Ị̀ Na-atụ Anya Ihe Ndị Ị Ga-enwetali?
Ị̀ Na-atụ Anya Ihe Ndị Ị Ga-enwetali?
● Gịnị ka ị chọrọ ná ndụ? Ihe ndị ị na-agbalị inweta hà bụ ihe aka gị ga-eruli, ka ị̀ na-anọ na-eche otú ị ga-esi enweta ihe ndị ị na-agaghị enwetali ma ọ bụ ihe ndị aka gị na-agaghị eruli? Otu onye nke lebara anya n’otú ụmụ mmadụ si akpa àgwà nyere ndụmọdụ a bara uru: “Ọ ka mma ịgba mbọ nweta ihe a hụrụ anya karịa ịmụ anya na-arọ nrọ. Nke a bụkwa ihe nkịtị na ịchụso ikuku.”—Ekliziastis 6:9, Baịbụl Nsọ: Nhazi Katọlik.
“Ihe [anyị] hụrụ anya” e kwuru okwu ya n’amaokwu ahụ bụ ihe ndị anyị nwere ugbu a na ihe ndị anyị ga-enwetali. O doro anya na ọ dịghị njọ ma mmadụ gbaa mbọ mee ka ihe dịkwuoro ya mma ná ndụ. Ma ihe Baịbụl na-ekwu ebe a bụ na ndị maara ihe anaghị achọ ihe aka ha na-agaghị eruli. Ihe ndị ahụ nwere ike ịbụ, ịbụ onye a ma ama, ịba ọgaranya, inweta di ma ọ bụ nwunye kacha mma n’ụwa, ma ọ bụ inwe ahụ́ ike kacha mma.
Ihe ọzọ bụ na ndị nwetarala ihe ha chọrọ ná ndụ, dị ka ndị nwerela akụnụba, nwere ike na-achọkwu ọzọ. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji kwuo hoo haa, sị: “Ọlaọcha agaghị eju onye hụrụ ọlaọcha n’anya afọ, ego agaghịkwa eju onye ọ bụla nke hụrụ akụ̀ n’anya afọ. Nke a kwa bụ ihe efu.” (Ekliziastis 5:10) N’ihi ya, ndị maara ihe na-ekwe ka “ihe anya [ha] hụrụ,” ya bụ ihe ha nwere, ju ha afọ. Ha ghọtara na ihe a Baịbụl kwuru bụ eziokwu, ya bụ: “Ọ dịghị ihe anyị ji bịa n’ụwa, ọ dịghịkwa ihe anyị pụrụ iwere si n’ime ya pụọ.”—1 Timoti 6:7.
Chineke kere anyị ka ihe ga-akacha enye anyị obi ụtọ bụrụ igbo mkpa ime mmụọ anyị. (Matiu 5:3) Olee otú anyị ga-esi egbo mkpa ime mmụọ anyị? Jizọs Kraịst sịrị: “Ọ bụghị naanị achịcha ga-eme ka mmadụ dị ndụ, kama ọ bụ okwu niile nke na-esi n’ọnụ Jehova pụta.” (Matiu 4:4) Ọ bụ na Baịbụl ka e dere okwu niile ahụ si n’ọnụ Jehova pụta, onye ọ bụla nwekwara ike ịgụ ya.
Otu n’ime ha dị n’Abụ Ọma 37:4, bụ́ ebe sịrị: “Ka ihe Jehova na-atọkwa gị ụtọ nke ukwuu, ọ ga-enyekwa gị ihe niile obi gị na-arịọ.” Ebe Jehova bụ Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile, ọ ga-enye ndị na-efe ya ihe mmadụ ọ bụla na-enweghị ike inye ha: ma ahụ́ ike kacha mma, ma akụnụba, ma ndụ ebighị ebi n’ime ụwa Paradaịs. (Luk 23:43; Mkpughe 21:3, 4) A gaghị asị na onye tụkwasịrị obi n’ihe ndị a na-achọ inwe ihe ndị ọ na-agaghị enwetali.