IHE GA-ENYERE NDỊ NA-ERU UJU AKA
Ọnwụ Na-agbawa Obi
Otu nwoke aha ya bụ Kostas kwuru, sị: “Mụ na Sophia a nwunye m lụrụ ihe karịrị afọ iri atọ na itoolu tupu ọrịa ọjọọ ọ na-arịa egbuo ya. Ndị enyi m nyeere m ezigbo aka idi ya. M gbalịkwara ịna-eme ihe ndị ga-eme ka ọ na-apụ m n’obi. Ma ruo otu afọ, obi nọ na-agbawa m. Ọ dị m ka agaghị m edili ya. Ugbu a, n’agbanyeghị na o ruola afọ atọ ọ nwụrụ, obi ka na-agbawa m mgbe ụfọdụ, ma mgbe m na-anaghị eche gbasara ya.”
Mmadụ ọ̀ nwụnahụtụla gị? Ọ bụrụ otú ahụ, ị ga-aghọta otú obi dị Kostas. Ọnwụ di ma ọ bụ nwunye, onye ikwu na ezigbo enyi so n’ihe kacha akpatara ndị mmadụ obi mgbawa n’ụwa a. Ndị ọkachamara na-amụ gbasara otú ọ na-adị ndị mmadụ nwụnahụrụ kwetara na ọ bụ eziokwu. Otu akwụkwọ aha ya bụ The American Journal of Psychiatry kwuru na “ọ bụrụ na mmadụ anwụọ, ọ na-adị ọtụtụ ndị mmadụ nwụnahụrụ ka ha agaghị ahụ onye ahụ ọzọ. Ọ na-agbawakwa ha obi.” Ụdị ihe a mee mmadụ, onye ahụ nwere ike ịna-eche, sị: ‘Olee mgbe m ga-ediru ihe a? M̀ ga-enweli obi ụtọ ọzọ? Gịnị ga-enyere m aka idi ya?’
A zara ajụjụ ndị ahụ na Teta! a. Isiokwu na-esonụ ga-akọwa ihe i nwere ike ịtụ anya ya ma ọ bụrụ na mmadụ nwụnahụrụ gị na nso nso a. Isiokwu ndị na-eso ya ga-ekwu ihe ndị nwere ike inyere gị aka idi ya.
Anyị nwere olileanya na ihe ndị e dere n’isiokwu ndị a na-esonụ ga-akasi onye ọ bụla mmadụ nwụnahụrụ obi, nyekwara ya aka idi ya.
a Aha a kpọrọ ndị mmadụ n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.