ỤWA ANYỊ A Ọ̀ GA-ADỊGIDE?
Ikuku
IKUKU dị anyị mkpa, mana ọ bụghị naanị ka anyị nwee ike ịna-eku ume. Ikuku na-eme ka okpomọkụ na-esi n’anyanwụ apụta ghara imerụ anyị ahụ́. Ọ bụrụ na ikuku adịghị, ụwa anyị ga-ajụ ezigbo oyi, kpụkọtakwa.
Ihe Ndị Na-emebi Ikuku
Mmebi e ji anwụrụ ọkụ na ihe ndị ọzọ emebi ikuku nwere ike ime ka a ghara inwe ihe ndị dị ndụ n’ụwa. Ngalaba Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Ahụ́ Ike kwuru na e kee mmadụ niile nọ n’ụwa ụzọ otu narị (100), naanị otu ụzọ n’ime ha na-ekuru ezigbo ikuku.
E kwuola na ọ bụ mmebi a na-emebi ikuku na-akpata ọrịa na-eme ka mmadụ ghara iku ume nke ọma, ọrịa kansa akpa ume, na ọrịa obi. Ikuru ikuku na-adịghị mma na-eme ka ihe dị ka nde mmadụ asaa (7,000,000) nwụchuo ọnwụ kwa afọ.
E Kere Ụwa Anyị A Ka Ọ Dịgide
E kere ụwa anyị a ka o nwee ike iji aka ya na-emepụta ezigbo ikuku ga-ezuru ihe ọ bụla na-eku ume. Ma naanị mgbe ọ ga-emeli ihe a bụ ma ọ bụrụ na ụmụ mmadụ anaghị emebi ụwa anyị a gafee ókè. Legodị ihe atụ ole na ole.
-
O doro onye ọ bụla anya na oké ọhịa na-esi n’ikuku amịkọrọ kabọn dayọgzaịd (carbon dioxide). Mana, ọtụtụ ndị amaghị na ala mmiri ndị dị n’akụkụ osimiri, nke osisi juru na ha, na-eme ihe a karịadị oké ọhịa. Osisi ndị ahụ na-akpa ezigbo ike n’isi n’ikuku ewepụ kabọn dayọgzaịd. Ha nwere ike iwepụ ya okpukpu ise karịadị otú oké ọhịa na-eme.
-
Nchọpụta ndị e mere na nso nso a gosiri na ahịhịa ụfọdụ na-eto ná mmiri, dị ka nke a na-akpọ kelp, na-amịkọrọ kabọn dayọgzaịd dị n’ikuku. Ahịhịa kelp na-enwe ụmụ obere oghere ikuku na-adị n’ime ha nke na-eme ka ha na-ese n’elu mmiri ruo n’ebe dị ezigbo anya. Ha si n’akụkụ osimiri ruo n’ime osimiri, oghere ndị ahụ na-agbawa. Ahịhịa kelp eburuzie kabọn ndị ahụ ọ mịkọọrọ gbadaa n’ala oké osimiri. Ọ ga-abụ na ha na-anọ ebe ahụ ruo ọtụtụ narị afọ.
-
Ihe ndị mere mgbe e tiri iwu onye apụtala èzí n’oge ọrịa koronavaịrọs gosiri na ikuku anyị nwere ike ịdịghachi mma ma e mebie ya. N’afọ 2020, mgbe ọtụtụ ụlọ ọrụ kwụsịrị ịrụ ọrụ, ọtụtụ ụgbọala akwụsịkwa ịgba, nke mere ka ọ fọ obere ka anwụrụ ọkụ niile ha na-ewepụta kwụsị, ikuku ndị mmadụ na-ekuru bịaziri ka mma. N’afọ ahụkwa, otu nchọpụta e mere gbasara ikuku kwuru na e kee mba ndị e mere nchọpụta ahụ na ha ụzọ iri, ụzọ asatọ sịrị na a malitere inwe ikuku ka mma obere oge e tichara iwu onye apụtala èzí.
Ihe Ndị Mmadụ Na-eme Ka Nsogbu A Kwụsị
Ndị ọchịchị ka na-agwa ụlọ ọrụ dị iche iche ka ha belata otú ha si emebi ikuku. Ndị ọkà mmụta sayensị ka na-achọpụta ụzọ ọhụrụ ha ga-esi eme ka e dozie nsogbu mmebi a na-emebi ikuku kpatarala. Dị ka ihe atụ, a na-eme ka ụmụ irighiri ihe dị ndụ mikọrọ ikuku ọjọọ ndị ahụ, wepụtazie ikuku ọma. Ndị ọkachamara na-agwakwa ndị mmadụ ka ha jiri ụkwụ ma ọ bụ ígwè na-aga ebe ndị ha chọrọ ịga kama iji ụgbọala, nakwa ka ha belata ihe ndị na-akwụ anwụrụ ọkụ n’ụlọ ha.
Ma, akụkọ ụlọ ọrụ dị ná mba dị iche iche jikọtara aka wepụta n’afọ 2022, nke Ngalaba Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Ahụ́ Ike na Ụlọ Akụ Ụwa so wepụta, gosiri na a ka kwesịrị imekwu ihe.
Akụkọ ahụ kwuru na n’afọ 2020, ihe otu ụzọ n’ime ụzọ atọ nke ndị bi n’ụwa na-ejikarị esi nri bụ ihe ndị na-emebi ikuku. N’ọtụtụ ebe, ọ bụ naanị mmadụ ole na ole nwere ike ịzụta ihe ọgbara ọhụrụ ndị e ji esi nri.
Ihe Mere Obi Ga-eji Sie Anyị Ike—Ihe Baịbụl Kwuru
“Jehova bụ ezi Chineke, Onye kere eluigwe . . . Ọ bụ ya kere ụwa na ihe niile dị n’ime ya. Ọ bụ ya na-eme ka ndị mmadụ na-eku ume.—Aịzaya 42:5.
Ọ bụ Chineke kere ikuku anyị na-ekuru, keekwa ya otú ọ ga na-eji aka ya na-eme onwe ya ka ọ dị ọcha. Ike Chineke enweghị nsọtụ, ọ hụkwara ụmụ mmadụ n’anya. N’ihi ya, ọ̀ bụ na i cheghị na ọ ga-eme ka mmebi a na-emebi ikuku kwụsị? Gụọ isiokwu bụ́ “Chineke Kwere Nkwa na Ụwa Anyị A Ga-adịgide.”