Olee Ndị Bụ Ndị Mmụọ Ọjọọ?
Echiche Baịbụl
Olee Ndị Bụ Ndị Mmụọ Ọjọọ?
N’ỌTỤTỤ ebe, ndị na-ekpe okpukpe dị iche iche kweere na e nwere ndị mmụọ ndị na-enyere ndị mmadụ aka, nwee ndị nke na-emesi ndị mmadụ ike, nweekwa ndị nke na-enyere ndị mmadụ aka mgbe ụfọdụ ma na-emesi ha ike mgbe ụfọdụ. Ndị ọzọ na-ekwu na e nweghị ndị bụ́ ndị mmụọ, na ihe ndị mmadụ na-akpọ ndị mmụọ bụ ihe ha chepụtara n’obi ha ma ọ bụ ihe ha kweere na ọ dị adị. Gịnị ka Baịbụl kwuru n’okwu a?
Baịbụl kwuru na Onye kere anyị bụ Mmụọ, kwuokwa na ndị mbụ o kere bụ mmụọ. (Jọn 4:24; Ndị Hibru 1:13, 14) Ma Baịbụl kwukwara na e nwere ndị mmụọ ọjọọ. (1 Ndị Kọrịnt 10:20, 21; Jems 2:19) Ma o kwughị na ọ bụ Chineke kere ndị mmụọ ọjọọ. Olee ndị bụ ndị mmụọ ọjọọ, oleekwa otú ha si dịwa?
‘Ndị Mmụọ Ozi Mehierenụ’
Mgbe Chineke kere ndị mmụọ ozi, o kere ha ka ha nwee ike iji aka ha na-ekpebi ma hà ga-eme ihe ọma ma hà ga-eme ihe ọjọọ. Ma, ọ dị mwute na mgbe e kechara ụmụ mmadụ, e nwere ndị mmụọ ozi kpebiri inupụrụ Chineke isi.
Mmụọ ozi mbụ nupụrụ isi, nke kachakwa nwee aha ọjọọ, bụ nke e mechara na-akpọ Setan. Jizọs Kraịst sịrị: “O guzosighịkwa ike n’eziokwu.” (Jọn 8:44) Gịnị mere Setan ji nupụrụ Chineke isi? Ọ malitere ịchọ ka e fewe ya otú e si efe Chineke, n’agbanyeghị na ọ bụ naanị Onye kere anyị ka e kwesịrị ife. O mechara mee onwe ya chi ma na-ama Chineke aka. Otú ahụ ka o si mee onwe ya “Setan,” nke pụtara “onye na-emegide [Chineke].” Ka ọtụtụ narị afọ gachara, tupu Iju Mmiri ụbọchị Noa, ndị mmụọ ozi ndị ọzọ sonyeere Setan, hapụ eluigwe ebe ha bi yiri ahụ́ mmadụ bịa biri n’ụwa. (Jenesis 6:1-4; Jems 1:13-15) Mgbe Iju Mmiri ahụ bịara, ọ ga-abụ na “ndị mmụọ ozi ahụ mehiere emehie,” bụ́ ndị yiiri ahụ́ mmadụ, yirikwaara ahụ́ mmụọ laghachi n’ógbè ndị bụ́ mmụọ. (2 Pita 2:4; Jenesis 7:17-24) Ọ bụ ha ka e mechara kpọwa ndị mmụọ ọjọọ.—Diuterọnọmi 32:17; Mak 1:34.
Ndị mmụọ ozi ahụ nupụrụ isi bịaziri chọpụta na a napụla ha ihe ùgwù ndị ha nweburu. Amaokwu nke isii n’akwụkwọ Jud sịrị: “Ndị mmụọ ozi ndị na-anọgideghị n’ọnọdụ mbụ ha, kama ha hapụrụ ebe obibi ha kwesịrị ekwesị, ọ bụ ha ka [Chineke] kere agbụ ebighị ebi wee debe ha n’oké ọchịchịrị maka ikpe nke oké ụbọchị ahụ.” N’eziokwu, Chineke ekweghị ka ha nọgide na-enwe ihe ùgwù ha nwere n’eluigwe, kama nke ahụ, o mere ka ha nọrọ “n’olulu nke oké ọchịchịrị,” nke pụtara na ha enweghịzi ike iso n’ihe ọ bụla Chineke na ndị mmụọ ozi ya na-eme.
“Onye Na-eduhie Elu Ụwa Dum Mmadụ Bi”
Ọ bụ eziokwu na Chineke anaghịzi ekwe ka ndị mmụọ ọjọọ gbanwee ghọọ mmadụ, ha ka nwere ike dị ukwuu, na-akpakwa ajọ ike n’obi nakwa ná ndụ ụmụ mmadụ. N’eziokwu, Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya “na-eduhie elu ụwa dum mmadụ bi.” (Mkpughe 12:9; 16:14) Olee otú ha si na-eduhie ha? Ha na-ejikarị “ozizi ndị mmụọ ọjọọ” eduhie ụmụ mmadụ. (1 Timoti 4:1) Ozizi ụgha ndị a, bụ́ nke ndị okpukpe na-akụzikarị, emeela ka uche ọtụtụ nde ụmụ mmadụ kpuo ìsì nke na ha anaghị aghọta eziokwu banyere Chineke. (2 Ndị Kọrịnt 4:4) Legodị ụfọdụ n’ime ha.
