‘Onyeikpe Ụwa Dum’ Na-eme Ihe Ziri Ezi Mgbe Niile
“Oké Nkume ahụ, ihe zuru okè ka ọrụ ya bụ, n’ihi na ụzọ ya niile bụ ikpe ziri ezi.”—DIUT. 32:4.
1. Olee otú Ebreham si gosi na obi siri ya ike na Jehova ga-ekpe ikpe ziri ezi? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)
EBREHAM jụrụ, sị: “Ọ̀ bụ na Onyeikpe nke ụwa dum agaghị eme ihe ziri ezi?” (Jen. 18:25) Ihe a ọ jụrụ gosiri na obi siri ya ike na Jehova ga-ekpe ndị Sọdọm na Gọmọra ikpe ziri ezi. Obi sikwara ya ike na Jehova agaghị ‘egbukọta onye ezi omume na onye ajọ omume.’ Ebreham sịrị na Jehova agaghị eme ya. Mgbe ihe dị ka narị afọ anọ gachara, Jehova kwuru gbasara onwe ya, sị: “Oké Nkume ahụ, ihe zuru okè ka ọrụ ya bụ, n’ihi na ụzọ ya niile bụ ikpe ziri ezi. Chineke nke kwesịrị ntụkwasị obi, onye ikpe na-ezighị ezi na-adịghị n’ebe ọ nọ; onye ezi omume na onye ziri ezi ka ọ bụ.”—Diut. 31:19; 32:4.
2. Gịnị mere e nwere ike iji kwuo na Jehova agaghị ekpeli ikpe na-ezighị ezi?
2 Gịnị mere obi ji sie Ebreham ike na Jehova na-ekpe ikpe ziri ezi mgbe niile? Ọ bụ n’ihi na ọ bụ Jehova kacha ekpe ikpe ziri ezi, bụrụkwa onye ezi omume. N’eziokwu, Ọma 33:5.
okwu Hibru e si sụgharịta “ikpe ziri ezi” na “ezi omume” na-apụtakọ ọnụ ọtụtụ mgbe n’Akwụkwọ Nsọ Hibru n’ihi na okwu abụọ a pụtara otu ihe. Ọ dabara adaba na ebe ọ bụ Jehova kacha bụrụ onye ezi omume, ihe ọ bụla o kpebiri na-ezi ezi. Baịbụl gwakwara anyị na “ọ hụrụ ezi omume na ikpe ziri ezi n’anya.”—3. Nye ihe atụ na-egosi na ikpe na-ezighị ezi juru n’ụwa taa.
3 Obi na-adị ndị ji obi ha niile na-achọ Chineke mma ma ha mụta na Jehova na-ekpe ikpe ziri ezi mgbe niile. A sị ka e kwuwe, ikpe na-ezighị ezi juru n’ụwa taa. Ọ bụ ya mere e ji eme ụfọdụ ndị ihe jọgburu onwe ya. Dị ka ihe atụ, e nwere ndị aka ha dị ọcha a mara ikpe, tụọ ha mkpọrọ. Ọ bụzi mgbe e wepụtara ihe ọgbara ọhụrụ e ji achọpụta ma aka mmadụ ọ̀ dị ọcha ka a tọhapụrụ ha mgbe ha nọrọla n’ụlọ mkpọrọ ọtụtụ afọ maka mpụ ọ na-abụghị ha mere. Anyị nụ na a tụrụ mmadụ mkpọrọ arụrụala, ọ ga na-agbakasị anyị ahụ́, ma ọ bụdị wee anyị ezigbo iwe. Ma, e nwere ụdị ikpe na-ezighị ezi ọzọ na-akadị esiri Ndị Kraịst ike odidi.
