Anakweere M Echiche Chineke Banyere Ọbara
Anakweere M Echiche Chineke Banyere Ọbara
Otu Dibịa Bekee Akọọ Ije Ya
ANỌ m n’ụlọ ezumezu nke ụlọ ọgwụ m na-arụ na ya, na-akọrọ ìgwè ndị dọkịta, n’ụzọ dị mkpirikpi, banyere nchọpụta e mere iji mara ihe gburu otu onye ọrịa. Onye ọrịa ahụ nwụrụnụ nwere akpụ na-ebibi ihe, ekwukwara m, sị, “Anyị pụrụ ikwubi na ihe gburu onye ọrịa a bụ hemolysis [mbibi nke mkpụrụ ndụ ọbara uhie] na nsogbu dị oké njọ nke akụrụ arụghị ọrụ nke ọma, bụ́ nke nnukwu ọbara a mịnyere ya kpatara.”
Otu prọfesọ biliri ọtọ ma jiri iwe kwuo n’oké olu, sị, “Ihe ị na-ekwu ọ̀ bụ na anyị mịnyere ya ọbara na-adịghị mma?” Azara m, sị, “Ọ bụghị ihe m na-ekwu.” N’igosi ha ihe nkiri slide ụfọdụ ndị na-egosi akụkụ ndị pere mpe nke akụrụ onye ọrịa ahụ, ekwukwara m, sị, “Anyị pụrụ ịhụ na ọtụtụ mkpụrụ ndụ ọbara uhie ndị dị n’akụrụ ya ebibiwo, anyị pụkwara ikwubi na nke a mere ka akụrụ ya kwụsị ịrụ ọrụ.” * Ọgba aghara dara, ekwulighịzi m okwu. Ọ bụ ezie na m bụ dọkịta nke ka malitere ọrụ amalite, ya onwe ya abụrụ prọfesọ, ekpebiri m na apụghị m ikwu ihe dị iche na nke m kwurula ekwu.
Mgbe ihe a mere, abụghị m otu n’ime Ndịàmà Jehova. A mụrụ m n’afọ 1943 na Sendai, bụ́ obodo dị n’ebe ugwu Japan. Ebe ọ bụ na nna m abụwo ọkà n’ịkọwa ihe banyere ọrịa, bụrụkwa dibịa na-agwọ ọrịa uche, ekpebiri m ịmụ nkà ọgwụ.
N’afọ 1970, bụ́ mgbe m nọ n’afọ nke abụọ m n’ụlọ akwụkwọ nkà mmụta ọgwụ, alụrụ m otu nwa agbọghọ aha ya bụ Masuko.Ịmụ Ihe Banyere Ọrịa
Masuko rụrụ ọrụ iji nye aka na-akwado anyị tupu m gụsịa akwụkwọ. Nkà mmụta ọgwụ masịrị m nke ukwuu. Otú e si kee ahụ́ mmadụ nke ọma wụrụ m ibobo n’ahụ́! N’agbanyeghị nke ahụ, echetụbeghị m echiche banyere ịdị adị nke Onye Okike. Echere m na ime nnyocha n’ihe banyere ọgwụ pụrụ ime ka ndụ m nwee nzube. Ya mere, mgbe m ghọsịrị dibịa Bekee, ahọọrọ m ịga n’ihu na nkà mmụta ọgwụ site n’ịmụ banyere ọrịa—ịmụ banyere ihe ndị e ji mara ọrịa, ihe ndị na-akpata ya, na mmetụta ndị ọ na-enwe.
