Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NDỤ

Ahụrụ M Otú Ụmụnna Nwere Okwukwe Si Na-eme Nke Ọma

Ahụrụ M Otú Ụmụnna Nwere Okwukwe Si Na-eme Nke Ọma

O NWERE ike ịbụ na ị ga-echeta ụka gị na mmadụ kparịtara baara gị ezigbo uru. E nwere otu nke m na-echeta mụ na enyi m kparịtara afọ iri ise gara aga mgbe anyị nọ ọdụ n’akụkụ ọkụ a kwanyere akwanye na Kenya. Anwụ achakatala anyị, anyị ana-ejizi oji n’ihi na anyị agaala ọtụtụ ebe kemgbe ọtụtụ ọnwa. Anyị nọ na-ekwu banyere otu fim kwuru gbasara okpukpe, enyi m ahụ asị, “Ihe fim ahụ kwuru adabaghị n’ihe Baịbụl kwuru.”

M dapụrụ n’ọchị n’ihi na ahụghị m enyi m ahụ ka onye chọọchị. M jụrụ ya, sị, “Olee ihe ị ma gbasara Baịbụl?” Ọ zaghachighị m ozugbo. Mana o mechara gwa m na mama ya bụ Onyeàmà Jehova, na ọ na-akụzikwara ya ihe. M chọrọ ịmatakwu gbasara ya. N’ihi ya, m gwara ya ka ọ kọkwuoro m ihe ndị mama ya kụziiri ya.

Anyị kparịtagidere ụka ruo mgbe chi jimiri. Ọ gwara m na Baịbụl kwuru na ọ bụ Setan na-achị ụwa a. (Jọn 14:30) O nwere ike ịbụ na gịnwa ma gbasara ya kemgbe ị dị obere, mana nke ahụ bụ m mbụ ịnụ ya. Ọ masịkwara m. Ihe m na-anụkarị bụ na e nwere Chineke dị obiọma, na-ekpekwa ikpe ziri ezi na-ahụ maka ihe niile na-eme n’ụwa. Ma ihe ndị m na-ahụ na-eme n’ụwa egosighị na ọ bụ eziokwu. Ọ bụ eziokwu na m dị naanị afọ iri abụọ na isii n’oge ahụ, ma ahụla m ọtụtụ ihe na-eme n’ụwa a na-enye m nsogbu.

N’oge ahụ, papa m na-akwọrọ ndị agha Amerịka ụgbọelu. N’ihi ya, mgbe m dị ezigbo obere, o doro m anya na ndị agha nwere ike ịtụpụ bọmbụ nwere ike igbu ọtụtụ ndị. A lụrụ agha Vietnam n’oge m nọ n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị na Kalịfọnịa. M sooro ụmụ akwụkwọ mee ngagharị iwe. Ndị uwe ojii ji okpiri chụọ anyị ọsọ, anyị agbaa ọsọ. Anyị enweghị ike iku ume nke ọma, anya na-afụkwa anyị ka ose n’ihi tịa gas a gbara. Ihe juru n’oge ahụ bụ ọgba aghara na nnupụisi. E gburu ọtụtụ ndị isi ọchịchị, ọtụtụ ndị nọ na-eme ngagharị iwe, na-akpatakwa ọgba aghara. Ihe ndị mmadụ na-eche gbasara ihe e kwesịrị ime dị iche iche. N’ihi ya, amaghị m nke m ga-eso eso.

Mgbe m si Lọndọn gaa Afrịka

N’afọ 1970, m malitere ịrụ ọrụ n’akụkụ osimiri dị n’ebe ugwu Alaska. Ọrụ ahụ nyekwara m ezigbo ego. M gaziri Lọndọn, zụta ọgba tum tum, tinye isi n’ebe ndịda. Ma, e nweghị ebe m ma m na-aga. Mgbe ọtụtụ ọnwa gachara, m rutere Afrịka. Mgbe m nọ n’ụzọ, m hụrụ ọtụtụ ndị na-achọ otú ha ga-esi gbaara nsogbu ha nọ na ya ọsọ.

