Mgbe E Mere Ka Nwatakịrị Jiri Ọsọ Gafere Ohere nke Ibi Ndụ Dị Ka Nwata
Mgbe E Mere Ka Nwatakịrị Jiri Ọsọ Gafere Ohere nke Ibi Ndụ Dị Ka Nwata
N’ỌNỌDỤ ihu igwe na-agbachapụghị agbachapụ, injin ụgbọelu ahụ malitere ọrụ ka obere ụgbọelu ahụ ji nke nta nke nta gbasiwe ọsọ ike ma felie. Ọ bụwo ihe ndị nta akụkọ ji mere akụkọ, a na-ese foto aghara aghara, ndị nta akụkọ a na-ajụ ajụjụ ndị na-akpali mmasị ma na-ekwu okwu ịja mma nke ukwuu. Ònye nọ na-adọta mmasị nile a? Ọ bụghị nanị otu ọkwọ ụgbọelu nwere akwụkwọ ikike bụ́ onye nọ n’ụgbọelu ahụ, ọ bụghịkwa otu onye e bu ebu n’ụgbọelu ahụ—otu nwoke toworo eto—kama ọ bụ nwa nwanyị nke onye ahụ e bu ebu. Ọ dị afọ asaa.
Nwata nwanyị ahụ na-aga ịnya ụgbọelu ahụ. Ọ na-aga ime ihe a na-ahụtụbeghị ụdị ya mbụ, ma mee ya kpọmkwem n’oge a kapịrị ọnụ. Ndị nta akụkọ ga na-eche n’ebe nke ọzọ ọ ga-efeda. Ya mere, n’agbanyeghị ihu igwe na-agbachapụghị agbachapụ, mmadụ atọ ahụ banyere n’ụgbọelu ahụ, nwatakịrị ahụ ejiri pilo nọdụ n’oche ka anya ya wee na-ahụ ihe dị n’ihu, a gbakwụnyekwara ihe na pedal ndị dị n’ụgbọelu ahụ iji mee ka ụkwụ nwatakịrị ahụ na-eru na ha.
N’ụzọ dị mwute, ụgbọelu ahụ efeteghị aka. N’ịbụ nke zutere oké ifufe na mberede, ụgbọelu ahụ chere ihu ebe ọzọ, fedaa ala, ma kpọkasịa, gbuo mmadụ atọ ahụ nọ n’ime ya. Usoro mgbasa ozi kwupụtara oké iru újú na mberede kama ikwu okwu ịja mma. Ndị nta akụkọ na ndị nchịkọta akụkọ ole na ole chere ma ọ̀ dị ụzọ ọ bụla usoro mgbasa ozi siworo kere òkè n’ịkpata ọdachi ahụ. Ọtụtụ ndị malitere ikwusi okwu ike na ụmụaka ekwesịghị ịnya ụgbọelu. Na United States, e tiri iwu metụtara nke ahụ. Ma, ka a na-ede ihe ndị a na-awụ akpata oyi n’ahụ́ ma na-atụ aro ihe ngwọta elu elu ndị dị mfe, e nwere isi ihe ndị miri emi karị kwesịrị nlebara anya.
Ọdachi ahụ mere ka ụfọdụ ndị chesie echiche ike banyere otu ihe na-eme n’oge anyị a. Taa, a na-eme ka ụmụaka jiri ọsọ gafere ohere nke ibi ndụ dị ka ụmụaka, mee ka ha na-arụ ọrụ ndị toworo eto na-arụ n’oge ha ka bụ nnọọ ụmụaka. N’ezie,
mmetụta ya adịghị apụta nnọọ ìhè ma ọ bụ akpata nnọọ ọdachi. Ma ọ pụrụ ịdị ukwuu ma dịtee aka. Ka anyị tụlee ụzọ ole na ole ndị a pụrụ isi mee ka nwatakịrị jiri ọsọ gafere ohere nke ibi ndụ dị ka nwata.Ndị E Ziri Ihe Ọkụ Ọkụ
O kwere nghọta ihe mere ndị mụrụ ụmụ ji achọsi ike ka ụmụ ha nwee ihe ịga nke ọma. Ma mgbe ọchịchọ ahụ ghọziri nchekasị, ndị mụrụ ụmụ pụrụ iji ọrụ bogbuo ụmụ ha, na-arụgidesi ha ike, mgbe ha na-etorubeghị etoru. Ọnọdụ ahụ na-amalitekarị n’enweghị ihe ọjọọ ọ bụla e bu n’uche. Dị ka ihe atụ, ọ bụ ihe a na-ahụkarịzi bụ́ ndị nne na nna ideba aha ụmụaka ha maka ihe omume ndị a na-eme ma a gbasaa akwụkwọ, site n’ihe ọmụmụ banyere egwuregwu gaa n’ịmụ ịgụ ma ọ bụ ịgba egwú. Mgbe mgbe, ọ na-agụnyekwa ihe ọmụmụ pụrụ iche a na-enwe ma a gbasaa akwụkwọ.
