Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ṅomie Jehova Bụ́ Chineke nke Na-agba Ndị Ya Ume

Ṅomie Jehova Bụ́ Chineke nke Na-agba Ndị Ya Ume

“Ka Chineke . . . bụrụ onye a gọziri agọzi, onye na-akasi anyị obi * ná mkpagbu anyị niile.”​​—⁠2 KỌR. 1:​3, 4.

ABỤ: 7, 3

1. Mgbe Adam na Iv nupụchara isi n’Iden, olee ihe Jehova kwuru nke na-agba ụmụ mmadụ ume?

KEMGBE ụmụ mmadụ mehiere ma bụrụ ndị na-ezughị okè, Jehova egosila na ya bụ Chineke nke na-agba anyị ume. Ozugbo Adam na Iv nupụchara isi n’Iden, Chineke kwuru ihe ga-eme ka ụmụ ha ga-amụta nwee obi ike. Ụmụ mmadụ ka nwere olileanya. Ha ghọta nkwa Chineke kwere na Jenesis 3:​15, ọ ga-eme ka ha nwee olileanya na a ga-emecha bibie “agwọ mbụ ahụ,” ya bụ, Setan bụ́ Ekwensu na ọrụ ya niile.​—⁠Mkpu. 12:9; 1 Jọn 3:⁠8.

JEHOVA GBARA NDỊ OHU YA N’OGE OCHIE UME

2. Olee otú Jehova si gbaa Noa ume?

2 Ohu Jehova bụ́ Noa dịrị ndụ n’oge ụwa jupụtara n’ihe ọjọọ. N’oge ahụ, ọ bụ naanị ya na ndị ezinụlọ ya na-efe Jehova. Otú tigbuo zọgbuo si ju ebe niile nakwa otú ndị mmadụ si na-akwa iko aghara aghara n’oge ahụ gaara eme ka Noa daa mbà. (Jen. 6:​4, 5, 11; Jud 6) Ma Jehova gwara ya ihe mere ka o nwee obi ike ọ ga-eji soro ‘ezi Chineke na-eje ije.’ (Jen. 6:⁠9) Jehova gwara Noa na ọ ga-ebibi ụwa ọjọọ ahụ, ma gwa ya ihe ọ ga-eme ka a zọpụta ya na ndị ezinụlọ ya. (Jen. 6:​13-18) Jehova gosiri Noa na ya bụ Chineke nke na-agba ume.

3. Olee otú Jehova si gbaa Jọshụa ume? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

3 Jehova mechara gbaa ohu ya bụ́ Jọshụa ume. Jọshụa nwere nnukwu ọrụ ọ ga-arụ. Ọ ga-akpọrọ ụmụ Izrel banye n’Ala Nkwa ahụ, meriekwa ndị agha siri ike nke mba ndị bi n’Ala Nkwa ahụ. Jehova ma na ihe a nwere ike ime ka ụjọ tụọ Jọshụa. N’ihi ya, Jehova gwara Mozis, sị: “Mee Jọshụa onye ndú, gbaakwa ya ume ma mee ka ọ dị ike, n’ihi na ọ bụ ya ga-ebutere ndị a ụzọ mgbe ha na-agafe, ọ bụkwa ya ga-eme ka ha nweta ala ahụ ị ga-ahụ.” (Diut. 3:28) Tupu Jọshụa ebido ịrụ ọrụ ahụ, Jehova gbara ya ume, sị: “Ọ̀ kwa m nyere gị iwu? Nwee obi ike, dịkwa ike. Amala jijiji, atụkwala ụjọ, n’ihi na Jehova bụ́ Chineke gị nọnyeere gị ebe ọ bụla ị na-aga.” (Jọsh. 1:​1, 9) Ihe a Jehova gwara ya gbara ya ume.

4, 5. (a) Olee otú Jehova si gbaa ndị ya n’oge ochie ume? (b) Olee otú Jehova si gbaa Ọkpara ya ume?

