Okwukwe Na-eme Ka Anyị Nwee Obi Ike
OKWUKWE na-akpa ike dị egwu. Dị ka ihe atụ, ọ bụ eziokwu na Setan chọrọ ime ka anyị na Jehova ghara ịdị ná mma, okwukwe na-eme ka anyị nwee ike “imenyụ akụ́ ụta niile na-ere ọkụ nke ajọ onye ahụ.” (Efe. 6:16) Anyị nwee okwukwe, anyị ga-edili nnukwu nsogbu ndị yiri ugwu. Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ọ bụrụ na unu enwee okwukwe há ka mkpụrụ osisi mọstad, unu ga-asị ugwu a, ‘Si n’ebe a gafee n’ebe nke ọzọ,’ ọ ga-agafe.” (Mat. 17:20) Ebe ọ bụ na okwukwe nwere ike ime ka anyị na Chineke dị ná mma, anyị kwesịrị ileba anya n’ajụjụ ndị a: Gịnị bụ okwukwe? Olee otú okwukwe anyị si gbasa otú obi anyị dị? Olee otú anyị nwere ike isi mee ka okwukwe anyị sikwuo ike? Ònye ka anyị kwesịrị inwe okwukwe na ya?—Rom 4:3.
GỊNỊ BỤ OKWUKWE?
Okwukwe apụtaghị naanị ikwere ma ọ bụ ikwu na ihe Baịbụl kwuru bụ eziokwu. A sị ka e kwuwe, “ndị mmụọ ọjọọ kwekwara [na Chineke dị] wee kụja.” (Jems 2:19) Gịnịzi bụ okwukwe?
Baịbụl kọwara na e nwere ihe abụọ okwukwe pụtara. Nke mbụ bụ na “okwukwe bụ atụmanya e ji n’aka na ihe ndị a na-ele anya ha ga-emezu.” (Hib. 11:1a) I nwee okwukwe, ị ga-ekwetasi ike na ihe niile Jehova kwuru bụ eziokwu nakwa na ha ga-emezu. Dị ka ihe atụ, Jehova gwara ndị Izrel, sị: “Ọ bụrụ na unu pụrụ imebi ọgbụgba ndụ m nke na-achị ehihie na ọgbụgba ndụ m nke na-achị abalị ka a ghara inwe ehihie na abalị n’oge ha, a pụkwara imebi ọgbụgba ndụ mụ na Devid bụ́ ohu m.” (Jere. 33:20, 21) Ò nwere mgbe ụjọ na-atụ gị na anyanwụ nwere ike ịkwụsị ịwa ma ọ bụ ịda, chi agharazie ịna-eji ma ọ bụ na-abọ? Mbanụ. Ọ bụrụ na obi siri gị ike na chi ga na-eji ma na-abọ, ò kwesịrị imewe gị obi abụọ na Onye kere ihe ndị a ga-emezu nkwa ndị o kwere?—Aịza. 55:10, 11; Mat. 5:18.
Nke abụọ bụ na okwukwe bụ “ihe àmà doro anya na ihe ndị a na-adịghị ahụ anya dị adị n’ezie.” Ọ pụtara na okwukwe bụ ihe doro anya na-egosi na e nwere ihe ndị dị adị n’eziokwu n’agbanyeghị na anyị anaghị ahụ ha anya. (Hib. 11:1b) N’ihi gịnị? Ka e were ya na nwatakịrị jụrụ gị, sị, ‘Olee otú i si mara na ikuku dị adị?’ N’agbanyeghị na ị hụtụbeghị ikuku, i nwere ike inyere nwatakịrị ahụ aka iche gbasara ihe ndị gosiri na ikuku dị. Dị ka ihe atụ, anyị na-anụ ka ikuku na-eku, na-ahụkwa ka ọ na-ebugharị osisi na ihe ndị ọzọ. Ozugbo o doro nwatakịrị ahụ anya na ihe ndị ahụ dị adị, ọ ga-aghọta na mmadụ nwere ike ikwere na ihe a na-anaghị ahụ anya dị adị n’eziokwu. Ọ bụ otú ahụ ka ihe àmà doro anya si eme ka anyị nwee okwukwe.—Rom 1:20.