Ka m na-eme nnyocha iji mara kpọmkwem ihe gburu ndị ọrịa bụ́ ndị nwụrụ n’ọrịa cancer, amalitere m inwe obi abụọ banyere uru mmịnye ọbara bara. Ọbara pụrụ ịkọ ndị na-arịa ọrịa cancer ọjọọ n’ahụ́ n’ihi ọbara gbapụrụ ha n’ahụ́. Ebe ọ bụ na iji ọgwụ agwọ ọrịa na-emekwu ka ọbara kọọ onye ọrịa n’ahụ́, ndị dọkịta na-ekwukarị ka a mịnye ya ọbara. Otú ọ dị, abịara m na-enwe obi abụọ ma mmịnye ọbara ọ̀ pụrụ nanị ime ka ọrịa cancer ahụ ka njọ. Otú o sina dị, taa, a maara na mmịnye ọbara na-ebelata ikike nke usoro ahụ́ ji alụso ọrịa ọgụ, bụ́ nke pụrụ ime ka akpụ toghachi mmadụ n’ahụ́ ma na-ebelata ọ̀tụ̀tụ̀ ndị mmadụ ji agbake n’ọrịa cancer. *
Ọ bụ n’afọ 1975 ka okwu ahụ m kọrọ banyere ya n’elu dara. Ọ bụ prọfesọ ahụ ka onye ọrịa ahụ nọ n’aka, ọ bụkwa ọkachamara n’ihe banyere ọbara. Ya mere, ọ bụghị ihe ijuanya na iwe were ya mgbe ọ nụrụ ka m kwuru na onye ọrịa ahụ nwụrụ n’ihi ọbara a mịnyere ya! Otú ọ dị, agara m n’ihu n’okwu m, obi jikwa nwayọọ nwayọọ dajụọ ya.
Ọrịa Ma Ọ Bụ Ọnwụ Agaghị Adị
Ọ bụ ihe dị ka n’oge ahụ ka otu agadi nwanyị bụ́ otu n’ime Ndịàmà Jehova kpọtụụrụ nwunye m. O ji okwu ahụ bụ́ “Jehova” mee ihe n’okwu ya, nwunye m jụkwara ya ihe ọ pụtara. Onyeàmà ahụ zara, sị, “Jehova bụ aha ezi Chineke ahụ.” Masuko anọwo na-agụ Bible kemgbe ọ bụ nwata, ma e jiriwo okwu bụ́ “ONYENWE ANYỊ” dochie aha Chineke n’ime Bible ọ nọ na-agụ. Ọ matala ugbu a na Chineke bụ onye nwere aha!
Masuko malitere ozugbo iso Onyeàmà ahụ merela agadi na-amụ Bible. Mgbe m si ụlọ ọgwụ lọta n’ihe dị ka elekere 1:00 nke ụtụtụ, nwunye m ji aṅụrị gwa m, sị, “E kwuru n’ime Bible na a gaje iwepụ ọrịa na ọnwụ!” Azara m, sị, “Nke ahụ ga-amagbu onwe ya!” Ọ gara n’ihu ikwu, sị, “Ebe ọ bụ na ụwa ọhụrụ ga-abịa n’oge na-adịghị anya, achọghị m ka ị laa oge gị n’iyi.” Ihe m ghọtara n’okwu ya bụ na ọ chọrọ ka m kwụsị ịbụ dọkịta, n’ihi ya, ewere m iwe, mụ na ya bịakwara sewe okwu.
Otú ọ dị, nwunye m adaghị mbà. O ji ekpere chọọ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị kwesịrị ekwesị ma gosi m ha. Okwu ndị dị n’Eklisiastis 2:22, 23 kasị ruo m n’obi: “Gịnị ka mmadụ nwere ná ndọgbu nile ọ na-adọgbu onwe ya n’ọrụ, na n’ime nchegbu nke obi ya, nke ya onwe ya na-adọgbu onwe ya n’ọrụ n’ime ya n’okpuru anyanwụ? . . . N’abalị obi ya edinaghị ịrahụ ụra. Nke a bụkwa ihe efu.” Nke a metụtara ihe m nọ na-eme—itinye onwe m na nkà mmụta ọgwụ ehihie na abalị n’enwetaghị ezi afọ ojuju.