N’ihi ihe m ji anya m hụ na ihe m nụrụ, ọ bịara doo m anya na ihe Baịbụl kwuru bụ eziokwu, ya bụ, na e nwere otu mmụọ obi fere azụ na-achị ụwa. Ma, ọ bụrụ na ọ bụghị Chineke na-ahụ maka ihe niile na-eme n’ụwa, oleekwanụ ihe ọ na-eme? M chọrọ ịmata.

N’ọnwa ole na ole na-eso ya, m matara azịza ya. M mechakwara mata ọtụtụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ji obi ha niile na-efe otu ezi Chineke n’agbanyeghị otú ihe si dịrị ha. M hụkwara ha n’anya.

NỌTAN AYALAND BỤ “OBODO A NA-AKWA MGBỌ MA NA-ATỤ BỌMBỤ”

Mgbe m laghachiri Lọndọn, m gakwuuru mama enyi m, ya enye m Baịbụl. Mgbe m mechara gaa Amstadam dị na Nedalandz, e nwere otu Onyeàmà Jehova hụrụ m ka m na-agụ Baịbụl n’ebe ọkụ dị n’okporo ámá na-enwu, ya enyere m aka ịmụtakwu ihe na ya. M mechaziri gaa Dọblịn dị n’Ayaland hụ alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova. M kụrụ aka n’ụzọ ya. Ọ bụ ebe ahụ ka m matara Arthur Matthews. Ọ bụ nwanna ma ezigbo ihe. M gwara ya na m chọrọ ka a mụwara m Baịbụl, ya ekweta ịmụrụ m Baịbụl.

M ji obi m niile na-amụ ihe, na-agụkwa akwụkwọ ọ bụla Ndịàmà Jehova bipụtara. M gụkwara Baịbụl. Ihe a tọrọ m ezigbo ụtọ. M gaa ọmụmụ ihe, m na-achọpụta na ụmụaka ma azịza ọtụtụ ajụjụ gbagwojuru ọtụtụ ndị gụrụ akwụkwọ anya kemgbe ọtụtụ narị afọ, ajụjụ ndị dị ka: ‘Gịnị mere ihe ọjọọ ji dịrị? Ònye bụ Chineke? Gịnị na-eme mmadụ ma ọ nwụọ?’ Ọ bụ naanị Ndịàmà Jehova bụ ndị enyi m. Ọ dịịrị m mfe n’ihi na e nweghị onye ọ bụla ọzọ m ma n’obodo ahụ. Ha nyeere m aka ịhụ Jehova n’anya na ịchọ ime uche ya.

Mụ na Nigel na Denis

M mere baptizim n’afọ 1972. Mgbe otu afọ gachara, m malitere ịsụ ụzọ, sorokwa otu obere ọgbakọ dị na Nuri, na Nọtan Ayaland. M chọtara ụlọ n’otu ebe dịpụrụ adịpụ n’akụkụ ugwu. E ji nkume rụọ ụlọ ahụ. E nwere ebe a na-azụ ehi n’ebe dị nso n’ebe ahụ. Ọ bụ n’ihu ehi ndị ahụ ka m na-anọ amụgharị ihe omume m. Ha na-eyicha ndị na-ege ntị nke ọma mgbe ha na-ata nri ha. Ha enweghị ike ịgwa m ebe m metara na ebe m na-emetaghị, mana ha nyeere m aka ịmụta ịna-ele ndị m na-agwa okwu anya. N’afọ 1974, a họpụtara m ka m bụrụ ọsụ ụzọ pụrụ iche. Nwanna Nigel Pitt mechakwara sonyere m ebe ahụ. Mụ na ya ghọrọ ezigbo enyi.

