OTÚ Ị GA-ESI NA-ENWE OBI ỤTỌ
Inwe Ezigbo Ahụ́ Ike na Idi Nsogbu Ndị Bịaara Anyị
ỌRỊA NA-ANAGHỊ ALA ALA MA Ọ BỤ NKWARỤ NWERE IKE ỊKPA NDỤ MMADỤ AKA ỌJỌỌ. Mgbe otu nwoke ahụ́ gbasiri ike aha ya bụ Ulf, mechara daa ngwọrọ, o kwuru, sị: “Obi dara m mbà, ike agwụkwa m. O nweghịzi ihe m ma m ga-eme . . . Ọ dị m ka nke m na-eme ọ̀ gwụla.”
Ihe a mere Ulf na-echetara anyị na o nweghị onye n’ime anyị ga-ekpebili otú ahụ́ ga-adị ya echi. Ma, n’agbanyeghị nke ahụ, anyị nwere ike ime ihe ụfọdụ ka anyị ghara ịna-arịakarị ọrịa. Ma, ọ bụrụkwanụ na ezigbo ọrịa ejide anyị, nke ahụ ọ̀ ga-eme ka anyị gharazie ịna-enwe obi ụtọ? Mbanụ. Ihe ndị anyị ga-atụle ugbu a ga-egosi na mmadụ ga-enweli obi ụtọ n’agbanyeghị ọrịa. Ma, ka anyị burugodị ụzọ leba anya n’ihe ndị ga-enyere anyị aka inwe ezigbo ahụ́ ike.
“NA-EMERU IHE N’ÓKÈ.” (1 Timoti 3:2, 11) O doro anya na iri oké nri na ịṅụ oké mmanya mgbe niile anaghị adị mma n’ahụ́, ma ya fọdụzie oké ego ọ na-efu. Baịbụl sịrị: “Anọla n’etiti ndị na-aṅụ oké mmanya, n’etiti ndị na-eribiga anụ ókè. N’ihi na onye aṅụrụma na onye na-eribiga nri ókè ga-ada ogbenye.”—Ilu 23:20, 21.
EMERỤLA AHỤ́ GỊ. Baịbụl kwuru, sị: “Ka anyị sachapụ onwe anyị mmerụ niile nke anụ ahụ́ na nke mmụọ.” (2 Ndị Kọrịnt 7:1) Ndị mmadụ na-emerụ ahụ́ ha ma ha na-ata ahịhịa ụtaba ma ọ bụ na-aṅụ sịga, na-aṅụ oké mmanya ma ọ bụ ọgwụ ọjọọ. Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Ịchịkwa na Igbochi Ọrịa n’Amerịka kwuru na ise sịga “na-akpata ọrịa na nkwarụ, na-emebikwa ihe fọrọ ntakịrị ka ọ bụrụ ime ahụ́ anyị niile.”
WERE AHỤ́ GỊ NA NDỤ GỊ KA ONYINYE DỊ OKÉ ỌNỤ AHỊA. Akwụkwọ Nsọ sịrị na “ọ bụ [Chineke] nyere anyị ndụ, meekwa ka anyị na-ejegharị.” (Ọrụ Ndịozi 17:28) Ịmata ihe a ga-eme ka anyị ghara itinye ndụ anyị n’ihe ize ndụ, ma mgbe anyị nọ n’ọrụ ma mgbe anyị na-akwọ ụgbọala ma mgbe anyị na-ahọrọ ụdị ihe anyị ga-eji atụrụ ndụ. Anyị ekwesịghị ịkpatara onwe anyị nkwarụ n’ihi ime ihe ga-atọ anyị ụtọ nwa oge.
Abụ Ọma 37:8 kwuru, sị: “Hapụ iwe, hapụkwa ọnụma.” Matiu 6:34, na-agbakwa anyị ume, sị: “Unu echegbula onwe unu mgbe ọ bụla maka echi, n’ihi na echi ga-enwe nchegbu nke ya.”