Otu ụtụtụ Sunday na July 1975, mgbe nwunye m gawara Ụlọ Nzukọ Alaeze
nke Ndịàmà Jehova, ekpebiri m na mberede ịgakwu. Ọ tụrụ nwunye m nnọọ n’anya ịhụ m ebe ahụ, Ndịàmà nabatakwara m nke ọma. Site n’oge ahụ gawa, anọgidere m na-aga nzukọ Sunday nile. Ihe dị ka otu ọnwa ka e mesịrị, otu Onyeàmà malitere iduziri m ọmụmụ Bible. Ọnwa atọ Ndịàmà Jehova letasịrị nwunye m na nke mbụ ya, e mere ya baptizim.Ịnakwere Echiche Chineke Banyere Ọbara
N’oge na-adịghị anya, amụtara m na Bible na-agwa Ndị Kraịst ka ha ‘zere ọbara.’ (Ọrụ 15:28, 29; Jenesis 9:4) Ebe ọ bụ na adịla m mbụ na-enwe obi abụọ banyere uru mmịnye ọbara bara, o sighịrị m ike ịnakwere echiche Chineke banyere ọbara. * Echere m echiche, sị, ‘Ọ bụrụ na e nwere Onye Okike, nke a abụrụkwa ihe o kwuru, ọ bụ ya bụ na ihe ahụ o kwuru aghaghị ịbụ eziokwu.’
Amụtakwara m na ihe na-akpata ọrịa na ọnwụ bụ mmehie Adam. (Ndị Rom 5:12) N’oge ahụ, anọ m na-eme nnyocha banyere ọrịa mgbasi akwara. Ka anyị na-emekwu okenye, akwara anyị na-esiwanye ike ma na-akpachi akpachi, na-akpata ọrịa ndị dị ka ọrịa obi, ọrịa ụbụrụ, na ọrịa akụrụ. Ọ bụ ihe ezi uche dị na ya na ọ bụ ezughị okè e ketara eketa na-akpata ya. Mgbe nke ahụ gasịrị, ịnụ ọkụ n’obi m nwere na nkà mmụta ọgwụ malitere ịjụ oyi. Ọ bụ nanị Jehova Chineke pụrụ ikpochapụ ọrịa na ọnwụ!
Na March 1976, ọnwa asaa mgbe m malitesịrị ọmụmụ Bible m, akwụsịrị m ihe ọmụmụ m na-amụ n’ụlọ ọgwụ nke mahadum. Ụjọ tụrụ m na agaghịzi m enwe ike ịrụ ọrụ dị ka dibịa Bekee, ma achọtara m ọrụ n’ụlọ ọgwụ ọzọ. E mere m baptizim na May 1976. Ekpebiri m na ụzọ kasị mma isi bie ndụ m ga-abụ site n’ije ozi dị ka onye nkwusa ozi ọma oge nile, ma ọ bụ ọsụ ụzọ, bụ́ nke m malitere na July 1977.
Ịgbachitere Echiche Chineke Banyere Ọbara
Na November 1979, mụ na Masuko gafere n’otu ọgbakọ dị n’Ógbè Chiba, bụ́ ebe e nwere mkpa dị ukwuu maka ndị nkwusa. Achọtara m ụlọ ọgwụ m pụrụ ịrụ ọrụ nwa oge na ya. N’ụbọchị mbụ m rụrụ ọrụ n’ụlọ ọgwụ ahụ, otu ìgwè ndị dọkịta na-awa ahụ́ gbara m gburugburu. Ha jụrụ m n’esepụghị ọnụ, sị, “Dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova, gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na a kpọta onye ọrịa nke ọ dị mkpa ka a mịnye ọbara?”
Eji m nkwanye ùgwù kọwaara ha na aga m agbaso ihe Chineke kwuru banyere ọbara. Akọwaara m ha na e nwere ihe ndị a pụrụ iji dochie anya mmịnye ọbara nakwa na m ga-eme ihe nile m pụrụ ime iji nyere ndị ọrịa aka. Mgbe anyị kparịtasịrị ụka ruo ihe dị ka otu awa, onyeisi ndị dọkịta ahụ na-awa ahụ zara, sị, “Aghọtara m ihe ị na-ekwu. Ma ọ bụrụ na a kpọta onye ọrịa nke ọbara gwụrụ n’ahụ́, anyị ga-eji aka anyị lebara ọnọdụ ya anya.” A maara onyeisi ndị dọkịta ahụ na-awa ahụ́ dị ka onye siri ike ná mmadụ, ma mgbe anyị nwesịrị mkparịta ụka ahụ, mụ na ya bịara dị ná mma, ọ nọgidekwara na-akwanyere nkwenkwe m ùgwù.