N’ỌGBAKỌ
4. Olee ihe nwere ike ịbụrụ Onye Kraịst ọnwụnwa?
4 Ọ naghị eju Ndị Kraịst anya ịhụ ikpe na-ezighị ezi n’ụwa. Ma, o nwere ike ịghọrọ anyị ọnwụnwa ma anyị hụ ihe yiri ikpe na-ezighị ezi n’ọgbakọ. Gịnị ka ị ga-eme ma i chee na e mere gị ihe ọjọọ n’ọgbakọ ma ọ bụ mgbe gị na nwanna mekọrọ ihe? Ị̀ ga-ekwe ka o mee ka ị sụọ ngọngọ?
5. Gịnị mere na o kwesịghị iju Onye Kraịst anya ma e megbuo ya ma ọ bụ onye ọzọ n’ọgbakọ?
5 Ebe ọ bụ na anyị niile ezughị okè, anyị na-emekwa mmehie, anyị ma na e nwere ike imegbu anyị ma ọ bụ anyị emegbuo onye ọzọ n’ọgbakọ. (1 Jọn 1:8) Ọ bụ eziokwu na ụdị ihe a anaghị emekarị, ọ naghị eju Ndị Kraịst ji obi ha niile na-efe Chineke anya ma ha hụ ya, ọ naghịkwa eme ka ha sụọ ngọngọ. Ọ bụ ya mere Jehova ji nye anyị ndụmọdụ dị n’Okwu ya iji nyere anyị aka ịna-erubere ya isi, ọ bụrụgodị na ụmụnna anyị emejọọ anyị.—Ọma 55:12-14.
6, 7. Olee otú e si megbuo otu nwanna n’ọgbakọ? Oleekwa àgwà ndị nyeere ya aka ime ihe o kwesịrị ime?
6 Chegodị ihe mere Nwanna Willi Diehl. Malite n’afọ 1931, Nwanna Diehl ji obi ya niile na-eje ozi na Betel dị na Ben, Swizaland. N’afọ 1946, ọ gara klas nke asatọ n’Ụlọ Akwụkwọ Gilied dị na Niu Yọk, n’Amerịka. Mgbe ha gụchara, e mechara mee ya onye nlekọta sekit na Swizaland. N’akụkọ ndụ ya, o kwuru na n’ọnwa Mee afọ 1949, ọ gwara alaka ụlọ ọrụ dị na Ben na ya chọrọ ịlụ nwaanyị. Gịnị ka a zara ya? A gwara ya na ọ gaghị enwe ihe ùgwù ije ozi ọ bụla ma e wezụga ịbụ ọsụ ụzọ oge niile. Ọ sịrị na e kweghịzi ya kwuo okwu n’ọmụmụ ihe nakwa ná mgbakọ. Ọtụtụ ndị anaghịzi ekele ya na nwunye ya, na-eme ha ka hà bụ ndị a chụrụ n’ọgbakọ.
7 Gịnịzi ka Nwanna Diehl mere? Ọ sịrị na ya na nwunye ya ma na Baịbụl ekwughị na ịlụ di na nwunye bụ ihe ọjọọ. N’ihi ya, ha kpesiri ekpere ike, tụkwasịkwa Jehova obi. E mechara mee ka ụmụnna ghọta otú Jehova si were ịlụ di na nwunye. E nyeghachikwara Nwanna Diehl ihe ùgwù ya. * Anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, sị: ‘Ọ bụrụ na a na-emegbu m, m̀ ga-eme ihe a Nwanna Diehl mere? M̀ ga-enwe ndidi chere Jehova, ka m̀ ga-esiwe ọnwụ ka m dozie ya n’onwe m?’—Ilu 11:2; gụọ Maịka 7:7.
Jehova gọziri ya n’ihi otú o si tụkwasị ya obi.8. Gịnị mere i nwere ike iji chee na e megburu gị ma ọ bụ nwanna ọzọ?
