Ka Anyị Gaa Otu Ahịa Dị n’Afrịka
Ka Anyị Gaa Otu Ahịa Dị n’Afrịka
OTU ụzọ kacha mma e si amata omenala, ọdịnala na nri dị iche iche a na-eri n’obodo ọ bụla bụ ịga ahịa ha. I ruo n’ahịa ha, ị ga-ahụ ndị obodo ahụ, rie nri ha na-eri, ma zụrụ ihe ndị ha na-ere. Ị ga-ahụkwa ndị ahịa, ndị ga-agbalị ịhụ na gị na ha kwurịtara okwu n’agbanyeghị asụsụ ị na-asụ.
Ọ ga-esiri gị ike ịhụ ahịa ga-amasị gị ka ahịa ndị dị n’Afrịka. Ndị mmadụ na-eju na ha, ọtụtụ ihe a na-ere ebe ahụ ga-atụkwa gị n’anya. N’ahịa ndị a, ị ga-achọpụta otú ndị Afrịka si eme ihe. Soro m ka anyị gaa n’otu ahịa dị na Duala, bụ́ otu obodo dị na Kamerun.
Otú Ndị Afrịka Si Aga Ahịa Ha
N’ọtụtụ obodo ukwu ndị dị n’Afrịka, otú kacha ọnụ ala isi gaa ahịa n’egbughị oge bụ ịgba ọkada. Ndị ọkada na-anọ n’ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ n’okporo ámá niile na-achọ ndị ha ga-eburu. Obi kaa gị, i nwere ike ịgwa otu n’ime ha ka o buru gị. Na Kamerun, ịgba ọkada na-ewu ewu n’ihi na ọ kacha ọnụ ala, ọ naghịkwa egbu oge.
Ma ọ bụrụ na obi akaghị gị ịgba ọkada, tagzi juru ebe niile, i nwekwara ike ịbanye ya. Ọtụtụ mmadụ na-abanyekarị n’otu tagzi ka o nwee ike belatara ha ego ha ga-akwụ.
Ọtụtụ Ọdụ Ahịa
Ọ bụrụ na ọ bụ nke mbụ ị na-abata n’ime ahịa a, ị gaghị enwe ọnụ okwu ma ị hụ otú mmadụ si ju n’ahịa ahụ nakwa ọtụtụ ọdụ ahịa e nwere ebe ahụ. Ị ga-ahụ ọtụtụ ndị toro eto, ma ụmụaka, ndị bu ngwá ahịa ha n’isi na-ere. I leruo anya, ị ga-ahụ ndị ji nkata buru ọkụkọ, ndị bu oroma e bere ebe, ndị na-ere ọgwụ na ọtụtụ ihe ndị ọzọ.
E nwekwara ọtụtụ tebụl ndị a kpọsara ihe oriri ndị dị ka kabej, karọt, kukumba, afụfa, àgwà, ji nwannu, tomato, ji, na akwụkwọ nri dị iche iche. Onye na-abụghị onye Afrịka nwere ike ọ gaghị amacha ihe niile ọ hụrụ n’ahịa ahụ n’ihi na ụfọdụ n’ime ha bụ nri naanị ndị Afrịka na-eri. N’ihe niile a kpọsara, nke yiri ka ọ̀ kacha mma ile anya bụ ose ndụ ndị na-acha ọbara ọbara na odo odo, bụ́ ndị na-egbuke egbuke ka anwụ ụtụtụ na-awasa ha. A na-erekwa ube bekee, unere, grep, wọtamelọn, akwụoro, oroma, na lemọn. Mkpụrụ osisi ndị a niile na-adọ akpịrị, ha dịkwa ọnụ
ala! Nri ndị a na-akọ n’obodo ahụ, ndị dị ka ji, akpụ, na osikapa, juru n’ahịa ahụ, ha na yabasị na galik, bụ́ ndị a na-esi mba ọzọ ebubata.N’otu ahịa dị na Duala, ọtụtụ ndị na-ere ahịa ebe ahụ bụ ndị Awụsa na ndị Fulani. Ị batahaala n’ahịa ahụ, ị ga-ama ha n’ihi na ha na-eyi uwe mwụda na-acha ọcha, anụnụ anụnụ, ma ọ bụ odo odo, bụ́ nke a na-akpọ gandoras ma ọ bụ búbú. Ihe ọzọkwa ị ga-eji ama ha bụ otú ha si eji obi ọcha ekele mmadụ n’asụsụ Fulfulde. Obi ruru ndị niile nọ n’ahịa ahụ ala. Otu onye na-ere ahịa n’ahịa ahụ, aha ya bụ Ịbrahim, nyere m yabasị atọ gbara agba. Ihe o kwuru mgbe o nyere m ya bụ, “Gwa nwunye gị ka o kunye osikapa e siri esi n’ime ya ma sie ya ka o jiri nwayọọ ghee.”
