Ihe Isi Ike nke Oge Agha Kwadebere M Maka Ndụ
Ihe Isi Ike nke Oge Agha Kwadebere M Maka Ndụ
DI KA ERNST KRÖMER SI KỌỌ
“Nke a bụ ọnụ ụlọ unu.” Ọ bụ okwu ahụ ka e ji nabata mụ na onye e kenyekọrọ mụ na ya ọrụ na Gabon, n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Africa. E nwere nanị ohere nke ga-aba otu matarasị. Anyị biri n’ọnụ ụlọ ahụ ruo ọnwa isii.
NDỤ m dịrị n’ugbo n’oge Agha Ụwa nke Abụọ kwadebere m maka ibi ndụ n’ọnọdụ ndị tara akpụ. Mgbe agha ahụ dara n’afọ 1939, ndị Nazi Germany weghaara Poland ngwa ngwa. Adị m afọ anọ mgbe ahụ. Ndị mejupụtara ezinụlọ anyị bụ nne na nna m, nwanne m nwoke na nwanne m nwanyị ndị m tọrọ, na ụmụnne m ndị nwanyị abụọ tọrọ m. Nna m dọrọ anyị aka ná ntị ịdị njikere maka oge ndị tara akpụ ma ọ bụrụ na e merie Germany n’agha ahụ.
Anyị bi na Löwenstein, bụ́ otu obere ime ime obodo Germany nke dị na Lower Silesia, bụ́ nke dị na Poland ugbu a. N’ugbo anyị nke dị ihe dị ka hekta 25, anyị na-akọ mkpụrụ akụ́kụ́ ma na-akpakwa anụ. Nna m rụkwara ọrụ dị ka onyeisi ndị ọrụ ugbo nọ n’ógbè ahụ. Mgbe ndị Nazi weghaara Silesia, ha ji nna m mee ihe n’ịhazi ndị ọrụ ugbo maka ịkwado agha ahụ.
Nna m jere ozi n’usuu ndị agha na-agbagharị agbagharị n’oge Agha Ụwa Mbụ, ugbu a kwa, ọrụ gọọmenti ọ na-arụrụ ndị Nazi mere ka a ghara ịgwa ya gaa agha. Ọ dịwo anya nne na nna m hapụrụ chọọchị n’ihi na ihe ndị ụkọchukwu mere n’oge Agha Ụwa Mbụ gbarụrụ ha afọ. N’ihi ya, etolitere m n’enweghị mmasị ọ bụla n’okpukpe.
Amalitere m ịga akwụkwọ n’afọ 1941, ma akpọrọ m ya asị, echekwara m na e nwere ihe ndị ọzọ na-adọrọ mmasị karịa ịdị na-ekiri ụgbọ ojii. Ná mmalite afọ 1945, nanị ọnwa ole na ole tupu agha ahụ ebie, ndị Russia wakporo Breslau (nke bụ́ Wrocław ugbu a), isi obodo Lower Silesia. Otu uhuruchi Saturday, anyị nọ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ kilomita 50 hụ ka ọkụ nwuuru n’obodo ahụ n’ihi ogbunigwe na bọmbụ ndị e ji ụgbọelu tụọ na ya. N’oge na-adịghị anya, anyị gbagara n’ugwu. Mgbe agha ahụ biri, anyị laghachitere obodo anyị bụ́ Löwenstein.
Mgbe Agha ahụ Bisịrị
Oge ndị tara akpụ sochiri agha ahụ. E dinara ụmụ nwanyị n’ike, a nọkwa na-akwakọrọ ngwongwo ndị mmadụ kwa ụbọchị. E zuru ihe ka ọtụtụ n’ime anụ ụlọ anyị n’ohi.
