Jun 16-22
ILU 18
Abụ nke 90 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)
1. Na-ekwu Ihe Ga-agba Ndị Nọ n’Ọrịa Ume
(Nkeji 10)
Na-ekwu okwu ka onye nwere amamihe si n’aka Chineke (Ilu 18:4; w22.10 22 ¶17)
Gbalịa ghọta ihe ya na onye ahụ na-alụ (Ilu 18:13; mrt igbe dị n’isiokwu nke 19)
Bụrụ enyi na-enyere enyi ya aka na enyi na-enwe ndidi (Ilu 18:24; wp23.1 14 ¶3–15 ¶1)
JỤỌ ONWE GỊ, SỊ: ‘Gịnị ka m ga-eme iji nyere di m ma ọ bụ nwunye m aka ma ọ bụrụ na ahụ́ adịghị ya ma ọ bụ na isi akpakọchaghịzi ya ọnụ?’
2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
(Nkeji 10)
-
Ilu 18:18—Gịnị mere e ji efe nza n’oge ochie? (it-2 271-272)
-
Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?
3. Ọgụgụ Baịbụl
(Nkeji 4) Ilu 18:1-17 (th ihe ọmụmụ nke 11)
4. Ịmalite Mkparịta Ụka
(1 nkeji) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Onye ahụ na-asụ asụsụ ọzọ. (lmd isi nke 2 nọmba nke 5)
5. N’Oge Ọzọ
(Nkeji 3) IKWUSA OZI ỌMA N’EBE NDỊ MMADỤ NA-ANỌKARỊ. Onye ahụ sịrị gị gbuo okwu gị nkenke. (lmd isi nke 7 nọmba nke 4)
6. N’Oge Ọzọ
(Nkeji 3) ỊGBA ÀMÀ N’OGE A NA-ANỌGHỊ N’OZI. Kụziere onye ahụ otu eziokwu dị mkpa banyere Alaeze Chineke. (lmd isi nke 9 nọmba nke 5)
7. Ịkọwa Ihe Ndị I Kweere
(Nkeji 4) Ihe Ngosi. ijwfq isiokwu nke 29—Isiokwu: Ùnu Kweere na E Ji Ụbọchị Isii Nkịtị Kee Ihe Niile n’Ime Puku Afọ Ole na Ole Gara Aga? (lmd isi nke 5 nọmba nke 5)
Abụ nke 144
8. Inyere Ndị Ezinụlọ Gị na Ndị Enyi Gị Aka Ịbịaru Jehova Nso ‘n’Ezighị Ha Ozi Ọma’
(Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.
Ọtụtụ n’ime anyị nwere onye anyị ma na-anaghị efe Jehova. O nwere ike ịbụ di anyị, nwunye anyị, nwa anyị, ma ọ bụkwanụ ezigbo enyi anyị si n’ọgbakọ pụọ. Ò nwetụla mgbe ị chọpụtara na ị na-amanye onye ahụ amanye ma ọ bụ jiri iwe na-agwa ya okwu mgbe ị na-agbalị ime ka o kweta ife Jehova? Ọ bụ eziokwu na ihe anyị bu n’obi na-eme otú ahụ dị mma, ma ihe anyị na-ekwu nwere ike ime ka ihe ka njọ. (Ilu 12:18) Olee otú ka mma isi nyere onye ahụ aka?
Ihe e dere na Pita nke Mbụ 3:1 gosiri na di na-anaghị efe Jehova ‘nwere ike fewe ya n’agbanyeghị na e zighị ya ozi ọma.’ Ọ bụrụgodị na nwoke anaghị ekwe ka ya na nwunye ya bụ́ Onye Kraịst na-ekwurịta ihe dị na Baịbụl, nwunye ya ka nwere ike inyere ya aka ịmata onye Jehova bụ. Ebe ọ bụ na Okwu Chineke emeela ka nwunye ya na-ahụ ndị ọzọ n’anya, dịrị obiọma, na-emekwa omume ka onye ma ihe, àgwà ọma ndị a na àgwà ọma ndị ọzọ ọ na-akpa nwere ike ime ka di ya gbanwee obi ya, bido fewe Jehova. (Ilu 16:23) Àgwà ọma anyị na obiọma anyị nwere ike ime ka ndị ezinụlọ anyị ma ọ bụ ndị enyi anyị na-anaghị efe Jehova bido fewe Jehova.—Kọl. 4:6.
Kpọnye VIDIO Bụ́ Ndị Na-agbasi Mbọ Ike Ka Okwukwe Ha Sie Ike—Ndị Di Ma Ọ Bụ Nwunye Ha Na-abụghị Ndịàmà Jehova. Jụzie ụmụnna ajụjụ ndị a:
-
Gịnị ka ị mụtara n’akụkọ Nwanna Nwaanyị Sasaki?
-
Gịnị ka ị mụtara n’akụkọ Nwanna Nwaanyị Ito?
-
Gịnị ka ị mụtara n’akụkọ Nwanna Nwaanyị Okada?
9. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ
(Nkeji 30) w23 Mach, Isiokwu A Na-amụ Amụ nke 14, “Mmadụ Niile Ga-eji Ya Mata na Unu Bụ Ndị Na-eso Ụzọ M” ¶1-10