4 Ọ bụghị naanị na Jehova na-agba ndị ya ume n’otu n’otu, kama, ọ na-agbakwa ha ume n’ìgwè. Dị ka ihe atụ, Jehova ma na e kwesịrị ịgba ndị Juu a dọọrọ n’agha laa Babịlọn ume. Ọ gwara ha ihe ga-agba ha ume. Ọ sịrị: ‘Atụla egwu, n’ihi na m nọnyeere unu. Elegharịla anya n’ụjọ, n’ihi na abụ m Chineke unu. M ga-eme ka unu dị ike. M ga-enyere unu aka. M ga-eji aka nri m nke ezi omume jidesie unu ike.’ (Aịza. 41:10) Jehova gbakwara Ndị Kraịst oge ochie ume, ọ na-agbakwa anyị ume taa.​—⁠Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 1:​3, 4.

5 Jehova gbakwara Ọkpara ya ume. Mgbe e mechara Jizọs baptizim, ọ nụrụ olu si n’eluigwe kwuo, sị: “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya, onye ihe ya masịrị m.” (Mat. 3:17) Okwu ahụ Chineke gwara Jizọs gbara ya ume n’oge niile o jere ozi ya n’ụwa.

JIZỌS GBARA NDỊ ỌZỌ UME

6. Olee otú ihe atụ Jizọs mere gbasara talent si agba anyị ume?

6 Jizọs ṅomiri otú Nna ya si gbaa ndị ọzọ ume. Mgbe Jizọs na-ekwu gbasara ọgwụgwụ usoro ihe a, o ji ihe atụ gbasara talent gbaa ndị mmadụ ume ka ha nọgide na-efe Jehova. Nna ukwu ahụ jara ohu ya nke ọ bụla mma, sị: “I mere nke ọma, ezi ohu kwesịrị ntụkwasị obi! I kwesịrị ntụkwasị obi n’ilekọta ihe ole na ole. M ga-eme gị onye na-elekọta ọtụtụ ihe. Soro nna gị ukwu ṅụrịa ọṅụ.” (Mat. 25:​21, 23) Ihe a Jizọs kwuru gbara ndị na-eso ụzọ ya ume ịnọgide na-efe Jehova.

7. Olee otú Jizọs si gbaa ndịozi ya ume, karịchaa Pita?

Ndịozi Jizọs sere okwu ọtụtụ ugboro gbasara onye ka ibe ya, ma Jizọs nọ na-enwere ha ndidi. Ọ gbara ha ume ka ha dịrị umeala n’obi ma na-ejere ndị ọzọ ozi, kama ịchọ ka ndị ọzọ na-ejere ha ozi. (Luk 22:​24-26) Pita mere ihe wutere Jizọs ọtụtụ ugboro. (Mat. 16:​21-23; 26:​31-35, 75) Ma Jizọs ajụghị ya, kama ọ gbara ya ume ma gwakwa ya ka o mee ka ụmụnna ya dị ike.​—⁠Jọn 21:⁠16.

OTÚ NDỊ OGE OCHIE SI GBAA IBE HA UME

8. Olee otú Hezekaya si gbaa ndị isi agha na ndị bi na Jeruselem ume?

8 Tupu Ọkpara Chineke abịa n’ụwa ma gosi otú e si agba ndị mmadụ ume, ndị ohu Jehova ma na ha kwesịrị ịgba ndị ọzọ ume. Mgbe ndị Asiria chọrọ ibuso ndị bi na Jeruselem agha, Hezekaya kpọkọtara ndị isi agha na ndị bi na Jeruselem ka ọ gbaa ha ume. Baịbụl sịrị: “Ha wee malite inwe obi ike n’ihi ihe Hezekaya eze Juda kwuru.”​—⁠Gụọ 2 Ihe E Mere 32:​6-8.

