Usoro Izi Ihe Sara Mbara
Usoro Izi Ihe Sara Mbara
“Ọ bụ nanị ndị gụrụ akwụkwọ nweere onwe ha.”—Epictetus, ihe dị ka 100 O.A.
ONYE na-emegide ịgba ohu na narị afọ nke 19 bụ́ William H. Seward kwenyere na “olileanya nile mmadụ nwere maka ọganihu dabeere ná mmetụta na-arịwanye elu Bible na-enwe n’ahụ mmadụ.”
Ndịàmà Jehova na-akwanyekwara Bible ùgwù nke ukwuu. Ha kwenyesiri ike na ndị na-etinye ụkpụrụ ya n’ọrụ na-aghọ ndị di ka mma, ndị nwunye ka mma, ụmụ ka mma—ee, ndị kasị mma n’ụwa. Ya mere ha na-erube isi n’iwu Jisọs Kraịst bụ́: “Ya mere, gaanụ, mee mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, . . . na-ezi ha [ihe].”—Matiu 28:19, 20.
Iji ruo ihe mgbaru ọsọ a nke ịkụziri ndị mmadụ Bible, Ndịàmà Jehova amalitewo ihe pụrụ ịbụ ọrụ izi ihe kasị zuo ebe nile n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ. Ókè hà aṅaa ka ọ saruru na mbara?
Ọrụ Mbipụta Akwụkwọ Zuru Ụwa Ọnụ
N’ozi ha na-eje maka ọha, Ndịàmà na-eji nsụgharị Bible ndị e nwere n’ọtụtụ narị asụsụ eme ihe. Ma ha ebipụtawokwa New World Translation of the Holy Scriptures n’asụsụ 21 na New World Translation of the Christian Greek Scriptures (nke a na-asị na ọ bụ Agba Ọhụrụ) n’asụsụ 16 ọzọ. Ọzọkwa, ha nọ ugbu a n’ọrụ ịsụgharị Bible a gaa n’asụsụ 11 ọzọ. Ndịàmà na-ebipụtakwa akwụkwọ ndị na-eme ka e nwekwuo ekele maka Bible ma mee ka a ghọta ya karị.
Dị ka ihe atụ, a na-ebipụta magazin a, bụ́ Teta!, n’asụsụ 82, a na-ebikwa nkezi nke ihe karịrị 20,380,000 ná mbipụta nke ọ bụla. A na-ebi magazin ya na ya na-agakọ, bụ́ Ụlọ Nche, ná nkezi nke 22,398,000 ná mbịpụta nke ọ bụla n’asụsụ 137. Nke a pụtara ibi ihe karịrị nnọọ otu ijeri magazin ndị a n’afọ nke ọ bụla! Ọzọkwa, a na-ebipụtakọta “Ụlọ Nche” ọnụ n’asụsụ 124 n’ime ha, e sikwa otú ahụ ebipụta Teta! n’asụsụ 58. Ya mere, ọtụtụ ndị na-asụ asụsụ dịgasị iche n’ụwa nile na-agụ ihe ọmụma dị na magazin ndị a n’otu oge ahụ n’asụsụ nke ha.
Ọzọkwa, n’iri afọ ndị na-adịbeghị anya, Ndịàmà Jehova ebipụtawo ọtụtụ narị nde akwụkwọ ndị na-enyere mmadụ aka ịmụ Bible. E biri ihe karịrị nde 107 nke akwụkwọ bụ́ Ezi-Okwu Ahu Nke Nedubà ná Ndu Ebigh-Ebi. Ka e mesịrị, e biri ihe karịrị nde 81 nke Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala, n’oge na-adịbeghị nnọọ anya, e bikwara ihe karịrị nde 75 nke Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi n’asụsụ 146. Ọzọkwa, e biwo ihe karịrị nde 113 nke broshuọ ahụ nwere peeji 32 bụ́ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? n’asụsụ 240.