N’oge ahụ, e nwere ọtụtụ ọgba aghara na Nọtan Ayaland. Ụfọdụ ndị na-akpọ Nọtan Ayaland “obodo a na-akwa mgbọ ma na-atụ bọmbụ.” N’oge ahụ, a na-alụkarị ọgụ n’okporo ámá, na-agbagbu ndị mmadụ, na-atụkwa ụgbọala bọmbụ. Ihe na-akpata ọgba aghara ndị ahụ na-abụkarị ihe gbasara ọchịchị na okpukpe. Ma, ndị Katọlik na ndị chọọchị ndị ọzọ ma na Ndịàmà Jehova anaghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. N’ihi ya, anyị na-enwe ike izi ndị mmadụ ozi ọma n’atụghị ụjọ ọ bụla. Ndị anyị na-ezi ozi ọma na-amakarị oge nakwa ebe e nwere ike inwe ọgba aghara, na-agwakwa anyị ka anyị zere ebe ndị ahụ.

Ma ọ bụghị mgbe niile ka ihe gaara anyị siriri werere. E nwere otu ụbọchị mụ na otu ọsụ ụzọ aha ya bụ Denis Carrigan so na-ekwusa ozi ọma n’otu obodo a na-enweghị Ndịàmà Jehova na ya. Ọ bụkwa naanị otu ugboro ka anyị gatụrụla ebe ahụ. Ka anyị nọ ebe ahụ, otu nwaanyị boro anyị ebubo na anyị bụ ndị agha Briten na-achọghị ka a mata ndị ha bụ. O nwere ike ịbụ na ihe mere o ji kwuo ya bụ na anyị anaghị ekwu ka ndị Ayaland. Ihe a nwaanyị a kwuru mere ka ezigbo ụjọ jide anyị. N’oge ahụ, ọ bụrụ na mmadụ na ndị agha bụ enyi, o nwere ike ime ka a gbagbuo ya ma ọ bụkwanụ gbaa ya égbè n’ikpere. Ka anyị nọ naanị anyị n’èzí na-eche bọs, oyi ana-atụkwa anyị, anyị hụrụ otu ụgbọala kwụsịrị n’ihu ebe nwaanyị ahụ nọ bo anyị ebubo. Nwaanyị ahụ pụtara na-agwa ụmụ nwoke abụọ nọ n’ụgbọala ahụ okwu, na-atụ anyị aka n’ihi na ụjọ ji ya. Ụmụ nwoke ndị ahụ ji nwayọọ nwayọọ gbara ụgbọala ha rute n’ebe anyị nọ ma jụọ anyị ajụjụ gbasara mgbe bọs ji abịa. Mgbe bọs rutere, ha gwara onye na-akwọ bọs ahụ okwu. Anyị anụghị ihe ha kwuru. E nweghịkwa ndị ọzọ bọs ahụ bu. N’ihi ya, anyị kwuru na ha akpaala otú ha ga-esi menyụọ anyị anya ma ha buru anyị si n’obodo ahụ pụọ. Mana, ihe a emechaghị mee. Mgbe anyị si na bọs ahụ na-apụta, anyị jụrụ onye na-akwọ bọs ahụ ma ọ̀ bụ anyịnwa ka ụmụ nwoke ndị ahụ na-agwa ya okwu gbasara ha. Ọ sịrị anyị, “Ama m ndị unu bụ. M gwakwara ha ndị unu bụ. Unu echegbula onwe unu. O nweghị ihe ọ bụla ga-eme unu.”

Ụbọchị anyị gbara akwụkwọ n’ọnwa Mach 1977

Mgbe m gara mgbakọ distrikti a n’afọ 1976 na Dọblịn, m hụrụ otu nwanna nwaanyị bụ́ ọsụ ụzọ pụrụ iche aha ya bụ Pauline Lomax. O si Ịngland bịa mgbakọ ahụ. Ọmarịcha nwanna nwaanyị a ji ofufe Chineke kpọrọ ihe, dịrịkwa umeala n’obi. Ya na nwanne ya nwoke bụ́ Ray malitere mgbe ha dị ezigbo obere fewe Chineke. Mgbe otu afọ gachara, mụ na Pauline lụrụ, anyị ka bụkwa ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche na Balimena dị na Nọtan Ayaland.

