Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 15

Olee Otú I Si Ewere Ndị Ị Na-ezi Ozi Ọma?

Olee Otú I Si Ewere Ndị Ị Na-ezi Ozi Ọma?

“Welienụ anya unu lee ubi, na ihe a kụrụ na ha achaala maka owuwe ihe ubi.”​—JỌN 4:35.

ABỤ NKE 64 Anyị Ji Ọṅụ Soro Na-ewe Ihe Ubi

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1-2. Gịnị ka ihe Jizọs kwuru na Jọn 4:​35, 36 pụtara?

JIZỌS nọ na-agafe n’ubi a kụrụ ọka. O nwere ike ịbụ na ọka ndị ahụ ka na-eto eto. (Jọn 4:​3-6) Ọ bụ n’ihe dị ka ọnwa anọ na-abịa abịa ka a ga-aghọrọ ọka ndị ahụ. Jizọs kwuru ihe nwere ike ịgbagwoju ndị nọ ebe ahụ anya. Ọ sịrị: “Welienụ anya unu lee ubi, na ihe a kụrụ na ha achaala maka owuwe ihe ubi.” (Gụọ Jọn 4:​35, 36.) Gịnị ka ihe a o kwuru pụtara?

2 O doro anya na Jizọs na-ekwu gbasara ịkpọkọta ndị mmadụ, ọ bụghị iwere ihe ubi. Chegodị gbasara ihe ka mepụrụnụ. N’agbanyeghị na ndị Juu na ndị Sameria anaghị emekọrịta ihe, Jizọs ziri nwaanyị Sameria ozi ọma, ya egee ntị. Ka Jizọs nọ na-ekwu gbasara ubi nke ihe a kụrụ na ya ‘chara maka owuwe ihe ubi,’ ọtụtụ ndị Sameria, bụ́ ndị si n’ọnụ nwaanyị ahụ nụ gbasara Jizọs, nọ n’ụzọ na-abịa ịmụtakwu ihe n’aka ya. (Jọn 4:​9, 39-42) Otu akwụkwọ na-akọwa Baịbụl kwuru gbasara ihe a, sị: “Otú ndị ahụ si bịakwute Jizọs ozugbo . . . gosiri na ha dị ka ọka karala aka na-eche ka a ghọrọ ya.”

Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma anyị were ya na ihe ubi anyị “achaala maka owuwe ihe ubi”? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 3)

3. Olee otú iwere ndị mmadụ otú Jizọs si were ha ga-esi mee ka ozi ọma gị ka mma?

3 Olee otú i si ewere ndị ị na-ezi ozi ọma? Ị̀ na-ewere ha ka ọka karala aka na-eche ka a ghọrọ ya? Ọ bụrụ otú ahụ, ị ga na-eme ihe atọ a. Nke mbụ, ị ga-eji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma. Oge owuwe ihe ubi anaghị adị ogologo. N’ihi ya, i kwesịghị igbuwe oge. Nke abụọ, obi ga-adị gị ụtọ ma ndị mmadụ na-ege ozi ọma. Baịbụl kwuru, sị: “A na-aṅụrị [ọṅụ] n’oge owuwe ihe ubi.” (Aịza. 9:3) Nke atọ, ị ga-ewere onye ọ bụla ka onye nwere ike ịghọ onye na-eso ụzọ Jizọs. N’ihi ya, ị ga na-agbanwe otú i si ezi ozi ọma ka ọ masị ha.

4. Gịnị ka anyị ga-amụta n’aka Pọl onyeozi n’isiokwu a?

4 O nwere ike ịbụ na ụfọdụ ndị na-eso ụzọ Jizọs chere na ndị Sameria emekataghị chegharịa. Ma Jizọs echeghị otú ahụ. Kama, o weere ha ka ndị nwere ike ịghọ ndị na-eso ụzọ ya. Anyịnwa kwesịkwara iwere ndị anyị na-ezi ozi ọma ka ndị nwere ike ịghọ ndị na-eso ụzọ Kraịst. Pọl onyeozi mekwara ihe magburu onwe ya anyị kwesịrị ime. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’aka ya? N’isiokwu a, anyị ga-atụle (1) otú o si mata ihe ndị o ziri ozi ọma kweere, (2) otú o si mata ihe na-amasị ha, nakwa (3) otú o si were ha ka ndị ga-emecha bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs.