E bipụtawo akwụkwọ ndị ọzọ iji gboo
mkpa dị iche iche kpọmkwem. E biri ihe karịrị nde 51 nke Akwukwọm nke Akukọ Bible, bụ́ nke e dere maka ụmụaka. E biri ngụkọta nke ihe karịrị nde 53 nke akwụkwọ abụọ e bipụtara maka ndị nọ n’afọ iri na ụma karịsịa, Ibu Nwa-okoro Na Ab̧ọghọ-Gi—Inweta Ihe Kachasi Nma Nime Ya, na Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè. E biwokwa Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ, bụ́ nke nyewooro ọtụtụ nde ezinụlọ aka ịnagide nsogbu ha, n’asụsụ 115.E biwo ngụkọta nke ihe karịrị nde 117 nke akwụkwọ anọ ọzọ e wepụtara eri 1985 bụ́ ndị na-ewulite okwukwe karịsịa n’Onye Okike, Ọkpara ya, nakwa na Bible. Ha bụ Life—How Did It Get Here? By Evolution or by Creation?, Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ, The Bible—God’s Word or Man’s?, na Is There a Creator Who Cares About You?
Taa, e nwere akwụkwọ ndị dabeere na Bible bụ́ ndị Ndịàmà Jehova bipụtara n’asụsụ 353, a ga-ewepụtakwa ụfọdụ n’ime ndị a n’oge na-adịghị anya n’asụsụ 38 ọzọ. N’ezie, Ndịàmà Jehova ebiwo ihe karịrị nnọọ ijeri 20 nke akwụkwọ, akwụkwọ nta, broshuọ, na magazin eri 1970! Ọzọkwa, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nde ndị nkụzi isii nọ n’ọrụ ịkpọsa ihe ọmụma Bible n’ihe karịrị mba 230. Ma olee otú ihe a nile siworo kwe omume, oleekwa otú o si emetụta ndụ ụmụ mmadụ?
Ihe Mere E Ji Na-ebipụta Ha n’Asụsụ nke Ha
Dị ka ị pụrụ iche nnọọ n’echiche, ọ na-ewe oké mgbalị e mekọrọ ọnụ iji bipụta akwụkwọ ndị dị mma n’ihe karịrị otu narị asụsụ n’otu oge. Ìgwè ndị nsụgharị, bụ́ ndị wepụtaworo oge na nkà ha n’afọ ofufo, na-eji kọmputa arụpụta ọrụ dị nnọọ mma, ziri nnọọ ezi, na n’ụzọ dị nnọọ ngwa. Otú a, a na-ebipụta akwụkwọ dị iche iche ngwa ngwa ọbụna n’asụsụ ndị a na-enweghị ọtụtụ ndị na-asụgharị ha. Ka ọ dị ugbu a, ihe karịrị ndị ikom na ndị inyom 1,950 na-arụ ọrụ nsụgharị a zuru ụwa ọnụ a na-ejighị akpa ego. Ma n’ihi gịnị ka e ji eme mgbalị dị otú ahụ? Ò kwesịrị ya n’ezie, ebe ọ bụ na ọtụtụ ndị bụ́ ndị na-asụ asụsụ mmadụ ole na ole maara, na-asụtụkwa nke ọtụtụ ndị na-asụ?
Ndịàmà Jehova achọpụtawo na mgbalị ahụ kwesịrị ya n’ezie n’ihi ihe ahụ William Tyndale, onye nsụgharị Bible a ma ama na narị afọ nke 16, kwuru. O dere, sị: “Ahụwo m site n’ahụmahụ na ọ pụghị ikwe omume ime ka ndị nkịtị mata eziokwu ọ bụla, ọ gwụla ma e mere ka ha nwee Akwụkwọ Nsọ n’asụsụ ala nna ha, ka ha wee nwee ike ịhụ isi ihe, ịdị n’usoro, na ihe ihe odide ahụ pụtara.”