E jidere nna m na July 1945. Mgbe a gbasịrị ya ajụjụ ọnụ ruo abalị asaa bụ́ nke a nọ na ya mekpọọ ya ọnụ, a tọhapụrụ ya. Ọnwa atọ mgbe e mesịrị, e jidere ya ọzọ ma kpụrụ ya pụọ. Anyị
ahụghịzi ya anya ọzọ mgbe nke ahụ gasịrị. Ụmụ nwoke abụọ bụ́ ndị Poland weghaara ugbo anyị ma zọrọ na ọ bụ nke ha. N’April 1946, a gwara ndị Germany nile nọ n’obodo nta ahụ ka ha were nanị ihe ha ga-ebunwu pụọ.Nne m adịla mbụ jikere maka nke a, obi ekoropụghịkwa ya. O nwere nnukwu nkata a na-akwagharị akwagharị bụ́ nke o tinyere ákwà ihe ndina, onye nke ọ bụla n’ime anyị bukwa akpa a na-anya n’azụ bụ́ ndị e tinyejuru ihe ndị dị anyị mkpa. Ndị agha Poland dubagasịrị anyị n’ụgbọ okporo ígwè ndị na-ebu ehi—mmadụ 30 n’ime otu ụgbọ. N’ihe dị ka izu abụọ mgbe e mesịrị, anyị ruru ebe anyị na-aga n’ebe ugwu ọdịda anyanwụ Germany, nke na-adịghị anya na Netherlands.
Gọọmenti nyere ezinụlọ anyị, gụnyere ndị ikwu anyị—anyị mmadụ 19—ọnụ ụlọ abụọ dị n’ugbo dị ihe dị ka kilomita 8 site na Quakenbrück. Ka oge na-aga, ụfọdụ n’ime ndị ikwu anyị nwetara ebe ndị ha ga-esoro ezinụlọ ndị ọzọ bụ́ ndị ọrụ ugbo nọrọ, ọnụ ụlọ ndị ahụ bịakwara batụ anyị.
Nne m chụrụ ọtụtụ ihe n’àjà maka anyị bụ́ ụmụaka, mgbe mgbe, ọ dịghị eri ihe iji mee ka anyị nwee ike iri. Anyị enweghị nkụ n’oge oyi nke mbụ anyị nọrọ n’ebe ahụ. Ọkpụrụkpụ ice kpuchisịrị ahụ́ nakwa uko ụlọ anyị, ime ụlọ anyị bịakwara yie ọgba ice. Ma ọ dabaara anyị na anyị nwere ihe ndina na-eme ka ahụ́ kpoo ọkụ, oyi atụgbughịkwa anyị.
Izute Ndịàmà
N’ihe dị ka n’afọ 1949, nne m nwetara otu Ụlọ Nche site n’aka nwunye nwanne ya. Otu isiokwu dị na ya chetaara ya na n’oge agha ahụ, ọ nụrụ ka Hitler si na redio na-akatọ ‘otu ìgwè mmadụ’ bụ́ ndị buru amụma banyere ọdịda Germany. Nne m anọwo na-eche banyere ndị ndị a bụ. Mgbe ọ gụtara n’Ụlọ Nche ahụ na ha bụ Ndịàmà Jehova, a kpaliri mmasị ya, o kpebikwara isoro ha mụọ Bible.
Otu ụbọchị, n’April 1954, ezutere m otu di na nwunye bụ́ Ndịàmà ka ha na-amụrụ nne m ihe. Mgbe ọmụmụ ihe ahụ gasịrị, anatara m akwụkwọ nta bụ́ Ì Puru Ibi Mgbe Ebigh-ebi n’Uwa n’Obi Utọ? natakwa ụtụ Ụlọ Nche. Mgbe m gụrụ akwụkwọ nta ahụ, abịara m kwenye na m achọtawo eziokwu ahụ. Ya mere, enyere m ya onye m na-arụrụ ọrụ ka ọ gụọ. Mgbe m jụrụ ya ihe o chere banyere ya, o kwuru, sị: “Ihe ndị e kwuru na ya dị nnọọ mma, ma ọ na-atọ nnọọ ụtọ ná ntị nke na ọ pụghị ịbụ eziokwu. Apụghị m nnọọ ikwere ya.”