GỊNỊ KA HA KWEERE?

5. Gịnị mere Pọl ji ghọta ndị ọ gwara okwu n’ụlọ nzukọ nke ọma?

5 Pọl kwusara ozi ọma ọtụtụ mgbe n’ụlọ nzukọ ndị Juu. Dị ka ihe atụ, n’ụlọ nzukọ dị na Tesalonaịka, “ya na [ndị Juu] nọ na-atụgharị uche n’Akwụkwọ Nsọ ruo ụbọchị izu ike atọ.” (Ọrụ 17:​1, 2) Pọl bụ onye Juu. N’ihi ya, ọ ga-abụ na obi ruru ya ala ikwusa ozi ọma n’ụlọ nzukọ. (Ọrụ 26:​4, 5) Ebe ọ bụ na Pọl ghọtara ndị Juu nke ọma, ahụ́ ruru ya ala izi ha ozi ọma.​—Fil. 3:​4, 5.

6. Olee ihe dị iche ná ndị Pọl ziri ozi ọma n’ahịa dị n’Atens na ndị o ziri ozi ọma n’ụlọ nzukọ?

6 Mgbe ndị mmegide mere ka Pọl si na Tesalonaịka na Beria gbapụ, ọ gbagara Atens. N’ebe ahụkwa, “ọ malitere iso ndị Juu na ndị ọzọ bụ́ ndị na-efe Chineke na-atụgharị uche n’ụlọ nzukọ.” (Ọrụ 17:17) Ma mgbe Pọl na-ekwusa ozi ọma n’ahịa, ndị o ziri ozi ọma dị iche. Ndị o ziri ozi ọma bụ ma ndị ọkà mmụta ma ndị Jentaịl ndị ọzọ. Ha weere ihe o kwuru ka “ozizi ọhụrụ.” Ha sịrị ya: “Ị na-akụzi ihe ndị anyị na-anụtụbeghị ná ntị.”​—Ọrụ 17:​18-20.

7. Dị ka e kwuru n’Ọrụ Ndịozi 17:​22, 23, olee otú Pọl si gbanwee otú o si ezi ozi ọma?

7 Gụọ Ọrụ Ndịozi 17:​22, 23. Otú Pọl si zie ndị Jentaịl nọ n’Atens ozi ọma dị iche n’otú o si zie ndị Juu nọ n’ụlọ nzukọ ozi ọma. Ọ ga-abụ na Pọl jụrụ onwe ya, sị: ‘Olee ihe ndị a nọ n’Atens kweere?’ O leruru anya n’ihe na-eme gburugburu ya, chọpụtakwa ihe ndị ha na-eme n’okpukpe ha. Ihe ọzọ Pọl mere bụ na o ji ihe ha kweere zie ha ozi ọma. Otu onye na-akọwa Baịbụl kwuru, sị: “Ebe ọ bụ na Pọl bụ onye Juu, ọ ma na ndị Grik na-ekpere arụsị anaghị efe ezi Chineke ndị Juu na Ndị Kraịst na-efe. N’agbanyeghị ya, ọ gbalịrị ime ka ndị Atens mata na Chineke ọ na-ekwusa banyere ya abụghị onye ha na-amaghị.” Pọl dị njikere ịgbanwe otú o si ekwusa ozi ọma. Ọ gwara ndị Atens na ozi ọma ọ na-ekwusa si n’aka “Chi [ahụ] A Na-amaghị Ama” ha na-agbalị ife kemgbe. N’agbanyeghị na ndị Jentaịl amaghị Akwụkwọ Nsọ, Pọl akwụsịghị izi ha ozi ọma. Kama nke ahụ, o weere ha ka ọka kara aka na-eche ka a ghọrọ ya. Ọ bụ ya mere o ji zie ha ozi ọma otú ọ ga-amasị ha.

Na-eme ka Pọl. Na-eleru anya ala, na-agbanwe otú i si ezi ozi ọma, na-ewerekwa ndị mmadụ ka ndị nwere ike ịghọ ndị na-eso ụzọ Jizọs (A ga-akọwa ya na paragraf nke 8, 12, 18) *

8. (a) Olee otú i nwere ike isi chọpụta ihe ndị ị chọrọ izi ozi ọma kweere? (b) Ọ bụrụ na mmadụ asị gị na ya nwere okpukpe ọ na-ekpe, gịnị ka i nwere ike ịgwa ya?