N’ezie, ọ dịghị ekwe omume mgbe nile ndị mmadụ inwe akwụkwọ ndị dabeere na Bible n’asụsụ ala nna ha. Ma mgbe a pụrụ ibipụta ha, eziokwu Bible na-eru ha n’obi ngwa ngwa nakwa n’ụzọ miri emi karị. A chọpụtawo nke a ná mba ndị dịbu na Soviet Union
bụ́ ebe ndị agbụrụ dị iche iche na-asụ ọtụtụ asụsụ ala ha. Ná mmalite narị afọ gara aga, e mere ka ọtụtụ n’ime ha bụrụ akụkụ Soviet Union, a kụzikwaara ha asụsụ Russian—ma chọọ ka ha na-asụ ya. N’ihi ya, ha na-agụ ma na-ede asụsụ Russian, na-asụkwa asụsụ ala ha n’otu oge ahụ.Karịsịa eri Soviet Union dakpọsịrị na 1991, ọtụtụ n’ime ndị a chọrọ ịdị na-asụ asụsụ ala nna ha. Nke a metụtara ndị asụsụ ala ha bụ Adyghe, Altai, Belorussian, Georgian, Kirghiz, Komi, Ossetian, Tuvinian, ma ọ bụ nke ọ bụla n’ime ọtụtụ ndị ọzọ. Ọ bụ ezie na ihe ka ọtụtụ n’ime ha pụrụ iji asụsụ Russian kparịta ụka, akwụkwọ ndị dabeere na Bible e bipụtara n’asụsụ Russian adịghị eru ha n’obi ngwa ngwa. N’aka nke ọzọ akwụkwọ ndị e bipụtara n’asụsụ ala ha na-akpali mmasị ha n’ụzọ dị ịrịba ama. “Ọ dị mma na unu amalitewala ibipụta akwụkwọ n’asụsụ anyị,” ka otu onye natara traktị dabeere na Bible bụ́ nke e bipụtara n’asụsụ Altai kwuru.
Ihe atụ ọzọ e nwere banyere nke a bụ Greenland, bụ́ àgwàetiti dị n’Arctic, nke nanị ihe dị ka mmadụ 60,000 bi na ya. A na-ebipụta ma Ụlọ Nche ma Teta! n’asụsụ Greenlandic, a makwa magazin ndị a ama nke ọma—dị ka a makwaara akwụkwọ ndị ọzọ Ndịàmà Jehova na-ebipụta n’asụsụ Greenlandic. N’eziokwu, a pụrụ ịhụ akwụkwọ ndị dị otú ahụ n’ọtụtụ ebe obibi dị n’obodo nta ndị kasị dị anya n’àgwàetiti ahụ.
N’Ebe Ndịda Pacific, ihe dị ka mmadụ 7,000 na-asụ asụsụ Nauruan, 4,500 na-asụ asụsụ Tokelauan, 12,000 na-asụkwa asụsụ Rotuman. Ndịàmà na-ebipụta ugbu a traktị na broshuọ ndị dabeere na Bible n’asụsụ ndị ahụ tinyere Ụlọ Nche ndị a na-ebipụta otu ugboro n’ọnwa n’asụsụ Niuean, bụ́ nke ihe dị ka mmadụ 8,000 na-asụ, nakwa n’asụsụ Tuvaluan, bụ́ nke ihe dị ka 11,000 na-asụ. N’ezie, Ndịàmà Jehova so ná ndị kasị ewepụta akwụkwọ ndị e biri ebi n’asụsụ mmadụ ole na ole na-asụ, na-ebipụta akwụkwọ ndị dabeere na Bible n’asụsụ ndị dị ka Bislama, Hiri Motu, Papiamento, Mauritian Creole, New Guinea Pidgin, Seychelles-Creole, Solomon Islands Pidgin, na ọtụtụ ndị ọzọ.
