Ikiri Ụwa
Ikiri Ụwa
Ihe Àmà E Gwutere n’Ala nke Bụ́ Adịgboroja
“Ruo afọ 116, o kokwasịrị n’ahụ ájá nke Ụlọ Ndebe Ihe Ochie nke Wales nke dị na Cardiff—ọkpụkpụ ghọworo ihe àmà e gwutere n’ala, nke otu anụ na-eri ibe ya nke dị nde afọ 200, nke bibu n’oké osimiri dị iche iche n’ọgbọ Jurassic,” ka akwụkwọ akụkọ Britain bụ́ The Guardian na-ekwu. “Mgbe ahụ, ndị nlekọta nke ụlọ ndebe ihe ochie ahụ dị na Cardiff kpebiri na ọ dị mkpa ka e hichasịa ọkpụkpụ nke anụ ahụ na-eri ibe ya bụ́ ichthyosaurus, nke biri n’ime mmiri—ha chọpụtakwara na a ghọrọ ha aghụghọ.” “Mgbe anyị kpekapụsịrị mkpo ágbá ise, anyị chọpụtara na ọ bụ wayo e ji nlezi anya gwuo,” ka onye nchekwa bụ́ Caroline Buttler kwuru. “Ọ bụ njikọta nke ụdị anụ ichthyosaurus abụọ nakwa iji akọ mepụta akụkụ ahụ adịgboroja ụfọdụ.” Kama ikpofu ya, ụlọ ndebe ihe ochie ahụ ga-edowe ya dị ka ihe atụ nke ihe àmà e gwutere n’ala nke bụ́ adịgboroja.
Ọdọ Mmiri E Metọrọ Emetọ Ndị Dị n’Elu Ugwu
Ọdọ mmiri ndị dị n’elu ugwu adịghị ọcha otú e chere na ha dị. “Ọbụna ọdọ mmiri ndị kasị dịrị n’elu, dị ka Schwarzsee ahụ dị elu karịa Sölden [Austria], jupụtara n’ihe mmetọ,” ka magazin Germany bụ́ natur & kosmos na-akọ. Azụ̀ ndị dị n’ọdọ mmiri ndị dị n’ebe dị elu nwere ọ̀tụ̀tụ̀ DDT ji ihe dị ka 1,000 ugboro karịa azụ̀ ndị dị n’ebe ndị dị ala karị. N’ihi gịnị? Ná mba ndị dị n’ebe okpomọkụ, ọgwụ ọjọọ na-aghọ ihe ikuku na-ebugharị site n’úzù na-ekupụ ekupụ, ikuku na-eburukwa ha gaa n’akụkụ ndị ọzọ nke ụwa. Ọ bụrụ na o ruo n’ebe ndị jụrụ oyi—dị ka ọdọ mmiri ndị dị n’elu ugwu—ụmụ irighiri DDT ndị ahụ na-akpụkọta ma zoo dị ka igirigi. “Ọdọ mmiri ndị ahụ dị n’elu, bụ́ ndị na-ajụ oké oyi na-ejichi ha,” ka magazin ahụ na-ekwu, ma “na-amịkọrọ DDT ahụ site n’ikuku.” A machiwo DDT—ọgwụ e ji egbu ụmụ ahụhụ nke bụ́ nsí nye ụmụ mmadụ na ụmụ anụmanụ—na Europe kemgbe ihe karịrị afọ 20, ma a ka na-eji ya eme ihe ná mba ndị ka na-emepe emepe.
Ili Ndị A Na-ewu Dị Ka Mmadụ Si Chọọ
“Ili ndị e wuru n’ụzọ pụrụ iche bụ ihe ọhụrụ na-ewu ewu banyere olili ozu,” ka magazin France bụ́ L’Express na-ekwu. Ndị na-ewu ili na-ekwe nkwa iwuru mmadụ ili otú o si chọọ n’ụdị àgwà 25, n’ọdịdị ndị ọhụrụ, na-ejikwa ihe ndị dị ka ugegbe ma ọ bụ ígwè nwere àgwà. Ihe ncheta ndị e wuworo ewu nwere ihe ndị a kpụrụ n’ụdị parachute, nkịta na ehi, ụgbọ okporo ígwè kpọkara akpọka, na otu nnukwute drọm—nke onye na-azụ ahịa mmanya tụrụ ọda ya. Otu nnukwute ụlọ ọrụ kwuru na ọ na-emepụta ma ọ dịkarịa ala ihe 80 yiri ọgba tum tum n’otu afọ iji chọọ ili mma. Dị ka isiokwu ahụ si kwuo, iwu nchịkwa nke ógbè pụrụ inye ohere nanị maka ịkpụ nkume ncheta na otu mbadamba ihe, ma iwu ndị France na-enye ohere maka ihe ndị mmadụ kwenyere ma na-enye ndị nwere ebe a na-eli ozu “nnwere onwe iwu ihe.”