N’ezie, ọ dịghị njọ ịkwalite nkà nwatakịrị ma ọ bụ ịgba ya ume n’ihe ndị o nwere mmasị na ha. Ma è nwere ihe ize ndụ dị n’imebiga ya ókè? N’ezie, e nwere, n’ihi na o yiri ka à na-arụgide ụmụaka ụfọdụ dị nnọọ ka ndị okenye na-enweta nrụgide ruo n’ókè nke enweghị obi iru ala. Magazin bụ́ Time na-ekwu, sị: “Ụmụaka ndị nọbu na-ebi ndụ dị ka ụmụaka kwesịrị ibi, na-echegbuzi onwe ha banyere ihe ọmụmụ; ụmụaka ndị kwesịrị inwere onwe ha iji ume ntorobịa na-eme ihe na-emezi ihe, na-enwe nzube dị elu nke yiri nke aṅụ ndị na-arụ ọrụ.”
Ndị nne na nna ụfọdụ na-enwe olileanya na ụmụ ha pụrụ ịghọ ndị ọkà n’egwuregwu, n’egwú, ma ọ bụ n’ime ihe nkiri. Tupu ha amụọ ụmụ, ndị nne na nna na-amalite idebanye aha ha n’ụlọ akwụkwọ ọta akara, na-enwe olileanya ime ka ohere ha nwere inwe ihe ịga nke ọma ka mma. Tụkwasị na nke a, ndị nne ụfọdụ na-edenye aha na “mahadum ndị dị ime” bụ́ ndị na-akụziri ụmụaka a ka bu n’afọ egwú. Nzube ya bụ ịkpali ụbụrụ ha na-akabeghị aka.
Ná mba ụfọdụ, a na-anwale ụmụaka maka nkà ịgụ ihe nakwa mgbakọ na mwepụ tupu ha eruo afọ isii. Omume ndị dị otú ahụ emewo ka e nwee nchegbu na ọ pụrụ ịkpata mkpaghasị uche. Dị ka ihe atụ, gịnị na-eme nwatakịrị “dara” n’ụlọ akwụkwọ ọta akara? David Elkind, onye dere akwụkwọ bụ́ The Hurried Child (Nwatakịrị E Mere Ka O Jiri Ọsọ Gafere Ohere nke Ibi Ndụ Dị Ka Nwata), na-ekwu na ụlọ akwụkwọ dị iche iche na-adị nnọọ ngwa n’ikwu na nwatakịrị bụ nke a ma ọ bụ nke ọzọ. Ha na-eme otú ahụ, ka Elkind na-ekwu, n’ihi ihe ndị metụtara nlekọta nke ụlọ akwụkwọ ha kama ịbụ n’ihi iji kụziere ụmụaka ihe n’ụzọ dị irè.
È nwere ihe ịrụgide ụmụaka ime ihe dị nnọọ ka ndị okenye na-efu? Ụzọ ọha mmadụ siworo nabata echiche nke ime ka ụmụaka bụrụ ndị ruru eru ibu ibu ndị okenye na-echegbu Elkind. Ọ na-ekwu, sị: “Ọ na-egosipụta omume anyị nke ịnakwere nrụgide na-arịwanye elu nke a na-arụgidekarị ndị na-eto eto n’oge a dị ka ihe dị ‘otú o kwesịrị.’” N’ezie, echiche banyere ihe dị otú o kwesịrị maka ụmụaka yiri ka ọ na-agbanwe ngwa ngwa.