Anyị rụrụ ọrụ nlekọta sekit ruo afọ ụfọdụ. Anyị nọ na-eleta ụmụnna nọ na Belfast, Lọndọnderi nakwa ebe ndị ọzọ a na-enwekarị ọgba aghara. Anyị hụrụ otú ụmụnna anyị si hapụ ihe ndị okpukpe na-akụzi na ịkpọ ndị ọzọ asị ka ha nwee ike fee Jehova. Otú ha si nwee okwukwe metụrụ anyị n’ahụ́. Jehova gọzikwara ụmụnna anyị ndị a ma chebe ha.

Ebiri m n’Ayaland ruo afọ iri. N’afọ 1981, a kpọrọ anyị ka anyị bịa gụọ akwụkwọ na klas nke iri asaa na abụọ n’Ụlọ Akwụkwọ Gilied. Mgbe anyị gụchara, e zigara anyị Siera Lion dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Afrịka.

ỤMỤNNA NỌ NA SIERA LION NA-EFE JEHOVA N’AGBANYEGHỊ NA HA DARA OGBENYE

Anyị na ụmụnna iri na otu ma nke a na-akọ biri n’ụlọ ndị ozi ala ọzọ. Ihe dị n’ebe ahụ bụ otu usekwu, ụlọ mposi atọ, ebe abụọ a na-asa ahụ́, otu telefon, otu ígwè e ji asa ákwà, na otu ígwè e ji agbakọ ákwà. Ọkụ na-emekarịkwa pịnyụ pịnyụ. Òké na-agbagharị n’elu ụlọ anyị, agwọ na-abatakwa n’ụlọ mgbe ụfọdụ.

Mgbe anyị na-agafe otu osimiri na-aga mgbakọ na Gini

Ọ bụ eziokwu na ihe siri ike n’obodo ahụ, ozi ọma na-atọ anyị ezigbo ụtọ. Ndị nọ ebe ahụ ji Baịbụl kpọrọ ihe ma na-ege anyị ntị nke ọma. Ọtụtụ ndị kwere ka a mụwara ha Baịbụl, ha abatakwa n’ọgbakọ. Ihe ndị obodo ahụ na-akpọ m bụ “Maazị Robert,” na-akpọ nwunye m Pauline “Oriakụ Robert.” Ma ka oge na-aga, mgbe ọrụ m na-arụ n’alaka ụlọ ọrụ na-ekweghịzi m pụta ozi otú m na-apụtabu, ndị mmadụ malitere ịkpọ nwunye m “Oriakụ Pauline,” na-akpọzi mụnwa “Maazị Pauline.” Ihe a na-atọgbu nwunye m atọgbu.

Mgbe anyị gara ikwusa ozi ọma na Siera Lion

Ọtụtụ ụmụnna nọ ebe ahụ dara ogbenye. Ma Jehova na-elekọta ha, mgbe ụfọdụ, otú ha na-atụghị anya ya. (Mat. 6:33) M na-echeta ihe mere otu ụbọchị. E nwere otu nwanna nwaanyị ihe o nwere bụ ego ga-ezuru ya ịzụta nri ga-ezuru ya na ezinụlọ ya n’ụbọchị ahụ. Mana o nyere otu nwanna nwoke ahụ́ na-adịghị ego ahụ niile ka o jiri ya zụrụ ọgwụ ịba. Mgbe e mechara n’ụbọchị ahụ, otu nwaanyị bịara ka o mee ya isi, kwụọkwa ya ụgwọ mgbe o mechara. E nwere ọtụtụ oge ụdị ihe a na-eme.