Kpachara Anya Maka Òzé Ndị Dị n’Ọla
“Ọ bụrụ na o yiri ka nwa gị ọ ga-ata ma ọ bụ mịa ọla òzé pụrụ ịdị na ya n’ọnụ, tụfuo ya ozugbo,” ka otu akụkọ sitere n’aka Health Canada na-adụ n’ọdụ. Nnyocha ndị e mere n’ụlọ ime nnyocha banyere ọla dị ọnụ ala ndị e ji eji ejiji bụ́ ndị a na-azụtakarịrị ụmụntakịrị kpughere na ihe ka ọtụtụ n’ime ndị e ji mee nnwale nwere òzé dị n’agbata pasent 50 na 100. “Ịmịrị ọbụna ọ̀tụ̀tụ̀ dị nnọọ nta nke òzé pụrụ inwe mmetụta ọjọọ n’ahụ ike bụ́ nke pụrụ imetụta uto ọgụgụ isi na akparamàgwà nke ụmụ ọhụrụ na ụmụntakịrị,” ka akụkọ ahụ na-ekwu. N’ezie, ọ na-esi ike ịmata otú òzé dị n’ihe hà n’ejighị ihe e ji eme nnyocha. Ya mere, n’ihi ịdịkarị ọnụ ala nke ọla ụmụaka, ihe kasị mma ime pụrụ ịbụ ihe ahụ a tụrụ aro ya n’akwụkwọ akụkọ bụ́ National Post: “Mgbe i na-ejighị n’aka, tụfuo ya.”
Ebe Obibi—Ihe Dị Oké Mkpa Maka Nchekwa
“Ichebe ebe obibi [bụ́ ihe] dị oké mkpa n’ichekwa anụ ndị bi n’ọhịa,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Times of Zambia na-ekwu. Akụkọ ahụ na-ekwu na ihe kasị emetụta mbelata nke ọnụ ọgụgụ anụ ndị bi n’ọhịa bụ ibibi ebe obibi ha. “Ịtabiga ahịhịa ókè, ọkụ ọgbụgba, nrichapụ nke elu ala, [na] ịkọ ihe” socha n’ihe ndị na-akpata ya. “N’ụzọ doro anya, ọrụ ubi dị mkpa, ọ dịghịkwa ụzọ ọ bụla anyị pụrụ isi kwụsị ya,” ka isiokwu ahụ na-akọwa. Ma, n’ógbè ebe ọrụ ubi “na-abakebeghị uru n’ihi ala na-adịghị emepụta nri,” a pụrụ ichekwa ebe obibi nke anụ ndị bi n’ọhịa, ka Times ahụ na-ekwu. Mgbe a kpụtara anụ ụlọ n’ebe ndị a, ọ na-esiri ha ike ịnagide ụmụ ahụhụ ndị na-ebi n’ime
ihe ndị ọzọ dị ka akpị́ na igwu, ma “anụ ọhịa nwere ụzọ maara ha ahụ ha si anagide ụmụ ahụhụ ndị ahụ,” malite n’ịtụrụgharị n’apịtị na ịtụrụ n’ájá ruo ná nnụnụ ịtụchasị ha.Ndịàmà Enwee Mmeri Ụlọikpe na Russia
The New York Times nke February 24, 2001 kọrọ, sị: “Taa [February 23], n’otu ụlọikpe dị na Moscow, Ndịàmà Jehova nwere mmeri gbara ọkpụrụkpụ n’isi ndị gbara ha akwụkwọ bụ́ ndị chọrọ ka a machibido ndị òtù ahụ iwu n’ihi otu iwu e tiri na 1997 bụ́ nke machibidoro òtù okpukpe ndị na-akpali ịkpọasị ma ọ bụ ekweghị ibe nọrọ.” A kwụsịtụrụ ikpe ahụ na March 12, 1999, a họpụtara ndị ọkachamara ise inyocha ihe Ndịàmà kwenyere. E kpeghị ikpe ahụ ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ abụọ. Ka a maliteghachiri ya na February 6, 2001, o werughị ụlọikpe ahụ izu atọ iji chọpụta na ebubo ndị ahụ gbara akwụkwọ na-ebo ha enweghị ihe ndabere. Otú ọ dị, ndị ahụ gbara akwụkowọ rịọrọ Ụlọikpe Moscow City ka o nye iwu ka e kpegharịa ikpe ahụ. Na May 30, e meere ha ihe ahụ ha rịọrọ, e weghachiri ikpe ahụ n’ụlọikpe mbụ kpere ya ka o kpegharịa ya. “Chọọchị Ọtọdọks nke Russia, bụ́ nke na-emegide ọrụ ozi ala ọzọ n’ụzọ kpụ ọkụ n’ọnụ,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Los Angeles Times kwuru, “bụ otu n’ime ndị bụ́ isi na-akwado iwu ahụ e tiri na 1997 banyere okpukpe, bụ́ nke manyere ọtụtụ òtù okpukpe idebanye aha site n’usoro ndebanye aha ahụ siri ike.
