OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Jehova Ma Ihe Dị Anyị Mkpa
Ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche na-enye anyị nri “n’oge kwesịrị ekwesị.” Ihe a na-egosi na Jehova, bụ́ onye na-eduzi ohu ahụ, ma ihe dị anyị mkpa ga-eme ka okwukwe anyị sie ike. (Mat. 24:45) Mgbakọ ukwu ndị anyị na-enwe, ọmụmụ ihe etiti izu anyị na ọtụtụ ihe ndị ọzọ gosiri na nke a bụ eziokwu.
LEENỤ VIDIO BỤ́ AKỤKỌ KỌMITII IZI IHE NKE ÒTÙ NA-ACHỊ ISI NKE AFỌ 2017, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ NA-ESONỤ:
-
Ònye ka anyị kwesịrị inye otuto maka mgbakọ ndị anyị na-enwe, n’ihi gịnịkwa?
-
Olee mgbe a na-amalite ịkwadebe ihe ndị a ga-eme ná mgbakọ?
-
Olee otú e si ahọta isiokwu mgbakọ?
-
Olee ọrụ ndị a na-arụ iji kwadebe mgbakọ?
-
Olee otú otú anyị si amụ ihe n’ọmụmụ ihe etiti izu si yie otú e si amụ ihe n’Ụlọ Akwụkwọ Gilied?
-
Olee otú ngalaba dị iche iche si arụkọ ọrụ ọnụ iji kwadebe usoro ihe omume ọmụmụ ihe etiti izu anyị?
Olee otú obi dị gị maka ihe ndị Jehova na-enye anyị iji mee ka okwukwe anyị sie ike?