8 Na-eleru anya ala ka Pọl. Leruo anya ka ị hụ ihe ndị ga-enyere gị aka ịmata ihe ndị ị na-ezi ozi ọma kweere. Olee ihe ndị ị hụrụ n’ihu ụlọ onye ị chọrọ izi ozi ọma ga-enyere gị aka ịmata gbasara ya? Aha ya, ejiji ya, ma ọ bụ otú o si ekwu okwu, ò mere ka ị mata okpukpe ya? O nwere ike ịbụ na ọ gwala gị na ya nwere okpukpe ọ na-ekpe. Ọ bụrụ na mmadụ agwa otu ọsụ ụzọ pụrụ iche aha ya bụ Flutura ụdị ihe a, ọ na-asị onye ahụ, “Abịaghị m ịmanye gị ka i kwere ihe m kweere. Kama m chọrọ ka mụ na gị kwurịta gbasara . . . ”

9. Olee ihe ndị gị na onye ji okpukpe kpọrọ ihe nwere ike ikwurịta?

9 Olee isiokwu ndị gị na onye ji okpukpe kpọrọ ihe nwere ike ikwurịta? Gbalịa chọpụta ihe ndị gị na ya kweere. O nwere ike ịbụ na o kweere na ya na-efe otu Chineke, kwetakwa na Jizọs bụ Onye Nzọpụta, ma ọ bụkwanụ kweta na ihe ọjọọ juru n’ụwa a ga-akwụsị n’oge na-adịghị anya. Jiri ihe ndị a gị na ya kweere zie ya ozi ọma otú ga-amasị ya.

10. Gịnị ka anyị kwesịrị ịgbalị mee? N’ihi gịnịkwa?

10 Buru n’obi na e nwere ike ọ bụghị ihe niile a na-akụzi n’okpukpe mmadụ na-ekpe ka o kweere. N’ihi ya, ọ bụrụgodị na ị chọpụtala okpukpe mmadụ na-ekpe, gbalịakwa chọpụta ihe onye ahụ kweere. Otu ọsụ ụzọ pụrụ iche nọ n’Ọstrelia aha ya bụ David kwuru, sị: “Ọtụtụ ndị ugbu a na-agwakọta amamihe mmadụ na ihe okpukpe ha na-akụzi.” Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Donalta bi n’Albenia kwuru, sị: “Ụfọdụ ndị anyị na-ahụ n’ozi ọma na-ekwu na ha bụ ndị okpukpe, ma, ha na-emecha kwuo na ha ekweghị na Chineke.” Otu nwanna onye ozi ala ọzọ bi n’Ajentina chọpụtara na e nwere ụfọdụ ndị na-ekwu na ha kweere n’Atọ n’Ime Otu, ma ha ekweghị na Nna ahụ, Ọkpara ya na mmụọ nsọ bụ otu Chineke. O kwuru, sị: “Ịmata ihe a na-eme ka ọ dịrị m mfe ịma ihe mmadụ kweere m ga-eji zie ya ozi ọma.” N’ihi ya, gbalịa na-achọpụta ihe ndị mmadụ kweere n’eziokwu. I mee otú ahụ, i nwere ike ịghọ “ihe niile n’ebe ụdị mmadụ niile nọ,” otú ahụ Pọl mere.​—1 Kọr. 9:​19-23.

OLEE IHE NDỊ NA-AMASỊ HA?

11. Dị ka e kwuru n’Ọrụ Ndịozi 14:​14-17, olee otú Pọl si zie ndị Listra ozi ọma otú ọ ga-amasị ha?

11 Gụọ Ọrụ Ndịozi 14:​14-17. Pọl chọpụtara ihe ndị na-amasị ndị ọ na-ezi ozi ọma ma jiri ha zie ha ozi ọma. Dị ka ihe atụ, ndị ọ na-agwa okwu na Listra amaghị ihe dị n’Akwụkwọ Nsọ. N’ihi ya, Pọl ji ihe ha ga-aghọta nke ọma gwa ha okwu. Ọ gwara ha gbasara oge mkpụrụ ji amị na ihe ga-eme ka mmadụ na-enwe obi ụtọ. Ọ gwara ha okwu ndị ha ga-aghọta, meekwara ha ihe atụ ndị ga-edo ha anya.

