Ọgbọ nke Nọ n’Ihe Ize Ndụ
Ọgbọ nke Nọ n’Ihe Ize Ndụ
“Tupu ọnwa abụọ gara aga, enwere m obi ụtọ ma dị gara gara. Ugbu a, mgbe ọ bụla m nwetara ohere ime ihe, ike na-agwụkasị m ahụ ime ihe ọ bụla. Obi adịghị adị m ụtọ, ana m ewekwa iwe ọsọ ọsọ, amaghị m otú mụ na onye ọ bụla ga-esi nọlie. O siri ike ikwu ihe mere m na-eji amalite inwe obi ilu na mberede.”—Paul.
“Ana m akwa ákwá ma na-enwe mwute nke ukwuu. Mgbe m na-anọghị ná mwute, adịghị m nnọọ enwe mmetụta. Ọ dịghị ihe m na-anụ ụtọ ya. Ọ dịghịzi amasị m iso ndị enyi m nọrọ. Ana m ehi ụra nke ukwuu. Ihe ka ọtụtụ n’ụbọchị, anaghị m enwe ike ibili iji gaa akwụkwọ, anaghịzikwa m enweta akara dị mma.”—Melanie.
Ọ BỤGHỊ nanị Paul na Melanie na-enwe mmetụta dị otú ahụ. Ihe ọmụmụ ndị e nwere na-egosi na ihe dị ka pasent 8 nke ndị nọ n’oge uto na United States na-enwe ịda mbà n’obi nakwa na kwa afọ, ihe dị ka pasent 4 na-ada nnọọ mbà n’obi. Ma ndekọ ọnụ ọgụgụ a adịghị akọwazu nsogbu a, n’ihi na ọtụtụ mgbe, a na-eleghara ịda mbà n’obi anya kpam kpam ma ọ bụkwanụ nchọpụta ndị e mere egosi ihe ọzọ. “N’ezie,” ka ọkà mmụta n’akparamàgwà ndị nọ n’oge uto bụ́ David G. Fassler na-ekwu, “mgbe m tụleghachisịrị nchọpụta e mere banyere ụmụaka na ndị nọ n’afọ iri na ụma, echere m na ihe karịrị otu onye n’ime ndị na-eto eto anọ ga-enwe oké ịda mbà n’obi mgbe ha na-erule afọ iri na asatọ.”
Mmetụta Ndị Na-emebi Ihe
Ịda mbà n’obi na-enwe mmetụta na-emebi ihe n’ebe ndị nọ n’afọ iri na ụma nọ. N’ezie, ndị ọkachamara kweere na ọ na-ekere òkè dị ukwuu ná nsogbu iri ihe, nrịanrịa mmetụta uche, ihe isi ike n’ụlọ akwụkwọ, na iji ihe ndị na-eri ahụ eme ihe.
Nke ka njọ, e jikọtawo ịda mbà n’obi na ogbugbu ndị nọ n’afọ iri na ụma na-egbu onwe ha. Dị ka Ụlọ Ọrụ Mba United States Na-ahụ Maka Ahụ Ike Uche si kwuo, ihe hà ka pasent 7 nke ndị na-eto eto bụ́ ndị dara nnọọ mbà n’obi na-egbu onwe ha. * Ọbụna nke a adịghị ekpughecha nsogbu ahụ n’ozuzu ya, ebe ọ bụ na e kweere na mgbe ọ bụla otu onye na-eto eto gburu onwe ya, ọtụtụ ndị na-anwa ime otú ahụ. N’ihi ya, e nwere ezi ihe mere ihe ndekọ Kansụl Carnegie Na-ahụ Maka Ọdịmma Ndị Nọ n’Oge Uto ji ekwu, sị: “Ileghara nsogbu ndị nọ n’oge uto anya taa bụ ịkpọ ọdachi òkù. N’eziokwu, nleghara anya dị otú ahụ na-etinye otu ọgbọ n’ihe ize ndụ.”