EKWELA KA ECHICHE ỌJỌỌ NA-ABATAKARỊ GỊ N’OBI. Uche gị na ahụ́ gị na-arụkọ ọrụ. N’ihi ya, gbalịa ka ị kwụsị nchegbu na-enweghị isi, iwe ọkụ, anya ụfụ na omume ndị ọzọ na-enye nsogbu n’ahụ́.GBALỊA NA-ECHE EZIGBO IHE N’OBI GỊ MGBE NIILE. Baịbụl kwuru n’Ilu 14:30, sị: “Obi dị jụụ bụ ndụ anụ ahụ́.” Baịbụl kwukwara, sị: “Obi nke na-aṅụrị ọṅụ bara uru dị ka ihe na-agwọ ọrịa.” (Ilu 17:22) Ndị sayensị kwetakwara na ihe a Baịbụl kwuru bụ eziokwu. Otu onye dọkịta na Skọtland kwuru, sị: “Ọ bụrụ na ị na-enwekarị obi ụtọ, i nwere ike ị gaghị arịa ọtụtụ ọrịa ndị na-anaghị enwe obi ụtọ nwere ike ịrịa n’ọdịnihu.”
MỤTA IDI NSOGBU NDỊ BỊAARA GỊ. Dị ka Ulf anyị kwuru gbasara ya ná mbido, o nwere ike o nweghị ihe ọzọ anyị ga-emeli karịa idiwe nsogbu bịaara anyị. Anyị nwere ike ịchọ otú anyị ga-esi na-edi ya. Ụfọdụ ndị na-ekwe ka nsogbu bịaara ha kụda ha mmụọ, ya emezie ka ihe ka njọ. Ilu 24:10 sịrị: “Ì nwewo obi ịda mbà n’ụbọchị ahụhụ? Ike gị ga-adị ntakịrị.”
E nwekwara ndị nwere nkụda mmụọ ozugbo nsogbu bịaara ha, ma ha emechaa nweta onwe ha. Ha gbalịrị chọta ụzọ ha si na-edi nsogbu ha. Ọ bụ ihe Ulf mere. Ọ sịrị na ikpechi ekpere anya na ịtụgharị uche n’okwu nkasi obi ndị dị na Baịbụl mere ka ya “bido ịna-enwe olileanya na ihe ga-aka mma, kama inwe nkụda mmụọ.” Ọtụtụ ndị nwere nsogbu na-amụta ịna-enwere ndị ọzọ ọmịiko. Ulf mụtakwara ime otú ahụ, nke mere o ji na-aga ezi ndị ọzọ ozi nkasi obi ndị dị na Baịbụl.
Onye ọzọ ihe mere ya nyere ezigbo nsogbu n’ahụ́ bụ otu nwoke aha ya bụ Steve. Mgbe ọ dị afọ iri na ise, o si n’elu osisi daa, ahụ́ ya akpọnwụọ si n’olu gbadaa. Mgbe ọ dị afọ iri na asatọ, ahụ́ bịara dịtụ ya mma, ya ebidokwa iji aka ya abụọ na-eme ihe, mechaakwa banye mahadum. Ebe ahụ ka ọ nọ bido ịṅụ ọgwụ ọjọọ, ịṅụbiga mmanya oké na ịkwa iko. Ike ndụ gwụrụ ya. Ma, mgbe o bidoro ịmụ Baịbụl, otú o si ele ihe anya gbanwere, ya akwụsị ibi ndụ ọjọọ ahụ ọ na-ebi. O kwuru, sị: “M kwụsịrị iche na ndụ m dị abaghị uru. Ugbu a, m nwere udo na obi ụtọ, afọ na-ejukwa m n’ihe m nwere.”
Ihe ndị Steve na Ulf kwuru na-echetara anyị ihe e kwuru n’Abụ Ọma 19:7, 8. Ebe ahụ sịrị: “Iwu Jehova zuru okè, na-eweghachite mkpụrụ obi. . . . Iwu Jehova ziri ezi, na-eme ka obi ṅụrịa ọṅụ; ihe Jehova nyere n’iwu dị ọcha, na-eme ka anya na-enwu gbaa.”