Mgbe mgbe, ka ndị na-asụ otu asụsụ na-adị ntakịrị karị, otú ahụ ka ha na-abụ ndị e kewapụrụ iche na ndị dara ogbenye karị. Ma, ọnụ ọgụgụ ndị maara akwụkwọ n’ebe ndị dị otú ahụ pụrụ ịdị elu. Bible e bipụtara n’asụsụ a na-asụ n’ebe ahụ na-abụkarịkwa otu n’ime akwụkwọ ole na ole ndị bi ebe ahụ na-enweta. N’eziokwu, e nweghị ọbụna akwụkwọ akụkọ ọ bụla n’ụfọdụ n’ime asụsụ ndị a, ebe ọ bụ na ibipụta nke ọ bụla ga-asụ ahịa.
Ihe Mere O Ji Bụrụ Ọrụ E Nwere Ekele Maka Ya
N’ihi na Ndịàmà Jehova na-ebipụta akwụkwọ ndị na-eme ka ọdịdị ndụ ndị mmadụ dịwanye mma, ọtụtụ ndị etowo mgbalị ndị ha na-eme n’ime nsụgharị. Linda Crowl, onye na-arụ ọrụ n’Ụlọ Akwụkwọ Maka Ihe Ọmụmụ Pacific, dị na Mahadum Ebe Ndịda Pacific na Suva, Fiji, kwuru na ọrụ nsụgharị nke Ndịàmà bụ “ihe kasị akpali akpali na-ewere ọnọdụ na Pacific.” Ọ na-atụ aro ka a na-agụ akwụkwọ ha n’ihi na ha dị nnọọ mma.
Mgbe a malitere ibipụta Teta! ugboro anọ n’afọ n’asụsụ Samoan, akwụkwọ akụkọ a na-ebipụta n’ebe ahụ nakwa TV mba ahụ
kọrọ akụkọ banyere ya. Mgbe a na-akọ akụkọ ahụ, e gosiri ihu Teta! ahụ, e meghekwara isiokwu nke ọ bụla dị na magazin ahụ. Mgbe nke ahụ gasịrị e kwuru okwu banyere ha otu otu.N’ụzọ dị ịrịba ama, ná mba ụfọdụ òtù ndị na-akwalite asụsụ obodo na-akpọtụrụ ndị na-asụgharị akwụkwọ Ndịàmà mgbe nile maka ụtọ asụsụ, ụkpụrụ ide okwu, ichepụta okwu ọhụrụ, na ihe ndị ọzọ. N’ụzọ doro anya, ọrụ izi ihe n’efu nke Ndịàmà Jehova na-arụ emetụtawo ndụ ọtụtụ ndị ọzọ ma e wezụga nke ndị nọsiri ike n’ọgbakọ ha.
Ma, dị ka e kwuru n’isiokwu bu ụzọ, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu ijeri ndị toworo eto—ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu ụzọ n’ụzọ isii nke ndị bi n’ụwa—amaghị akwụkwọ. Gịnị ka e meworo iji nyere ndị dị otú ahụ aka irite uru n’ihe ọmụma dị mkpa a na-enweta site n’ịgụ na ịmụ ihe?
Igbo Mkpa Mmụta Ndị Bụ́ Isi
N’ọtụtụ mba, Ndịàmà ahaziwo ihe omume nke ịmụ ịgụ na ide ihe bụ́ nke a na-enwe
n’efu, na-akụziri ndị mmadụ otú e si agụ na otú e si ede ihe. Ha ebipụtawo ọbụna akwụkwọ ndị nke ha e ji akụzi ihe, dị ka akwụkwọ bụ́ Apply Yourself to Reading and Writing, bụ́ nke e bipụtaworo n’asụsụ 28. Klas ndị a enyeworo ọtụtụ puku mmadụ aka, gụnyere ndị inyom na ndị agadi, ịghọ ndị maara akwụkwọ.Na Burundi, Ndịàmà Jehova eduziwo klas ịmụ ịgụ na ide ihe bụ́ ndị nyewooro ọtụtụ narị mmadụ aka ịgụ na ide ihe. Mgbe ha tụlesịrị ezi ihe ndị si n’ihe omume a pụta, Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Ịkuziri Ndị Okenye Ịgụ na Ide Ihe ná mba ahụ nyere Ndịàmà anọ na-akụzi ihe na klas ndị ahụ onyinye n’Ụbọchị Ịgụ na Ide Ihe nke Mba Nile, bụ́ nke e nwere na September 8, 1999.