E Tinye Nkwanye Ùgwù Maka Ọbara n’Ule
Mgbe anyị nọ na-eje ozi na Chiba, a nọ na-ewu isi ụlọ ọrụ ọhụrụ nke Ndịàmà Jehova nọ na Japan n’Ebina. Mụ na nwunye m na-eji ụgbọala aga ebe ahụ otu ugboro n’izu iji lebara ahụ́ ike nke Ndịàmà na-arụ ọrụ afọ ofufo n’iwu ihe owuwu a, bụ́ nke a na-akpọ Betel, anya. Mgbe ọnwa ole na ole gasịrị, anyị nwetara akwụkwọ ịkpọ òkù maka ije ozi oge nile na Betel dị n’Ebina. N’ihi ya, na March 1981, anyị malitere ibi n’ụlọ ga-adịru nwa oge bụ́ ndị a rụrụ maka ihe karịrị ndị ọrụ afọ ofufo 500. N’ụtụtụ, ana m enye aka edebe ebe ndị a na-asa ahụ́ na ụlọ mposi ndị dị n’ebe ahụ a na-ewu ihe owuwu ọcha, n’ehihie kwa, ana m ele ndị mmadụ ahụ́.
Otu n’ime ndị ọrịa m na-agwọ bụ Ilma Iszlaub, bụ́ onye si Australia bịa Japan dị ka onye ozi ala ọzọ na 1949. Ọ na-arịa leukemia, ndị dọkịta gwakwara ya na ndụ ya fọdụrụ nanị ọnwa ole na ole. Ilma jụrụ ịnara mmịnye ọbara iji gbatịkwuo ndụ ya, ọ họkwaara ibitọpụ ụbọchị ndụ ya fọdụrụnụ na Betel. N’oge ahụ, e nwebeghị ọgwụ ndị na-eme ka ahụ́ na-emepụtakwu mkpụrụ ndụ ọbara uhie, dị ka erythropoietin. Ya mere, mgbe ụfọdụ, ọ̀tụ̀tụ̀ hemoglobin ya na-agbadatarucha gram 3 ma ọ bụ 4! (Nke dị otú o kwesịrị bụ gram 12 ruo 15.) Ma emere m ike m iji gwọọ ya. Ilma nọgidere na-egosipụta okwukwe siri ike o nwere n’Okwu Chineke ruo mgbe ọ nwụrụ na January 1988—ihe dị ka afọ asaa mgbe e mesịrị!
N’ime afọ ndị gafeworonụ, ọ dịwo mkpa ịwa ọtụtụ ndị ọrụ afọ ofufo nọ n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Japan ahụ́. N’ụzọ kwesịrị ịja mma, ndị dọkịta nọ n’ụlọ ọgwụ ndị dị nso ekwenyewo ịwa ha ahụ́ n’ejighị ọbara. A kpọwo m mgbe mgbe ka m nọrọ n’ọnụ ụlọ a na-anọ awa ahụ́ iji hụ ụzọ ha si eme ya, mgbe ụfọdụkwa, ọbụna enyewo m aka n’ịwa ahụ́. Enwere m ekele n’ebe ndị dọkịta ahụ nọ bụ́ ndị na-egosi nkwanye ùgwù maka nguzo Ndịàmà Jehova na-ewere maka ọbara. Iso ha na-arụkọ ọrụ emewo ka m nwee ọtụtụ ohere nke iso ndị ọzọ kerịta ihe ndị m kweere. Otu n’ime ndị dọkịta ahụ ghọrọ Onyeàmà e mere baptizim n’oge na-adịbeghị anya.
N’ụzọ na-akpali mmasị, mgbalị ndị dọkịta na-eme iji gwọọ Ndịàmà Jehova n’ejighị ọbara enwewo mmetụta dị ukwuu na nkà ọgwụ. Ịwa ahụ́ n’ejighị ọbara enyewo ihe àmà na-egosi uru izere mmịnye ọbara bara. Nnyocha ndị e mere na-egosi na ndị ọrịa na-agbake ngwa ngwa nakwa na ha adịchaghị enwe nsogbu mgbe a wasịrị ha ahụ́.
