Mkpu A Na-eti Maka Mgbanwe
Mkpu A Na-eti Maka Mgbanwe
SITE N’AKA ONYE EDEMEDE TETA! NA GERMANY
“A sị na emebeghị m agadi, aga m eguzobe òtù maka mgbanwe!” ka Anna, bụ́ nwanyị dị afọ 80 na Germany ji oké olu kwuo. “Gịnị ka unu ga-agbanwe?” ka Robert jụrụ ya. “Ihe nile!” ka Anna zara.
ỌTỤTỤ mmadụ ga-ekwenyere Anna. Njụta echiche e mere na Germany n’etiti afọ ndị 1990 gosiri na mmadụ 2 n’ime mmadụ 3 ọ bụla a jụtara echiche ha, chere na ọ dị mkpa ime ‘mgbanwe ndị sara mbara na ndị dị mkpa n’etiti ọha mmadụ.’ Ikekwe, otú ahụ ka ọ dị ná mba i bi na ya.
Mgbe ọha na eze na-eti mkpu ka e mee mgbanwe, a na-ekwekarị ha nkwa na ihe ga-agbanwe. Banyere mgbanwe a na-eme n’agụmakwụkwọ, * Anyị na-agụkwa na ndị òtù chọọchị ụfọdụ na-eti mkpu ka e mee mgbanwe banyere nkwenkwe.
Frederick Hess, bụ́ onye inyeaka nke prọfesọ na-ahụ maka agụmakwụkwọ na ọchịchị, dere, sị: “Mgbanwe na-abụkarị mgbalị na-esighị n’obi a na-eme iji mee ka obi dajụtụ ógbè ndị na-adịghị enwe ndidi.” Anyị na-agụ isi akụkọ ndị gbara n’akwụkwọ akụkọ, bụ́ ndị na-ama ọkwa banyere atụmatụ ndị a na-eme iweta mgbanwe n’ihe banyere ụtụ isi, n’usoro ahụ́ ike, n’ọrụ ugbo, nakwa n’usoro iwu. Anyị na-anụ ka a na-ekwu na a ga-eme mgbanwe n’usoro agụmakwụkwọ, usoro ahụ́ ike, nakwa n’usoro inye ntaramahụhụ.Ịgbanwe Ihe Ka Ọ̀ Bụ Ịhapụ Ya Otú Ọ Dị?
Gịnị na-eme ka e tiwe mkpu dị otú ahụ maka mgbanwe? Ụmụ mmadụ na-anwa mgbe nile imeziwanye ụwa ha bi na ya. Ha anwawo ime nke ahụ site n’ime ntụli aka, site n’imefu ego, site n’iti iwu, ma ọ bụ site n’ịlụrụ ya ọgụ. Nke a bụ n’ihi ọchịchọ siri ike ụmụ mmadụ na-enwe ime ka ọnọdụ ha ná ndụ ka mma, ịkwadebere ụmụ ha ọdịnihu ka mma, ma ọ bụ ime ka ọnọdụ ọha mmadụ kwekọọ n’ihe ndị ha chere kasị mma banyere ọdịmma, omume, na ikpe ziri ezi. Ọ bụrụhaala na e nwere ndị na-adọga ịgbanahụ ọnọdụ ọjọọ nke amaghị nke a na-akọ, ọrịa, ịda ogbenye, na agụụ na-akpata, a ga na-eti mkpu maka mgbanwe.
Ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị na-akwado ka e mee mgbanwe, ndị ọzọ na-enwe echiche dị iche banyere ndị na-eti mkpu maka mgbanwe na ihe ha na-anwa ịrụzu. Ụfọdụ ndị na-ahọrọ ka a hapụ ọnọdụ ọha mmadụ otú ọ dị. Ha na-ewere ndị na-eme mgbanwe dị ka ndị na-echepụta ihe na-agaghị ekwe omume, ndị chọrọ ịgbanwe ụwa ma bụrụ ndị na-amaghịzi ihe ndị na-eme eme n’ezie. Akwụkwọ bụ́ Handbuch der deutschen Reformbewegungen 1880-1933 (Akwụkwọ Ntụziaka nke Òtù Ndị Na-ahụ Maka Mgbanwe na Germany 1880-1933) na-ekwu na ndị na-eti mkpu maka mgbanwe “bụ ndị a na-akatọkarị, ndị a na-esekarị n’ihe osise ndị metụtara ọchịchị bụ́ ndị e ji akpa ndị mmadụ ọchị, na ndị a na-emekarị akaje.” Onye France na-ede egwuregwu bụ́ Molière kwuru n’otu oge, sị: “N’ime echiche nzuzu nile e nwere, ọ dịghị nke karịrị ịchọ ime ka ụwa bụrụ ebe ka mma.”
Gịnị ka i chere? Mgbanwe ọ̀ pụrụ ime ka ụwa ka mma? Ka ndị na-eti mkpu maka mgbanwe hà bụ ndị na-arọ nrọ na-enweghị isi? Gịnị banyere mgbanwe ndị e mere n’oge ndị gara aga? Ndị mere mgbanwe ndị ahụ hà enwetawo ihe ha bu n’obi mee ha? Isiokwu ndị na-esonụ ga-atụle ihe ndị a.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 5 N’ụzọ kwekọrọ n’ihe e kwuru bụ́ nzube ya, Teta! “[adịghị] mgbe ọ na-etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị.” Ihe e bu n’uche wee na-atụle isiokwu ndị a metụtara mgbanwe bụ iji mee ka ndị na-agụ akwụkwọ anyị mara banyere ya nakwa iji gosi nanị ezigbo ihe ngwọta e nwere maka mkpa ụmụ mmadụ.