● Ndị nwụrụ anwụ ka dị ndụ. Ndị mmụọ ọjọọ na-eme ka ụmụ mmadụ kweta na mmadụ na ndị nwụrụ anwụ nwere ike ikwurịta okwu. Ihe ha na-eme bụ ime ka ọ na-adị ndị mmadụ ka hà na-ahụ ma ọ bụ na-anụ olu ndị nwụrụ anwụ ma ọ bụkwanụ ha emee ihe ọ bụla ọzọ Ekliziastis 9:5, 6) Ebe ọ bụ na ha ‘agbadala n’ebe ịnọ duu,’ ha enweghịzi ike ito Chineke.—Abụ Ọma 115:17. *
iji ghọgbuo ha. Aghụghọ a na-emekwa ka ndị mmadụ kwere nkụzi ụgha bụ́ na mkpụrụ obi na-adịrị ndụ gawa ma mmadụ nwụọ. Ma Baịbụl kwuru hoo haa, sị: “Ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla ma ọlị.” (● Onye ọ bụla mewe otú masịrị ya. 1 Jọn 5:19 sịrị: “Ụwa dum dị n’aka ajọ onye ahụ.” Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya na-eme ka e si na tiivi, fim nakwa ihe ndị ọzọ na-akụziri ndị mmadụ na ọ dịghị njọ ime ihe ọ bụla anụ ahụ́ ha chọrọ. (Ndị Efesọs 2:1-3) Ọ bụ ya mere omume rụrụ arụ, ma ụdị nke na-adịghị mma iji ntị anụ, ji ju ebe niile taa. Ndị mmadụ na-eweredị na omume rụrụ arụ enweghị ihe o mere, na-elekwa ihe ndị e kwuru na Baịbụl anya ka ihe mgbe ochie na ihe na-anaghị ekwe mmadụ megharịa ahụ́.
● Ime mgbaasị adịghị njọ. O nwere oge Pọl onyeozi hụrụ otu nwa agbọghọ na-eje ozi, onye nwere “mmụọ ọjọọ nke a na-ajụta ase,” nke na-eme ka ọ “na-ewetara ndị nna ya ukwu uru dị ukwuu site n’ịkọ ọdịnihu.” (Ọrụ 16:16) Ebe ọ bụ na Pọl maara ebe ike nwa agbọghọ ahụ ji akọ ọdịnihu si, ọ jụrụ ige ya ntị. Ihe ọzọkwa bụ na ọ chọghị ịkpasu Chineke iwe n’ihi na ọ maara na ụdị mgbaasị ọ bụla, ma mmadụ ịchọ ihe bụ́ akara aka ya ma ịjụ ndị mmụọ ase, bụ ihe arụ n’anya Jehova.—Diuterọnọmi 18:10-12.
Ekwela Ka Ndị Mmụọ Ọjọọ Nweta Gị
Olee ihe ị ga-eme ka ndị mmụọ ọjọọ ghara inweta gị? Baịbụl zara, sị: “Doonụ onwe unu n’okpuru Chineke; ma na-eguzogidenụ Ekwensu, ọ ga-agbapụkwa n’ebe unu nọ.” (Jems 4:7) Otú anyị ga-esi mee ihe a Baịbụl kwuru bụ ịna-ebi ndụ otú Baịbụl si kwuo. Nke a bụ n’ihi na naanị Baịbụl bụ akwụkwọ dị nsọ nke gbara Setan, ndị mmụọ ọjọọ, na “atụmatụ aghụghọ” ha niile n’anwụ. (Ndị Efesọs 6:11; 2 Ndị Kọrịnt 2:11) Baịbụl gwakwara anyị na ndị mmụọ ọjọọ, nakwa ndị niile na-emegide Chineke, agaghị adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. (Ndị Rom 16:20) Ilu 2:21 sịrị: “Ndị ziri ezi ga-ebi n’ụwa, ọ bụkwa ndị na-enweghị ihe a ga-eji taa ha ụta ka a ga-ahapụ n’ime ya.”
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 11 Ị chọọ ịmata ihe bụ́ ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ nakwa ihe Baịbụl kwuru banyere ịkpọlite ha n’ọnwụ, biko gụọ isi nke 6 na nke 7 nke akwụkwọ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
Ì CHETỤLA NKE A N’ECHICHE?
● Chineke ò kere ndị mmụọ ọjọọ?—2 Pita 2:4.
● Ì nwere ike ịgwa ndị nwụrụ anwụ okwu?—Ekliziastis 9:5, 6.
● Olee otú i nwere isi chebe onwe gị ka ndị mmụọ ọjọọ ghara inweta gị?—Jems 4:7.
[Foto dị na peeji nke 23]
Ndị mmụọ ọjọọ nwere ọtụtụ ụzọ ha si akpa ike ná ndụ ndị mmadụ