A natara akụkọ na-esonụ banyere klas ịmụ ịgụ na ide ihe ndị e nwere n’ihe dị ka ọgbakọ 700 nke Ndịàmà Jehova dịgasị na Mozambique: “N’ime afọ anọ gara aga, ụmụ akwụkwọ 5,089 agụsịwo akwụkwọ, anyị nwekwara mmadụ 4,000 aha ha dị n’akwụkwọ ugbu a.” Otu nwa akwụkwọ dere, sị: “Ana m ekwupụta ekele m sitere n’obi maka ụlọ akwụkwọ a . . . Abụ m onye na-enwebughị ihe ọ ma. N’ihi ụlọ akwụkwọ a, apụrụ m ịgụ ihe, ọ bụ ezie na ọ ka dịkwa m mkpa ịdị na-eme ya mgbe nile, apụrụ m ide ihe.”
Eri 1946, bụ́ mgbe a malitere inwe ihe
ndekọ maka ya na Mexico, a nọwo n’ụlọ akwụkwọ a pụrụ iche bụ́ nke e guzobere maka ịkụzi ịgụ na ide ihe kụziere ihe karịrị mmadụ 143,000 nọ n’ebe ahụ nkà ndị a. Otu nwanyị dị afọ 63 dere, sị: “Ana m ekele Ndịàmà Jehova nke ukwuu, bụ́ ndị kụziiri m otú e si agụ na otú e si ede ihe. Ahụsiri m anya ná ndụ. Otú ọ dị, apụrụ m ịga na Bible ugbu a maka ndụmọdụ, achọtawokwa m obi ụtọ n’ozi dị na ya.”Ná mba Ebe Ndịda America bụ́ Brazil, Ndịàmà akụziwokwara ọtụtụ puku mmadụ ịgụ na ide ihe. “Ịmụta ịgụ ihe yiri ịbụ onye a tọhapụrụ n’agbụ mgbe ọtụtụ afọ gasịrị,” ka otu onye dị afọ 64 kwuru. “Ana m agụ ụdị ihe ọ bụla ugbu a. Nke kasị mkpa, ịgụ na ịmụ Bible emewo ka m nwere onwe m pụọ n’ozizi ụgha.”
Mgbe mgbe, ndị na-akụzi Bible bụ́ Ndịàmà Jehova na-enyere ndị ha na-amụrụ ihe aka n’otu n’otu ịmụta ịgụ ihe. Na Philippines, Martina dị afọ 80 na ụma mgbe otu Onyeàmà letara ya. Martina chọrọ ka a na-eduziri ya ọmụmụ Bible mgbe nile, ma ọ maghị otú e si agụ ihe. Site n’enyemaka nke onye na-akụziri ya Bible, Martina nwere ọganihu, tinyere ọzụzụ ọzọ ọ natara n’ọgbakọ dị ebe ahụ, ọ ghọrọ onye ruru eru iji Bible na-akụziri ndị ọzọ ihe. Taa ọ bụ onye maara akwụkwọ, nke na-akụzi Bible oge nile.
N’ụzọ doro anya, mmadụ nile nwere ikike nke ịbụ ndị maara akwụkwọ. Ma anyị pụrụ ịjụ sị, Ihe ọmụma sitere na Bible banyere Chineke na nzube ya dị iche iche hà na-abara ndị mmadụ uru n’ezie? Isiokwu ikpeazụ nke usoro isiokwu a ga-aza ajụjụ ahụ.
