Ị̀ Maara?
Olee ụdị ụgbọ ịnyịnya nwoke onye Etiopia bụ́ nnukwu mmadụ nọ na-agba mgbe Filip bịakwutere ya?
OKWU Grik a sụgharịrị “ụgbọ ịnyịnya” na Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nwere ike ịpụta ụdị ụgbọ ịnyịnya dị iche iche. (Ọrụ 8:28, 29, 38) Ma, o yikarịrị ka ụdị ụgbọ ịnyịnya nwoke Etiopia ahụ na-agba ò buru ibu karịa nke a na-eji alụ agha ma ọ bụ nke a na-eji agba ọsọ. Ka anyị lee ihe ụfọdụ mere anyị ji kwuo otú ahụ.
Onye Etiopia ahụ bụ nnukwu mmadụ. O mekwara njem dị ezigbo anya. Ọ bụ “nnukwu mmadụ n’obí eze nwaanyị ndị Etiopia. Aha eze nwaanyị a bụ Kandesi. Ọ bụ nwoke ahụ na-elekọta akụ̀ niile eze nwaanyị a nwere.” (Ọrụ 8:27) Ebe bụ́ Etiopia n’oge ochie bụ ebe bụ́ Sudan ugbu a na ụfọdụ ebe n’ebe ndịda ebe a na-akpọ Ijipt ugbu a. Ọ bụ eziokwu na o nwere ike ọ bụghị otu ụgbọ ịnyịnya ka o ji mee njem ya niile, ma ọ ga-abụrịrị na o nwere ibu ndị o ji na-aga njem ahụ dị ezigbo anya. Ụfọdụ n’ime ụgbọ ịnyịnya ndị a na-agba n’oge ndịozi Jizọs e ji ebu ndị na-eme njem na-enwe ụkwụ anọ, e jirikwa ihe kpuchie elu ya. Otu akwụkwọ aha ya bụ An Exegetical Commentary sịrị: “Ụdị ụgbọ ịnyịnya a na-enwe ohere ebe a ga-etinye akpa na ihe ndị ọzọ nke ga-eme ka njem dịrị onye ahụ mfe, meekwa ka ọ dị mfe mmadụ iji ya gaa ebe dị ezigbo anya.”
Nwoke Etiopia ahụ na-agụ akwụkwọ mgbe Filip bịakwutere ya. Baịbụl kwuru, sị: “Filip wee gbara ọsọ gaa n’akụkụ ụgbọ ahụ ma nụ ka nwoke [Etiopia] ahụ na-agụpụta akwụkwọ Aịzaya onye amụma.” (Ọrụ 8:30) Ụgbọ ịnyịnya e ji eme njem anaghị agba oké ọsọ. Otú ọ na-esi eji nwayọọ aga mere ka ọ dịrị nwoke Etiopia ahụ mfe ịnọ na ya na-agụ akwụkwọ, meekwa ka ọ dịrị Filip mfe iji ụkwụ chụkwute ya.
Nwoke Etiopia ahụ gwara “Filip ka ọ rịgota soro ya nọdụ ala.” (Ọrụ 8:31) N’ụgbọ ịnyịnya ndị nke a na-eji agba ọsọ, ndị na-anọ na ya na-akwụ ọtọ. Mana na nke a na-eji eme njem, ọ ga-abụ na e nwere ohere ebe nwoke Etiopia ahụ na Filip ga-anọdụ ala.
N’ihi ihe e kwuru n’Ọrụ Ndịozi isi 8, nakwa ihe ndị ọzọ a chọpụtarala mere eme, ihe ndị a na-ese n’akwụkwọ anyị na nso nso a na-egosi na nwoke Etiopia ahụ nọ n’ụgbọ ịnyịnya buru ibu, ọ bụghị nke obere a na-eji alụ agha ma ọ bụkwanụ nke a na-eji agba ọsọ.