ỊMỤTA OMENALA ỌHỤRỤ NA NAỊJIRỊA

Anyị nọrọ na Siera Lion afọ itoolu. A gwaziri anyị ka anyị jewe ozi na Betel dị na Naịjirịa. Alaka ụlọ ọrụ dị n’obodo a buru ibu. Ihe m na-arụ n’alaka ụlọ ọrụ a bụkwa ụdị ọrụ ahụ m rụrụ mgbe m nọ na Siera Lion. Mana, ọ dịghị nwunye m otú ahụ. Mgbanwe a adịrịghị ya mfe. Mgbe anyị nọ na Siera Lion, ọ bụ ọsụ ụzọ pụrụ iche na-eji otu narị awa na iri atọ ekwusa ozi ọma n’ọnwa ọ bụla. O nwekwara ọtụtụ ndị ọ na-amụrụ Baịbụl. Mana, a gwaziri ya ka ọ na-arụ n’ebe a na-adụ ákwà. Ihe ọ na-arụzi bụ ịdụzi ákwà mebiri emebi. Ọrụ a adịrịghị ya mfe. Mana, o mechara chọpụta na ụmụnna ji ọrụ ahụ ọ na-arụ kpọrọ ihe. N’ihi ya, ọ na-eme ike ya niile ịna-agba ụmụnna ndị na-eje ozi na Betel ume.

Omenala ndị Naịjirịa dị iche na nke anyị. E nwekwara ọtụtụ ihe anyị ga-amụta n’aka ha. E nwere oge otu nwanna kpọ nwanna nwaanyị ka bịara Betel ọhụrụ bịa n’ọfis m. Mgbe m wepụtara aka ka o kwe m n’aka, ya adaara m n’ala n’ụkwụ m. Ihe a tụrụ m n’anya. E nwere ebe abụọ na Baịbụl batara m n’obi ozugbo. Otu bụ Ọrụ Ndịozi 10:25, 26, nke ọzọ abụrụ Mkpughe 19:10. M nọ na-eche n’obi m, sị: ‘Ọ̀ bụ m sị ya emezila ihe a?’ Ma, m chetara na ebe ọ bụ na a kpọrọ nwanna nwaanyị a ka ọ bịa Betel, ọ pụtara na ọ ma ihe Baịbụl na-akụzi.

Ahụ́ eruchaghị m ala mgbe mụ na ha nọ na-akparịta ụka. N’ihi ya, mgbe e mechara, m mere nchọnchọ gbasara ya. Ihe m chọpụtara bụ na ihe a nwanna nwaanyị a mere bụ omenala ụfọdụ ndị na Naịjirịa. Ụmụ nwoke na-adakwara mmadụ n’ala otú ahụ. Ọ bụ otú ha si akwanyere mmadụ ùgwù. Ha anaghị eme ya iji fee mmadụ. E nwekwara ndị mere otú ahụ na Baịbụl. (1 Sam. 24:8) Obi dị m ụtọ na agwaghị m nwanna nwaanyị ahụ ihe menyere ya ihere n’ihi na aghọtaghị m ihe mere o ji mee ya.

Mgbe anyị nọ na Naịjirịa, anyị hụrụ ọtụtụ ụmụnna ndị ihe ha mere kemgbe ọtụtụ afọ gosiri na ha nwere ezigbo okwukwe. Ka m kwuo gbasara Nwanna Isaiah Adagbona. b Ọ mụtara eziokwu Baịbụl mgbe ọ ka bụ okorobịa. Mana, e mechara chọpụta na ọ na-arịa ekpenta. A kpọgaziri ya n’ebe a na-elekọta ndị ekpenta. Ọ bụ naanị ya bụ Onyeàmà Jehova n’ebe ahụ. N’agbanyeghị na ha na-emegide ya n’ebe ahụ, o nyeere ihe karịrị mmadụ iri atọ bụ́ ndị ekpenta aka ịmụta eziokwu Baịbụl, e hiwekwa ọgbakọ n’ebe ahụ.

ỤMỤNNA NỌ NA KENYA NWEERE M NDIDI

Ebe m hụrụ anụ raịno na-enweghị nne na nna na Kenya

N’afọ 1996, e zigara anyị ka anyị jewe ozi n’alaka ụlọ ọrụ dị na Kenya. Ihe a bụ nke mbụ ụkwụ m na-akpa n’obodo a kemgbe ihe ahụ m kọrọ ná mmalite mechara. Anyị bi na Betel. Enwe jukwara eju na Betel ebe ahụ. Ọ na-abụ nwanna nwaanyị buru mkpụrụ osisi, ha agaa zuru mkpụrụ osisi ahụ o bu. E nwere otu ụbọchị otu nwanna nwaanyị na-emechighị windo ya emechi pụwa. Mgbe ọ lọtara, ọ hụrụ na enwe juziri n’ụlọ ya na-eri nri ha hụrụ n’ụlọ ya. Nwanna nwaanyị a tiri mkpu gbapụ n’ụlọ ya, ụmụ enwe ndị ahụ emere mkpọtụ si na windo mịpụsịa.