9. Olee ihe akwụkwọ Job na-akụziri anyị gbasara ịgba mmadụ ume?

9 Anyị nwere ike ịmụta otú anyị nwere ike isi gbaa ndị ọzọ ume n’aka Job. Ọ bụ eziokwu na e kwesịrị ịgba ya ume, ọ kụziiri ndị ọzọ otú e si agba mmadụ ume. Ọ gwara ndị bịara ịkasi ya obi na ọ bụrụ na ọ bụ ya chọrọ ịgba ha ume, na ya ‘gaara eji okwu ọnụ ya mee ka ha dị ike, okwu ngụgụ obi nke si n’egbugbere ọnụ ya ga-ebelatakwa ihe mgbu ha.’ (Job 16:​1-5) N’ikpeazụ, ma Elaịhu ma Jehova gbara Job ume.​—⁠Job 33:​24, 25; 36:​1, 11; 42:​7, 10.

10, 11. (a) Olee ihe mere e kwesịrị iji gbaa ada Jefta ume? (b) Olee ndị e kwesịrị ịgba ụdị ume ahụ taa?

10 Onye ọzọ n’oge ochie e kwesịrị ịgba ume bụ ada Jefta. Tupu Jefta agawa ibuso ndị Amọn agha, o kwere Jehova nkwa na ọ bụrụ na ya emerie, na onye mbụ ga-apụta izute ya, ga-eji ndụ ya niile jeere Jehova ozi n’ụlọikwuu. Ada ya, bụ́ naanị nwa ọ mụtara, bụ onye mbụ bịara zute ya mgbe o meriri. Obi gbawara Jefta. Ma, o mechara mezuo nkwa o kwere ma ziga nwa ya nwaanyị na-amaghị nwoke na Shaịlo, ka o jiri ndụ ya niile na-ejere Jehova ozi n’ụlọikwuu.​—⁠Ikpe 11:​30-35.

11 N’agbanyeghị otú ihe a si siere Jefta ike, o nwere ike ịbụ nwa ya nwaanyị ka ọ kacha siere ike. Ma, o kwetara ime ihe nna ya kwere Jehova ná nkwa. (Ikpe 11:​36, 37) Ọ pụtara na ọ gaghị alụ di, mụta ụmụ ma mee ka aha ezinụlọ ha na ihe nketa ezinụlọ ha ghara ifu. E kwesịrị ịkasi ya obi ma gbaa ya ume. Baịbụl kwuru, sị: “O wee bụrụ ụkpụrụ n’Izrel: Site n’afọ ruo n’afọ, ndị inyom Izrel na-aga aja ada Jefta onye Gilied mma, ụbọchị anọ n’afọ.” (Ikpe 11:​39, 40) Ọ̀ bụ na e kwesịghịkwa ịgba ụmụnna anyị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye ji ndụ ha na-arụ ọrụ “Onyenwe anyị” ume ma jaa ha mma?​—⁠1 Kọr. 7:​32-35.

NDỊOZI GBARA ỤMỤNNA HA UME

12, 13. Olee otú Pita si ‘mee ka ụmụnna ya dị ike’?

12 N’abalị bọtara ụbọchị Jizọs nwụrụ, ọ gwara Pita onyeozi, sị: “Saịmọn, Saịmọn, lee! Setan achọsiwo ike ka a yọchaa unu dị ka ọka wit. Ma arịọsiwo m arịrịọ ike maka gị ka okwukwe gị wee ghara ịda mbà; gị onwe gị kwa, ozugbo ị laghachiri, mee ka ụmụnna gị dị ike.”​—⁠Luk 22:​31, 32.