INWE EZIGBO OBI DỊ MKPA
Ebe ọ bụ na ihe ga-eme ka anyị nwee okwukwe bụ ihe àmà doro anya, onye chọrọ inwe okwukwe ga-ebugodị ụzọ nweta “ezi ihe ọmụma nke eziokwu.” (1 Tim. 2:4) Ma, ọ bụghị ebe okwu biri. Pọl onyeozi dere, sị: “Mmadụ na-eji obi enwe okwukwe.” (Rom 10:10) Mmadụ ga-ekwere n’eziokwu, jirikwa ya kpọrọ ihe. Ọ bụ naanị ihe ga-eme ka onye ahụ gosi na o nwere okwukwe, ya bụ, ịna-eme ihe dị Chineke mma. (Jems 2:20) Onye na-ejighị obi ya nabata eziokwu Baịbụl nwedịrị ike ịjụ ihe gosiri na ihe Baịbụl kwuru bụ eziokwu ma ọ bụrụ na o siri ọnwụ jụ ịhapụ ihe ọ dị mbụ kwere ma ọ bụ na-achọ ihe ọ ga-akụdo aka na-eme ihe ọjọọ na-agụ ahụ́ ya. (2 Pita 3:3, 4; Jud 18) Ọ bụ ihe mere na n’oge Baịbụl, ọ bụghị ndị niile hụrụ ọrụ ebube a rụrụ mechara nwee okwukwe. (Ọnụ Ọgụ. 14:11; Jọn 12:37) Naanị ndị mmụọ nsọ Chineke na-enyere aka inwe okwukwe bụ ndị nabatara eziokwu ma jụ ụgha.—Gal. 5:22; 2 Tesa. 2:10, 11.
OTÚ DEVID SI NWEE EZIGBO OKWUKWE
Eze Devid so ná ndị nwere ezigbo okwukwe. (Hib. 11:32, 33) Ma, ọ bụghị ndị niile si n’ezinụlọ Devid hà nwere ụdị okwukwe ahụ. Dị ka ihe atụ, chegodị banyere Elayab, bụ́ ọkpara nne Devid. Mgbe Golayat mara ndị Izrel aka, iwe were Devid. Ma, Elayab baara ya mba maka ya. Mba ọ baara ya gosiri na o nweghị okwukwe na Jehova. (1 Sam. 17:26-28) A naghị ebu okwukwe apụta ụwa. Ọ naghịkwa esi mmadụ n’ọbara. N’ihi ya, ihe mere Devid ji nwee okwukwe bụ na ya na Chineke dị ná mma.
N’Abụ Ọma nke 27, Devid kwuru otú o si nwee ezigbo okwukwe. (Amaokwu nke 1) Devid tụgharịrị uche n’ihe ndị mere n’oge gara aga nakwa n’ihe Jehova mere ndị iro ya. (Amaokwu nke 2 na nke 3) O ji ebe a na-anọ efe Jehova kpọrọ ihe. (Amaokwu nke 4) Devid so ndị Izrel ibe ya na-efe Jehova n’ụlọikwuu ya. (Amaokwu nke 6) O ji obi ya niile kpee ekpere ka Jehova nyere ya aka. (Amaokwu nke 7 na nke 8) Devid chọkwara ka Chineke kụziere ya ụzọ ya. (Amaokwu nke 11) N’ihi otú okwukwe si dị Devid mkpa, ọ jụrụ, sị: “Gịnị ka m gaara eme ma a sị nnọọ na enweghị m okwukwe?”—Amaokwu nke 13.
OTÚ Ị GA-ESI MEE KA OKWUKWE GỊ SIE IKE
Ị ga-enweli okwukwe ka Devid ma ọ bụrụ na ị na-eme ihe ndị ahụ o mere n’Abụ Ọma nke 27. Ebe ọ bụ ịmata nke bụ́ eziokwu ga-eme ka anyị nwee okwukwe, ka ị na-amụkwu Okwu Chineke na akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl, ọ ga-adịkwuru gị mfe inwe okwukwe, nke so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ. (Ọma 1:2, 3) Ị mụwa ihe, wepụta oge na-atụgharị uche. Ịtụgharị uche ga-eme ka obi na-adị gị ụtọ maka ihe Jehova na-emere gị. Ka ị na-enwekwu obi ụtọ maka ihe Jehova na-emere gị, ị ga na-achọkwu igosi na i nwere okwukwe. Otú ị ga-esi na-egosi ya bụ ịna-aga ọmụmụ ihe ọgbakọ na ịna-agwa ndị ọzọ olileanya i nwere. (Hib. 10:23-25) Otú ọzọ anyị si egosi na anyị nwere okwukwe bụ ‘ịna-ekpe ekpere mgbe niile ma ghara ịda mbà.’ (Luk 18:1-8) N’ihi ya, ‘na-ekpe ekpere n’akwụsịghị akwụsị,’ ka obi siekwa gị ike na ‘ihe banyere gị na-emetụ Jehova n’obi.’ (1 Tesa. 5:17; 1 Pita 5:7) Okwukwe na-eme ka anyị na-eme ihe dị mma. Ọ bụrụkwa na anyị ana-eme ihe dị mma, okwukwe anyị ga-esikwu ike.—Jems 2:22.
