Gịnị Ka M Kwesịrị Iji Ndụ M Mee?
Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .
Gịnị Ka M Kwesịrị Iji Ndụ M Mee?
“Anabughị m echegbu onwe m banyere ọdịnihu. Ma, ka m gụchawara akwụkwọ, achọpụtara m na o ruwela oge m ga-ama ihe ụwa na-akọ, oge m ga-amalite rụwa ọrụ ma kwụwara onwe m ụgwọ ihe nile.”—Alex, ọ dị afọ 17.
MGBE ị bụ nwata, ị̀ mụtụla anya rọọ nrọ banyere ihe ị ga-abụ ma i too? Olee otú i sizi ele ihe ahụ ị chọrọ ịbụ mgbe ahụ anya? Ị̀ ka na-eche banyere ụdị ọrụ ị ga-arụ ma i too? Ọ bụrụ otú ahụ, ọ bụghị nanị gị nọ n’ọnọdụ a. Akwụkwọ bụ́ Career Coaching Your Kids kwuru, sị: “Otu n’ime ihe ndị kasị esiri ndị na-eto eto ike bụ ikpebi ụdị ọrụ ha ga-arụ ná ndụ.”
N’aka nke ọzọ, eleghị anya ị malitebeghịdị iche banyere ụdị ọrụ ị ga-arụ ná ndụ. Ikekwe ihe obi gị ka dị na ya bụ otú ị ga-esi kporie ndụ. O nweghị ihe ọjọọ dị n’ikpori ndụ, n’ihi na Bible na-agwa gị “ka obi gị meekwa gị mma n’ụbọchị nile nke okorobịa [ma ọ bụ, agbọghọbịa] ị bụ!” (Eklisiastis 11:9) Ka o sina dị, ugbu a bụ oge dị mma ịmalite chewe banyere ihe ị ga-eji ndụ gị mee. Ilu 14:15 na-ekwu, sị: “Onye nwere ezi uche na-aghọta ijeụkwụ ya.” Olee otú ị ga-esi ghọta ijeụkwụ gị?
“Mara Ebe Ị Na-aga”
Were ya na ị na-eme atụmatụ ime njem ga-ewe gị ọtụtụ kilomita site n’ụlọ unu. Ma eleghị anya, ị ga-ebu ụzọ lee anya na map iji mata ụzọ ga-akasị mma isi gaa ebe ahụ. Otu ihe ahụ ka a chọrọ ma a bịa n’ime atụmatụ maka ọdịnihu gị. Michael bụ́ nwa okorobịa nke na-arụ ugbu a n’otu n’ime alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova, kwuru, sị, “I nwere ọtụtụ ihe ndị i nwere ike ịhọrọ.” Olee otú ị ga-esi mara nke ị ga-ahọrọ n’ọtụtụ ihe ndị a? Michael kwuru, sị: “Ọ dabeere n’ihe mgbaru ọsọ mmadụ setịpụrụ.”
Were ihe mgbaru ọsọ dị ka à ga-asị na ọ bụ obodo nke ị na-aga na ya. O yiri nnọọ ka ị gaghị eru ya ma ọ bụrụ na ị na-awagharị dị ka onye na-enweghị ebe o bu n’obi ịga. Ọ ka nnọọ mma ka i weta map ma jiri ya chọpụta ụzọ ị ga-eso, dị ka a pụrụ isi kwuo ya. I mee otú a, ọ bụ ndụmọdụ dị n’Ilu 4:26 ka ị na-agbaso. Ndụmọdụ ahụ kwuru, sị: “Mee ka okporo ụzọ nke ụkwụ gị abụọ dị larịị.” Nsụgharị Contemporary English Version si otú a kwuo ya: “Mara ebe ị na-aga.”
N’afọ ndị na-abịa n’ihu, ị ga-eme ọtụtụ mkpebi
ndị dị mkpa bụ́ ndị metụtara ofufe, ọrụ, alụmdi na nwunye, ezinụlọ, na okwu ndị ọzọ dị oké mkpa. Ọ ga-adịrị gị mfe ime mkpebi ndị amamihe dị na ha n’ihe ndị a ma ọ bụrụ na i buru ụzọ mara ebe ị na-aga. Ọzọkwa, ka ị na-ekpebi ihe ị ga-eji ndụ gị mee, e nwere otu ihe ị na-ekwesịtụghị ileghara anya.“Chetakwa Onye Keworo Gị”
Ọ bụrụ na ị chọrọ inwe obi ụtọ n’ezie, ị ga-emerịrị ihe a Eze Solomọn maara ihe kwuru, nke bụ́: “Chetakwa Onye keworo gị n’ụbọchị nile ị dị n’okorobịa.” (Eklisiastis 12:1) Ọchịchọ ime ihe Chineke na-achọ kwesịrị imetụta ihe ị ga-ekpebi iji ndụ gị mee.