“Eji m n’aka na nke a bụ eziokwu ahụ,” ka m gwara ya, “m ga-agbasokwa ya.” O fufere isi wee kwuo, sị: “Ozi a bụ maka onye dị nwayọọ. Ị dịgburu onwe gị n’aghara nke ịbịa bụrụ Onyeàmà.” Ma amalitere m ime mgbanwe ná ndụ m.
N’agbanyeghị na ọ dịghị Onyeàmà nọ n’ógbè ahụ, amụrụ m ihe n’onwe m ma jiri ịnyịnya ígwè na-agba ihe dị ka kilomita 10 aga nzukọ ha kwa izu. E mesịa, agara m mgbakọ sekit, bụ́ ebe ọtụtụ ọgbakọ Ndịàmà zukọrọ maka ofufe. Ọ bụ n’ebe ahụ ka m sooro ndị ọzọ mee nkwusa ihu ọha na nke mbụ ya. N’oge na-adịghị anya, anọ m na-emechi nke ahụ anya. Na July 14, 1954, e mere mụ na nne m baptizim. E mesịa, nne nne m ghọkwara Onyeàmà mgbe ọ dị afọ 80.
Ọrụ m na-arụ n’ugbo na-eri m oge dị ukwuu, n’ihi ya akwụsịrị m ya ma nweta ọrụ n’ụlọ ọrụ na-elekọta ọhịa ndị e chekwara echekwa. Mgbe nke ahụ gasịrị, ezinụlọ anyị kwagara na Reutlingen, bụ́ obodo nta dị nso na Stuttgart. Ọ bụ n’oge anyị nọ n’ebe ahụ ka nwanne m nwanyị nke m tọrọ, bụ́ Ingrid, ghọkwara Onyeàmà, bụ́ onye nanị ya ghọworo Onyeàmà n’ime ụmụnne m nile.
Ikwusa Ozi Ọma Oge Nile
N’afọ 1957, nne m mesịrị nwee ike inweta akwụkwọ ikike na-egosi na e werela nna m dị ka onye nwụrụ anwụ. N’ihi ya, ọ malitere ịnata ụgwọ a na-akwụ ndị di ha nwụrụ, bụ́ nke mere ka o nwee ike igbo mkpa ya n’achọghị enyemaka m n’ụzọ ego. Ebe ọ bụ na ebughịzi m ibu ezinụlọ dị otú ahụ, anaara m ọrụ m na-arụ oge ụfọdụ, n’April 1957 kwa, amalitere m ikwusa ozi ọma oge nile dị ka ọsụ ụzọ. E mesịa, a kpọrọ m ije ozi dị ka ọsụ ụzọ pụrụ iche. Mgbe otu Onyeàmà ibe m nụrụ banyere nke a, ọ kpọrọ m n’ọfịs ya ma kwuo, sị: “Eji m n’aka na ị ga-achọ enyemaka ụfọdụ.” O nyeziri m deutsche mark 500. Eji m ya zụọ uwe nile dị m mkpa, ya afọdụkwa deutsche mark 200.
N’afọ 1960, ewepụtara m onwe m ije ozi n’Austria, bụ́ ebe m nụrụ ụtọ ime nkwusa n’otu obodo
nta bụ́ Scheibbs, meekwa nkwusa obere oge n’obodo ukwu bụ́ Linz, ma ná ngwụsị afọ ahụ, enwere m ajọ ihe mberede ọgba tum tum, agbajikwara m ụkwụ aka nri m. Mgbe a wasịrị m ụkwụ ọtụtụ ugboro, abịara m nwee ike ịga n’ihu n’ọrụ e kenyere m. Otú ọ dị, n’afọ 1962, alaghachiri m obodo m bụ́ Reutlingen iji hụ maka nsogbu ụfọdụ m nwere n’akwụkwọ ikike m maka ịkwaga ala ọzọ. Ka m nọ n’ebe ahụ, a wara m ụkwụ ọzọ iji wepụ otu ígwè e tinyere m n’ụkwụ. Akwụsịrị m ịsụ ụzọ ruo ọnwa isii iji nweta ego iji hụ maka ụgwọ ụlọ ọgwụ.Mgbe otu onye nlekọta na-ejegharị ejegharị letara ọgbakọ ebe m nọ na-eje ozi, ọ tụrụ aro ka m tinye akwụkwọ maka ije ozi n’alaka ụlọ ọrụ nke Ndịàmà, nke dị na Wiesbaden, Germany, n’oge ahụ. Emere m otú ahụ, izu abụọ mgbe e mesịkwara, enwetara m teligram nke gwara m ka m bịa ngwa ngwa o kwere mee. Otu izu mgbe nke ahụ gasịrị, na May 1963, anọ m n’alaka ụlọ ọrụ Germany, nke a na-akpọ Betel, na-ebipụta magazin n’otu ígwè ọrụ rotary.