NWEE OKWUKWE NA JIZỌS
N’abalị bọtara ụbọchị Jizọs nwụrụ, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Nweenụ okwukwe n’ebe Jọn 14:1) N’ihi ya, anyị kwesịrị inwe okwukwe na Jehova nakwa na Jizọs. Olee otú i nwere ike isi gosi na i nwere okwukwe na Jizọs? Ka anyị leba anya n’ụzọ atọ i nwere ike isi mee ya.
Chineke nọ, nweekwanụ okwukwe n’ebe mụ onwe m nọ.” (Nke mbụ bụ na ị ga-ewere ihe mgbapụta ahụ ka onyinye Chineke nyere gịnwa. Pọl onyeozi sịrị: “M dị [ndụ] site n’okwukwe nke m nwere n’ebe Ọkpara Chineke nọ, bụ́ onye hụrụ m n’anya ma nyefee onwe ya maka m.” (Gal. 2:20) Ọ bụrụ na ị na-egosi na i nwere okwukwe na Jizọs, ọ pụtara na i kwetasiri ike na ihe mgbapụta ahụ baara gị uru, na ọ na-eme ka a gbaghara gị mmehie gị, na-eme ka i nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi, bụrụkwa ihe kacha gosi na Jehova hụrụ gị n’anya. (Rom 8:32, 38, 39; Efe. 1:7) Ọ ga-eme ka obi ghara ịna-ajọ gị njọ ma ọ bụ na-ama gị ikpe maka ihe ndị i mere n’oge gara aga.—2 Tesa. 2:16, 17.
Nke abụọ bụ na ị ga na-ekpe ekpere ma na-abịaru Jehova nso n’ihi àjà ahụ Jizọs chụrụ. Ihe mgbapụta ahụ na-eme ka anyị jiri “nkwuwa okwu” na-ekpe ekpere “ka e wee meere anyị ebere, nwetakwa obiọma na-erughịrị mmadụ n’oge kwesịrị ekwesị mgbe enyemaka dị anyị mkpa.” (Hib. 4:15, 16; 10:19-22) Ekpere na-eme ka anyị kpebisie ike imeri ọnwụnwa.—Luk 22:40.
Nke atọ bụ na ị ga na-erubere Jizọs isi. Jọn onyeozi dere, sị: “Onye nwere okwukwe n’Ọkpara ahụ nwere ndụ ebighị ebi; onye na-enupụrụ Ọkpara ahụ isi agaghị ahụ ndụ, kama ọnụma Chineke na-adịgide n’ahụ́ ya.” (Jọn 3:36) Ị̀ chọpụtara na Jọn gosiri ihe dị iche n’inwe okwukwe na inupụ isi? N’ihi ya, otú ị ga-esi egosi na i nwere okwukwe na Jizọs bụ ịna-erubere ya isi. Otú ị ga-esi na-erubere Jizọs isi bụ ịna-edebe “iwu nke Kraịst,” ya bụ, ihe niile ọ kụziri nakwa iwu ya niile. (Gal. 6:2) Otú ọzọ ị ga-esi na-erubere Jizọs isi bụ ịna-eme ihe “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” kwuru. (Mat. 24:45) Ọ bụrụ na ị na-erubere Jizọs isi, ị ga-enwe ike ị ga-eji die nsogbu ndị tara akpụ.—Luk 6:47, 48.
NA-EME KA OKWUKWE GỊ SIKWUO IKE
Otu nwoke tiri mkpu, sị Jizọs: “Enwere m okwukwe! Nyere m aka n’ebe okwukwe dị m mkpa!” (Mak 9:24) Nwoke ahụ nwetụrụ okwukwe. Ma, ịdị umeala n’obi mere ka ọ ghọta na o kwesịrị inwekwu okwukwe. O nwere ike ịdị anyị otú ahụ ọ dị nwoke ahụ. Ihe ụfọdụ nwere ike ime ka anyị ghọta na anyị kwesịrị inwekwu okwukwe. Anyị niile nwekwara ike ime ka okwukwe anyị sikwuo ike ugbu a. Anyị ahụla na otú anyị nwere ike isi mee ka okwukwe anyị sikwuo ike bụ ịna-amụ Okwu Chineke na ịna-atụgharị uche na ya. Ọ ga-eme ka obi na-adị anyị ụtọ maka ihe Jehova na-emere anyị. Okwukwe anyị ga na-esikwu ike ma ọ bụrụ na anyị esoro ụmụnna anyị na-efe Jehova, na-agwa ndị ọzọ gbasara olileanya anyị, ma na-ekpesi ekpere ike. Anyị mee ka okwukwe anyị na-esikwu ike, anyị ga-enweta ezigbo ụgwọ ọrụ. Baịbụl gwara anyị, sị: “Ndị m hụrụ n’anya, site n’iwuli onwe unu elu n’okwukwe unu nke kasị nsọ, . . . nọrọnụ n’ịhụnanya Chineke.”—Jud 20, 21.