Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Ọrụ Siri Ezigbo Ike nke Mmụọ Nsọ Mere Ka A Rụọ

Ọrụ Siri Ezigbo Ike nke Mmụọ Nsọ Mere Ka A Rụọ

Kemgbe ụwa, ndị Chineke na-arụzu ọtụtụ ihe dị ịtụnanya. Ọ bụghị ike aka ha ka ha ji arụzu ihe ndị a, kama ọ bụ Jehova na-enyere ha aka. N’afọ 1954, nzukọ Jehova mepụtara otu vidio Bekee aha ya bụ The New World Society in Action. Ọ bụ ndị na-eje ozi na Betel, ndị na-amaghị otú e si eme vidio, rụrụ ọtụtụ ọrụ dị n’imepụta ya. Ọ bụ naanị mmụọ nsọ Jehova nwere ike ime ka ịrụ ụdị ọrụ a kwe omume. Ihe a na-eme ka obi sie anyị ike na ọ bụrụ na anyị atụkwasị Jehova obi, anyị ga-arụli ọrụ ọ bụla e nyere anyị rụọ.​—Zek. 4:6.

LEENỤ VIDIO BỤ́ OTÚ E SI MEPỤTA VIDIO BEKEE BỤ́ “THE NEW WORLD SOCIETY IN ACTION,” ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Gịnị mere e ji kpebie ime vidio banyere isi ụlọ ọrụ anyị?

  • Olee otú vidio ahụ si gosi na Betel na-arụ ọrụ ka ahụ́ mmadụ?​—1 Kọr. 12:​14-20

  • Olee ihe ndị siiri ụmụnna anyị ike mgbe ha na-emepụta vidio ahụ, oleekwa otú ha si merie ihe ndị ahụ?

  • Gịnị ka akụkọ a na-akụziri anyị banyere mmụọ nsọ Jehova?