Ndị Ọ Dị Ọkụ n’Ahụ́ Imeri
O yiri ka ọtụtụ ndị nne na nna hà na-eche na ọ bụ ihe dị otú o kwesịrị, ọbụna ihe dị mma, ịkụziri ụmụ ha na ọ dịghị ihe ọ bụla dị mkpa karịa inwe mmeri—karịsịa n’egwuregwu. Ihe nrite egwuregwu Olimpik bụ ihe na-akpali mmasị nke ọtụtụ ụmụaka n’oge a. Iji bụrụ ndị ga-enweta otuto nwa oge maka inwe mmeri nakwa iji bụrụ ndị ga-ebi ndụ dị mma mgbe ha toro, a na-amanye ụmụaka ụfọdụ iji ọsọ gafere ohere nke ibi ndụ dị ka ụmụaka ma ọ bụ ọbụna mee ka ha gharadị ibi ndụ dị ka nwata ma ọlị.
Tụlee ihe banyere ndị inyom na-eme egwuregwu mmega ahụ́. Ha na-amalite nnọọ na nwata na-enwe mmega ahụ́ ndị siri ike bụ́ ndị na-etinye obere ahụ́ ha n’oké ndọlị. Ha na-eji ọtụtụ afọ eme njikere n’ụzọ mmetụta uche nakwa n’ụzọ anụ ahụ́ maka asọmpi egwuregwu Olimpik. N’ezie, ọ bụ nanị mmadụ ole na ole ga-emeri. Ndị na-emerighị hà ga-eche na ihe ha nwetara kwesịrị àjà ndị ha jiworo ihe ka ukwuu n’oge ntorobịa ha chụọ? Ka oge na-aga, ọbụna ndị nke meririnụ pụrụ ịmalite iche ma ihe ha nwetara ò rudịrị àjà ndị ha chụworo.
N’ụzọ mmetụta uche, a pụrụ ime ka ụmụaka nwanyị ndị a jiri ọsọ gafere ohere nke ibi ndụ dị ka ụmụntakịrị n’ihi ọchịchọ siri ike nke ime ka ha ghọọ ndị ọkà a ma ama n’egwuregwu. Ma mmega ahụ́ ndị tara akpụ otú ahụ pụrụ ime ka ha ghara ito nke ọma n’ụzọ anụ ahụ́. Ọkpụkpụ nke ụfọdụ n’ime ha adịghịkwa eto nke ọma. Ọtụtụ n’ime ha na-enwekarị nsogbu iri ihe. Ọtụtụ ndị adịghị amalite inwe mgbanwe ndị a na-ahụ n’ahụ́ nwa agbọghọ na-etopụta etopụta n’oge ha kwesịrị ịmalite—ọbụna ruo ọtụtụ afọ. Otú ọ dị, ọtụtụ ụmụ agbọghọ taa na-enwe nsogbu ahụ n’akụkụ ya nke ọzọ: ịmalite oké ngwa ngwa nwewe mgbanwe ndị a na-ahụ n’ahụ́ nwa agbọghọ na-etolite etolite.—Lee igbe dị n’elu.
Ụmụaka Ndị Nwere Ihe Nile Ma E Wezụga Ibi Ndụ Dị Ka Ụmụaka
Ọ bụrụ na ị ga-ekwenyere usoro mgbasa ozi ndị na-egosi ntụrụndụ, ị pụrụ iche na ụzọ magburu onwe ya isi nụ ụtọ oge nke ịbụ nwata bụ inwe ụdị ntụrụndụ dị iche iche. Ndị nne na nna ụfọdụ na-arụsi nnọọ ọrụ ike gabiga ókè iji mee ka ụmụ ha nwee ihe onwunwe ọ bụla ha pụrụ inwe, gụnyere ụlọ ndị oké ozu, ihe ntụrụndụ gabigara ókè na uwe ndị dara oké ọnụ.
Ma, ọtụtụ ụmụaka a zụlitere n’ụzọ dị otú ahụ na-etinye aka n’ịṅụ oké mmanya, n’iji ọgwụ ọjọọ eme ihe, nakwa n’ịkpa àgwà iwe iwe na nke nnupụisi. N’ihi gịnị? Oké iwe na-ewe ọtụtụ ndị n’ihi na ha na-enwe mmetụta nke ịbụ ndị e leghaara anya. Ụmụaka chọrọ nne na nna bụ́ ndị ga-anọ ha nso, hụ ha n’anya ma lekọta ha. Ndị nne na nna na-adịghị enwe ohere ime otú ahụ pụrụ iche na ha na-arụ ọrụ iji hụ na ụmụ ha nwere obi ụtọ—ma ọ pụrụ nnọọ ịbụ na ha na-eme ihe megidere nke ahụ.
