Ụdị Dị Iche Iche nke Ajọ Mbunobi
Ụdị Dị Iche Iche nke Ajọ Mbunobi
“Si n’ọnụ ụzọ chụpụ ajọ mbunobi, ọ ga-esikwa na windo bataghachi.”—Frederick Onye Ukwu, bụ́ Eze Prussia.
RAJESH bi na Paliyad, bụ́ obodo nta nke dị n’India. Dị ka ndị ọzọ bụ́ osu, ọ na-eji ụkwụ aga minit 15 iji kutere ezinụlọ ya mmiri. “N’obodo nta anyị, a dịghị ekwe anyị gbara mmiri na pọmpụ ndị ọzọ na-agbara mmiri,” ka ọ na-akọwa. Mgbe ọ nọ n’ụlọ akwụkwọ, Rajesh na ndị enyi ya apụghịdị imetụ bọl ụmụaka ndị ọzọ na-agba aka. “Nkume ka anyị na-eji emere bọl,” ka ọ na-ekwu.
“Achọpụtara m na ndị mmadụ kpọrọ m asị, ma amaghị m ihe kpatara ya,” ka Christina na-ekwu, bụ́ onye dị afọ iri na ụma nke si Eshia ma biri na Europe. “Ọ bụ nnọọ ihe na-ekoropụ obi,” ka ọ gara n’ihu ikwu. “Ịkpọasị ahụ na-emekarị ka m na-anọpụrụ onwe m iche, ma nke ahụ adịghịkwa enyere m aka.”
“Oge mbụ m matara ihe bụ́ ajọ mbunobi bụ mgbe m dị afọ 16,” ka Stanley, bụ́ onye si n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Africa na-ekwu. “Ndị m na-amabughị gwara m ka m si n’obodo ahụ pụọ. A gbara ụlọ nke ụfọdụ ndị si n’obodo m ọkụ. A machibidoro nna m iwu ịdọrọ ego o tinyere n’ụlọ akụ̀. N’ihi ya, amalitere m ịkpọ agbụrụ ahụ na-akpa ókè megide anyị asị.”
Rajesh, Christina, na Stanley bụ ndị e gosiri ajọ mbunobi, ma ọ bụghị nanị ha. “Ọtụtụ narị nde ndị mmadụ nọgidere na-ata ahụhụ taa n’ihi ịkpa ókè, ịkpa ókè agbụrụ, ụjọ a na-atụ ndị si esi bịa, nakwa n’ihi ịbụ ndị e kewapụrụ iche,” ka Koïchiro Matsuura, bụ́ ọga kpata kpata nke Òtù Mmụta, Sayensị, na Ọdịbendị nke Mba Ndị Dị n’Otu (UNESCO) na-akọwa. “Omume ndị dị otú ahụ na-eweda mmadụ ala, bụ́ ndị ikwere ihe n’ajụghị ase na ajọ mbunobi na-akpata, emewo ka e nwee ọgba aghara n’ime ọtụtụ mba, ọ kpatawokwara ndị mmadụ ntaramahụhụ dị ukwuu.”
Ọ bụrụ na e gositụbeghị gị ajọ mbunobi, ọ pụrụ isiri gị ike ịghọta ụdị obi mgbawa ọ na-akpata. “Ụfọdụ na-anagide ya n’akọsaraghị ya mmadụ. Ndị ọzọ e gosiri ajọ mbunobi na-egosigwara,” ka akwụkwọ bụ́ Face to Face Against Prejudice na-ekwu. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka ajọ mbunobi si ebibi ndụ?
Ọ bụrụ na i so n’ìgwè nta, ị pụrụ ịchọpụta na ndị mmadụ na-eze gị eze, na-ele gị anya ọjọọ, ma ọ bụ na-ekwu okwu ndị na-eweda ọdịbendị gị ala. Ọ pụrụ isiri gị ike inweta ọrụ, ọ gwụla ma i kweere ịrụ ọrụ dị ala nke ọ na-adịghị onye
ọzọ chọrọ ịrụ ya. Ikekwe ọ na-esiri gị ike inweta ụlọ dị mma. N’ụlọ akwụkwọ, ọ pụrụ ịdị ụmụ gị ka ụmụ klas ha hà na-ekewapụ ha iche ma na-agbara ha ọsọ.Nke ka njọ bụ na ajọ mbunobi pụrụ ịkpali ndị mmadụ ime ihe ike ma ọ bụ ọbụna igbu ọchụ. N’ezie, akụkọ ihe mere eme jupụtara n’ihe atụ ime ihe ike ndị na-awụ akpata oyi n’ahụ́ bụ́ ndị ajọ mbunobi pụrụ ịkpata—gụnyere mgbuchapụ na ihe a sị na ọ bụ mkpocha agbụrụ.