12. Olee otú i nwere ike isi chọpụta ihe na-amasị mmadụ ma jiri ya zie ya ozi ọma?

12 Gbalịa chọpụta ihe ndị na-amasị ndị unu na-ezi ozi ọma ma jiri ha zie ha ozi ọma. Olee otú i nwere ike isi chọpụta ihe na-amasị mmadụ ma i rutewe ya ma ọ bụ ụlọ ya nso? Na-eleru anya ala. O nwere ike ịbụ na ọ na-asụchasị ahịhịa ma ọ bụ na-agụ akwụkwọ, na-emezi ụgbọala ma ọ bụkwanụ na-eme ihe ndị ọzọ. I nwere ike iji ihe ahụ ọ na-eme malite izi ya ozi ọma. (Jọn 4:7) Uwe mmadụ yi nwedịrị ike ịgwa gị ụdị onye ọ bụ. O nwere ike ime ka ị mata obodo ya, ọrụ ya, ma ọ bụ òtù egwuregwu na-amasị ya. Otu nwanna aha ya bụ Gustavo sịrị: “M malitere ịgwa otu nwa okorobịa dị afọ iri na itoolu okwu. O yi uwe e sere otu onye egwú a ma ama. M jụrụ ya gbasara ya, ya agwa m ihe mere ihe onye egwú ahụ ji amasị ya. Mkparịta ụka ahụ mere ka mụ na ya mụwa Baịbụl. Ugbu a, ọ bụ nwanna anyị.”

13. Olee otú i nwere ike isi mee ka mmadụ nwee mmasị ịmụ Baịbụl?

13 Ọ bụrụ na ị gwawa mmadụ na ị chọrọ ka gị na ya mụwa Baịbụl, gwa ya gbasara ya otú ọ ga-amasị ya. Meekwa ka ọ mata uru ọ ga-abara ya. (Jọn 4:​13-15) Dị ka ihe atụ, otu nwaanyị nwere mmasị gwara otu nwanna nwaanyị ka ọ bata n’ụlọ ya. Mgbe ọ batara, ọ hụrụ asambodo e konyere n’ahụ́ ụlọ gosiri na nwaanyị ahụ bụ ọkachamara n’ihe gbasara agụmakwụkwọ. Nwanna nwaanyị ahụ gwara ya na anyịnwa na-akụzikwara ndị mmadụ ihe. Otú anyị si eme ya bụ ịkụziri ha Baịbụl n’ụlọ ha nakwa n’ọmụmụ ihe anyị. Nwaanyị ahụ kwetara ka a mụwara ya Baịbụl, bịa ọmụmụ ihe anyị echi ya, bịakwa mgbakọ sekit ọzọ anyị nwere. Mgbe otu afọ gara, o mere baptizim. Jụọ onwe gị, sị: ‘Olee ihe ndị na-amasị ndị m na-agara nletaghachi? M̀ nwere ike ịkọwara ha otú anyị si amụrụ ndị mmadụ Baịbụl otú ọ ga-amasị ha?’

14. Olee otú i nwere ike isi mee ka ihe ị na-akụzi baara onye nke ọ bụla ị na-amụrụ ihe uru?

14 E nwee onye ị na-amụrụ ihe, kwadebe nke ọma mgbe ọ bụla ị na-aga ịmụrụ ya ihe. Buru n’obi ihe ndị ị ma gbasara onye ahụ na ihe ndị na-amasị ya na-akwadebe ya. Ka ị na-akwadebe ya, kpebie amaokwu Baịbụl ị ga-agụrụ ya, vidio ị ga-egosi ya, nakwa ihe atụ ị ga-eji kọwaara ya eziokwu dị na Baịbụl. Jụọ onwe gị, sị: ‘Olee ihe ga-akacha amasị onye a m na-amụrụ Baịbụl ma ruo ya n’obi?’ (Ilu 16:23) N’Albenia, otu nwaanyị ya na onye ọsụ ụzọ aha ya Flora na-amụ Baịbụl kwuru hoo haa, sị: “Emekataghị m kweta na a ga-enwe mbilite n’ọnwụ.” Flora amanyeghị ya ikweta. Ọ sịrị: “M ghọtara na tupu ya enwee ike ikweta ná mbilite n’ọnwụ, o kwesịrị ibu ụzọ mata Chineke ahụ kwere nkwa mbilite n’ọnwụ.” Malite mgbe ahụ gawa, n’ọmụmụ ihe ọ bụla, Flora na-akọrọ ya gbasara ịhụnanya Jehova, amamihe ya na ike ya. Ka oge na-aga, onye ahụ ọ na-amụrụ Baịbụl kwetara ná mbilite n’ọnwụ. Ugbu a, ọ bụ Onyeàmà Jehova na-anụ ọkụ n’obi.