Etinyere M Mgbalị Iji Mụta Ihe
Betel bụ ebe kasị mma m bitụrụla, ọrụ a na-arụsi ike n’ebe ahụ bịara mara m ahụ́ ngwa ngwa. N’afọ 1965, agara m nleta na Spen, zoro ezo webaa akwụkwọ e ji amụ Bible na ya, ebe ọ bụ na a machibidoro ọrụ nkwusa iwu n’ebe ahụ n’oge ahụ. Nleta ahụ mere ka m chọọ ịmụ asụsụ ọzọ, ahọkwaara m asụsụ Bekee. Eji m ohere ọ bụla dapụtaranụ mụọ ihe. N’ihe dị ka n’oge a, e guzobere ìgwè mbụ na-eji asụsụ Bekee eme ihe na Germany, esonyekwara m ha. Mgbe mbụ m mụrụ isiokwu dịịrị ọmụmụ n’Ụlọ Nche n’asụsụ Bekee, o were m awa asaa. Mgbe o were m nanị awa ise n’oge nke abụọ, amatara m na m nahụ enwe ọganihu.
N’afọ 1966, a kpọrọ m ịga klas nke 43 nke Gilead, bụ́ ụlọ akwụkwọ dị na United States nke e guzobere iji na-enye ndị ozi nke Ndịàmà Jehova ọzụzụ maka ozi ala ọzọ. Mgbe m gụsịrị akwụkwọ na Gilead, e kenyere mụ na Gunther Reschke ọrụ na Gabon, n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Africa, n’April 1967. Mgbe anyị ruru Libreville, bụ́ isi obodo Gabon, anyị biri n’obere ọnụ ụlọ ahụ m kọwara ná mmalite, na-ekowe uwe anyị n’ọnụ ụlọ iri ihe. Ọnwa isii mgbe e mesịrị, anyị kwagara n’ebe obibi ọzọ nke ndị ozi ala ọzọ.
Na Gabon, ihe kasị taa m akpụ bụ ịmụ asụsụ French. N’ikpeazụ, mgbe m tinyesịrị mgbalị siri ike, amụtara m ya ruo n’ókè ụfọdụ. E mesịa, n’afọ 1970, a machibidoro ọrụ nkwusa anyị iwu na Gabon na mberede, e nyekwara anyị bụ́ ndị ozi ala ọzọ izu abụọ ịhapụ mba ahụ.
Ịga Central African Republic
E kenyere mụ na ndị ozi ala ọzọ ndị ọzọ ọrụ na Central African Republic. French bụ asụsụ bụ́ isi a na-asụ ná mba ahụ, ma anyị mụrụ asụsụ Sango iji nwee ike ikwusara ọnụ ọgụgụ ka ukwuu ozi ọma. E zigara anyị ịga mepee otu ebe obibi ndị ozi ala ọzọ n’obodo Bambari, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ kilomita 300 site n’isi obodo, bụ́ Bangui. Bambari enweghị ma ọkụ eletrik ma mmiri pọmpụ, ma enyemaka anyị dị ọgbakọ abụọ dị n’ebe ahụ mkpa. Ahụmahụ ndị
m nwere n’oge agha na Europe mere ka ọ dịrị m nnọọ mfe karị ịnagide ọnọdụ ibi ndụ e nwere na Bambari, nakwa n’ebe ndị ọzọ sochirinụ.Mgbe m jesịrị ozi ruo afọ abụọ na Bambari, e kenyere m ọrụ ileta ọgbakọ dị iche iche dị ka onye nlekọta na-ejegharị ejegharị. E nwere ihe dị ka ọgbakọ 40 ná mba ahụ, m na-ejikwa otu izu eleta ọgbakọ nke ọ bụla so ná ndị e kenyere m. Enwere m obere ụgbọala, ma mgbe ụzọ ndị a na-eteghị korota bịara mebie nke ukwuu, ana m eji ụgbọ njem ọha na eze eme ihe.