Iji Uwe Ndị E Nyere n’Onyinye Achọ Uru
Ọ bụ “nanị ọnụ ọgụgụ dị nta” nke uwe e nyere n’onyinye na-erute ndị nọ ná mkpa n’ezie aka, ka akwụkwọ akụkọ Germany bụ́ Südwest Presse na-ekwu. Kwa afọ na Germany, a na-enye uwe karịrị tọn 500,000 n’onyinye iji nyere ndị nọ ná mkpa aka. Ma, n’ozuzu ha, òtù ndị na-anakọta uwe ndị ahụ na-eresị ha ụlọ ọrụ achụmnta ego dị iche iche, na-eme ka uwe ndị e nyere n’onyinye bụrụ achụmnta ego na-enye ọtụtụ narị nde mark ndị Germany. Ọtụtụ mgbe, ndị ahụ na-anakọta ha adịghị ama ihe na-eme ihe ndị ahụ e nyere n’onyinye. Isiokwu ahụ na-ekwu, sị: “Ọ bụrụ na ị chọrọ ijide n’aka na uwe gị ga-abara ndị ogbenye uru n’ezie, ị ga-eji aka gị wegara ha ndị nọ ná mkpa ma ọ bụ zigara ha ndị ị tụkwasịrị obi nọ n’ógbè ahụ nwere nsogbu.”
Ihe Mere O Ji Esiri Ụmụaka Ike Ikwurịta Okwu
Dị ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Berliner Morgenpost si kwuo, ọnụ na-ekwuchitere òtù ndị ọkà n’ọrịa ụmụaka na Berlin kwuru na ọ bụ ikiribiga telivishọn ókè na iji kọmputa eme ihe na-akpata nsogbu inwe nkwurịta okwu nke ụmụaka. O kwuru na ụmụaka, karịsịa ndị na-amalitebeghị ịga akwụkwọ, kwesịrị itinye oge dị ala karị n’ikiri TV ma ọ bụ n’iji kọmputa eme ihe ma tinye oge ka ukwuu n’isoro ndị mmadụ ha na-ahụ anya na-ekwurịta okwu nakwa n’ịbụ ndị ha na-akpali. Tụkwasị na nke a, The Sunday Times nke Britain na-ekwu na nchọpụta ọhụrụ na-egosi na “ọnụ ọgụgụ na-ebuwanye ibu nke ndị nọ n’afọ iri abụọ na ụma na iri atọ na ụma ha na-echefu ihe nke ukwuu,” ha adịghịkwa enwe ike “ịmata ihe ndị dị mkpa na ihe ndị na-adịghị mkpa” n’ihi “ịdị na-adaberekwu na nkà na ụzụ kọmputa.”
Asụsụ Ndị Na-apụ n’Anya
Otu atụmatụ ọrụ nke ndị Brazil na ndị Germany jikọrọ aka na ya na-eme atụmatụ idetu asụsụ ọdịnala Brazil ndị a na-akwado ikpochapụ kpam kpam, ka akwụkwọ akụkọ Brazil bụ́ Folha de S. Paulo na-akọ. Ndị nchọpụta na-enwe olileanya ichebe asụsụ Trumai, Aweti, na Cuicuro site n’inwe ihe ndekọ nke ihe odide na ụda na kọmputa. Dị ka onye ọkà mmụta asụsụ bụ́ Aryon Rodrigues si kwuo, nanị asụsụ 180 n’ime asụsụ ọdịnala 1,200 nke Brazil ka a ka na-asụ. Ọ bụ ihe na-erughị 100 mmadụ na-asụ ma ọ dịkarịa 50 n’ime asụsụ ndị a. N’otu asụsụ bụ́ Makú, nanị onye na-asụ ya bụ́ otu nwoke nwunye ya nwụrụ anwụ nke dị afọ 70 onye bi n’ebe ugwu Brazil. Rodrigues kwuru na ichebe asụsụ ọdịnala dị oké mkpa iji chekwaa omenala ndị mmadụ.
Nsogbu nke Ihe Mkpofu na Mexico City
Pasent 30 nke ihe e kpofuru ekpofu na Mexico City na-adị n’okporo ụzọ ọha na eze ma ghọọ mmetọ pụrụ ịdị ize ndụ, ka otu akụkọ e bipụtara na nso nso a n’akwụkwọ akụkọ Mexico City bụ́ El Universal kwuru. Aarón Mastache Mondragón, bụ́ minista na-ahụ maka gburugburu ebe obibi kwuru na ọ bụ nanị pasent 10 nke ihe ndị e kpofuru ekpofu na Mexico City ka a na-eji emegharị ihe, nakwa na ihe dị ka pasent 48 adịghị ere ure. Dabere n’ihe ndekọ sitere n’aka òtù bụ́ National Institute of Recyclers, tiketi e ji kadbọd mee na-ewe otu ọnwa iji ree; alaka achara, na-ewe malite n’otu ọnwa ruo atọ; ákwà nhicha ahụ e ji ogho mee, malite n’otu ọnwa ruo ise; sọks e ji ajị anụ kpaa, otu afọ; osisi e tere ágbá, ihe ga-eji ntakịrị gafee otu afọ; kom kom tin, 100 ọnwa; kom kom aluminum, malite n’afọ 200 ruo 500; nakwa karama, ihe karịrị otu nde afọ.