WERE HA KA NDỊ NWERE IKE ỊGHỌ NDỊ NA-ESO ỤZỌ JIZỌS

15. Dị ka e kwuru n’Ọrụ Ndịozi 17:​16-18, olee omume a na-eme n’Atens oge ochie wutere Pọl? Gịnị mere ike agwụghị ya ikwusara ha ozi ọma?

15 Gụọ Ọrụ Ndịozi 17:​16-18. Ike agwụghị Pọl ikwusara ndị Atens ozi ọma n’agbanyeghị na ihe juru n’obodo ahụ bụ ikpere arụsi, omume rụrụ arụ, na nkụzi ndị ọgọ mmụọ. Mkparị ha kparịrị ya emekwaghị ka ọ kwụsị ikwusara ha ozi ọma. Pọl ghọdịrị Onye Kraịst n’agbanyeghị na ọ bụbu “onye nkwulu na onye mkpagbu na onye na-akparị mmadụ.” (1 Tim. 1:13) Otú ahụ Jizọs si were Pọl ka onye nwere ike ịghọ onye na-eso ụzọ ya, ka Pọl sikwa were ndị Atens ka ndị nwere ike ịghọ ndị na-eso ụzọ Jizọs. Ụfọdụ n’ime ha mechakwara ghọọ ndị na-eso ụzọ Jizọs.​—Ọrụ 9:​13-15; 17:34.

16-17. Gịnị gosiri na ụdị mmadụ niile nwere ike ịghọ ndị na-eso ụzọ Jizọs? Nye ihe atụ.

16 N’oge ndịozi Jizọs, ụdị mmadụ dị iche iche ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs. Mgbe Pọl degaara Ndị Kraịst bi n’obodo ndị Grik bụ́ Kọrịnt akwụkwọ ozi, o kwuru na e nwere mgbe ndị ụfọdụ nọ n’ọgbakọ ahụ bụ ndị omekome ma ọ bụ ndị na-eme omume rụrụ arụ na-awụ akpata oyi. O kwukwara, sị: “Ma nke ahụ bụkwa ihe ụfọdụ n’ime unu bụbu. Ma a sachawo unu.” (1 Kọr. 6:​9-11) Ì nwere ike ichetụ n’echiche na ụdị ndị ahụ nwere ike imecha ghọọ ndị na-eso ụzọ Jizọs?

17 Taa, ọtụtụ ndị dị njikere ịgbanwe ihe ụfọdụ iji bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs. Dị ka ihe atụ, n’Ọstrelia, otu nwanna nwaanyị bụ́ ọsụ ụzọ pụrụ iche aha ya bụ Yukina chọpụtara na ụdị mmadụ niile nwere ike ịnabata ozi ọma dị na Baịbụl. N’otu oge ọ nọ n’ọfis ndị na-ahụ maka ala na ụlọ, ọ hụrụ otu nwa agbọghọ gburu egbugbu n’ahụ́ ya. Yukina kwuru, sị: “M gbachiri nkịtị ná mmalite. Ma m mechara gwawa ya okwu. M chọpụtara na o nwere ezigbo mmasị na Baịbụl nke na ihe ụfọdụ o gburu n’egbugbu n’ahụ́ ya si n’Abụ Ọma.” Nwa agbọghọ ahụ mechara mụwa Baịbụl ma na-abịa ọmụmụ ihe. *