8 Ihe ọzọ bụ na o nwere ike ịdị gị mgbe ụfọdụ ka è megburu gị ma ọ bụ nwanna ọzọ. I nwere ike iche otú ahụ n’ihi ezughị okè ma ọ bụ n’ihi na ị maghị otú ihe niile si mee. Nke ọ bụla ọ bụ, ma ihe anyị chere ò ziri ezi ma ọ bụ na o zighị ezi, ikpesi ekpere ike na ịtụkwasị Jehova obi ga-eme ka anyị ghara ‘iweso ya iwe.’—Gụọ Ilu 19:3.
9. Olee ndị anyị ga-amụ gbasara ha n’isiokwu a nakwa na nke na-eso ya?
9 Ka anyị chee banyere mmadụ atọ fere Jehova Baịbụl gwara anyị na e megburu. N’isiokwu a, anyị ga-amụ gbasara Josef, bụ́ nwa nwa Ebreham, na ihe ụmụnne ya mere ya. N’isiokwu na-eso nke a, anyị ga-eleba anya n’otú Jehova si meso Eze Ehab nakwa ihe Pita onyeozi mere n’Antiọk nke Siria. Ka anyị na-amụ banyere ndị a, lee ma ị̀ ga-amụta ihe ga-enyere gị aka ịtụkwasị Jehova obi ma ghara ikwe ka ihe ọ bụla mee ka gị na ya ghara ịdị ná mma, nke ka nke, ma i chee na e megburu gị.
E MEGBURU JOSEF
10, 11. (a) Olee ihe ọjọọ ndị e mere Josef? (b) Olee ohere dapụtaara Josef mgbe ọ nọ n’ụlọ mkpọrọ?
10 Josef ji obi ya niile fee Jehova. Ma e megburu ya. Ọ bụghị naanị ndị ọ na-amaghị megburu ya, kama nke kadị mwute bụ na ụmụnne ya rụsara ya arụrụala. Mgbe Josef dị afọ iri na asaa, ụmụnne ya tọọrọ ya, ree ya ka ọ gaa gbawa ohu. A kpụụrụ ya gaa Ijipt. (Jen. 37:23-28; 42:21) Mgbe o biri ebe ahụ afọ ole na ole, e boro ya ebubo ụgha na ọ chọrọ idina nwunye mmadụ, a tụọ ya mkpọrọ n’ekpeghị ya ikpe. (Jen. 39:17-20) Ọ gbara ohu, nọọkwa n’ụlọ mkpọrọ ruo ihe dị ka afọ iri na atọ. Olee ihe anyị ga-amụta n’ihe mere Josef, nke ga-enyere anyị aka idi mmegbu nwanna megburu anyị?
11 Josef mechara kọọrọ onye mkpọrọ ibe ya ihe e mere ya. Onye mkpọrọ ahụ bụbu obu ihe ọṅụṅụ eze. N’oge ahụ Josef na obu ihe ọṅụṅụ ahụ nọ n’ụlọ mkpọrọ, nwoke ahụ rọrọ nrọ, Josef akọwaa ya. Josef kwuru na a ga-enyeghachi obu ihe ọṅụṅụ ahụ ọrụ ya n’obí eze Fero. Mgbe Josef kọwachaara ya nrọ ahụ, o ji ohere ahụ kọọrọ ya ihe mere e ji tụọ ya mkpọrọ. Anyị ga-amụta ihe bara uru n’ihe Josef kwuru nakwa n’ihe ọ na-ekwughị.—Jen. 40:5-13.
12, 13. (a) Olee otú ihe Josef gwara obu ihe ọṅụṅụ si gosi na ọ gbachighị nkịtị ná mmegbu e megburu ya? (b) Olee ihe Josef na-agwaghị obu ihe ọṅụṅụ ahụ?
12 Gụọ Jenesis 40:14, 15. Cheta na Josef kwuru na ‘a tọọrọ ya.’ Okwu Hibru e si sụgharịta ya pụtara na ‘e zuuru ya.’ O doro anya na e megburu ya. Josef kwukwara na ya emeghị ihe ahụ e kwo tụọ ya mkpọrọ. Ọ bụ ya mere o ji gwa obu ihe ọṅụṅụ ahụ ka ọ gwa Fero gbasara ya. Maka gịnị? O kwuru, sị: “Ka m si n’ụlọ a pụta.”