Gịnị mere nke ahụ ji dị mkpa? Ná Mkpughe 4:11, Bible na-ekwu, sị: “I kwesịrị ekwesị, Jehova, ọbụna Chineke anyị, ịnata otuto na nsọpụrụ na ike, n’ihi na i kere ihe nile, ọ bụkwa n’ihi ọchịchọ gị ka ha ji dịrị, ka e jikwa kee ha.” N’ezie, ihe nile e kere eke ma n’eluigwe ma n’ụwa ji Onye Okike ha ụgwọ ekele. Ì nwere ekele na o nyere gị “ndụ na ume na ihe nile”? (Ọrụ 17:25) Ọ́ dịghị emetụ gị n’ahụ́ inyeghachi Jehova Chineke ihe iji kelee ya maka ihe nile o nyere gị?
N’ihi na ọtụtụ ndị ntorobịa bụ́ Ndịàmà Jehova bu Onye Okike ha n’uche, ha ahọrọla ịbanye n’ozi oge nile. Nke bụ́ eziokwu bụ na ozi oge nile bụ ihe mgbaru ọsọ magburu onwe ya, ọ na-ewetakwa ọtụtụ ngọzi. (Malakaị 3:10) Ma, ọ dị gị mkpa ibu ụzọ chebara ya echiche. Dị ka ihe atụ, jụọ onwe gị, sị, ‘Olee ọrụ ndị m ma arụ nke ọma bụ́ ndị m ga-eji na-akpata ego ma m banye n’ozi oge nile?’
Kelly, bụ́ nwa agbọghọ dị afọ 27 ugbu a, malitere mgbe ọ dị obere mewe atụmatụ nke ya. O nwere nnọọ ihe mgbaru ọsọ nke ịbanye n’ozi oge nile. Mgbe Kelly dị ihe dị ka
afọ 18, ọ malitere “mewe atụmatụ” banyere ụdị ọrụ ọ ga-arụ ná ndụ. O kwuru, sị, “Ahọọrọ m ọrụ ga-enye m ohere igbo mkpa m ma na-ejekwa ozi m.”Kelly nwetara ọzụzụ n’ụlọ akwụkwọ n’ihe banyere otú e si enyere ndị nwere ọrịa ezé aka. Ọ gbadịrị onye mbụ n’otu ule steeti ha haziri. Ma, ihe ịga nke ọma o nwere emeghị ka o chefuo ihe mgbaru ọsọ ya bụ́ isi. Kelly kwuru, sị, “Ọrụ m chọrọ ịrụ bụ ije ozi oge nile. Ihe ọ bụla ọzọ nọ n’ọnọdụ nke abụọ.” Kelly ka na-eje ozi oge nile, ọ na-enwetakwa ọṅụ na ya. O kwuru, sị, “Echeghị m na ọ dị mkpebi ọzọ m gaara eme gaara aka nke a mma.”
Rịọ Maka Nduzi
Ọ bụrụ na ị na-aga n’obodo ị na-amaghị, o yiri nnọọ ka ọ̀ ga-abụ ị gatụ, gị akwụsị jụọ ndị mmadụ ụzọ—ọbụna ma a sị na i ji map. I nwekwara ike ime otu ihe ahụ mgbe ị na-eme atụmatụ banyere ihe ị ga-eji ndụ gị mee. Gwa ndị ọzọ ka ha tụọrọ gị aro. Ilu 20:18 na-ekwu, sị: “Echiche nile na-eji ndụmọdụ guzosie ike.” N’ezie, ndị mụrụ gị so ná ndị pụrụ inye gị ezigbo nduzi. I nwekwara ike ịchọ ndụmọdụ n’aka Ndị Kraịst tozuru okè bụ́ ndị na-ebi ndụ otú na-egosi na ha nwere amamihe Chineke. Roberto tụrụ aro, sị: “Gakwuru ndị toro eto, bụ́ ndị na-esetịpụ ezi ihe nlereanya n’ọgbakọ unu ma ọ bụ n’ọgbakọ ndị dị unu nso. Ha pụrụ ịkọrọ gị ihe ụfọdụ ndị ị na-echetụbeghị n’echiche.”
Karịa onye ọ bụla ọzọ, Jehova Chineke chọrọ inyere gị aka ime nhọrọ ndị ga-eme ka i bie ụdị ndụ ga-akasị enye gị obi ụtọ. Ya mere, rịọ ya ka o nyere gị aka ‘ịnọgide na-aghọta ihe uche ya bụ’ banyere ọdịnihu gị. (Ndị Efesọs 5:17) Ọ bụrụ na ị tụkwasị Jehova obi gị nile, “ya onwe ya ga-emekwa ka okporo ụzọ gị nile zie ezie.”—Ilu 3:5, 6.
Ị pụrụ ịhụ isiokwu ndị ọzọ dị n’usoro isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . . ” n’ebe a na-edebe ihe ọmụma n’Intanet nke adress ya bụ www.watchtower.org/ypa
IHE NDỊ A GA-ECHEBARA ECHICHE
▪ Olee ọrụ ndị ị ma arụ nke ọma?
