma, ebe ọ bụ na anyị nwere okwukwe n’ihe Jehova ji kpuchiere anyị mmehie anyị nakwa n’ihe mgbapụta ahụ, Jehova ji maka ya kagbuo mmehie anyị.​—Rom 3:24; Gal. 2:16.

18 Olee uru ọ na-abara anyị ma Jehova kpọọ anyị ndị ezi omume? A kpọọla ndị ha na Jizọs ga-eso chịa n’eluigwe ndị ezi omume, ha aghọọkwala ụmụ Chineke. (Taị. 3:7; 1 Jọn 3:1) A gbagharala ha mmehie ha. O yiziri ka e nweghị mgbe ọ bụla ha mere mmehie. N’ihi ya, ha ruru eru inweta Alaeze Chineke. (Rom 8:1, 2, 30) A kpọọkwala ndị nwere olileanya iketa ụwa ndị ezi omume na ndị enyi Chineke. A gbagharakwala ha mmehie ha. (Jems 2:21-23) Oké ìgwè mmadụ ndị ga-alanahụ Amagedọn nwere olileanya na ha emekataghị nwụọ. (Jọn 11:26) A ga-akpọlite “ndị ezi omume” na “ndị ajọ omume” nwụrụ anwụ. (Ọrụ 24:15; Jọn 5:28, 29) N’ikpeazụ, ndị ohu Jehova niile, ndị na-erubere ya isi n’ụwa, ‘ga-enwere onwe ha n’ụzọ dị ebube ka ụmụ Chineke.’ (Rom 8:21) Anyị na-atụsi anya ike ịhụ mgbe anyị ga-ezu okè, anyị na Nna anyị bụ́ Jehova adịrịkwa ná mma otú ahụ.

19. Olee otú ihe si gbanweere anyị? (Kwuokwa ihe dị n’igbe isiokwu ya bụ “ Uru Ọ Na-abara Anyị.”)

19 N’eziokwu, e nwere mgbe anyị dị ka nwa okorobịa ahụ e kwuru okwu ya ná mmalite, onye gba aka ihe niile ọ gaara enweta, e kotekwara ya nnukwu ụgwọ ọ na-agaghị akwụli. Mana, Jehova nyeere anyị aka. Anyị adịghịzi ka ndị na-enweghị olileanya n’ihi na Jehova mere ndokwa ka a gbaghara anyị mmehie anyị, Jizọs akwụọkwa ihe mgbapụta. Okwukwe anyị nwere na Jizọs Kraịst mere ka e nwee ike ịgbapụta anyị ma ọ bụ mee ka anyị nwere onwe anyị n’aka mmehie na ọnwụ. Jehova gbaghara anyị, ọ na-adị ka anyị emetụbeghị mmehie. Ma, nke kacha mkpa bụ na anyị na Jehova, bụ́ Nna anyị nke eluigwe hụrụ anyị n’anya, ga-adịli ná mma ugbu a.

20. Gịnị ka anyị ga-amụ n’isiokwu na-eso nke a?

20 Ka anyị na-atụgharị uche n’ihe Jehova na Jizọs meere anyị, obi na-atọgbu anyị atọgbu. (2 Kọr. 5:15) A sị na ha enyereghị anyị aka, anyị agaraghị enwe olileanya ọ bụla. Mana, olee uru otú Jehova si agbaghara anyị mmehie na-abara onye nke ọ bụla n’ime anyị? Ọ bụ ihe anyị ga-amụ n’isiokwu na-eso nke a.

ABỤ NKE 10 Toonụ Jehova Chineke Anyị

a N’asụsụ ụfọdụ, a na-eji okwu ndị pụtara “ụgwọ a kwụrụ maka ndụ” ma ọ bụ “ụgwọ a kwụrụ” asụgharị “ihe mgbapụta.”