OTÚ Ị GA-ESI NA-ENWE OBI ỤTỌ
Otú Ị Ga-esi Na-enwe Obi Ụtọ
Ị̀ NA-EWERE ONWE GỊ KA ONYE OBI ỤTỌ? Ọ bụrụ otú ahụ, olee ihe mere i ji na-enwe obi ụtọ? Ọ̀ bụ n’ihi ezinụlọ gị, ọrụ gị ka ọ̀ bụ okpukpe gị? O nwere ike ịbụ na o nwere ihe ndị ị na-atụ anya ha ga-eme gị obi ụtọ, dị ka, ịgụcha akwụkwọ, inweta ọrụ ma ọ bụ ịzụta ụgbọala ọhụrụ.
Ọtụtụ ndị na-enwe obi ụtọ ma ha nweta ihe ha na-atụ anya ya ma ọ bụ mechaa ihe ha chọrọ ime. Ma, obi ụtọ ahụ ọ̀ na-adịte aka? Ọtụtụ mgbe, ọ naghị adịte aka. Ọ na-agbawakwa ha obi.
E kwuo na mmadụ na-enwe obi ụtọ, ọ pụtara na obi na-adị onye ahụ mma. Ụdị obi ụtọ a na-adịte aka, na-emekwa ka ndụ ju onye ahụ afọ.
Ihe ọzọ bụkwa na iji na-enwe obi ụtọ, ọ dịghị mkpa na anyị ga-enweta ihe niile anyị chọrọ ná ndụ, kama, anyị kwesịrị ịmụta ikwe ka ihe anyị nwere na-eju anyị afọ. Ọ bụrụ na mmadụ asị na ya ga-enwe obi ụtọ ma ya mee nke a ma ọ bụ nke ọzọ, ọ pụtara na o nweghị mgbe onye ahụ ga-enwe obi ụtọ ná ndụ ya.
Iji mee ka o dokwuo anya, ka anyị jirigodị obi ụtọ tụnyere inwe ezigbo ahụ́ ike. Gịnị na-eme ka ahụ́ gbasie mmadụ ike? Onye ahụ ga-akpachara anya n’ihe ọ na-eri, otú o si emega ahụ́ na ihe ndị ọzọ ọ na-eme ná ndụ. Otú ahụkwa ka ọ dị inwe obi ụtọ. Ọ bụrụ na anyị ana-ebi ndụ otú Baịbụl kwuru, anyị ga na-enwe obi ụtọ.
Olee ihe ụfọdụ mmadụ ga-eme ka ọ na-enwe obi ụtọ? E nwere ọtụtụ ihe nwere ike inyere mmadụ aka ịna-enwe obi ụtọ. Ụfọdụ dị mkpa karịa ibe ha. Ma ihe ndị a na-esonụ na-enye ezigbo aka:
-
INWE AFỌ OJUJU NA IMESAPỤ AKA
-
INWE EZIGBO AHỤ́ IKE NA IDI NSOGBU NDỊ BỊAARA ANYỊ
-
ỊHỤNANYA
-
MGBAGHARA
-
ỊGHỌTA IHE MERE ANYỊ JI DỊRỊ NDỤ
-
OLILEANYA
Baịbụl kwuru, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị ụzọ ha na-enweghị ntụpọ.” (Abụ Ọma 119:1) Ka anyị leba anya n’ụfọdụ ihe ndị ga-enyere anyị aka ịna-enwe obi ụtọ.