Mụ na nwunye m banyere n’ọgbakọ na-asụ Swahili. O teghị aka, ha ahọpụta m ka m na-eduzi Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ (nke a na-akpọzi Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ). Ma, amachaghị m asụsụ ahụ nke ọma. M na-amụ akwụkwọ ahụ nke ọma. N’ihi ya, m na-enwe ike ịgụpụta ajụjụ ndị ahụ. Ma ọ bụrụ na onye na-aza ajụjụ ekwuo ihe dịtụ iche n’ihe e dere n’akwụkwọ, anaghị m aghọta ihe o kwuru. Ihe a na-emenye m ihere. Ebere ụmụnna ndị ahụ nọ na-eme m. Ma obi dị m ụtọ na ha nweere m ndidi ma wetuo obi hapụ m ka m ka na-eduzi ọmụmụ ihe ahụ.

ỤMỤNNA NỌ N’AMERỊKA NWERE OKWUKWE N’AGBANYEGHỊ NA OBODO AHỤ BARA ỌGARANYA

Anyị anọrughị Kenya otu afọ. N’afọ 1997, a kpọziri anyị ka anyị bịa jewe ozi na Betel dị na Bruklin, Niu Yọk. Obodo a bara ọgaranya. Ihe a nwekwara ike ịkpata nsogbu. (Ilu 30:8, 9) Mana n’agbanyeghị na obodo a bara ọgaranya, ụmụnna nọ na ya nwere ezigbo okwukwe. Ihe ụmụnna anyị na-eji oge ha na ihe ndị ha nwere eme bụ ịkwado ezigbo ọrụ nzukọ Jehova na-arụ, ọ bụghị iji ya na-eme onwe ha ọgaranya.

Kemgbe ọtụtụ afọ, anyị ahụla otú ụmụnna anyị si nwee okwukwe n’agbanyeghị otú ihe si dịrị ha. Ụmụnna anyị nọ n’Ayaland nwere okwukwe n’agbanyeghị na ọgba aghara juru ebe ahụ. Ụmụnna anyị nọ n’Afrịka nwere okwukwe n’agbanyeghị na ha dara ogbenye. Ụmụnna anyị nọ n’Amerịka nwere okwukwe n’agbanyeghị na obodo ahụ bara ọgaranya. O doro anya na obi na-atọgbu Jehova atọgbu ma ọ hụ ka ndị na-efe ya na-eme ihe ndị gosiri na ha hụrụ ya n’anya n’agbanyeghị otú ihe si dịrị ha.

Mụ na nwunye m Pauline na Betel dị na Wọwik

Afọ agbaala ọsọ. Ọ gafeela “ọsọ ọsọ karịa osisi a gbanyere eri nke onye na-ekwe ákwà ji ekwe ákwà.” (Ihe e dere n’ala ala peeji Job 7:6.) Ugbu a, anyị na ụmụnna anyị ndị ọzọ na-arụ ọrụ n’isi ụlọ ọrụ anyị na Wọwik dị na Niu Yọk. Obi dịkwa anyị ụtọ na anyị na ndị hụrụ ibe ha n’anya na-arụkọ ọrụ. Obi dị anyị ụtọ na anyị na-eme ihe anyị nwere ike ime iji kwado Eze anyị bụ́ Jizọs Kraịst, onye ga-akwụ ndị na-eso ụzọ ya ụgwọ n’oge na-adịghị anya.​—Mat. 25:34.

a N’oge ahụ, ihe a na-akpọ mgbakọ ukwu bụ mgbakọ distrikti.

b Akụkọ ndụ Nwanna Isaiah Adagbona gbara n’Ụlọ Nche April 1, 1998, peeji nke 22 ruo 27. Ọ nwụrụ n’afọ 2010.