Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ebe Job na-enye nwaanyị dara ogbenye na nwa ya nwoke ihe oriri n’ọnụ ụzọ ámá obodo.

Ebe Job na-egosi ndị ihe siiri ike ịhụnanya pụrụ iche

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

Ì Nwere Aha Ọma Ka Job?

Ì Nwere Aha Ọma Ka Job?

Otú Job si akpa àgwà mere ka ndị agbata obi ya na-akwanyere ya ùgwù (Job 29:7-11)

A ma Job ama na ọ na-egosi ndị ihe siiri ike ịhụnanya pụrụ iche (Job 29:12, 13; w02 5/15 22 ¶19; kọwaa ihe e sere n’ihu akwụkwọ a)

Job mere ezi omume, o megbughịkwa onye ọ bụla (Job 29:14; it-1 655 ¶10)

Foto ndị na-egosi: Ebe nwanna nwaanyị bụ́ agbọghọbịa na-enyere ndị ọzọ aka. 1. O kwere ka nwanna nwaanyị merela agadi jide ya aka ka ha na-aga n’ụzọ. 2. Ọ na-ege ntị ka nwanna nwaanyị ọzọ na-akọrọ ya ihe dị ya n’obi. 3. Ya na nwanna nwaanyị ọzọ na-ezi otu nwaanyị du nkịta ya na-akpagharị ozi ọma. 4. Ọ na-ebupụtara ndị bịara n’ụlọ ya ihe oriri.

Mmadụ inwe aha ọma bara ezigbo uru. (w09 2/1 15 ¶3-4) Otú mmadụ si enwe aha ọma bụ onye ahụ ịna-eme ihe ziri ezi ruo ogologo oge.

JỤỌ ONWE GỊ, SỊ: ‘Olee àgwà ndị e ji mara m?’