Ebe Ịchụàjà Ndị Dị n’Ụlọikwuu na Ọrụ Ha n’Ofufe Jehova
A rụrụ ebe ịchụàjà ndị dị n’ụlọikwuu otú Jehova si kwuo, e nwekwara ihe pụrụ iche ha pụtara.
-
Dị ka ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ onye na-eme mmanụ otite mere, ekpere ndị ohu Jehova ji obi ha niile kpee na-atọ ya ụtọ
-
Jehova nabatara àjà ndị a chụrụ n’elu ebe ịchụàjà nke àjà nsure ọkụ ahụ. Otú ebe ịchụàjà ahụ si nọrọ n’ihu ụlọ nsọ na-echetara anyị na anyị kwesịrị inwe okwukwe n’àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ ma anyị chọọ ka anyị na Chineke dịrị ná mma.—Jọn 3:16-18; Hib. 10:5-10
Olee otú anyị nwere ike isi mee ka ekpere anyị dịrị ka ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ a kwadebere n’ihu Chineke?—Ọma 141:2