Ná mba ahụ nile, ọ bụ nanị na Bangui ka a pụrụ ịrụzi ụgbọala. Ebe ọ bụ na ozi m chọrọ na m ga na-eme njem nke ukwuu, azụtara m akwụkwọ ụfọdụ na-akọwa otú e si arụzi ụgbọala, nweta ngwá ọrụ ụfọdụ, ma na-arụzi ụgbọala m n’onwe m n’oge ka ọtụtụ. N’otu oge, ihe na-ejide okporo ígwè nke na-atụgharị taya ụgbọala m gbakara, ụgbọala ahụ enweghịkwa ike ịgba ọzọ. Anọ m ihe dị ka kilomita 60 site n’ebe ndị mmadụ bi, ya mere egbutere m osisi siri ike n’oké ọhịa ahụ ma pịa ya otú ọ ga-esi nwee ike ịrụ ihe ihe ahụ gbakaranụ na-arụ. N’ite ya mmanụ griiz nke ọma, eji m waya kegide ya n’okporo ígwè ahụ na-atụgharị taya wee nwee ike ịga n’ihu na njem m na-eme.
Ije ozi n’ime ọhịa, ma ọ bụ n’ime ime obodo, bụụrụ m ihe ịma aka karịsịa n’ihi na ndị pụrụ ịgụ na ide ihe na-adịkarị ole na ole. N’otu ọgbakọ, ọ bụ nanị otu onye pụrụ ịgụ ihe, o nwekwara nsogbu ikwu okwu. Ihe ọmụmụ dị n’Ụlọ Nche na-esikarị ike, ma, ọ bụ ihe na-ewusi okwukwe ike ịhụ ka ọgbakọ ahụ ji ezi obi na-agbalị ịghọta isi ihe a na-atụle.
Mgbe e mesịrị, ajụrụ m ìgwè ahụ otú ha si erite uru n’ihe ọmụmụ ha na-apụghị ịghọtacha. Ihe ha zara magburu onwe ya: “Anyị na-enweta agbamume site n’aka ibe anyị.”—Ndị Hibru 10:23-25.
N’agbanyeghị na ọtụtụ n’ime ụmụnna m Ndị Kraịst amaghị akwụkwọ, ha kụziiri m ọtụtụ ihe banyere ndụ. Abịara m ghọta abamuru nke ndụmọdụ Akwụkwọ Nsọ ahụ bụ́, “na-ewere na ndị ọzọ ka unu.” (Ndị Filipaị 2:3) Ụmụnna m ndị Africa kụziiri m ihe dị ukwuu banyere ịhụnanya, obiọma, na ile ọbịa nakwa ụzọ e si ebi ndụ n’ime ọhịa. Okwu Nwanna Nathan Knorr, bụ́ onyeisi oche nke ụlọ akwụkwọ Gilead n’oge ahụ, ji sị anyị gaa nke ọma n’ụbọchị anyị na-agụsị akwụkwọ, bịara dokwuo m anya karị. O kwuru, sị: “Nọgidenụ na-adị umeala n’obi, ka anyị ghara iche ma ọlị na anyị maara ihe nile. Anyị amaghị ihe nile. Anyị nwere nnọọ ọtụtụ ihe anyị ka ga-amụta.”