Ka anyị na-aga, anyị rutere ebe a na-ere anụ, anụ ndị a na-erekarịkwa ebe ahụ bụ anụ ewu na anụ ehi. Ị ga-ahụ ụmụ nwoke ndị gbasiri ike ka ha bu ozu anụ n’ubu ha ma dọsa ya n’elu tebụl e ji ere anụ. Ndị na-ere anụ na-eji ogologo mma abụọ n’aka na-amụchasị ya, na-akpọ ndị ahịa ka ha bịa kwuo nke ha chọrọ ịzụ ka ha benye ha. E nwekwara ewu, ọkụkọ, na ézì maka ndị chọrọ ịzụrụ gaa gburu n’aka ha.
Ka Anyị Gaa Rie Nri n’Ụlọ Nri
N’ahịa niile dị n’Afrịka, a na-enwerịrị ebe a na-ere nri e siri esi. Na Kamerun, a na-akpọ ebe a na-ere nri e siri esi ụlọ nri. N’ụfọdụ ụlọ nri ndị a, a na-akpọ egwú na-ada oké ụda iji dọta ndị ahịa, ma e nwekwara ndị nke mkpọtụ na-anaghị adị, ebe mmadụ nwere ike ịnọ rie nri ndị Afrịka ma soro ụfọdụ ndị obodo ahụ kparịta ụka. A na-enwekarị bọọdụ a na-ede nri ndị e nwere, onye na-amaghị otú nri ndị ahụ na-adị nwere ike ịrịọ mmadụ ka ọ kọwaara ya.
Ụzọ nri abụọ a na-ahụkarị bụ osikapa na ụtara. Ha na-enwe ụtara akpụ, ụtara abrịka ma ọ bụ ụtara ji. Ha na-enwekwa azụ̀ a mịrị amị, anụ ewu, na anụ akụkọ, ya na stuu e ji ọkwụrụ, ahụekere a kwọrọ akwọ, ma ọ bụ tomato sie. O nweghị onye ọ na-adị ọsọ ọsọ n’ụlọ nri ndị ahụ, ị ga-enwekwa ohere gị na ndị mmadụ ga-eji kparịta ụka.
Ozugbo anyị nọdụrụ ala, ụmụ nwaanyị abụọ ndị na-ebutere ndị mmadụ nri bịakwutere anyị. Otu onye ji otu nnukwu tree buru ọtụtụ efere ndị e kunyere osikapa, àgwà, na ụtara. Ihe e ji eri nri ndị a bụ stuu e ji ọkwụrụ sie, tinye ya anụ na azụ̀ a mịrị n’osisi. E nwekwara obere mkpọ̀ e tinyere ose maka ndị chọrọ ya. Onye nke ọzọ wetaara anyị mmiri ịkwọ aka na ákwà nhicha aka. Nke a dị ezigbo mkpa, n’ihi na ọ bụ aka ka e ji eri nri ndị obodo ahụ. A na-ahụkarị ka onye bịara iri nri na-ekpe ekpere tupu ya eriwe nri, nakwa ka ndị nọ n’akụkụ na-esoro ya kwee “Amen” mgbe o kpechara ekpere.
Ikwusa Ozi Ọma n’Ahịa
Kemgbe ụwa, ahịa bụ ihe dị mkpa n’obodo ọ bụla. Ọ bụghị naanị na a na-azụ ma na-ere ihe n’ahịa, kamakwa, a na-anọ n’ahịa anụ ihe ndị megasịrị n’obodo, ọtụtụ ndị na-enwetakwa ọrụ ha ga-arụ n’ahịa, ndị mmadụ ana-ahụkwa ndị enyi ha n’ahịa. Baịbụl kwuru na Jizọs gara n’ọma ahịa kụziere ndị mmadụ banyere Chineke ma gwọọ ụfọdụ ndị ọrịa ha. Pọl onyeozi kwusakwaara “ndị nọ n’ọma ahịa” ozi ọma. (Ọrụ 17:16, 17; Mak 6:56) N’otu aka ahụkwa taa, Ndịàmà Jehova nọ na Kamerun achọpụtala na ọ dị mma ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke n’ahịa.—Ọ bụ onye na-agụ akwụkwọ anyị detara ya.
[Foto dị na peeji nke 28]
Ose ndị nwere ụcha dị iche iche