13 Ihe a Josef kwuru ọ̀ pụtara na o weere ụwa ya otú o si hụ ya ma gbachi nkịtị? Mbanụ. Ọ ma na e mere ya ọtụtụ ihe ọjọọ. Ọ kọwaara obu ihe ọṅụṅụ ahụ ihe merenụ n’ihi na ọ bụ onye nwere ike inyere ya aka. Ma, cheta na Baịbụl ekwughị ihe ọ bụla gosiri na Josef gwara onye ọ bụla, ma ọ bụdị Fero, na ọ bụ ụmụnne ya tọọrọ ya. Nke bụ́ eziokwu bụ na mgbe ụmụnne Josef bịara n’Ijipt, ha na ya ekpezie, Fero nabatara ha, gwa ha ka ha were Ijipt ka obodo ha ma na-eri “ihe ọma dị n’ala Ijipt.”—14. Olee ihe ga-eme ka anyị ghara iji ihe ọjọọ e mere anyị n’ọgbakọ na-agba asịrị?
14 Onye Kraịst chee na e megburu ya, o kwesịrị ịkpachara anya ka ọ ghara iji ihe ahụ gbawa asịrị. N’eziokwu, o kwesịrị ịgakwuru ndị okenye ka ha nyere ya aka. O kwesịkwara ịgwa ha ma nwanna mee mmehie jọgburu onwe ya. (Lev. 5:1) Ma, ọtụtụ mgbe, ọ bụrụ na ihe ahụ abụghị mmehie dị oké njọ, ya na onye ahụ nwere ike idozi nghọtahie ahụ n’agwaghị onye ọzọ, ma ọ bụdị ndị okenye. (Gụọ Matiu 5:23, 24; 18:15.) Ka anyị kpebisie ike ime ihe Baịbụl kwuru ma ụdị ihe a mee. Mgbe ụfọdụ, anyị nwere ike ịghọta na o mechara bụrụ na e megbughị anyị emegbu. Obi ga-adị anyị ezigbo ụtọ na anyị ejighị nwanna gbaa asịrị, bụ́ ihe gaara eme ka nsogbu ahụ ka njọ. Cheta na, ma ihe anyị mere ọ̀ dị mma ma ọ̀ dị njọ, iji ihe ahụ merenụ na-agba asịrị agaghị eme ka ihe ka mma. Ịhụ Jehova na ụmụnna anyị n’anya ga-eme ka anyị ghara ime ụdị ihe ahụ. Otu ọbụ abụ kwuru na “onye na-eje ije n’ụzọ na-enweghị ntụpọ” anaghị “eji ire ya ekwutọ mmadụ. Ọ dịghị eme mmadụ ibe ya ihe ọjọọ, ọ dịghịkwa akọcha onye ya na ya na-akpachi anya.”—Ọma 15:2, 3; Jems 3:5.
CHETA ADỊM NÁ MMA GỊ NA JEHOVA
15. Olee otú adịm ná mma Josef na Jehova si mee ka Jehova gọzie ya?
15 E nwere ihe ọzọ dị mkpa anyị ga-amụta n’adịm ná mma Josef na Jehova. N’afọ iri na atọ ahụ Josef tara ahụhụ, o mere ihe gosiri na ọ na-ele ihe anya otú Jehova si ele ya. (Jen. 45:5-8) O nweghị mgbe ọ tara Jehova ụta maka nsogbu ya. Ọ bụ eziokwu na o chefughị ihe ọjọọ e mere ya, o kweghị ka ọsụkọsụ na-asụ ya. Ihe kacha mkpa bụ na o kweghị ka ezughị okè ndị ọzọ na ihe ha mejọrọ mee ka ọ hapụ Jehova. Otú Josef si na-erubere Jehova isi mere ka o nwee ike ịhụ otú Jehova si na-edozi ihe ọjọọ niile e mere ya, na-agọzikwa ya na ezinụlọ ya.