Ịnọgide Na-amụta Ihe n’Aka Dibịa Kasị Ukwuu
Ana m agbalị ịnọgide na-amata ọganihu ndị ọhụrụ a na-enwe na nkà ọgwụ. Ma, ana m anọgidekwa na-amụta ihe n’aka Jehova, bụ́ Dibịa kasị ukwuu. Ọ dịghị ahụ nanị ihe ndị dị n’elu ahụ́, kamakwa ọ na-ahụ anyị n’ozuzu. (1 Samuel 16:7) Dị ka dọkịta, ana m agbalị ilebara onye ọrịa nke ọ bụla anya dị ka mmadụ n’onwe ya, ọ bụghị nanị ịgwọ ya ọrịa ya. Nke a na-eme ka m nwee ike inye onye ọrịa ọgwụgwọ ka mma.
Aka m na-eje ozi na Betel, inyere ndị ọzọ aka ịmụta banyere Jehova—gụnyere echiche ya banyere ọbara—ka bụkwa ihe kasị enye m ọṅụ. Ekpere m bụ ka Dibịa Ukwu ahụ, bụ́ Jehova Chineke, weta ọrịa nile na ọnwụ ná njedebe n’isi nso.—Dị ka Yasushi Aizawa si kọọ.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 4 Dị ka akwụkwọ ọgụgụ bụ́ Modern Blood Banking and Transfusion Practices nke Dr. Denise M. Harmening dere si kwuo, “mbibi mkpụrụ ndụ ọbara uhie bụ́ nke na-adịghị ewere ọnọdụ ozugbo” pụrụ iwere ọnọdụ n’ahụ́ “onye ọrịa nke ahụ́ ya na-adịghịzi anabata ihe, bụ́ nke mmịnye ọbara, afọ ime, ma ọ bụ ojiji e ji akụkụ ahụ́ onye ọzọ dochie nke ya, kpatara.” N’ọnọdụ ndị dị otú ahụ, “usoro bụ́ ịgba e ji eme ihe tupu a mịnye mmadụ ọbara adịghị achọpụta” ihe ndị ahụ na-alụso ọrịa ọgụ bụ́ ndị na-eme ka onye ọrịa nwewe nsogbu ma a mịnye ya ọbara. Dị ka akwụkwọ bụ́ Dailey’s Notes on Blood si kwuo, mbibi mkpụrụ ndụ ọbara uhie “pụrụ iwere ọnọdụ ọbụna mgbe ọbara . . . ọjọọ a mịnyere mmadụ na-ebughị ibu. Mgbe akụrụ kwụsịrị ịrụ ọrụ nke ọma, ọ na-eji nke nta nke nta akpatara onye ahụ ọrịa n’ihi na akụrụ ya agaghịzi enwe ike iwepụ ihe ndị na-adịghị mma bụ́ ndị dị n’ọbara ya.”
^ par. 8 Magazin bụ́ Journal of Clinical Oncology, August 1988, kọrọ, sị: “Ndị ọrịa a mịnyere ọbara mgbe a na-awa ha ahụ́ adịtụghị agbake ngwa ngwa dị ka ndị ọrịa a na-amịnyeghị ọbara mgbe a na-awa ha ahụ́ maka ọrịa cancer.”
^ par. 16 Iji nwetakwuo ihe ọmụma banyere ozizi Bible ndị metụtara ọbara, lee broshuọ bụ́ How Can Blood Save Your Life? (Olee Otú Ọbara Pụrụ Isi Chebe Ndụ Gị?) nke Ndịàmà Jehova bipụtara.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 14]
“Akọwaara m ha na e nwere ihe ndị a pụrụ iji dochie anya mmịnye ọbara nakwa na m ga-eme ihe nile m pụrụ ime iji nyere ndị ọrịa aka”
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 15]
“Ịwa ahụ́ n’ejighị ọbara enyewo ihe àmà na-egosi uru izere mmịnye ọbara bara”
[Foto ndị dị na peeji nke 15]
N’elu: Ka m na-ekwu okwu dabeere na Bible
N’aka nri: Mụ na nwunye m, bụ́ Masuko, taa