[Igbe/Foto dị na peeji nke 21]
“Apụghị M Ikwutecha . . . ”
Ndị ọchịchị, ndị gụrụ akwụkwọ, na ndị nkịtị amatachawo mgbalị ndị Ndịàmà Jehova na-eme iji kwalite nkụzi a na-akụziri ndị mmadụ ihe n’ụwa dum. Nke a bụ ụfọdụ n’ime ihe ndị ha kwuru:
“Obi dị mụ na gọọmenti m ụtọ karịsịa n’ihi na akwụkwọ a [Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala, n’asụsụ Tuvaluan] bụkwa ihe ọhụrụ ọzọ dị mkpa a tụkwasịrị ‘n’akụ̀’ ndị dị oké ọnụ ahịa nke Tuvalu. Unu kwesịrị inwe nnọọ obi ụtọ n’òkè unu kerewooro—òkè magburu onwe ya n’iwulite ndụ ime mmụọ nke ndị nọ ná mba a. Ekweere m na a ga-edebanye akwụkwọ a n’akụkọ ihe mere eme nke Tuvalu ma a bịa n’ihe banyere mbipụta nke akwụkwọ ndị e ji amụ ihe.”—Dr. T. Puapua, onye bụbu praịm minista Tuvalu, Ebe Ndịda Pacific.
“Ndịàmà Jehova nwere usoro mbipụta akwụkwọ na-arụsi ọrụ ike, bụ́ nke na-eji nkà na ụzụ kasị ọhụrụ n’Ebe Ndịda Pacific eme ihe. . . . Nkà a nke ibipụta akwụkwọ dị nnọọ ịrịba ama ma mmadụ tụlee mgbanwe ndị a na-enwe n’asụsụ . . . n’etiti ndị Pacific Islands.”—Linda Crowl, Mahadum nke Ebe Ndịda Pacific, Suva, Fiji.
“Lee ka akwụkwọ bụ́ Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ nke e bipụtara n’asụsụ Isoko si magbuo onwe ya ma dị ike! Anyị na-ekele ndị ọrụ afọ ofufo so n’ìgwè nsụgharị asụsụ Isoko maka inyere anyị aka ịghọta akwụkwọ ahụ nke ọma.”—C.O.A., Nigeria.
“Apụghị m ikwutecha otú m nweruru ekele maka nsụgharị a nke Bible [New World Translation n’asụsụ Serbia], bụ́ nke dị mfe nghọta. N’oge gara aga, agbalịrị m ịgụcha Bible, ma ike na-agwụkarị m ngwa ngwa n’ihi na apụghị m ịghọta asụsụ ya. Enwere m ike ugbu a ịgụ nsụgharị a pụrụ iche ma ghọta ya!”—J. A., Yugoslavia.
“Ana m ekele unu maka akwụkwọ ndị mara mma, na-akụzi ihe ma na-ewuli elu, bụ́ ndị a sụgharịrị n’asụsụ Tiv. N’eziokwu, apụghị m ikwutecha abamuru na agbamume nile m nwetara n’akwụkwọ nakwa na broshuọ ndị a. Akwụkwọ ndị a erutewo ọtụtụ puku mmadụ aka.”—P.T.S., Nigeria.
[Foto]
Nde 36 asụsụ 115
[Foto ndị dị na peeji nke 16, 17]
E bipụtawo ihe karịrị 100 nde nke “New World Translation” n’asụsụ 37
[Foto ndị dị na peeji nke 19]
Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ 2,000 na-ekere òkè n’ịsụgharị akwụkwọ Ndịàmà Jehova n’ụwa dum. (Ìgwè ndị nsụgharị asụsụ Zulu na South Africa, n’aka ekpe; nakwa onye nsụgharị asụsụ Japanese, n’ala ala)
[Foto dị na peeji nke 19]
A na-ebi ihe karịrị otu ijeri “Ụlọ Nche” na “Teta!” n’afọ ọ bụla
[Foto ndị dị na peeji nke 20]
Ndịàmà Jehova na-eduzi klas ndị a na-amụ ịgụ na ide ihe na ha n’ụwa dum. (Mexico, n’aka nri; na Burundi, n’ala ala.)