2 Ọ̀ Bụ Anyị Ka Ahụhụ Anyị Na-ata Si n’Aka?
Ihe Mere O Ji Dị Mkpa Ịmata Azịza Ya
Ọ bụrụ na azịza ajụjụ a bụ ee, ọ pụtara na anyị nwere ike ibelata ahụhụ anyị na-ata.
Ihe Ị Ga-echebara Echiche
Olee otú ụmụ mmadụ si soro na-akpata ahụhụ?
Imeso Mmadụ Ihe Ike na Imetọ Ụmụaka.
Ngalaba Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Ahụ́ Ike kwuru na e mesoro otu onye n’ime mmadụ anọ ọ bụla ihe ike n’oge ọ bụ nwata. Ha kwukwara na e mesoro otu onye n’ime ụmụ nwaanyị atọ ọ bụla ihe ike ma ọ bụ metọọ ya ma ọ bụkwanụ mee ya ha abụọ n’otu oge ná ndụ ya.
Ọnwụ Mmadụ.
Ihe Òtù Mba Ụwa bipụtara nke a na-akpọ World Health Statistics nke afọ 2018 kwuru na “e gburu ihe dị ka narị puku mmadụ anọ na puku iri asaa na asaa n’ụwa niile n’afọ 2016.” Ndị nwụrụ n’agha na n’ọgba aghara n’afọ ahụ dịkwa ihe dị ka otu narị puku na puku iri asatọ.
Ọrịa.
N’otu isiokwu gbara n’akwụkwọ bụ́ National Geographic, otu nwoke na-ede akwụkwọ aha ya bụ Fran Smith kwuru na ihe karịrị otu ijeri mmadụ na-aṅụ sịga, na ịṅụ sịga sokwa akpata ọrịa ndị kacha egbu ndị mmadụ n’ụwa niile, ya bụ, ọrịa obi, ọrịa strok, ọrịa iku ume, na ọrịa kansa akpa ume.
Ịda Ogbenye na Mmegbu.
Otu nwoke mụrụ banyere akparamàgwà mmadụ aha ya bụ Jay Watts kwuru, sị: “Ịda ogbenye, mmegbu, ịkpa ókè agbụrụ, imegbu ndị inyom, ịkwaga mba ọzọ n’ihi nsogbu na ịmarịta aka socha n’ihe ndị na-akpata nchegbu na ụra aga n’anya.”
MỤTAKWUO IHE NDỊ ỌZỌ
Lee vidio bụ́ Gịnị Mere Chineke Ji Kee Ụwa? Ọ dị na jw.org.
Ihe Baịbụl Kwuru
Ọ bụ ụmụ mmadụ na-akpata ọtụtụ ahụhụ a na-ata n’ụwa taa.
Ọtụtụ n’ime ahụhụ ndị ahụ si n’aka ndị ọchịchị ọjọọ ndị na-eme ka ihe na-esiri ndị ha na-achị ike.
‘Mmadụ achịwo mmadụ ibe ya ọchịchị nchịgbu.’—EKLIZIASTIS 8:9.
Ma, e nwere ike ibelata ahụhụ.
Ime ihe Baịbụl kwuru na-eme ka mmadụ nwee ezi ahụ́ ike, na-emekwa ka mmadụ na ibe ya na-adị ná mma.
“Obi dị jụụ bụ ndụ anụ ahụ́, ma ekworo bụ ure ọkpụkpụ.”—ILU 14:30.
“Wepụnụ obi ilu niile na iwe na ọnụma na iti mkpu na okwu mkparị, tinyere ihe ọjọọ niile, n’etiti unu.”—NDỊ EFESỌS 4:31.