Akwụkwọ ozi ndịozi dere gbara Ndị Kraịst ezigbo ume n’oge ndịozi Jizọs, ha na-agbakwa anyị ume taa (A ga-akọwa ya na paragraf nke 12 ruo na nke 17)

13 Pita mere ihe gosiri na ọ bụ ogidi n’ọgbakọ Ndị Kraịst oge mbụ. (Gal. 2:⁠9) Otú o si kata obi kwuo okwu na Pentikọst na mgbe e mechara, gbara ụmụnna ya ume. Mgbe o jeerela Chineke ozi ọtụtụ afọ, o degaara Ndị Kraịst ibe ya akwụkwọ ozi, sị: “M detaara unu akwụkwọ ozi a dị nkenke, iji gbaa unu ume, gbasiekwa àmà ike na nke a bụ ezi obiọma Chineke nke na-erughịrị mmadụ; guzosienụ ike na ya.” (1 Pita 5:12) Akwụkwọ ozi ndị Pita dere na-agba Ndị Kraịst ume kemgbe ụwa. Agbamume a dị anyị ezigbo mkpa ka anyị na-eche ka Jehova mezuo nkwa ndị o kwere anyị.​—⁠2 Pita 3:⁠13.

14, 15. Olee otú akwụkwọ ndị Jọn dere si gbaa Ndị Kraịst ume n’oge gara aga? Oleekwa otú o si na-agba anyị ume taa?

14 Jọn onyeozi bụkwa ogidi n’ọgbakọ Ndị Kraịst oge mbụ. Ihe ndị mara mma o dere n’akwụkwọ Jọn banyere ozi Jizọs, gbara Ndị Kraịst ume n’oge gara aga, ọ ka na-agbakwa anyị ume taa. Ọ bụ naanị n’akwụkwọ Jọn ka e dere na Jizọs kwuru na ịhụnanya bụ ihe e ji amata ezigbo ndị na-eso ụzọ ya.​—⁠Gụọ Jọn 13:​34, 35.

15 E nwere eziokwu ndị magburu onwe ha n’akwụkwọ ozi atọ Jọn dere. Ọ bụrụ na mmehie anyị mere na-ewute anyị, ọ̀ bụ na obi anaghị eru anyị ala ma anyị gụta na “ọbara Jizọs . . . na-asachapụ anyị mmehie niile”? (1 Jọn 1:⁠7) Ọ bụrụkwa na obi anyị na-ama anyị ikpe, ọ̀ bụ na obi anaghị atọ anyị ezigbo ụtọ, ma anyị gụta na “Chineke karịrị obi anyị”? (1 Jọn 3:20) Ọ bụ naanị Jọn dere na “Chineke bụ ịhụnanya.” (1 Jọn 4:​8, 16) O ji akwụkwọ ozi ya nke abụọ na nke atọ jaa Ndị Kraịst “na-eje ije n’eziokwu” mma.​—⁠2 Jọn 4; 3 Jọn 3, 4.

16, 17. Olee otú Pọl si gbaa Ndị Kraịst oge mbụ ume?

16 N’oge ndịozi, ọ ga-abụ Pọl onyeozi kacha gbaa Ndị Kraịst ume. N’oge na-adịghị anya Jizọs nwụchara, ọtụtụ n’ime ndịozi bi na Jeruselem, bụ́ ebe ndị so n’òtù na-achị isi nọ. (Ọrụ 8:14; 15:⁠2) Ndị Kraịst nọ na Judia kwusaara ndị kweere na e nwere naanị otu ezi Chineke ozi ọma banyere Kraịst. Ma, mmụọ nsọ zigara Pọl ka o kwusaara ndị Gris na ndị Rom, nakwa ndị ọzọ na-efe ọtụtụ chi, ozi ọma.​—⁠Gal. 2:​7-9; 1 Tim. 2:⁠7.