Ibi Ndụ n’Ime Ime Obodo Africa
Eso m ụmụnna ndị bi n’ógbè ahụ na-ebi ka m na-esi n’otu ọgbakọ aga n’ọzọ. Dị ka ọ na-adịkarị, izu m ga-eleta na-eyi nnọọ ka ememe, karịsịa nye ụmụaka. Nke a bụ n’ihi na ọgbakọ nke m na-eleta na-aga ịchụ nta ma ọ bụ igbu azụ̀ ma mee mgbalị pụrụ iche inweta ihe oriri dị ukwuu maka mmadụ nile.
Ebe ọ bụ na m na-eso ụmụnna ebi n’obere ụlọ ha, ọ dịghị ihe m na-erighị malite n’àkị́kà ruo n’anụ enyí. Anyị na-ata anụ enwe mgbe nile. Ezì ọhịa na ebi ogwu na-atọ ụtọ karịsịa. N’ezie, ụbọchị nile adịghị abụ oriri. Na mbụ, o were oge ka nri ndị a mara m ahụ́, ma mgbe ọ bịara mara m ahụ́, afọ m bịara nwee ike ịgbari ihe ọ bụla e nyere m. Amụtara m na ịrakọta pọpọ na mkpụrụ ya na-adị mma n’afọ.
Ụdị ihe dị iche iche a na-atụghị anya ha pụrụ ime n’ime ime obodo. N’otu oge, e weere na m bụ mamị wọta, bụ́ nke a sịrị na ọ bụ mmụọ na-acha
ọcha nke onye nwụrụ anwụ nke bi n’ime mmiri. Ndị mmadụ kweere na ọ pụrụ ịdọtu mmadụ ala ma mee ka mmiri rie onye ahụ. Ya mere, n’otu oge m si na mmiri na-arịgopụta mgbe m sachara ahụ́, otu nwa agbọghọ nke bịara ikuru mmiri hụrụ m gbawa ọsọ, na-eti mkpu. Mgbe Onyeàmà ibe m nwara ịkọwa na m bụ onye nkwusa si esi bịa, na m abụghị mmụọ, ndị mmadụ ekwetaghị. Ha rụrụ ụka, sị, “Nwa Bekee agatụghị abịa n’ime ọhịa ebe a.”Mgbe mgbe, ana m ehi ụra n’èzí n’ihi na ikuku na-ajụ oyi n’ebe ahụ. M na-ebukarị ụgbụ anwụnta aga, ebe ọ bụ na ọ na-echebekwa m pụọ n’ebe agwọ, akpị, òké, na ihe ndị ọzọ nọ. Ọtụtụ oge, ijere kpụzuru ebe m dina, ọ bụkwa ụgbụ anwụnta ahụ chebere m. Otu abalị, agbara m tọọchị m n’ụgbụ ahụ ma hụ na ijere akpụzuola ya. Etikapụru m ọsọ n’egbughị oge n’ihi na, n’agbanyeghị na ijere ndị ahụ dị obere, ha pụrụ igbu ọbụna ọdụm.
Mgbe m nọ n’ebe ndịda nke Central African Republic, na nso Osimiri Congo, ekwusaara m Ndị Akakpọ ozi ọma, bụ́ ndị na-adabere n’ala iji kpata afọ ha. Ha bụ ọkà n’ịchụ nta, ha makwaara ihe mmadụ pụrụ iri na ihe ndị ọ na-apụghị iri. Ụfọdụ n’ime ha na-asụ asụsụ Sango, ha nwekwara obi ụtọ ige ntị. Ha ga-ekweta ka a bịa letaghachi ha, ma anyị bịaghachi, anyị na-achọpụta na ha akwagawo ebe ọzọ. Ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ha ghọrọ Onyeàmà n’oge ahụ, ma emesịrị m nụ na ụfọdụ Ndị Akakpọ ghọrọ Ndịàmà na Republic of Congo.