▪ Ì nwere ike icheta ụzọ ndị ị pụrụ isi jiri ọrụ ndị a too Jehova?
▪ N’ime ozi oge nile ndị a kpọtụrụ aha n’isiokwu a, olee nke masịrị gị?
[Igbe dị na peeji nke 16]
ỤZỌ NA-EDUBA NÁ NSOGBU
Bible kwuru, sị: “Ndị kpebisiri ike ịba ọgaranya na-adaba n’ọnwụnwa na ọnyà na ọtụtụ ọchịchọ amaghị ihe nke na-emerụkwa ahụ́, bụ́ ndị na-akwakpu mmadụ ná mbibi na ịla n’iyi.” Olulu juru n’ụzọ na-eduga n’inweta akụ̀ na ụba! N’eziokwu, ọ pụrụ ịghọ ụzọ na-eduba mmadụ ná nsogbu nke ịba n’ụgwọ, inwe nchekasị, na ịkwụsị iji ofufe Chineke kpọrọ ihe.—1 Timoti 6:9, 10.
[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 17, 18]
ỌRỤ ỌSỤ ỤZỌ
Onye ọsụ ụzọ bụ Onye Kraịst e mere baptizim nke na-esetịpụ ezi nlereanya ma hazie oge ya iji nwee ike ịdị na-eji, ọ dịkarịa ala, awa 70 na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke kwa ọnwa. Ọzụzụ na ahụmahụ ndị ọsụ ụzọ na-enweta na-eme ka nkà ha nwere n’ịkụzi Bible na-akawanye mma.
OZI BETEL
Ndị òtù ezinụlọ Betel na-eje ozi n’alaka ụlọ ọrụ dị iche iche nke Ndịàmà Jehova, bụ́ ebe ha na-enye aka n’ịkwadebe, n’ibipụta, na n’ikesa akwụkwọ ndị e ji amụ Bible. Ụdị ọrụ ọ bụla mmadụ na-arụ na Betel bụ ihe ùgwù ije ozi dị nsọ.
IJE OZI N’EBE E NWERE MKPA KA UKWUU
Ụfọdụ ndị ọsụ ụzọ na-esi n’obodo ha kwapụ ma kwaga ebe e nwere mkpa ka ukwuu maka ndị nkwusa Alaeze. Ndị ọzọ na-amụ asụsụ ọzọ ma na-eje ozi ná mba ọzọ ma ọ bụ n’ọgbakọ a na-eji asụsụ ahụ amụ ihe.
IJE OZI NÁ MBA ỌZỌ
Ndị na-eje ozi ná mba ọzọ na-aga ná mba na-abụghị nke ha iji nye aka n’iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze na alaka ụlọ ọrụ dị iche iche. Nke a bụ ozi dị nsọ nke a pụrụ iji ndị na-arụ ya tụnyere ndị wuru ụlọ nsọ Solomọn.—1 Ndị Eze 8:13-18.
ỤLỌ AKWỤKWỌ ỌZỤZỤ NDỊ OZI
N’ọzụzụ a na-ewe izu asatọ, a na-akụziri ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi ruru eru, bụ́ ndị na-alụbeghị nwanyị, otú e si ahazi ọgbakọ na otú e si ekwu okwu n’ihu ọha. A na-eziga ụfọdụ ndị gụsịrị akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ a ije ozi ná mba ha; a na-eziga ndị ọzọ ije ozi ná mba ọzọ.
OZI ALA ỌZỌ
A na-azụ ndị ọsụ ụzọ ruru eru bụ́ ndị ahụ́ gbasiri ike ije ozi ná mba ọzọ. Ndị ozi ala ọzọ na-ebi ndụ obi ụtọ na nke na-eju afọ.
[Igbe/Foto dị na peeji nke 17]
GỊNỊ KA M GA-EJI NDỤ M MEE?
Na fim a Ndịàmà Jehova mepụtara, e gosiri ajụjụ ọnụ a gbara ndị na-eto eto si Brazil, Britain, Germany, na United States, bụ́ ndị ji nnọọ obi ọcha ha zaa ajụjụ ndị a jụrụ ha. N’oge na-adịghị anya, a ga-enwe fim a n’ọtụtụ asụsụ.
[Foto dị na peeji nke 16]
“Ọ dabeere n’ihe mgbaru ọsọ mmadụ setịpụrụ.”—Michael, ọ bụ onye òtù ezinụlọ Betel
[Foto dị na peeji nke 17]
‘Ọ bụ mkpebi kachasị mma m mere.’—Kelly, ọ rụọla ọrụ ọsụ ụzọ ruo afọ isii
[Foto dị na peeji nke 18]
“Gakwuru ndị . . . na-esetịpụ ezi ihe nlereanya.”—Roberto, ọ bụ onye òtù ezinụlọ Betel