18. Gịnị mere anyị ekwesịghị iwere ndị mmadụ ka ndị na-emekataghị ghọọ ndị na-eso ụzọ Kraịst?

18 Ihe mere Jizọs ji were ya na ihe ubi achaala maka owuwe ihe ubi ọ̀ bụ maka na ọ na-atụ anya ka ọtụtụ ndị sowe ya? Mba. Akwụkwọ Nsọ ebula ụzọ kwuo na ọ bụ mmadụ ole na ole ga-enwe okwukwe na ya. (Jọn 12:​37, 38) Jizọs nwere ike ịmata ihe dị ndị mmadụ n’obi. (Mat. 9:4) Ọ bụ eziokwu na ndị ọ kacha lekwasị anya na-akụziri ihe bụ mmadụ ole na ole ga-ekwere na ya, o jikwa ịnụ ọkụ n’obi kwusaara mmadụ niile ozi ọma. Ebe ọ bụ na anyịnwa enweghị ike ịmata ihe dị mmadụ n’obi, anyị ekwesịghị iwere ụfọdụ ndị ma ọ bụ ndị nọ n’ókèala ụfọdụ ka ndị na-enweghị ike ịghọ ndị na-eso ụzọ Jizọs. Kama nke ahụ, ka anyị na-ewere ndị mmadụ ka ndị nwere ike ịghọ ndị na-eso ụzọ Jizọs. Otu onye ozi ala ọzọ bi na Bokina Faso aha ya bụ Marc kwuru, sị: “Ọtụtụ ndị m chere na ha ga-eme nke ọma na-emecha kwụsị ịmụ Baịbụl. Ma, ndị nke m chere na ha ga-emecha kwụsị na-emecha mee nke ọma. Ihe a akụzierela m na ọ kacha mma ikwe ka mmụọ Jehova na-eduzi anyị.”

19. Olee otú anyị kwesịrị isi were ndị anyị na-ezi ozi ọma?

19 Ná mmalite, o nwere ike ịdị ka o nweghị ọtụtụ ndị anyị na-ezi ozi ọma dị ka ọka kara aka na-eche ka a bịa ghọrọ ya. Ma, cheta na Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya na ihe ubi achaala, ya bụ, na oge a ga-aghọrọ ha eruola. Ndị mmadụ nwere ike ịgbanwe ma ghọọ ndị na-eso ụzọ Kraịst. Jehova na-ewere ndị nọ n’ókèala anyị ka ndị nwere ike ịghọ ndị na-eso ụzọ Jizọs nakwa dị ka “ihe a na-achọsi ike.” (Hag. 2:7) Ọ bụrụ na anyị ewere ndị mmadụ otú Jehova na Jizọs si were ha, anyị ga-agbalị mata banyere ha na ihe ndị na-amasị ha. Anyị agaghị ewere ha ka ndị na-agaghị echegharị, kama ka ndị ga-emecha ghọọ ụmụnna anyị.

ABỤ NKE 57 Anyị Na-ezi Ụdị Mmadụ Niile Ozi Ọma

^ par. 5 Olee otú otú anyị si ewere ndị nọ n’ókèala anyị si eme ka otú anyị si ezi ozi ọma na otú anyị si akụzi ihe ka mma? N’isiokwu a, anyị ga-atụle otú Jizọs na Pọl si were ndị ha ziri ozi ọma na otú anyị nwere ike isi na-eme ka ha ma na-eche gbasara ihe ndị anyị na-ezi ozi ọma kweere na ihe ndị na-amasị ha, matakwa na ha nwere ike imecha bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs.

^ par. 17 I nwere ike ịhụ otú ndị ọzọ si gbanwee n’isiokwu bụ́ “Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ.” Isiokwu ndị a gbara n’Ụlọ Nche ruo n’afọ 2017. Ugbu a, ọ na-agbazi na jw.org®. Gaa n’ebe e dere GBASARA ANYỊ, pịa AJỤJỤ ỌNỤ.

^ par. 57 NKỌWA FOTO: Mgbe otu di na nwunye na-aga ozi ọma ụlọ n’ụlọ, ha hụrụ (1) ụlọ e doziri nke ọma e ji okooko osisi chọọ mma; (2) ụlọ ezinụlọ nwere ụmụaka bi; (3) ụlọ ime ya na èzí ya ruru unyi; nakwa (4) ụlọ ndị bi na ya bụ ndị okpukpe. Olee ebe ị ga-akacha ahụ onye nwere ike ịghọ onye na-eso ụzọ Jizọs?