16. Gịnị mere anyị ga-eji bịarukwuo Jehova nso ma e mee anyị ihe ọjọọ n’ọgbakọ?
16 Otú ahụkwa ka anyị kwesịrị iji adịm ná mma anyị na Jehova kpọrọ ihe, ghara ikwe ka ihe ọ bụla mee ya. Ebe anyị hụrụ Chineke n’anya ma na-efe ya, anyị ekwesịghị ikwe ka ezughị okè ụmụnna anyị mee ka anyị na ya ghara ịdị ná mma. (Rom 8:38, 39) Kama, ọ bụrụ na nwanna emee anyị ihe ọjọọ, ka anyị mee ka Josef ma bịarukwuo Jehova nso, na-agbalị ile ihe anya otú o si ele ya. Anyị gbalịchaa ime ihe niile Baịbụl kwuru ka anyị mee iji dozie nsogbu ahụ, anyị kwesịrị ịhapụrụ ya Jehova, ma nwee obi ike na ọ ga-edozi ya mgbe oge ya ruru nakwa otú dị ya mma.
TỤKWASỊ ‘ONYEIKPE ỤWA DUM’ OBI
17. Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị tụkwasịrị ‘Onyeikpe ụwa dum’ obi?
17 Ebe anyị ka bi n’ụwa ochie a, anyị kwesịrị ịtụ anya na a ga-emegbu anyị. N’ọgbakọ, e nwere ike ime gị ma ọ bụ onye ị ma ihe yiri ka ọ̀ bụ mmegbu, ma ọ bụkwanụ unu ahụ ebe e mere ya onye ọzọ. Ekwela ka o mee ka ị sụọ ngọngọ. (Ọma 119:165) Kama, ebe anyị ji obi anyị niile na-efe Chineke, anyị kwesịrị ịtụkwasị ya obi anyị niile ma na-ekpe ekpere ka o nyere anyị aka. Anyị kwesịkwara icheta na o nwere ike ịbụ na anyị amaghị otú ihe niile si mee. Anyị ma nke ọma na o nwere ike ịbụ na ezughị okè mere ka anyị chee na ihe ahụ bụ mmegbu. Ihe Josef mere kụziiri anyị na anyị ekwesịghị iji ihe ọjọọ e mere anyị na-agba asịrị n’ihi na ime otú ahụ ga-eme ka ihe kakwuo njọ. N’ikpeazụ, kama idozi nsogbu ahụ n’onwe anyị, ka anyị kpebisie ike ịtụkwasị Jehova obi, nwee ndidi ma chere Jehova ka o dozie ya. O doro anya na anyị mee otú ahụ, obi ga-adị Jehova mma, ọ ga-agọzikwa anyị otú ahụ ọ gọziri Josef. N’eziokwu, ka obi sie anyị ike na Jehova, bụ́ ‘Onyeikpe ụwa dum,’ ga-eme ihe dị mma mgbe niile, “n’ihi na ụzọ ya niile bụ ikpe ziri ezi.”—Jen. 18:25; Diut. 32:4.
18. Gịnị ka anyị ga-eleba anya na ya n’isiokwu na-eso nke a?
18 N’isiokwu na-eso nke a, anyị ga-eleba anya n’akụkọ abụọ ọzọ gbasara otú ụfọdụ ndị Jehova si megbuo ibe ha n’oge ochie. Ịmụ gbasara ihe ndị a Baịbụl kọrọ ga-enyere anyị aka ịhụ otú ịdị umeala n’obi na ịgbaghara ndị ọzọ ga-esi nyere anyị aka ile ikpe ziri ezi anya otú Jehova si ele ya.
^ para. 7 Gụọ akụkọ ndụ Willi Diehl, nke isiokwu ya bụ “Jehova Bụ Chineke M, Onye M Ga-atụkwasị Obi,” n’Ụlọ Nche November 1, 1991.