Hà Na-ebi Ndụ nke Enweghị Nchegbu?
Ọ na-esiri ụfọdụ ndị ike ikwere na ndị nọ n’afọ iri na ụma pụrụ n’ezie ịda mbà n’obi. ‘Ha ka bụ nanị ụmụaka,’ ka ndị toworo eto pụrụ iche. ‘Ha na-ebi ndụ nke enweghị nchegbu, n’ezie, ha adịghịkwa enwe nchegbu nke ndị toworo eto na-enwe.’ Ka hà na-enwe? Nke bụ́ eziokwu bụ na ndị nọ n’oge uto na-enweta nrụgide siri nnọọ ike karịa otú ndị toworo eto maara. Dr. Daniel Goleman na-ekwu, sị: “Kemgbe mmalite nke narị afọ [nke 20], n’ụwa nile, ọgbọ nke ọ bụla anọwo n’ihe ize ndụ nke inwe oké ịda mbà n’obi karịa nne na nna ha—ọ bụghị enweghị obi ụtọ nkịtị, kama ọnọdụ nke enweghị mmasị bụ́ nke na-agwụ ike, nkụda mmụọ, na mmadụ iruru onwe ya újú, nakwa oké enweghị olileanya—n’oge ndụ ha. Oge ịda mbà n’obi ndị ahụ na-ebidokwa n’afọ ndụ ndị na-adịwanye ala.”
Otú o sina dị, ọtụtụ ndị nne na nna nwere ike ghara ikwenye: ‘Anyị gabigara oge uto n’adaghị mbà n’obi. N’ihi gịnị ka nwa anyị na-ejighị nnọọ enwe obi ụtọ?’ Ma ndị toworo eto ekwesịghị iji ahụmahụ ha nwere n’oge uto ha tụnyere nke ndị na-eto eto taa. E kwuwerị, ndị mmadụ n’otu n’otu nwere ụzọ dịgasị iche iche ha si ele ụwa gbara ha gburugburu anya nakwa ụzọ ha si emeghachi omume na ya.
E wezụga nke ahụ, ndị nọ n’afọ iri na ụma taa na-eche ihe ịma aka ka ukwuu ihu. “Ha na-eto n’ụwa dị nnọọ iche na nke nne na nna ha toro na ya,” ka Dr. Kathleen McCoy dere n’akwụkwọ ya bụ́ Understanding Your Teenager’s Depression (Ịghọta Ịda Mbà n’Obi Nwa Gị Nọ n’Afọ Iri na Ụma). Mgbe Dr. McCoy hotasịrị ọtụtụ mgbanwe pụtara ìhè bụ́ ndị wewooro ọnọdụ n’ime iri afọ ndị na-adịbeghị anya, o mechiri ihe odide ya site n’ikwu, sị: “Taa, ndị nọ n’afọ iri na ụma adịghị enwecha mmetụta nke ịnọ ná nchebe, ha adịghị enwecha obi ike na nchekwube otú anyị nwere n’ọgbọ gara aga.”
N’ihi njupụta nke ịda mbà n’obi n’etiti ndị nọ n’afọ iri na ụma, isiokwu ndị na-esonụ ga-aza ajụjụ atọ bụ́:
• Gịnị bụ ụfọdụ mgbaàmà nke ịda mbà n’obi nke ndị nọ n’afọ iri na ụma?
• Gịnị na-akpata ọnọdụ ahụ?
• Olee otú a pụrụ isi nyere ndị nọ n’afọ iri na ụma dara mbà n’obi aka?
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 7 Ụfọdụ ndị ọkachamara kweere na ọnụ ọgụgụ nke bụ́ ezie ka nnọọ elu, ebe ọ bụ na ọtụtụ ndị a sịrị na ha nwụrụ n’ihe mberede nwere ike ịbụwo na ha gburu onwe ha.