Ajọ Mbunobi n’Ime Narị Afọ Ndị Gafeworonụ
N’otu oge, Ndị Kraịst bụ ndị bụ́ isi e gosiri ajọ mbunobi. Dị ka ihe atụ, n’oge na-adịghị anya mgbe Jizọs nwụsịrị, e ji obi ịta mmiri kpagbuo ha n’ụzọ kpụ ọkụ n’ọnụ. (Ọrụ 8:3; 9:1, 2; 26:10, 11) Narị afọ abụọ mgbe nke ahụ gasịrị, ndị sị na ha bụ Ndị Kraịst bịara chee mmegbu obi ọjọọ ihu. “Ọ bụrụ na e nwee ihe otiti,” ka onye edemede narị afọ nke atọ bụ́ Tertullian dere, “mkpu a na-eti ozugbo na-abụ, ‘Kpụrụnụ Ndị Kraịst Tụbara Ọdụm.’”
Otú ọ dị, malite na narị afọ nke 11 bụ́ mgbe a lụrụ Agha Ntụte ahụ, ndị Juu ghọrọ ìgwè nta a na-ele anya ọjọọ na Europe. Mgbe ọrịa bubo kpara mkpamkpa na Europe, na-egbu ihe dị ka otu ụzọ n’ụzọ anọ nke ndị bi na ya nanị n’ime afọ ole na ole, e boro ya ndị Juu n’egbughị oge, ebe ọ bụ na ọtụtụ mmadụ adịlarị mbụ kpọọ ha asị. “Ọrịa ahụ mere ka e nwee ihe nkụdo aka maka ịkpọasị a, ịkpọasị a mekwara ka a na-atụ otu ndị ụjọ dị ka ndị kpatara ọrịa ahụ,” ka Jeanette Farrell na-ede n’akwụkwọ ya bụ́ Invisible Enemies.
N’ikpeazụ, otu nwoke onye Juu nke bi n’ebe ndịda France “kwetara” mgbe e mekpọgidere ya ọnụ, na ọ bụ ndị Juu kpara mkpamkpa ahụ site n’itinye nsí n’olulu mmiri dị iche iche. N’ezie, ihe o kwetara abụghị eziokwu, ma a kpọsara ya dị ka eziokwu. N’oge na-adịghị anya, e gbuchapụrụ ndị Juu bi n’ógbè dị iche iche na Spen, France, nakwa na Germany. O yiri ka ọ dịghị onye lebaara isi ihe kpatara ọrịa ahụ anya—òké. Ọ bụkwa mmadụ ole na ole chọpụtara na ọrịa ahụ gbukwara ndị Juu otú o si gbuo ndị ọzọ!
Ozugbo a mụnyere ọkụ nke ajọ mbunobi, ọ pụrụ iregide ruo ọtụtụ narị afọ. N’etiti narị afọ
nke 20, Adolf Hitler mụnyere ọkụ nke ịkpọasị megide ndị Juu site n’ikwu na ọ bụ ha kpatara mmeri e meriri Germany n’Agha Ụwa Mbụ. Mgbe Agha Ụwa nke Abụọ biri, Rudolf Hoess—ọchịagha Nazi nke na-elekọta ogige ịta ahụhụ Auschwitz—kwetara, sị: “Ọzụzụ anyị nwetara n’agha nakwa na nkà iche echiche mere ka anyị were echiche ahụ bụ́ na anyị aghaghị ichebe Germany pụọ n’aka ndị Juu dị ka eziokwu.” Iji ‘chebe Germany,’ Hoess hụrụ maka mgbuchapụ nke ihe dị ka mmadụ 2,000,000, ndị ihe ka ọtụtụ n’ime ha bụ ndị Juu.N’ụzọ dị mwute, ka iri afọ ndị ọzọ gaferela, arụrụala akwụsịbeghị. Dị ka ihe atụ, n’afọ 1994, ịkpọasị agbụrụ bilitere n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Africa n’etiti ndị Tutsi na ndị Hutu, bụ́ nke e gburu, ọ dịkarịa ala, ọkara nde mmadụ na ya. “E nweghị ebe mgbaba,” ka magazin bụ́ Time kọrọ. “E gburu ndị mmadụ n’ime chọọchị dị iche iche bụ́ ebe ha gbabara maka nchebe. . . . A lụrụ ọgụ ahụ ihu na ihu n’ụzọ na-awụ akpata oyi n’ahụ́, ụdị agụụ ịkwafu ọbara e gosipụtara dị nnọọ ukwuu nke na ndị lanahụrụ ya bịara nọrọ ná mgbagwoju anya n’enweghị ọnụ okwu.” Ihe ike ahụ na-awụ akpata oyi n’ahụ́ metụtara ọbụna ụmụaka. “Rwanda epeka,” ka otu nwa amaala kwuru. “Ma anyị bu ịkpọasị nile dị n’ụwa a n’isi.”