Dr. Judith Paphazy na-akọwa “ndị nne na nna na-arụcha ọrụ, bụ́ ndị nọ n’ìgwè ndị nwere akụ̀ na ụba,” ma na-ekwu na mgbe mgbe, ha “na-azụrụ ụmụ ha ihe ọ bụla ha chọrọ n’ihi na n’ụzọ ụfọdụ ha na-echeta na nchụso ha na-achụso ihe onwunwe na-emetụta ezinụlọ ha n’ụzọ dị njọ.” N’echiche ya, ndị nne na nna nọ n’ọnọdụ dị otú ahụ na-anwa
“iji ihe onwunwe zụrụ nnwere onwe pụọ n’ọrụ ha dị ka nne na nna.”Ọ bụ ụmụaka na-atakarị ahụhụ ya n’ụzọ dị njọ. Ọ bụ ezie na ha pụrụ inwe ọtụtụ ihe ntụrụndụ n’ụzọ ihe onwunwe, ha adịghị enweta ihe kasị mkpa maka ịnụ ụtọ oge ha bụ nwata: oge na ịhụnanya nke nne na nna ha. N’ịbụ ndị na-enweghị nduzi, ndị na-adịghị enweta ịdọ aka ná ntị na ntụziaka, ha na-eche ajụjụ ndị dịịrị ndị okenye ihu n’oge ha ka bụ nnọọ ụmụaka, n’adịbeghị njikere maka ya. ‘Èkwesịrị m iji ọgwụ ọjọọ na-eme ihe? Inwe mmekọahụ? Ime ihe ike ike mgbe iwe na-ewe m?’ Ma eleghị anya ha ga-achọta azịza ha n’onwe ha, site n’aka ndị ọgbọ ha ma ọ bụ TV ma ọ bụ ndị na-eme ihe nkiri. Ihe na-esi na ya apụta na-ewetakarị oge nke ibi ndụ dị ka nwata ná njedebe na mberede, ọbụna n’ụzọ ọdachi.
Mgbe Nwatakịrị Nọchiri Anya “Onye Toworo Eto”
Mgbe ezinụlọ nke nwere nne na nna ghọrọ ezinụlọ nwere nanị nne ma ọ bụ nna na mberede, n’ihi ọnwụ, nkewa, ma ọ bụ ịgba alụkwaghịm, ụmụaka na-atakarị ahụhụ n’ụzọ mmetụta uche. N’ezie, ọtụtụ ezinụlọ ndị nwere nanị nne ma ọ bụ nna na-anagide ọnọdụ ahụ n’ụzọ gara nke ọma. Ma n’ezinụlọ ụfọdụ, a na-amanye ụmụaka iji ọsọ gafere ohere nke ibi ndụ dị ka ụmụaka.
N’ụzọ kwere nghọta, owu pụrụ ịdị na-ama nne ma ọ bụ nna nanị ya na-azụ ụmụ mgbe ụfọdụ. N’ihi ya kwa, ụfọdụ na-ekwe ka nwatakịrị—karịsịa nke tọsịrịnụ—rụwa ọrụ dịịrị onye toworo eto n’ezinụlọ. Ikekwe, n’ihi nkụda mmụọ, nne ma ọ bụ nna ahụ pụrụ ịdị na-akọrọ obere nwa ya nwoke ma ọ bụ nwa ya nwanyị ihe nzuzo ya, jiri nsogbu ndị nwatakịrị ahụ na-adịbeghị njikere ibu na-ebogbu ya. Ụfọdụ ndị nne ma ọ bụ nna nanị ha na-azụ ụmụ na-adabere n’ebe nwatakịrị nọ n’ụzọ mmetụta uche gabiga ókè.
Ndị nne na nna ndị ọzọ na-agbahapụ ibu ọrụ ha kpam kpam, na-amanye nwatakịrị ịdị na-arụ ọrụ dị ka okenye nọ n’ezinụlọ. Carmen na nwanne ya nwanyị, bụ́ ndị a kpọtụrụ aha na mbụ, hapụrụ ọnọdụ ahụ ma malite ibi n’okporo ámá. N’ịbụ ndị ka bụ ụmụaka n’onwe ha, e debewo ha n’ọnọdụ nke ịdị na-arụ ọrụ nne na nna ha kwesịrị ịdị na-arụrụ ụmụnne ha. Ibu ahụ karịrị ha.