17 Pọl gara ebe dị iche iche n’ebe a na-akpọ Tọki ugbu a, nakwa na Gris na Ịtali, kwusaara ndị na-abụghị ndị Juu bi n’obodo ndị ahụ ozi ọma, ma hiwe ọgbakọ Ndị Kraịst. Ndị a ghọrọ Ndị Kraịst ọhụrụ ‘tara ahụhụ n’aka ndị obodo ha,’ n’ihi ya, e kwesịrị ịgba ha ume. (1 Tesa. 2:14) N’ihe dị ka afọ 50, Pọl degaara ọgbakọ ọhụrụ e hiwere na Tesalonaịka akwụkwọ ozi, sị: “Anyị na-ekele Chineke mgbe niile mgbe anyị na-echeta unu niile n’ekpere anyị, n’ihi na anyị na-eburu n’uche mgbe niile ọrụ unu ji ikwesị ntụkwasị obi na-arụ na ndọgbu unu ji ịhụnanya na-adọgbu onwe unu n’ọrụ na ntachi obi unu.” (1 Tesa. 1:​2, 3) Ọ gwakwara ha ka ha mee ka ibe ha sie ike. Ọ gwara ha, sị: “Na-akasirịtanụ ibe unu obi ma na-ewulirịtanụ ibe unu elu.”​—⁠1 Tesa. 5:⁠11.

ÒTÙ NA-ACHỊ ISI NA-AGBA NDỊ KRAỊST UME

18. Olee otú òtù na-achị isi n’oge ndịozi Jizọs si gbaa Filip ume?

18 Òtù na-achị isi n’oge ndịozi Jizọs gbakwara ma ndị na-edu ndú n’ọgbakọ nakwa Ndị Kraịst niile ume. Mgbe Filip onye na-ekwusa ozi ọma ziri ndị Sameria ozi ọma banyere Kraịst, òtù na-achị isi kwadoro ya. Ha zipụrụ Pita na Jọn, bụ́ ndị sokwa n’òtù na-achị isi, ka ha gaa kpeere ndị ahụ ghọrọ Ndị Kraịst ọhụrụ ekpere ka ha nweta mmụọ nsọ. (Ọrụ 8:​5, 14-17) Ihe a òtù na-achị isi mere gbara Filip na ndị ahụ o ziri ozi ọma ha aghọọ Ndị Kraịst ume.

19. Olee otú obi dị ụmụnna n’oge ndịozi Jizọs maka akwụkwọ ozi ahụ òtù na-achị isi degaara ha?

19 Ka oge na-aga, a gwara òtù na-achị isi ka ha kpebie ma è kwesịrị ibi Ndị Kraịst na-abụghị ndị Juu úgwù, otú ahụ Iwu Mozis kwuru ka ndị Juu na-eme. (Ọrụ 15:​1, 2) Mgbe òtù na-achị isi kpechara ekpere banyere ya ma leba anya n’ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru, ha kpebiri na ọ dịghị mkpa ka e bie ha úgwù. Ha degaara ọgbakọ dị iche iche akwụkwọ ozi gwa ha gbasara ya. Ha zipụrụ ndị nnọchiteanya ha ka ha gaa nye ọgbakọ dị iche iche akwụkwọ ozi ahụ. Olee otú obi dị ụmụnna maka akwụkwọ ozi ahụ? Baịbụl sịrị na “mgbe ha gụsịrị ya, ha ṅụrịrị ọṅụ n’ihi agbamume ahụ.”​—⁠Ọrụ 15:​27-32.

20. (a) Olee otú Òtù Na-achị Isi si agba anyị ume taa? (b) Olee ajụjụ a ga-aza n’isiokwu na-eso nke a?

20 Taa, Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova na-agba ma ndị nọ n’ozi oge niile pụrụ iche ma ụmụnna niile ume. Anyị na-aṅụrịkwa ọṅụ n’ihi ume ha na-agba anyị, otú ahụ Ndị Kraịst n’oge ndịozi Jizọs si ṅụrịa ọṅụ. N’afọ 2015, Òtù Na-achị Isi wepụtara broshọ Lọghachikwute Jehova. Ihe mere ha ji wepụta ya bụ ka e jiri ya gbaa ndị hapụrụ ọgbakọ ume ka ha lọghachi n’ọgbakọ. Ma, ọ̀ bụ naanị ndị na-edu ndú n’ọgbakọ kwesịrị ịgba ndị ọzọ ume ka Jehova? A ga-aza ajụjụ a n’isiokwu na-eso nke a.

^ para. 2 Ma ọ bụ na-agba anyị ume.