Ruo afọ ise, ejere m ozi dị ka onye nlekọta sekit na Central African Republic. Emere m njem gaa akụkụ nile nke mba ahụ, na-eletakarị ọgbakọ ndị dị n’ime ime obodo.
Ije Ozi n’Alaka Ụlọ Ọrụ Nigeria
Na May 1977, a kpọrọ m ije ozi n’alaka ụlọ ọrụ nke Ndịàmà Jehova dị na Lagos, Nigeria. Mba a nke nwere ọnụ ọgụgụ mmadụ karịa mba ndị ọzọ n’Africa nwere ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 100,000 Ndịàmà n’oge ahụ, ihe dịkwa ka mmadụ 80 nọ na-eje ozi n’alaka ahụ. E kenyere m ọrụ n’ebe a na-arụzi ụgbọala.
N’afọ 1979, alaghachiri m n’ọrụ ugbo, bụ́ ọrụ m rụworo n’oge m bụ okorobịa na Europe. Ugbo ahụ, bụ́ nke a na-akọ nri maka ndị na-arụ ọrụ n’alaka ahụ, dị n’Ilaro, ihe dị ka kilomita 80 site na Lagos. Ọ bụ n’ebe ahụ ka m matara na ịkọ ugbo n’oké ọhịa dị n’ebe mmiri na-ezokarị dị iche n’ịkọ ugbo na Europe. Mgbe m rụsịrị ọrụ n’ebe ahụ ruo afọ atọ na ọkara, alaghachiri m Lagos ma maliteghachi ịrụ ọrụ n’ebe a na-arụzi ụgbọala.
N’afọ 1986, e zigara m n’Igieduma, ihe dị ka kilomita 360 site na Lagos, bụ́ ebe a nọ na-arụ nnukwu alaka ụlọ ọrụ ọhụrụ. A raara alaka a nye na January 1990. Ọ na-agụnye ebe obibi akwụkwọ, obere ugbo, na ebe obibi nke ihe karịrị mmadụ 500 bi na ya. Ha dị n’ala dị hekta 60 nke e ji mgbidi fọrọ nke nta ka o ruo mita abụọ n’ịdị elu gbaa ogige. Ka ọ dị ugbu a, ana m elekọta ọrụ n’ugbo nakwa ná ngalaba na-edozi gburugburu alaka ahụ, bụ́ nke ndị ọrụ dị mmadụ 35 na-elekọta.
Ebiwo m na Nigeria ugbu a ruo ihe dị ka afọ 27, anụwokwa m ụtọ ọrụ dị iche iche ndị m rụworo n’alaka ahụ. Obi dị m ụtọ na nne m anọgidewo na-ekwesị ntụkwasị obi nye Jehova, nakwa na nwanne m nwanyị nke m tọrọ, bụ́ Ingrid, bụ́ onye jere ozi ruo afọ 14 dị ka ọsụ ụzọ pụrụ iche, ka nọgidere na-ejere Jehova ozi, ya na di ya.
N’agbanyeghị ihe ịma aka ndị m cheworo ihu, n’ezie anụwo m ụtọ ozi m jeere Jehova na ụmụnna ime mmụọ m n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Africa. Enwere m ekele maka ahụ́ ike m nweworo ruo ugbu a, m na-ekpekwa ekpere ka m nọgide na-enwe ahụ́ ike iji nọgide na-ejere Chineke ukwu anyị, bụ́ Jehova, ozi n’ụzọ zuru ezu.
[Map dị na peeji 15]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
Nigeria
Central African Republic
Gabon
[Ebe E Si Nweta Foto]
Mountain High Maps® Copyright © 1997 Digital Wisdom, Inc.
[Foto dị na peeji nke 12]
Ka mụ na nne m, bụ́ Gertrud, na nwanne m nwanyị bụ́ Ingrid nọ n’afọ 1939
[Foto dị na peeji nke 14]
Mgbe m na-eje ozi dị ka onye ozi ala ọzọ na Gabon
[Foto dị na peeji nke 14]
Ka m nọ na Central African Republic, anọrọ m n’ime ime obodo ndị dị ka nke a