Obi abụọ adịghị ya na ịmanye ụmụaka iji ọsọ gafere ohere nke ibi ndụ dị ka ụmụaka bụ omume dị ize ndụ, nke e kwesịrị izere ma ya kwe nnọọ mee. Ma e nwere ozi na-eme obi ụtọ: Ndị toworo eto pụrụ ime ihe ndị bara uru iji hụ na ụmụ ha biri ndụ obi ụtọ dị ka ụmụaka ruo ọtụtụ afọ. Ihe ndị dị aṅaa? Ka anyị tụlee azịza ụfọdụ a nwapụtaworo eri oge.
[Igbe dị na peeji nke 16]
Ihe Ịma Aka Ndị Na-adị n’Ihi Ịmalite Oké Ngwa Ngwa Nwewe Mgbanwe Ndị A Na-enwe n’Ahụ́ Onye Na-etopụta Etopụta
Ụmụ agbọghọ hà na-amalite ngwa ngwa enwe mgbanwe ndị a na-ahụ n’ahụ́ nwa agbọghọ na-etopụta etopụta? Ndị ọkà mmụta sayensị ekwekọrịtaghị n’ajụjụ ahụ. Ụfọdụ na-ekwu na n’etiti narị afọ nke 19, nkezi afọ ole ụmụ agbọghọ na-adị amalite inwe mgbanwe n’ahụ́ ha bụ afọ 17, ma taa, ọ bụ ihe na-erughị afọ 13. Dị ka nnyocha e mere na 1997 n’ebe ụmụ agbọghọ 17,000 nọ, ihe dị ka pasent 15 nke ụmụ agbọghọ ndị ọcha na pasent 50 nke ụmụ agbọghọ Ndị America si Africa bụ́ ndị nọ na United States na-egosi na ha malitere oké ngwa ngwa n’inwe mgbanwe n’ahụ́ ha, mgbe ha dị afọ asatọ! Otú ọ dị, ndị dọkịta ụfọdụ na-arụ ụka banyere nchọpụta ndị a ma na-adọ ndị nne na nna aka ná ntị megide ịnabata inwe mgbanwe ahụ́ oké ngwa ngwa dị ka “ihe dị otú o kwesịrị.”
Otú ọ bụla o si dị, ọnọdụ a na-ewetara ma ndị nne na nna ma ụmụaka ihe ịma aka. Magazin bụ́ Time na-ekwu, sị: “Ihe na-enye nsogbu n’obi, karịa mgbanwe nke ahụ́, bụ mmetụta nke inwe mgbanwe n’ahụ́ n’etorughị etoru pụrụ inwe n’uche ụmụaka bụ́ ndị kwesịrị ịdị na-agụ akụkọ ifo, ọ bụghị ịdị na-achụpụ ndị ikom na-achọ ịrata ndị inyom. . . . Ka o sina dị, oge ụmụaka ji ebi ndụ dị ka ụmụaka dị nnọọ mkpụmkpụ.” Isiokwu ahụ welitere ajụjụ a na-enye nsogbu n’obi: “Ọ bụrụ na ahụ́ ụmụntakịrị ndị inyom emee ka ha yie ndị toworo eto tupu obi na uche ha adị njikere maka ya, gịnị ga-efunahụ ha kpam kpam?”
Mgbe mgbe, ihe na-efunahụ ha bụ obi dị ọcha—site ná mmegbu n’ụzọ mmekọahụ. Otu nne kwuru ya n’ezoghị ọnụ, sị: “Ụmụ agbọghọ ndị na-eyi ka ha etofeela afọ ndụ ha n’ezie dị ka mmanụ aṅụ [nye aṅụ]. Ha na-adọta mmasị ụmụ okoro ndị totụworo eto.” Ihe ịbụ onye a rụgidere inwe mmekọahụ na nwata na-efu na-adị ukwuu. Ùgwù nwata nwanyị , akọ na uche dị ọcha, na ọbụna ahụ́ ike ya n’ụzọ anụ ahụ́ nakwa n’ụzọ mmetụta uche pụrụ ifunahụ ya.
[Foto dị na peeji nke 15]
Ime atụmatụ ihe nwata ga-eme n’ụzọ gabigara ókè pụrụ ịkpata nsogbu
[Foto dị na peeji nke 17]
Ịrụgide ụmụaka ịdị na-asọ mpi gabiga ókè pụrụ ime ka egwuregwu ghara ịdị ụtọ
[Foto dị na peeji nke 17]
Ihe onwunwe apụghị ịnọchi anya ezi ọzụzụ nke nne na nna