Esemokwu ndị mere ka ebe bụbu Yugoslavia kewaa, gburu ihe karịrị mmadụ 200,000. Ndị agbata obi, bụ́ ndị biworo n’udo ruo ọtụtụ afọ, gburịtara ibe ha. E dinara ọtụtụ puku ndị inyom n’ike, a chụpụkwara ọtụtụ nde mmadụ n’ụlọ ha n’ike n’ihi atụmatụ obi ọjọọ bụ́ mkpocha agbụrụ.
Ọ bụ ezie na ihe ka ọtụtụ n’ajọ mbunobi adịghị akpata igbu ọchụ, ọ na-ekewakarị ndị mmadụ ma na-akpali ibu iwe n’obi. N’agbanyeghị njikọ a na-ejikọ ụwa ọnụ, ịkpa ókè agbụrụ “yiri ka ọ̀ na-agba mkpọrọgwụ n’akụkụ ka ukwuu nke ụwa,” ka otu akụkọ e si n’aka òtù UNESCO nweta n’oge na-adịbeghị anya na-ekwu.
Ọ̀ dị ihe ọ bụla a pụrụ ime iji kpochapụ ajọ mbunobi? Iji zaa ajụjụ ahụ, anyị aghaghị ịchọpụta otú ajọ mbunobi si agbanye mkpọrọgwụ n’uche nakwa n’obi.
[Igbe dị na peeji nke 5]
Ụzọ Ndị E Si Egosipụta Ajọ Mbunobi
N’akwụkwọ ya bụ́ The Nature of Prejudice (Ọdịdị nke Ajọ Mbunobi), Gordon W. Allport depụtara ụdị àgwà ise ajọ mbunobi na-eme ka mmadụ na-akpa. Onye nwere ajọ mbunobi na-egosipụtakarị otu n’ime àgwà ndị a ma ọ bụ karịa.
1. Okwu ọjọọ. Mmadụ na-ekwu okwu mweda n’ala banyere ìgwè ọ na-enweghị mmasị na ya.
2. Nzere. Ọ na-ezere onye ọ bụla nke so n’ìgwè ahụ.
3. Ịkpa ókè. Ọ dịghị ekwe enye ndị so n’ìgwè ahụ ọ kpọrọ asị ọrụ ụfọdụ, ụlọ obibi, ma ọ bụ ọkwá ụfọdụ.
4. Mwakpo. Ọ na-ekere òkè n’ime ihe ike bụ́ nke a na-eme iji majaa ndị ahụ ọ kpọrọ asị.
5. Mkpochapụ. Ọ na-ekere òkè n’ihe omume nke igbu, igbukpọ, ma ọ bụ ikpochapụ ndị ahụ.
[Foto dị na peeji nke 4]
Ogige ndị gbara ọsọ ndụ nke dị na Benaco, Tanzania, May 11, 1994
Ka otu nwanyị na-ezu ike n’akụkụ galọn mmiri ya. Ihe karịrị mmadụ 300,000, nke ihe ka ọtụtụ n’ime ha bụ ndị Hutu si Rwanda, gbaara ọsọ ndụ gbaga Tanzania
[Ebe E Si Nweta Foto]
Foto si n’aka Paula Bronstein/Liaison